Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Septemba 2027 › 27 Septemba

Kalenda Ọtọdọks · 14 Septemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 27 Septemba 2027

Mọnde · Izu nke 15 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 5

Mmemme na ndị nsọ

The Universal Exaltation of the Precious and Life-Giving Cross

Obubu ọnụ otu ụbọchị · Obubu ọnụ siri ike

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ọpụ 15:22–16:1

22Mgbe ihe ndị a mesịrị, Mosis nọgidere na-edu ụmụ Izrel. Ha sitere nʼOsimiri Uhie ahụ bilie ije, jeruo ọzara Shua. Ha jere ije nʼime ọzara abalị atọ, ma ha achọtaghị mmiri ọṅụṅụ 23Mgbe ha ruru Mara, ha enweghị ike ịṅụ mmiri dị nʼebe ahụ, nʼihi na mmiri ahụ na-elu ilu. (Ọ bụ ilu ilu a mere e ji kpọọ ya Mara.) 24Nʼebe a, ụmụ Izrel malitere itamu ntamu, megide Mosis sị, “Olee mmiri anyị ga-aṅụ?” 25Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa. Onyenwe anyị gosiri Mosis osisi ọ ga-atụnye nʼime mmiri ahụ. Mgbe Mosis mere otu a, mmiri ahụ malitere ịdị ụtọ ọṅụṅụ. Ọ bụkwa na Mara ka Onyenwe anyị nọ nye ha ụkpụrụ ya na iwu ya maka iji ya nwalee ha. 26Ọ sịrị, “Ọ bụrụ na unu ga-ege ntị nke ọma nʼokwu Onyenwe anyị Chineke unu, mee ihe ziri ezi nʼanya ya, ọ bụrụkwa na unu eleruo anya idebe iwu ya na ụkpụrụ ya niile, ọ dịghị ọrịa nke m tinyere nʼahụ ndị Ijipt nke m ga-etinye nʼahụ unu. Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, onye na-agwọ unu ọrịa niile.” 27Ha bịaruru nʼobodo Elim, ebe e nwere isi iyi mmiri ala na-asọpụta dị iri na abụọ, na iri osisi nkwụ asaa. Ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ mmiri ahụ. 16:1Ọgbakọ ụmụ Izrel niile hapụrụ obodo Elim, jere ije bịarute nʼọzara Sin nke dị nʼetiti Saịnaị na Elim. Ha bịaruru nʼebe ahụ nʼabalị iri na ise nke ọnwa abụọ, site na mgbe ha hapụrụ Ijipt.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ilu 3:11–18

11Nwa m nwoke ajụla ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị, ike agwụla gị ịnagide ịba mba ya. 12Nʼihi na ọ bụ ndị Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba, dịka nna si abara nwa ya nke ihe ya na-atọ ya ụtọ mba. 13Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ onye chọtara amamihe, onye nwetara nghọta. 14Nʼihi na amamihe dị mma karịa ọlaọcha, ọ bakwara uru karịa ọlaedo. 15Ọ dị oke ọnụahịa karịa ọla rubi, ọ dịghị ihe na-amasị gị e ji atụnyere ya. 16Ndụ ogologo dị nʼaka nri ya; nʼaka ekpe ya ka akụnụba na nsọpụrụ dịkwa. 17Ụzọ ya bụ ụzọ dị mma bụrụkwa ụzọ udo. 18Amamihe bụ osisi nke ndụ nye ndị na-ejide ya aka, e, onye ahụ nke na-ejidesi ya aka ike ka ihe na-agara nke ọma.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Aịz 60:11–16

11Ọnụ ụzọ ama gị ga-eghe oghe oge niile site nʼụtụtụ ruo nʼụtụtụ, ịnabata akụ niile si na mba dị iche iche. A ga-edurukwa ndị eze dị iche iche bata nʼime ya nʼọnọdụ ndị a dọtara nʼagha. 12Mba ọbụla jụrụ ijere gị ozi ga-ala nʼiyi; a ga-ekpochapụ ha. 13“Otuto niile na ịma mma niile nke Lebanọn ga-abụ nke gị. Osisi junipa, na osisi fịa, na osisi junipa, na osisi saipres, ka a ga-eji chọọ ụlọnsọ m mma. Aga m emekwa ka ebube jupụta nʼebe ahụ ụkwụ m na-adị mgbe niile. 14Ụmụ ndị na-emegbu gị ga-abịa kpọọ isiala nye gị. Ndị ahụ niile na-elelị gị ga-abịa daa nʼala nʼihu gị sutu ụkwụ gị ọnụ. Ha ga-akpọ Jerusalem, Obodo Onyenwe anyị, Zayọn nke Onye nsọ Izrel. 15“Ọ bụ ezie na ọ dị mgbe ị bụ onye a kpọrọ asị, onye a na-emegbu, onye mmadụ niile na-eweda nʼala, ma ugbu a, ị ga-ama mma ruo ebighị ebi; ị ga-abụ ihe na-ewetara ọgbọ niile nke ụwa ọṅụ, nʼihi na otu a ka m ga-eme gị. 16Ị ga-aṅụ mmiri ara nke mba dị iche iche, ọ bụkwa ara ndị eze ka a ga-eji zuo gị. Mgbe ahụ, ị ga-amata nʼezie na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nzọpụta gị na Onye mgbapụta gị, Onye dị ike nke Jekọb.

Ofufe ụtụtụ: Oziọma

Jọn 12:28–36

28Nna, nye aha gị otuto.” Mgbe ahụ, otu olu siri nʼeluigwe bịa, “Enyela m ya otuto, m ga-enyekwa ya otuto ọzọ.” 29Igwe ndị mmadụ guzo nʼebe ahụ, ndị nụrụ ya na-ekwu, “Ọ bụ egbe eluigwe gbara.” Ndị ọzọ na-asị, “Ọ bụ mmụọ ozi na-agwa ya okwu.” 30Jisọs zara ma sị, “Olu a abịaghị nʼihi m kama ọ bịara nʼihi unu. 31Ugbu a bụ oge a ga-ekpe ụwa a ikpe. Ugbu a ka a ga-achụpụ onye ahụ na-achị ụwa a. 32Ma mụ onwe m, mgbe e si nʼụwa welie m elu, aga m adọta mmadụ niile nye onwe m.” 33O kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ nke ọ gaje ịnwụ. 34Igwe mmadụ ahụ zara ya, “Anyị anụla site nʼakwụkwọ iwu na Kraịst ahụ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ma gịnị mere i ji asị na, ‘A ghaghị iweli Nwa nke Mmadụ elu’? Onye bụ ‘Nwa nke mmadụ a’?” 35Jisọs sịrị ha, “Ìhè ga-enwuru unu naanị nwa oge nta. Jegharịanụ nʼìhè a, ugbu a unu nwere ya, tupu ọchịchịrị abịakwasị unu. Onye na-ejegharị nʼọchịchịrị amaghị ebe ọ na-aga. 36Kwerenụ nʼìhè ahụ ugbu a unu nwere ya ka unu ghọọ ụmụ nke ìhè.” Mgbe Jisọs kwusiri nke a ọ hapụrụ ha pụọ ga zoo onwe ya.

Akwụkwọ ozi (maka Mbuli elu nke Obe)

1Kọ 1:18–24

18Nʼihi na okwu maka obe bụ ihe nzuzu nye ndị na-efu efu, ma nye anyị ndị a na-azọpụta, ọ bụrụ anyị ike nke Chineke. 19E dere ya, “Aga m emebi amamihe ndị maara ihe. Aga m emekwa ka oke nghọta nke ndị maara ihe bụrụ ihe efu.” 20Olee ebe ndị oke amamihe nọ? Olee ebe ndị ode akwụkwọ nọ? Olee ebe ndị oke ịrụ ụka nke oge a nọ? Chineke o mebeghị ka amamihe nke ụwa a bụrụ ihe efu? 21Ma ebe ọ bụ site nʼamamihe nke Chineke, ụwa enweghị ike ịmata Chineke site na amamihe nke ya, ọ dị Chineke ezi mma isite nʼoziọma nke a na-ekwusa nke ndị mmadụ na-akpọ ihe nzuzu zọpụta ndị kweere. 22Ndị Juu chọrọ ịhụ ihe ịrịbama, ndị Griik na-achọkwa amamihe. 23Ma anyị onwe anyị na-ekwusa Kraịst, onye a kpọgburu nʼobe, onye bụ ihe mgbochi nʼebe ndị Juu nọ, ma na ntị ndị mba ọzọ, ọ dị ka okwu nzuzu. 24Ma nye ndị niile a kpọrọ, ma ndị Juu ma ndị Griik, Kraịst bụ ike nke Chineke bụrụkwa amamihe nke Chineke.

Oziọma (maka Mbuli elu nke Obe)

Jọn 19:6–11, 13–20, 25–28, 30–35

6Ngwangwa, ndịisi nchụaja na ndị nche hụrụ ya, ha tiri mkpu sị, “Kpọgide ya nʼobe! Kpọgide ya nʼobe!” Pailet sịrị ha, “Kpọrọnụ ya kpọgbuo ya nʼonwe unu. Achọpụtaghị m ihe ọjọọ ọbụla o mere.” 7Ndị Juu zara ya, “Anyị nwere iwu, dị ka iwu ahụ siri dị, ihe kwesiri ya bụ ọnwụ, nʼihi na ọ kpọrọ onwe ya Ọkpara Chineke.” 8Mgbe Pailet nụrụ nke a, oke egwu tụrụ ya karịa. 9Ọ laghachiri azụ nʼime ụlọeze ahụ, jụọ Jisọs, “Olee ebe i siri bịa?” Ma Jisọs azaghị ya ihe ọbụla. 10Pailet sịrị ya, “Ị na-agba m nkịtị? Ọ bụ na ị maghị na m nwere ike ịkpọgide gị nʼobe, nweekwa ike ịhapụ gị ka ị laa?” 11Jisọs zara ya, “Ị garaghị enwe ike ọbụla nʼebe m nọ, ma ọ bụrụ na o siteghị nʼelu rute gị aka. Nke a mere mmehie onye duru m nye nʼaka gị ji karịa.” 13Mgbe Pailet nụrụ okwu ndị a, ọ kpọpụtara Jisọs nʼezi, nọdụkwa ala nʼoche ikpe ya dị nʼebe a na-akpọ Pevumentị (maọbụ Gabata nʼasụsụ Hibru). 14Ọ bụ nʼihe dịka nʼoge ehihie nke ụbọchị nkwadebe maka oriri Ngabiga. Ọ sịrị ndị Juu, “Leenụ eze unu!” 15Ma ha tiri mkpu, “Kpọpụ ya, Kpọpụ ya! Kpọgide ya nʼobe.” Pailet jụrụ ha, “Unu chọrọ ka m kpọgide eze unu nʼobe?” Ma ndịisi nchụaja zara, “Anyị enweghị eze ọzọ karịa Siza.” 16Mgbe ahụ, o nyefere ya nʼaka ha, ka ha kpọgide ya nʼobe. Ha kpọọrọ Jisọs pụọ. 17O buuru obe ya gaa nʼebe a na-akpọ Okpokoro Isi (nke pụtara Gọlgọta nʼasụsụ Hibru). 18Nʼebe ahụ ka ha kpọgidere ya nʼobe, ya na mmadụ abụọ ndị ọzọ. Otu onye nʼaka nri ya, onye nke ọzọ nʼaka ekpe ya. 19O nwere ihe Pailet dere kụpanye nʼelu obe ahụ. Ihe o dere bụ nke a: Jisọs onye Nazaret, Eze ndị Juu. 20Ọtụtụ ndị Juu gụrụ ihe a o dere, nʼihi na ebe a kpọgburu Jisọs dị nso nʼobodo ahụ. E dekwara ya nʼasụsụ Hibru, Griik na Latin. 25Nne ya, nwanne ya nwanyị, bụ Meri nwunye Klopas, na Meri Magdalin guzo nso nʼakụkụ obe Jisọs. 26Mgbe Jisọs hụrụ nne ya na onye na-eso ụzọ ya ọ hụrụ nʼanya ka o guzo nʼakụkụ ya, ọ sịrị nne ya, “Nwanyị lee nwa gị nwoke.” 27Ọ sịrị onye ahụ nke na-eso ụzọ ya, “Lee nne gị.” Site nʼoge ahụ, onye ahụ na-eso ụzọ ya kpọọrọ ya laa nʼụlọ nke ya. 28Nʼikpeazụ, mgbe Jisọs matara na ihe niile emezuola. Ma iji mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, ọ sịrị, “Akpịrị na-akpọ m nkụ.” 30Mgbe Jisọs detụrụ mmanya ahụ ọnụ, ọ sịrị, “Ọ gwụchaala.” O hulatara isi ya, kubie ume. 31Ma ndị Juu achọghị ka ahụ ndị ahụ a kpọgidere nʼobe nọgide nʼebe ahụ ka chi bọọ, nʼihi na ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe. Echi ya bụ ga-abụ ụbọchị izuike pụrụ iche. Ha rịọọrọ Pailet ka a gbajisie ha ụkwụ ma bupụkwa ahụ ha. 32Ndị agha ahụ bịara gbajie ụkwụ onye nke mbụ na onye nke ọzọ a kpọgburu ha na ya. 33Ma mgbe ha bịaruru nʼebe Jisọs nọ, ha hụrụ na ọ nwụọlarị. Nʼihi nke a, ha agbajighị ụkwụ ya. 34Kama otu onye nʼime ndị agha ahụ weere ùbe mapuo ya akụkụ ya. Ngwangwa ọbara na mmiri gbapụtara. 35Onye hụrụ ihe ndị a gbara ama ka unu kwere, ama ya bụ eziokwu, ọ matakwara na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 14 Septemba na kalenda nzukọ bụ 27 Septemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike