Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 20 Jun
Kalenda Ọtọdọks · 7 Jun (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 20 Jun 2027
Sọnde · Olu 7
Mmemme na ndị nsọ
Pentikọọsụ Nsọ. Mmemme nke Atọ nʼIme Otu Nsọ
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
16Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Kpọkọta iri ndị okenye ụmụ Izrel asaa, ndị ị maara na ha bụ ndị ndu, na ndị nlekọta ije ozi nʼetiti ụmụ Izrel. Kpọta ha nʼụlọ nzute m ka ha soro gị guzoro. 17Aga m abịa nʼebe ahụ gwa gị okwu. Mgbe ahụ kwa, aga m ewere ụfọdụ nʼime Mmụọ m dị nʼime gị tinye nʼime iri ndị ndu asaa ahụ. Ha ga-enyere gị aka ibu ibu arọ nke ịchịkọta ụmụ Izrel. Nʼụzọ dị otu a, ọ gaghị abụkwa ibu dịrị naanị gị ibu. 24Ya mere, Mosis pụrụ ga gwa ụmụ Izrel ihe Onyenwe anyị kwuru. Ọ chịkọtara iri ndị okenye asaa ahụ nye ha ọnọdụ gburugburu ụlọ nzute ahụ. 25Mgbe ahụ, Onyenwe anyị rịdatara nʼime igwe ojii. Ya na Mosis kparịtaa ụka. Onyenwe anyị weere ụfọdụ nʼime Mmụọ dị nʼime Mosis, tinye ya nʼime iri ndị okenye asaa ndị ahụ. Mgbe Mmụọ a batara nʼime ha, ha niile buru amụma. Ma ha ebughị amụma gaa nʼihu. 26Ma mmadụ abụọ nʼime iri ndị okenye asaa ndị ahụ, Eldad na Medad nọgidere nʼọmụma ụlọ ikwu ha. Ọ bụ ezie na e depụtara aha ha dịka ndị ndu, ma ha esoghị ndị ọzọ gaa nʼụlọ nzute. Ma Mmụọ ahụ bịakwasịrị ha nʼebe ahụ ha nọ. Ha bukwara amụma. 27Otu okorobịa gbapụrụ ọsọ gaa kọọrọ Mosis sị ya, “Eldad na Medad na-ebu amụma nʼọmụma ụlọ ikwu ha.” 28Joshua nwa Nun, onyeozi Mosis site na mgbe ọ bụ okorobịa, gwara Mosis okwu sị ya, “Onyenwe m Mosis, mee ka ndị a kwụsị ibu amụma.” 29Ma Mosis zara sị, “Ọ bụ nʼihi ikwochitara m ekworo ka i ji chọọ ka m kwụsị ha? Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na ndị Onyenwe anyị niile bụ ndị amụma, ndị Onyenwe anyị ga-etinye Mmụọ ya nʼime ha!”
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
23Ụmụ Zayọn, ka obi tọọ unu ụtọ, ṅụrịanụ ọṅụ nʼime ịdị mma Onyenwe anyị, bụ Chineke unu. Nʼihi na o nyela unu mmiri ozuzo mbụ nke ọkọchị, nʼihi ịdị mma ya. Ọ na-ezite ọtụtụ mmiri ozuzo, nke ọkọchị, na nke udu mmiri, dịka ọ dị na mbụ. 24Ebe ịzọcha ọka gị niile ga-ejupụtakwa na mkpụrụ ọka, ebe ịnara mmanya gị niile ga-ejubiga oke na mmanya na mmanụ ọhụrụ. 25“Aga m enyeghachi afọ niile nke igurube riri, ndị ahụ nke igurube ukwu na igurube nta, na ụkpana, na ndị mbibi ọzọ riri, bụ usuu ndị agha ahụ m zitere nʼetiti unu. 26Unu ga-eri ka unu siri chọọ, rijuchaa afọ, unu ga-etokwa Onyenwe anyị bụ Chineke unu, onye rụrụ ọrụ ebube ndị a nʼihi unu. Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ ihere ga-eme ndị m. 27Mgbe ahụ unu ga-amata na m nọ nʼebe a nʼetiti ndị m Izrel. Unu ga-amatakwa na naanị m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, na ọ dịkwaghị onye ọzọ. Ihere agaghị emekwa ndị m ọzọ. 28“Ma emesịa, aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m. Ụmụ unu ndị ikom, na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma. Ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ. Ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ. 29Nʼụbọchị ahụ, aga m awụsa mmụọ m ọbụladị nʼahụ ndị ohu m ndị nwoke na ndị nwanyị. 30Aga m egosi ihe ebube dị iche iche na mbara eluigwe, na nʼelu ụwa; a ga-ahụ ọbara, na ire ọkụ, na ogidi anwụrụ ọkụ. 31Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-aghọkwa ọbara, tupu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa oke egwu. 32Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị ka a ga-azọpụta. Nʼihi na ọ bụ nʼelu ugwu Zayọn, na nʼime Jerusalem ka mgbapụta ga-adị, dịka Onyenwe anyị kwuru ya. Mgbapụta a ga-adịkwara ndị fọdụrụ ndụ, bụ ndị ahụ Onyenwe anyị na-akpọ.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
24“ ‘Nʼihi na aga m esi na mba niile dị iche iche kpọpụta unu. Aga m achịkọta unu site nʼala niile, mee ka unu bata nʼala unu. 25Aga m efekwasị unu mmiri dị ọcha, unu ga-adịkwa ọcha. Aga m eme ka unu dị ọcha site na-adịghị ọcha unu niile, na site nʼikpere arụsị unu niile. 26Aga m enye unu obi ọhụrụ, kenyekwa unu mmụọ ọhụrụ. Aga m ewepụ obi nkume nke mmehie dị nʼime unu, nye unu mkpụrụobi nke anụ ahụ. 27Aga m etinyekwa mmụọ m nʼime unu, mee ka unu gbaso ụkpụrụ m niile ma lezie anya mekwaa ihe niile m nyere nʼiwu. 28Unu ga-ebikwa nʼala ahụ nke m nyere nna unu ha. Unu ga-abụ ndị m, aga m abụkwa Chineke unu.
Ofufe ụtụtụ: Oziọma
19Nʼuhuruchi nke ụbọchị ahụ, bụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe ndị na-eso ụzọ ya zukọtara nʼime otu ụlọ. Ha mechiri ụzọ niile nʼihi egwu ndị Juu. Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu!” 20Mgbe o kwusiri nke a, o gosiri ha aka ya na akụkụ ya. Ọṅụ juru ndị na-eso ụzọ ya obi nʼihi na ha ahụla Onyenwe anyị. 21Ọzọkwa, Jisọs sịrị ha, “Udo dịrị unu! Dị ka Nna m si zite m, otu a ka m na-eziga unu.” 22Mgbe o kwuchara nke a, o kusara ha ume sị ha, “Naranụ Mmụọ Nsọ. 23Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ọbụla mmehie ya, a ga-agbaghara ya, ọ bụrụkwa na unu ajụ ịgbaghara ha, agaghị agbaghara ha.”
Akwụkwọ ozi
1Mgbe ụbọchị Pentikọọsụ ruru, ha niile zukọtara nʼotu ebe. 2Na mberede, ụzụ yiri nke oke ifufe dị ike sitere nʼeluigwe bịa jupụta nʼụlọ ahụ ha nọ. 3Ha hụrụ ihe dịka ire ọkụ ka o kewara nọkwasị nʼisi ha nʼotu nʼotu. 4Ha niile jupụtara na Mmụọ Nsọ, malite ịsụ asụsụ dị iche iche dịka Mmụọ Nsọ nyere ha ike. 5Nʼoge ahụ, ọtụtụ ndị Juu ji obi ọcha na-efe Chineke nọ na Jerusalem. Ndị si na mba dị iche iche nʼokpuru eluigwe. 6Igwe mmadụ gbakọtara nʼọnọdụ mgbagwoju anya mgbe ha nụrụ ụzụ ahụ, nʼihi na ha nụrụ ka ha na-asụ asụsụ nke onye ọbụla nʼime ha na-aghọta, nʼasụsụ obodo ha dị iche iche. 7Nʼoke iju anya, ha kwurịtara nʼonwe ha, “Ndị a niile na-ekwu okwu ha abụghị ndị Galili? 8Gịnị mere onye ọbụla nʼime anyị ji na-anụ okwu ha na-ekwu nʼasụsụ ala anyị dị iche iche? 9Ndị Patia, na ndị Midia, na ndị Elam, ndị bikwa nʼime Mesopotamịa, ndị Judịa, na ndị Kapadosia, ndị Pọntọs, na ndị Eshịa, 10ndị Frigia, na ndị Pamfilia, na ndị Ijipt, na ndị akụkụ Libiya nke dị Sirini nso, na ndị ọbịa si na Rom bịa 11(ndị Juu na ndị kwere nʼokpukpe ndị Juu). Ndị Kriit na ndị Arab; anyị na-anụ okwu ha na-ekwu nʼasụsụ anyị dị iche iche banyere ọrụ ebube Chineke.”
Oziọma
37Nʼụbọchị ikpeazụ bụkwa ụbọchị kacha ibe ya nke mmemme ahụ, Jisọs guzooro ọtọ jiri oke olu tie mkpu sị, “Ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ onye ọbụla nkụ, ya bịakwute m bịa ṅụrụ mmiri. 38Onye ọbụla kweere na m, dị ka akwụkwọ nsọ kwururị, isi iyi mmiri nke ndụ ga na-asọpụta site nʼime afọ ya.” 39O kwuru nke a banyere Mmụọ ahụ ndị kwere na ya ga-anata. Tutu ruo oge ahụ, e nyebeghị Mmụọ ahụ, nʼihi na e nyebeghị Jisọs otuto. 40Mgbe ha nụrụ nke a, ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ sịrị, “Nʼeziokwu onye a bụ onye amụma ahụ.” 41Ndị ọzọ sịrị, “Ọ bụ Kraịst ahụ.” Ma ndị nke ọzọ sịkwara, “Nʼezie Kraịst ahụ, ọ ga-esi na Galili pụta? 42Ọ bụ na akwụkwọ nsọ ekwughị na Kraịst ga-esi nʼagbụrụ Devid pụta, na Betlehem bụ obodo Devid?” 43Ya mere nkewa dapụtara nʼetiti igwe mmadụ ahụ nʼihi ya. 44Ụfọdụ chọrọ ijide ya ma ọ dịghị onye ọbụla metụrụ ya aka. 45Mgbe ahụ, ndị nche ụlọnsọ ukwu lọghachiri nʼebe ndịisi nchụaja na ndị Farisii nọ, ndị sịrị ha, “Gịnị mere unu akpụtaghị ya?” 46Ha zara, “Anyị ahụbeghị onye kwuru okwu dị ka nwoke a.” 47Ndị Farisii zara ha, “Unu esorola bụrụ ndị a ghọgburu? 48Ọ dị onye ọbụla nʼime ndịisi maọbụ nʼime ndị Farisii tụkwasịrị ya obi? 49E e! Kama igwe mmadụ ndị a na-amaghị iwu bụ ndị a bụrụ ọnụ.” 50Nikọdimọs, otu nʼime ha bụ onye bịakwutere ya na mbụ sịrị ha, 51“Iwu anyị ọ na-ama mmadụ ikpe, ma ọ bụrụ na o bụghị ụzọ nụta okwu nʼọnụ ya, ịchọpụta ihe onye ahụ na-eme?” 52Ha zaghachiri ya sị, “Gị onwe gị, i sokwa na ndị si Galili pụta? Nyochaa nke ọma, ị ga-achọpụta na onye amụma ọbụla agaghị esi na Galili pụta.” 8:12Ọzọ, Jisọs gwara ha sị, “Abụ m ihe nke ụwa. Onye ọbụla na-eso m agaghị ejegharị nʼọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ìhè nke ndụ.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 7 Jun na kalenda nzukọ bụ 20 Jun na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike