Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Novemba 2027 › 28 Novemba
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 28 Novemba 2027
Sọnde · Izu nke 1 nke Advent
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 1 nke Advent
Sọnde · Agba ofufe: odo odo
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
14“ ‘Ụbọchị ndị ahụ na-abịa,’ ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘mgbe m ga-emezu ezi nkwa ahụ m kwere ụlọ Izrel na ụlọ Juda. 15“ ‘Nʼụbọchị ndị ahụ, na nʼoge ahụ, aga m eme ka Alaka ezi omume pupụta site nʼezinaụlọ Devid. Ọ ga-eme ihe ziri ezi, kpeekwa ikpe ziri ezi nʼala ahụ. 16Nʼụbọchị ndị ahụ, ka a ga-azọpụta Juda, Jerusalem ga-ebikwa nʼudo. Nke a bụ aha a ga-akpọ ya, Onyenwe anyị Onye Nzọpụta, bụ ezi omume anyị.’
Abụ Ọma nzaghachi
4O Onyenwe anyị, zi m ụzọ gị niile, kuzikwaara m ụzọ gị niile. 5Duo m nʼeziokwu gị, kuzikwaara m ihe, nʼihi na ị bụ Chineke, onye Nzọpụta m, ụbọchị niile, olileanya m dị na gị. 8Onye dị mma na onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ; ọ bụ ya mere ọ na-ezi ndị mmehie ụzọ ya. 9Ọ na-edu ndị dị umeala nʼobi nʼụzọ ziri ezi, na-ezikwa ha ụzọ nke ya. 10Ụzọ niile nke Onyenwe anyị jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, nye ndị niile na-edebe iwu ọgbụgba ndụ ya. 14Onyenwe anyị na-eme ka ndị ahụ na-atụ egwu ya mara ọgbụgba ndụ ya na izu nzuzo ya.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
12Ka Onyenwe anyị meekwa ka unu baa ụba, ka unu babiga ụba oke nʼịhụnanya unu nwere nye ibe unu, na ndị ọzọkwa, dị ka ịhụnanya anyị si dị ukwuu nʼebe unu nọ. 13Ka ọ mee ka obi unu guzosie ike nʼịdị nsọ, na-enweghị ịta ụta ọbụla, nʼihu Chineke na Nna anyị, nʼọbịbịa nke Onyenwe anyị Jisọs ya na ndị nsọ ya niile. 4:1Nʼikpeazụ, ụmụnna anyị, anyị na-arịọ ma na-akwagidekwa unu nʼime Onyenwe anyị Jisọs, dị ka unu mụtara site nʼaka anyị otu unu kwesiri isi bie ndụ, nakwa ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Unu na-eme nke a karịa. 2Nʼihi na unu maara ụdị ndụmọdụ ahụ sị nʼaka Onyenwe anyị Jisọs nke anyị nyere unu.
Oziọma
25“A ga-enwe ihe ịrịbama nʼanyanwụ, nʼọnwa, na kpakpando. Nʼelu ụwa, mba niile ga-anọ nʼoke ahụhụ na mgbagwoju anya dị ka oke osimiri na-eme mkpọtụ, ebili mmiri ga na-ebilikwa. 26Ndị mmadụ ga-adakwa mba nʼobi nʼihi ụjọ mgbe ha ghọtara ihe gaje ịbịakwasị ụwa, nʼihi na a ga-eme ka ike niile nke dị nʼeluigwe maa jijiji. 27Nʼoge ahụ, a ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼike na ebube nʼigwe ojii. 28Mgbe ihe ndị a malitere ime, guzoronụ ọtọ welie isi unu elu, nʼihi na oge mgbapụta unu dị nso.” 34“Kpachapụkwanụ anya, unu ekwela ka e bogbuo obi unu site nʼoke oriri na ọṅụṅụ na nchekasị nke ndụ a, site otu a mee ka ụbọchị ahụ bịakwasị unu na mberede, dị ka ọnya. 35Nʼihi na ọ ga-abịakwasị ndị niile bi nʼelu ụwa. 36Nọrọnụ na nche oge niile ma na-ekpekwanụ ekpere ka unu nwee ike ịgbanarị ihe niile gaje ịbịa, ka unu nweekwa ike iguzo nʼihu Nwa nke Mmadụ.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde C, afọ ụbọchị izu II.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike