Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 29 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 29 Novemba 2026
Sọnde · Izu nke 1 nke Advent
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 1 nke Advent
Sọnde · Agba ofufe: odo odo
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
16Ma gị onwe gị, bụ Nna anyị, a sịkwarị na Ebraham amaghị anyị maọbụ Izrel agọnarị anyị, gị onwe gị, Onyenwe anyị, bụ Nna anyị, onye Mgbapụta anyị ka ị na-azakwa siterị na mgbe ochie. 17Onyenwe anyị, gịnị mere i ji na-eme ka anyị si nʼụzọ gị kpafuo na-eme ka obi anyị sie ike otu a, na anyị adịghị atụ egwu gị? Lọghachi nʼihi ndị ohu gị, nʼihi ebo ndị ahụ bụ ihe nketa gị. 64:1Ọ gaara adị mma ma asị na ị ga-adọwa eluigwe rịdata nʼala, ma asị nʼugwu ukwu niile ga-ama jijiji nʼihu gị! 3Nʼihi na ọ bụ mgbe i mere ọtụtụ ihe egwu dị iche iche nke anyị na-atụghị anya ya ka ị rịdatara mee ka ugwu ukwu niile maa jijiji nʼihu gị. 4Nʼihi na site na mgbe ochie, ọ dịbeghị onye nụrụ, ọ dịbeghị ntị ghọtara, o nwebeghị anya hụrụ Chineke ọzọ karịa gị, onye na-emejupụtara ndị na-echere ya ihe na-akpa ha. 5Ị na-enyere ndị na-eme ezi ihe aka, bụ ndị ji ọṅụ na-echeta ụzọ gị nʼechiche uche ha. Ma mgbe anyị nọgidere na-emehie megide ha, iwe were gị. A ga-esikwanụ aṅaa zọpụta anyị? 6Anyị niile dịka onye rụrụ arụ, ezi omume anyị niile kwa dịka nkịrịnka akwa ruru unyi. Anyị akpọnwụọla dịka akwụkwọ osisi, mmehie anyị na-ebufukwa anyị dịka ifufe. 7Ọ dịghị onye nʼime anyị na-arịọ gị arịrịọ; ọ dịkwaghị onye na-akpọku aha gị. Nʼihi ya, i zoola ihu gị site nʼebe anyị nọ, meekwa ka anyị bụrụ ndị gbazere agbaze nʼihi mmehie anyị. 8Ma otu ọbụla o si dị, gị Onyenwe anyị bụ Nna anyị. Anyị bụ ụrọ, ma ị bụ ọkpụ ite. Ọ bụ aka gị kpụrụ anyị niile.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Ọ bụ olu abụ eji ekwe “Okoko lili nke Ọgbụgba Ndụ” Abụ Ọma nke Asaf. Nụrụ olu anyị, O Onye ọzụzụ atụrụ nke Izrel, gị onye na-edu Josef dịka igwe atụrụ. Gị onye na-anọdụ dịka eze, nʼetiti cherubim, nwupụta Ìhè 2nʼihu Ifrem, Benjamin na Manase. Kpọtee ịdị ike gị, bịa zọpụta anyị. 14Lọghachikwute anyị, O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Si nʼeluigwe ledata anya ma hụ! Letakwa osisi vaịnị a, 15mgbọrọgwụ nke aka nri gị kụrụ, ọkpara nke ị zụlitere nye onwe gị. 17Ka aka gị dịkwasị nwoke ahụ nọ nʼaka nri gị, nwa nke mmadụ onye ị zụlitere nye onwe gị. 18Mgbe ahụ, anyị agaghị esikwa nʼebe ị nọ laghachi azụ; tutee anyị, anyị ga-akpọkukwa aha gị.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
3Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu. 4Ana m ekele Chineke ekele nʼihi onyinye amara niile o nyere unu site na Kraịst Jisọs. 5Nʼihi na e emeela ka unu baa ụba nʼụzọ niile, nʼime ya, ma nʼokwu unu ma na nghọta unu. O meekwala ka unu nwee nghọta zuru ezu banyere eziokwu niile. Ọ na-emekwa ka unu nwee ike na-ekwupụta okwu banyere oziọma ya. 6Nʼihi na ịgba akaebe banyere Kraịst pụtara ihe, guzosiekwa ike na ndụ unu. 7Otu ihe si dị, ọ dịghị onyinye mmụọ fọdụrụ unu nke unu na-enweghị, ka unu nọrọ na-eche mgbe Chineke ga-egosipụta Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. 8Ọ ga-eme ka unu dị ike ruo na mgbe ikpeazụ, meekwa ka unu bụrụ ndị na-enweghị ịta ụta nʼụbọchị Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. 9Chineke, onye kpọbatara unu ka unu na Ọkpara ya bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na-enwe mmekọrịta kwesiri ntụkwasị obi.
Oziọma
33Ebe ọ bụ na unu amaghị mgbe ha ga-emezu, nọrọnụ na nche! Mụrụkwanụ anya! 34Ọ dị ka nwoke hapụrụ ụlọ ya na-aga njem, tinye nʼaka ndị ohu ya ilekọta ihe, onye ọbụla nʼime ha ka o nyere ọrụ ọ ga-arụ ma nyekwa onye nche ọnụ ụzọ iwu ka ọ nọ na nche. 35“Ya mere nọrọnụ na nche, nʼihi na unu amaghị mgbe Onyenwe ụlọ ga-alọta. Ma ọ bụ nʼuhuruchi maọbụ nʼetiti abalị. Maọbụ mgbe ọkụkụ kwara akwa, maọbụ nʼisi ụtụtụ. 36Ọ bụrụ na ọ lọta na mberede, unu ekwela ka ọ lọkwute unu mgbe unu nọ nʼụra. 37Ihe m gwara unu ka m na-agwakwa mmadụ niile. ‘Nọrọnụ na nche.’ ”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike