Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 26 Septemba
Kalenda Ọtọdọks · 13 Septemba (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 26 Septemba 2027
Sọnde · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 14 mgbe Pentikọọsụ gasịrị
Sọnde tupu Mbuli elu nke Obe
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
22Mgbe ahụ, Solomọn guzoro nʼihu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, na nʼihu ọgbakọ ụmụ Izrel niile, gbasapụ aka ya abụọ chilie ha elu, 23kwuo sị, “ Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, ọ dịghị Chineke dịka gị nʼeluigwe nke dị nʼelu, maọbụ nʼụwa, nʼokpuru eluigwe. Gị onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya gị na ndị ohu gị, bụ ndị ji obi ha niile na-eso ụzọ gị. 27“Ma ọ bụ ezie na gị Chineke ga-ebi nʼelu ụwa? Lee, eluigwe ọbụladị ebe kachasị elu nke eluigwe, ezughị ịba gị. Olee otu ụlọ a nke m wuru ga-esi bata gị? 28Ma Onyenwe anyị Chineke m, ṅaa ntị nʼekpere ohu gị, na arịrịọ ọ na-arịọ maka ebere. Nụrụ akwa na ekpere nke ohu gị na-ekpe nʼihu gị taa. 29Biko, mee ka anya gị abụọ ghere oghe nʼebe ụlọnsọ ukwu a dị, abalị na ehihie, bụ ebe a i kwuru banyere ya, sị, ‘Aha m ga-adị nʼebe ahụ,’ ka i si otu a nụrụ ekpere nke ohu gị ga-ekpe banyere ebe a. 30Nụrụkwa arịrịọ ohu gị na nke ndị gị Izrel niile, mgbe ọbụla ha chere ihu ha nʼebe a nʼekpere. Biko, site nʼeluigwe bụ ebe obibi gị nụrụ, mgbe ị nụrụ biko, gbagharakwa.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
19Ọ bụ site nʼamamihe ka Onyenwe anyị ji tọọ ntọala ụwa; ọ bụkwa nghọta ya mere ka eluigwe dịrị ebe ọ dị. 20Esitere nʼihe ọmụma ya kewaa ogbu mmiri niile, igwe ojii na-atụdakwa igirigi. 21Nwa m nwoke, ekwela ka ihe abụọ ndị a site nʼihu gị wezuga onwe ha: amamihe na nghọta nke ime ihe dị mma nʼizuzu zuruoke, 22nʼihi na ha na-enye gị ndụ ọhụrụ, ha bụkwaara gị ihe ịchọ mma amara nʼolu gị. 23Ha na-eme ka ị na-aga ije nʼụzọ gị na-enweghị ihe egwu maọbụ ihe mkpọbi ụkwụ. 24Mgbe ị ga-edina ala, ị gaghị atụ egwu, ị ga-edina ala ụra gị ga-adị ụtọ. 25Ị gaghị atụ egwu ihe mbibi mberede ọbụla maọbụ tụọ egwu ịla nʼiyi nke na-abịakwasị ndị ajọ omume. 26Nʼihi na Onyenwe anyị bụ ebe ndabere gị, ọ ga-echebekwa gị. 27Ejigidele ihe ọma ị pụrụ imere onye ọzọ mgbe ọ dị gị nʼaka ime ya. 28A sịkwala onye agbataobi gị laa, bịaghachi azụ echi mgbe i nwere ike ime ya taa. 29Agbala izu ọjọọ megide onye agbataobi gị, nʼihi na o nwere ntụkwasị obi nʼebe ị nọ. 30Ebola mmadụ ebubo na-enweghị isi, mgbe onye ahụ na-emeghị gị ihe ọjọọ ọbụla. 31Ekwosola onye na-eme ihe ike ekworo maọbụ họrọ ụzọ ya ọbụla. 32Nʼihi na ndị dị otu a bụ ihe arụ nʼanya Onyenwe anyị, ma ọ na-emeso ndị na-eme ihe ziri ezi mmeso ọma. 33Ọbụbụ ọnụ Onyenwe anyị dị nʼụlọ ndị na-eme ajọ omume, ma ọ na-agọzi ụlọ ndị ezi omume. 34Ndị mpako na-akwa emo ka ya onwe ya na-akwakwa emo, ma ndị dị umeala nʼobi ka ọ na-enye amara.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
1Amamihe ewuola ụlọ ukwu ya nʼelu ogidi asaa. 2O doziela oriri ya nʼusoro, o gbuola anụ ya, gwaakwa mmanya. 3O zipụkwala ndị ozi ya ka ha gaa kpọọ mmadụ niile, site nʼebe dị elu nke obodo ka ha nọ na-akpọ oku na-asị, 4“Bịanụ nʼụlọ m, unu ndị niile na-enweghị uche” Ma nye ndị amamihe kọrọ, ọ na-asị, 5“Bịanụ, rie nri m, ṅụọkwa mmanya m gwakọtara. 6Hapụnụ ụzọ enweghị uche unu, ka unu were dị ndụ; gbasokwanụ ụzọ mmụọ ịghọta ihe.” 7Onye ọbụla na-adọ onye na-akwa emo aka na ntị na-ewetara onwe ya nlelị; onye na-abara mmadụ ọjọọ mba na-enweta nkọcha. 8Abarala ndị na-akwa emo mba, ma ọ bụghị ya, ha ga-akpọ gị asị; baara ndị maara ihe mba, ha ga-ahụ gị nʼanya. 9Kuziere onye maara ihe ihe o kwesiri ịmụta, ọ ga-ama ihe karịa, kuziere onye ziri ezi ihe ọ ga-atụkwasị ihe ọ mụtara nʼamamihe ya. 10Nʼihi na ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe, inwe ihe ọmụma banyere onye Nsọ ahụ bụkwa nghọta. 11Nʼihi na ọ bụ site na amamihe, ka ụbọchị gị ga-adị ogologo. A ga-etinyekwara gị ọtụtụ afọ na ndụ gị.
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 3
9Mgbe Jisọs biliri nʼọnwụ nʼisi ụtụtụ nʼụbọchị mbụ nke izu, onye mbụ o gosiri onwe ya bụ Meri Magdalin, onye ahụ o siri nʼahụ ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa. 10Ọ lara gaa kọrọ ndị ya na ha na-anọ na mbụ, bụ ndị nọrịị na-ebe akwa ma na-erukwa ụjụ. 11Mgbe ha nụrụ na ọ dị ndụ, na ọ hụkwala ya, ha ekweghị. 12Mgbe ihe ndị a gasịrị, o gosiri mmadụ abụọ nʼime ha onwe ya nʼụdị ọzọ, mgbe ha na-abanye nʼime obodo. 13Ndị a laghachiri bịa kọọrọ ndị nke ọzọ ma ha ekwetakwaghị. 14Emesịa, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya iri na otu ahụ onwe ya, mgbe ha nọkọrọ na-eri nri. Ọ baara ha mba nʼihi enweghị okwukwe ha nakwa mkpọchi obi ha, nʼihi na ha jụrụ ikwenye nʼihe ndị ọzọ hụrụ ya gwara ha mgbe e mesịrị ka ọ si nʼọnwụ bilite. 15Ọ gwara ha sị, “Gaanụ nʼime ụwa niile kwusaara ihe niile e kere eke oziọma. 16Onye ọbụla kweerenụ na onye e mekwara baptizim ka a ga-azọpụta. Ma a ga-ama onye ọbụla na-ekwereghị ikpe. 17Ihe ịrịbama ndị a ga-esokwa ndị kwerenụ. Site nʼaha m, ha ga-achụpụ mmụọ ọjọọ; kwuokwa okwu nʼasụsụ ọhụrụ dị iche iche. 18Ha ga-eji aka ha abụọ atụtụlie agwọ, ṅụọkwa nsi ma ọ gaghị emerụ ha ahụ ma otu. Ha ga-ebikwasị ndị ọrịa aka, ahụ ga-adịkwa ha mma.” 19Mgbe Onyenwe anyị Jisọs gwasịrị ha okwu ndị a, e weliri ya elu, baa nʼeluigwe, ebe ọ nọdụ ala nʼakụkụ aka nri Chineke. 20Ha pụrụ kwusaa oziọma nʼebe niile. Onyenwe anyị nọnyekwaara ha, mee ka okwu ya guzosie ike site nʼihe ịrịbama dị iche iche nke na-eso ya.
Akwụkwọ ozi (maka Sọnde tupu Mbuli elu nke Obe)
11Leenu otu mkpụrụ akwụkwọ m ji aka m dee nʼakwụkwọ ozi a si gbaa okpotokpo. 12Ọ bụ ndị na-achọ ka a hụ ha nʼanụ ahụ, bụ ndị ga-amanye unu ka e bie unu ugwu, naanị ihe ha ji eme otu a bụ ka a ghara ịkpagbu ha nʼihi obe Kraịst. 13Ọ bụladị ndị kwere ka e bie ha ugwu, anaghị edebe iwu, kama ha chọrọ ka e bie unu ugwu ka ha nwee ike jiri ya nyaa isi nʼanụ ahụ. 14Ka m gharakwa ịnya isi nʼihe ọbụla karịakwa nʼobe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Nke e sitere na ya kpọgbuo ụwa nʼebe m nọ, ma kpọgbukwaa mụ onwe m nʼebe ụwa nọ. 15Obibi ugwu abụghị ihe, ebighị ugwu abụghịkwa ihe, kama ị bụ onye e kere ọhụrụ bụ ihe dị mkpa. 16Ka udo na ebere dịnyere ndị niile na-ebi ndụ ha nʼusoro a, dakwasịkwa unu Izrel nke Chineke. 17Site ugbu a gaa nʼihu, achọghị m ka onye ọbụla nye ndụ m nsogbu, nʼihi na-ebu m apa nke Jisọs nʼahụ m. 18Ụmụnna m, ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu. Amen.
Akwụkwọ ozi
21Ọ bụ Chineke nʼonwe ya mere ka anyị na unu guzosie ike nʼime Kraịst. O meela ka anyị bụrụ ndị e tere mmanụ. 22Ọ kara anyị akara nʼihu, nyekwa anyị Mmụọ Nsọ ya ka o biri nʼobi anyị, dịka onye ga-ahụ na anyị ga-emezu nkwa ahụ niile. 23Ana m akpọku Chineke dịka onye akaebe m, ọ bụ nʼihi ịnapụta unu mere m ji hapụ ịbịa Kọrint. 24Ọ bụghị na anyị bụ ndị ọchịchị nke okwukwe unu, kama anyị so unu na-arụkọ ọrụ ka unu nwe ọṅụ nʼihi na ọ bụ site nʼokwukwe ka unu ga-esi kwụrụ chịm. 2:1Ekpebiri m nʼime obi m na-agaghị m abịakwute unu ọzọ, iwetara unu ihe mwute. 2Nʼihi na ọ bụrụ na m eme ka obi jọọ unu njọ, onye kwanụ ga-akasị m obi ma ọ bụghị unu, unu onwe unu ndị m mere ka obi jọọ njọ? 3E deere unu akwụkwọ a dịka m kwesiri ime ka m ghara inwe mwute mgbe m bịara, site nʼaka ndị kwesiri ime ka obi dị m mma, nʼihi na o doro m anya na ọṅụ m ga-abụ ọṅụ nke unu niile. 4Eji m anya mmiri dị ukwuu na oke obi mgbu na obi mgbawa deere unu akwụkwọ, ọ bụghị ka m kpasuo unu iwe kama ka unu nwee ike ịmata oke ịhụnanya m nwere nʼebe unu nọ.
Akwụkwọ ozi (maka nraranye Chọọchị nke Ili Nsọ)
1Ya mere, ụmụnna m dị nsọ, ndị so keta oke nʼọkpụkpọ eluigwe ahụ, ka echiche unu dịgide naanị na Jisọs. Onyeisi ozi na onyeisi nchụaja nke okwukwe anyị. 2O kwesiri ntụkwasị obi nye onye ahụ họpụtara ya dịka Mosis si bụrụ onye kwesiri ntụkwasị obi nʼije ozi ya nʼụlọ Chineke. 3Ma Jisọs nwere ugwu na nsọpụrụ karịa Mosis, dịka onye na-ewu ụlọ si enwe ugwu na nsọpụrụ karịa ụlọ o wuru. 4Nʼihi na ụlọ ọbụla nwere onye wuru ya, maọbụ Chineke na-ewu ihe niile.
Oziọma (maka Sọnde tupu Mbuli elu nke Obe)
13O nwebeghị onye ọbụla rigooro nʼeluigwe ewezuga Nwa nke Mmadụ bụ onye siri nʼeluigwe rịdata. 14Dị ka Mosis weliri agwọ elu nʼime ọzara, otu a ka a ga-ewelikwa Nwa nke Mmadụ elu. 15Ka onye ọbụla kwere na ya nwee ndụ ebighị ebi.” 16Nʼihi na Chineke hụrụ ụwa nʼanya, nke a mere o jiri nye Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka onye ọbụla kweere na ya ghara ịla nʼiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi. 17Nʼihi na Chineke eziteghị Ọkpara ya nʼụwa ka o maa ụwa ikpe, kama ka e site nʼaka ya zọpụta ụwa.
Oziọma
1Jisọs gwara ha okwu ọzọ nʼilu sị, 2“Alaeze eluigwe dị ka otu eze, nke kwadoro oke oriri ọlụlụ di na nwunye, nʼihi nwa ya nwoke. 3O zipụrụ ndị ohu ya ka ha gaa chetara ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa. Ma ha niile achọghị ịbịa. 4“O zipụkwara ndị ohu ya ọzọ na-ejere ya ozi ka ha gaa gwa ndị ahụ a kpọrọ oriri sị, ‘E dozichaala ihe oriri ugbu a, egburu m oke ehi, na anụ ọzọ gbara abụba. Edoziela ihe niile. Bịanụ nʼoriri ọlụlụ di na nwunye.’ 5“Ma ndị ahụ niile a kpọrọ oriri gawaara mkpa ha nʼihi na ha akpọghị ya ihe ọbụla. Otu onye gara nʼala ubi ya, nke ọzọ nʼụlọ ahịa ya. 6Ndị fọdụrụ jidere ndị ohu ya, mee ha ihe ihere ma gbukwaa ha. 7Onye eze ahụ were iwe nke ukwuu, zipụ ndị agha ya ka ha gaa laa ndị ogbu mmadụ ahụ nʼiyi, rechapụkwa obodo ha nʼọkụ. 8“Mgbe ahụ ọ gwara ndị ohu ya sị, ‘E doziela m oriri ọlụlụ di na nwunye, ma ndị a kpọrọ oku ekwesighị ekwesi. 9Ugbu a, gaanụ nʼakụkụ ụzọ niile, kpọbatanụ ndị niile unu hụrụ, ka ha bịa nʼoriri ọlụlụ di na nwunye a.’ 10Ndị ohu ahụ pụrụ gaa nʼokporoụzọ niile kpọbata mmadụ niile ha hụrụ. Ha kpọbatara ndị bụ ezi mmadụ na ndị bụ ajọ mmadụ. Ụlọ oriri ahụ jupụtakwara na ndị a kpọrọ. 11“Ma mgbe eze ahụ batara ileta ndị niile nọ na nri, ọ hụrụ otu nwoke nke na-eyighị uwe ọlụlụ nwunye. 12Ọ jụrụ ya ajụjụ sị, ‘Enyi m, i si aṅaa bata nʼebe a mgbe ị na-eyighị uwe ọlụlụ di na nwunye?’ O mechiri ọnụ ya nʼihi na o nweghị ihe ọ ga-asa. 13“Eze ahụ nyere ndị ozi ya iwu sị ha, ‘Keenụ ya eriri, aka na ụkwụ, tụpụkwanụ ya nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.’ 14“Nʼihi na akpọrọ ọtụtụ mmadụ oku, maọbụ mmadụ ole na ole ka a họọrọ.”
Oziọma (maka nraranye Chọọchị nke Ili Nsọ)
13Mgbe Jisọs bịaruru obodo a na-akpọ Sizaria Filipai, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Onye ka ndị mmadụ na-asị na Nwa nke Mmadụ bụ?” 14Ha zara ya sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ụfọdụ na-asị na ị bụ Ịlaịja, ndị ọzọ na-asịkwa na ị bụ Jeremaya, maọbụ otu nʼime ndị amụma.” 15Ọ jụrụ ha sị, “Ma unu onwe unu, ọ bụ onye ka unu na-asị na m bụ?” 16Saimọn Pita zara sị ya, “Ị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ.” 17Jisọs gwara ya sị, “Saimọn Pita nwa Jona, ị bụ onye a gọziri agọzi, nʼihi na anụ ahụ na ọbara ekpugheghị ya nye gị. Kama, ọ bụ Nna m bi nʼeluigwe mere ka ị mata ya. 18Ma mụ onwe m na-agwa gị, na gị onwe gị bụ Pita. Ọ bụkwa nʼelu nkume a ka m ga-ewu ụlọ chọọchị m. Ike niile nke ọkụ ala mmụọ apụghịkwa iguzo megide ya.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 13 Septemba na kalenda nzukọ bụ 26 Septemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike