Ụlọ › Ihe Baịbụl kwuru › Ịdị umeala n'obi
Ndụ na ọrụ
Ihe Baịbụl kwuru banyere Ịdị umeala n'obi
Amaokwu ndị na-agụ ya na-elekarị anya maka isiokwu a (10), e hotara ha nʼuju site na Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a.
2Ih 7:14
ọ bụrụ na ndị m ndị a kpọkwasịrị aha m, ewedata onwe ha nʼala, kpee ekpere, chọsie ihu m ike, sitekwa na mmehie ha chigharịa, aga m esite nʼeluigwe za ekpere ha, gbaghara ha mmehie ha, mee ka ala ha dịrị ndu.1Pt 5:6
Ya mere, wedanụ onwe unu nʼokpuru aka dị ike nke Chineke, ka o bulie unu elu nʼoge ya.Jem 4:6
Ma ọ na-enye anyị amara karịa. Ya mere, Akwụkwọ nsọ ji sị, “Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu, ma ọ na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.”Ilu 22:4
Obi umeala bụ egwu Onyenwe anyị, ụgwọ ọ na-akwụ bụ akụnụba, na nsọpụrụ na ndụ ogologo.Ilu 11:2
Nganga bịa, nlelị a na-eso ya, ma onye dị umeala nʼobi na-amụta ihe.Jem 4:10
Wedanụ onwe unu ala nʼihu Onyenwe anyị ọ ga-ebulikwa unu elu.Mai 6:8
Nʼihi na o gosila gị, gị mmadụ, ihe dị mma. Gịnịkwa bụ ihe ahụ Onyenwe anyị na-achọ nʼaka gị, Ọ bụ na ọ bụghị ikpe ziri ezi, na ịhụ ime ebere nʼanya, na iji obi dị umeala soro Chineke gị na-eje ije?Efe 4:2
Werekwanụ obi dị umeala niile na ịdị nwayọọ, na ndidi na-anagide ibe unu nʼịhụnanya.1Pt 5:5
Nʼotu aka ahụ, unu ụmụ okorobịa, doonụ onwe unu nʼokpuru ndị bụ okenye. Unu niile werenụ obi umeala na-ejeritara onwe unu ozi, nʼihi na, “Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu, ma ọ na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.”Kọl 3:12
Ya mere, dị ka ndị Chineke họpụtara, ndị dị nsọ na ndị ọ hụrụ nʼanya, yikwasịnụ onwe unu obi ọmịiko, na obi ebere, na obi dị umeala, na ịdị nwayọọ, na ntachiobi.Ndị a bụ amaokwu ndị na-agụ na-achọkarị maka isiokwu a — ọ bụghị nkuzi banyere ya. Gụọ nke ọ bụla n'isiakwụkwọ ya.
Isi mmalite
Amaokwu nke isiokwu ọ bụla na usoro ha: data isiokwu nke OpenBible.info, dịka votu ndị na-agụ ya si dị: OpenBible.info · CC BY 4.0
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.