Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 26 Septemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 26 Septemba 2027
Sọnde · Izu nke 26 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 26 nke Oge Nkịtị
Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
25Mgbe ahụ, Onyenwe anyị rịdatara nʼime igwe ojii. Ya na Mosis kparịtaa ụka. Onyenwe anyị weere ụfọdụ nʼime Mmụọ dị nʼime Mosis, tinye ya nʼime iri ndị okenye asaa ndị ahụ. Mgbe Mmụọ a batara nʼime ha, ha niile buru amụma. Ma ha ebughị amụma gaa nʼihu. 26Ma mmadụ abụọ nʼime iri ndị okenye asaa ndị ahụ, Eldad na Medad nọgidere nʼọmụma ụlọ ikwu ha. Ọ bụ ezie na e depụtara aha ha dịka ndị ndu, ma ha esoghị ndị ọzọ gaa nʼụlọ nzute. Ma Mmụọ ahụ bịakwasịrị ha nʼebe ahụ ha nọ. Ha bukwara amụma. 27Otu okorobịa gbapụrụ ọsọ gaa kọọrọ Mosis sị ya, “Eldad na Medad na-ebu amụma nʼọmụma ụlọ ikwu ha.” 28Joshua nwa Nun, onyeozi Mosis site na mgbe ọ bụ okorobịa, gwara Mosis okwu sị ya, “Onyenwe m Mosis, mee ka ndị a kwụsị ibu amụma.” 29Ma Mosis zara sị, “Ọ bụ nʼihi ikwochitara m ekworo ka i ji chọọ ka m kwụsị ha? Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na ndị Onyenwe anyị niile bụ ndị amụma, ndị Onyenwe anyị ga-etinye Mmụọ ya nʼime ha!”
Abụ Ọma nzaghachi
7Iwu Onyenwe anyị zuruoke; ọ na-eweghachi mkpụrụobi. Ụkpụrụ Onyenwe anyị niile kwesiri ntụkwasị obi; ọ na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe. 9Ịtụ egwu Onyenwe anyị dị ọcha, ọ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị na-eguzosi ike, ha niile bụkwa ihe ziri ezi. 11Ọ bụ site na ha ka a na-adọ ohu gị aka na ntị; ụgwọ ọrụ dị ukwuu dị nʼidebe ha. 12Onye pụrụ ịghọta amaghị ama ya niile? Gbaghara m ihe niile zoro ezo nke adịghị ike m. 13Chebe m, ka m ghara ilezi anya mehie megide gị. Ekwela ka ha na-achị achị na ndụ m. Mgbe ahụ ka m ga-abụ onye zuruoke, onye nwere onwe ya site nʼebe ihe ọjọọ niile nke mmehie dị.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
1Ugbu a geenụ ntị unu ndị ọgaranya, oge eruola mgbe unu kwesiri ịkwa akwa na ịsụ ude nʼihi nsogbu na-akwado ịbịakwasị unu. 2Akụnụba unu ebidola ịta nchara, mkpu eripịakwala uwe unu. 3Ọlaọcha na ọlaedo unu agbaala nchara. Nchara a ga-abụkwa ama megide unu, ọ ga-erepịa anụ ahụ unu dịka ọkụ. Unu akpakọtala akụ nʼụbọchị ikpeazụ ndị a. 4Geenụ ntị! Ụzụ akwa ndị ọrụ unu, ndị unu jụrụ ịkwụ ụgwọ ọrụ ha dị ka o kwesiri na-agbago imegide unu. Ụzụ akwa ndị ọrụ unu, ndị unu ghọgburu, eruola ntị Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. 5Unu ebiela ndụ nke oke oriri na oke ọṅụṅụ nʼelu ụwa, na ndụ inye anụ ahụ unu ihe ọbụla na-akpa ya mkpa. Ma ugbu a, anụ ahụ unu ahụ gbara abụba ejikerela na-eche ụbọchị mgburi ya. 6Unu amala ndị aka ha dị ọcha ikpe, gbukwaa ha, ọ bụladị mgbe ha na-egbochighị unu.
Oziọma
38Jọn sịrị ya, “Onye ozizi, anyị hụrụ otu onye na-achụpụ mmụọ ọjọọ nʼaha gị, ma anyị gbalịrị igbochi ya nʼihi na ọ bụghị otu onye nʼime anyị.” 39Ma Jisọs gwara ha sị, “Unu egbochila ya, nʼihi na onye ọbụla ji aha m na-arụ ọrụ ebube agaghị ekwu okwu ọjọọ megide m. 40Nʼihi na onye ọbụla na-adịghị emegide anyị dịnyeere anyị. 41Nʼeziokwu asị m unu, onye ọbụla ga-ekunye unu otu iko mmiri nʼaha m, nʼihi na unu bụ ndị nke Kraịst, ga-anatakwa ụgwọ ọrụ ya. 42“Ọ bụrụkwa na onye ọbụla emee ka otu nʼime ndị a dị nta kweere na m jehie, ọ ga-akara onye ahụ mma ma ọ bụrụ na e kenyere nkume igwe nri buru ibu nʼolu ya, tụnye ya nʼime oke osimiri. 43Ọ bụrụ na aka gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya. Ọ ga-akara gị mma inwe ọrụsị baa na ndụ karịa inwe aka abụọ banye nʼọkụ ala mmụọ, ebe ọkụ ya na-adịghị anyụ anyụ; 44ebe “ ‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’ 45Ọ bụrụ na ụkwụ gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya, tufukwaa ya, nʼihi na ọ ga-akara gị mma ịba na ndụ na ngwụrọ karịa inwe ụkwụ abụọ a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ; 46ebe “ ‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’ 47Ọ bụrụ na anya gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya. Ọ ga-akara gị mma na i nwere otu anya baa nʼalaeze Chineke, karịa inwe anya abụọ a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ, 48ebe “ ‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Ndị nsọ Kọsmas na Damian, Ndị nwụrụ nʼihi okwukwe
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike