Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2026 › 28 Novemba

Kalenda Ọtọdọks · 15 Novemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 28 Novemba 2026

Satọdee · Izu nke 26 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 8

Mmemme na ndị nsọ

Martyrs and Confessors Gurias, Samonas († 299-306) and Habib († 322) of Edessa

Obubu ọnụ Ọmụmụ

E kwere azụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Gal 3:8–12

8Dị ka ọ dị nʼAkwụkwọ nsọ, nʼoge ahụ dị nʼihu, nke bụ ugbu a, Chineke ga-agụ ndị mba ọzọ dị ka ndị ezi omume, site nʼokwukwe ha nwere nʼime ya. Nʼihi nke a, o buru ụzọ zie Ebraham oziọma ahụ nʼoge gara aga sị, “A ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na gị.” 9Ya mere, ndị dabeere nʼokwukwe bụkwa ndị na-eso Ebraham, nwoke okwukwe ahụ eketa ngọzị. 10Ma ndị niile na-ele anya na a ga-azọpụta ha nʼihi na ha debere iwu niile, ka ọbụbụ ọnụ na-adakwasị. Nʼihi na e deela ya nʼakwụkwọ nsọ sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka ọ bụ, bụ onye ọbụla na-edebeghị ọ bụladị otu nʼime iwu niile e dere nʼakwụkwọ iwu.” 11Ugbu a, ọ bụ ihe pụtara ìhè na ọ dịghị onye ọbụla a na-agụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke, nʼihi na o debere iwu. Nʼihi na, “Onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe dị ndụ.” 12Ma iwu ahụ adabereghị nʼokwukwe, kama, iwu kwuru sị, “Mmadụ ahụ na-eme ihe iwu kwuru bụ onye ga-enwe ndụ site na ha.”

Oziọma

Luk 9:37–43

37Nʼechi ya, mgbe ha si nʼugwu ahụ rịdata, oke igwe mmadụ bịara zute ya. 38Otu nwoke si nʼetiti igwe mmadụ ahụ jiri oke olu tie mkpu sị, “Onye ozizi, arịọ m gị ka i lee nwa m nwoke anya, nʼihi na naanị ya bụ nwa m nwere. 39Mmụọ ọjọọ na-ejide ya mee ka ọ na-eti mkpu. Ọ na-atụda ya nʼala, na-ese ya ese, na-adọkwa ya adọ mee ka ọ na-agbọ ụfụfụ nʼọnụ. Ọ dịghị mgbe ọ na-ahapụ ya kama ọ na-echihịasị ya ahụ. 40Arịọrọ m ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ ya, ma ha enweghị ike.” 41Jisọs zara sị, “Leenụ ọgbọ rụrụ arụ, nke na-enweghị okwukwe! Ruo olee mgbe ka mụ na unu ga-anọ, ruokwa olee mgbe ka m ga-anagide ekweghị ekwe unu? Kpọtara m nwa gị nwoke ahụ nʼebe a!” 42Mgbe ọ na-abịa, mmụọ ọjọọ ahụ kwadara ya nʼala sesie ya ike, ma Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba. Ọ gwọrọ nwata ahụ kpọnyekwa ya nna ya. 43Ebube ukwu nke Chineke tụrụ ha nʼanya. Ma mgbe onye ọbụla nọ na mgbagwoju anya nʼihi ọrụ ọ rụrụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya,

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 15 Novemba na kalenda nzukọ bụ 28 Novemba na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike