Ụlọ › Ihe Baịbụl kwuru › Inyere ndị ogbenye aka
Ndụ na ọrụ
Ihe Baịbụl kwuru banyere Inyere ndị ogbenye aka
Amaokwu ndị na-agụ ya na-elekarị anya maka isiokwu a (15), e hotara ha nʼuju site na Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a.
Ilu 19:17
Onye ọbụla na-egosi ndị ogbenye obi ebere na-ebinye Onyenwe anyị ihe, ọ ga-akwụghachi ha nʼihi ihe ọma ha mere.Ilu 14:31
Onye ọbụla na-emegbu onye ogbenye na-elelị Chineke kere ha anya, ma onye na-emere onye ogbenye ebere na-asọpụrụ Chineke.1Jọn 3:17–18
Ọ bụrụ na onye ọbụla nwere akụ nke ụwa, ahụ nwanna ya ka ọ nọ na mkpa ma o nweghị obi ebere nʼebe ọ nọ, olee otu ịhụnanya Chineke si dịrị nʼime ya? Ụmụntakịrị m, ka ịhụnanya anyị ghara ịbụ naanị nʼegbugbere ọnụ maọbụ nke okwu efu, kama ka ọ bụrụ nke sitere nʼeziokwu nakwa nʼomume anyị.Gal 2:10
Ọ bụ naanị otu ihe ka ha rịọrọ anyị, nke bụ ka anyị cheta ndị ogbenye. Nke a bụkwa ihe m na-achọsi ike ime.Ilu 28:27
Ọ bụrụ na i nye ogbenye, a ga-egboro gị mkpa gị. Ma ọbụbụ ọnụ dịrị ndị ahụ na-ekpuchi anya ha nʼebe ndị ogbenye nọ.Ilu 22:9
Onye na-agbasapụ aka enye onyinye ga-abụ onye a gọziri agọzi, nʼihi na ha na ekenyetụ ndị ogbenye nri.Lev 25:35
“ ‘Ọ bụrụ na nwanne gị adaa ogbenye ruo na o nweghị ike inyere onwe ya aka, ọ dị gị nʼaka inyere ya aka, kpọbata ya ka ọ bịa biri nʼụlọ gị dịka ị ga-esi kpọbata onye ọbịa. Nʼụzọ dị otu a, ọ ga-anọgide biri nʼetiti unu.Luk 14:12–14
Ọ gwara onye ahụ kpọrọ ya oriri sị, “Mgbe ị na-akpọ oriri nke nri ehihie maọbụ nke nri anyasị, akpọla naanị ndị enyi gị maọbụ ụmụnne gị ndị nwoke maọbụ ndị ikwu na ibe gị, maọbụ ndị agbataobi gị bara ọgaranya, nʼihi ma eleghị anya, ha pụrụ ịkpọkwa gị na mgbe nke ha, sị otu a kwụghachi gị ụgwọ. Kama mgbe ị na-akpọ oriri, kpọọ ndị ogbenye na ndị ọlụsị na ndị ngwụrọ na ndị ìsì. A ga-agọzikwa gị, nʼihi na ha enweghị ike ịkwụghachi gị, a ga-akwụghachikwa gị mgbe ndị ezi omume ga-ebili nʼọnwụ.”Ilu 31:8–9
Jisie ike kwuchite ọnụ ndị ahụ na-enweghị ike ikwuru ọnụ onwe ha; kwuchitekwa ọnụ ndị niile ọnọdụ ha dị ala. Kwusie okwu ike, kpeekwa ikpe ziri ezi. Gbooro ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa ọgụ site nʼaka ndị na-emegbu ha.Ọrụ 20:35
Nʼihe niile, abụkwa m ihe ilere anya nye unu banyere inyere ndị ogbenye aka, site nʼịrụ ọrụ nʼụzọ dị otu a, na-echetara m okwu nke Onyenwe anyị Jisọs kwuru sị, ‘Ngọzị karịrị dị nʼinye enye karịa ịnara anara.’ ”Mat 19:21
Jisọs zara sị ya, “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ onye zuruoke nʼezie, laa nʼụlọ gị ree ihe niile i nwere, nyekwa ndị ogbenye ego i retara. Ị ga-enwe akụ nʼeluigwe, mgbe ahụ, bịakwa soro m.”Ilu 14:21
Onye na-eleda onye agbataobi ya anya na-emehie, ma onye na-emere ndị ogbenye ebere ka ihe ga-agara nke ọma.Ilu 29:7
Onye ezi omume na-etinye anya nʼihe banyere ikpe ziri ezi nke ndị ogbenye, ma ụdị echiche ahụ adịghị abata ndị ajọ omume nʼobi.Jem 2:15–16
Ọ bụrụ na otu nwanne anyị nwoke maọbụ nwanne anyị nwanyị yi nkịrịnka akwa, ọ bụrụkwa na o nweghị ihe oriri ga-ezuru ya nʼụbọchị, ma otu onye nʼime unu asị ha, “Laa nʼudo, kpuchiekwa onwe gị nke ọma, rijuokwa afọ,” nʼenyeghị ya ihe dị mkpa maka ahụ ya, uru gịnị ka ọ bara?Aịz 58:6–7
“Nke a ọ bụghị ụdị obubu ọnụ m họpụtara: Ịtọpụ agbụ niile nke ikpe na-ezighị ezi, na ịtọpụ ụdọ niile nke mmegbu, na ime ka ndị a na-emegbu nwere onwe ha na itiji yoku ọbụla? Ka i kenye ndị agụụ na-agụ ihe oriri gị, ka ị kpọbata nʼime ụlọ gị ndị na-enweghị onye inyeaka, ma ndị ogbenye. Ka i nye ndị na-agba ọtọ uwe, ka ị hapụ izo onwe gị nʼebe ndị ikwu gị chọrọ inyeaka gị nọ.Ndị a bụ amaokwu ndị na-agụ na-achọkarị maka isiokwu a — ọ bụghị nkuzi banyere ya. Gụọ nke ọ bụla n'isiakwụkwọ ya.
Isi mmalite
Amaokwu nke isiokwu ọ bụla na usoro ha: data isiokwu nke OpenBible.info, dịka votu ndị na-agụ ya si dị: OpenBible.info · CC BY 4.0
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.