Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 29 Epreel
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 29 Epreel 2027
Tọọzdee · Izu nke 5 nke Oge Ista
Mmemme na ndị nsọ
Tọọzdee nke izu nke 5 nke Oge Ista
Ncheta · Agba ofufe: ọcha
Onye nsọ Katrin nke Siena, Nwaagbọghọ na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
7Mgbe ha nọ tulegide okwu ahụ ruo oge dị anya, Pita guzoro ọtọ sị ha, “Ụmụnna m, unu niile maara na site na mbụ Chineke họpụtara m site nʼetiti unu, ka m zisaa oziọma ahụ nye ndị mba ọzọ ka ha nụrụ, ma kwerekwa. 8Chineke a, onye maara obi mmadụ niile gbaara ha akaebe site nʼinye ha onyinye Mmụọ Nsọ dịka anyị si nata ya na mbụ. 9O gosighị na o nwere ihe dị iche nʼetiti anyị na ha. Nʼihi na o mere ka obi ha dị ọcha site nʼokwukwe. 10Ugbu a, gịnị mere unu ji anwa Chineke ọnwụnwa site na-itinye nʼolu ndị na-eso ụzọ ya ibu arọ nke anyị maọbụ nna nna anyị ha na-enweghị ike ịdọkpụ? 11Mba, anyị kwenyere na ọ bụ site nʼamara nke Onyenwe anyị Jisọs ka a ga-eji zọpụta anyị, dịka a ga-esi zọpụtakwa ha.” 12Mmadụ niile nọdụrụ nwayọọ, ha bidoro ige ntị nʼakụkọ Banabas na Pọl na-akọrọ ha banyere ihe ịrịbama niile na ọrụ ebube niile Chineke jiri ha rụọ nʼetiti ndị mba ọzọ. 13Mgbe ha kwusiri okwu ndị a, Jemis sịrị, “Ụmụnna m geenụ ntị. 14Saimọn akọọlara anyị otu Chineke si buru ụzọ lekọta ndị mba ọzọ site na isite nʼetiti ha họpụtara onwe ya ndị ga-ekwere na aha ya. 15Nke a na okwu ndị amụma dakọtara, dịka e dere ya, 16“ ‘Mgbe nke a gasịrị, aga m alọghachi, aga m ewughachikwa ụlọ ikwu Devid nke dara ada. Ebe ya niile dakpọsịrị adakpọsị ka m ga-ewugharịkwa, aga m emekwa ka ọ guzozie, 17ka ndị fọdụrụ nʼetiti mmadụ nwe ike chọọ Onyenwe anyị, ọ bụladị ndị mba ọzọ niile ndị a kpọkwasịrị aha m, ka Onyenwe anyị kwuru, onye na-emekwa ihe ndị a.’ 18Nke a amaara site na mgbe ochie. 19“Nʼihi nke a, mkpebi ikpe m bụ nke a, ka anyị ghara isogbu ndị mba ọzọ lọghachikwutere Chineke, 20kama o kwesiri ka anyị degara ha akwụkwọ gwa ha sị ha hapụ iri nri ọbụla e ji chụọrọ arụsị aja. Ka ha wezugakwa onwe ha site na mmehie ịkwa iko, ya na iri anụ a nyagburu anyagbu, maọbụ ọbara. 21Site na mbụ, Mosis nwere ndị na-ekwusa iwu nʼobodo niile. A na-agụkwa ya nʼụlọ nzukọ nʼụbọchị izuike niile.”
Abụ Ọma nzaghachi
1Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ, bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ụwa niile. 2Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, toonu aha ya; kwupụtanụ nzọpụta ya site nʼotu ụbọchị ruo nʼụbọchị nke ọzọ. 3Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile, kọsakwanụ banyere oke ọrụ ya niile nʼetiti ndị niile dị iche iche. 10Kwusaa nʼetiti mba niile sị, “ Onyenwe anyị na-achị.” Elu ụwa kwụ chịm, a pụghị iwezuga ya nʼọnọdụ ya; ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ndị niile ikpe.
Oziọma
9“Dị ka Nna sị hụ m nʼanya, otu a ka m sị hụkwa unu nʼanya. Ya mere, nọgidenụ nʼime ịhụnanya m. 10Unu ga-anọgide nʼịhụnanya m ma ọ bụrụ na unu edebe iwu m. Dị ka m debere iwu Nna m ma nọgidekwa nʼịhụnanya ya. 11Agwala m unu ihe ndị a ka ọṅụ m dịrị nʼime unu ka ọṅụ unu zukwaa oke.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Katrin nke Siena, Nwaagbọghọ na Onye nkuzi nke Chọọchị
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike