Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 19 Ọgọọst
Kalenda Ọtọdọks · 6 Ọgọst (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 19 Ọgọọst 2027
Tọọzdee · Izu nke 9 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7
Mmemme na ndị nsọ
The Holy Transfiguration of Our Lord God and Saviour Jesus Christ
Obubu ọnụ Ndaba ụra
E kwere azụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
12Mgbe nke a gasịrị, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Rigota, bịakwute m nʼelu ugwu, nọdụkwa ebe ahụ, maka na aga m enye gị mbadamba nkume nke iwu na ụkpụrụ dị na ya, nke m ji aka m dee maka i ji kuziere ha.” 13Mosis biliri, ya na Joshua onye na-agara ya ozi. Mosis nʼonwe ya rigokwara nʼelu ugwu Chineke. 14Ọ gwara ndị okenye Izrel okwu sị, “Cherenụ anyị nʼebe a tutu ruo mgbe anyị ga-alaghachikwute unu. Unu na Erọn na Hua nọ, onye ọbụla nwere nsogbu jekwuru ha.” 15Ngwangwa, Mosis rigoro nʼelu ugwu ahụ, oke igwe ojii kpuchiri ugwu ahụ niile, 16ebube Onyenwe anyị kpuchikwara elu ugwu ahụ. Ọ bụ ụbọchị isii ka igwe ojii kpuchiri ugwu ahụ. Nʼụbọchị nke asaa, Onyenwe anyị sitere nʼetiti igwe ojii ahụ kpọọ Mosis oku. 17Ma nʼebe ndị Izrel nọ, ebube Onyenwe anyị na-enwu dịka ọkụ na-achọ irechapụ ugwu ahụ. 18Mosis banyere nʼime igwe ojii ahụ mgbe ọ na-arịgo ugwu ahụ. Ọ nọgidere nʼelu ugwu ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
11Nʼime ụlọ nzute ahụ, Onyenwe anyị na-agwa Mosis okwu ihu na ihu, dịka mmadụ sị agwa enyi ya okwu. Mgbe ha kparịchara ụka, Mosis na-alọghachi azụ nʼebe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha. Ma nwokorobịa ahụ na-enyere ya aka, bụ Joshua, nwa Nun, na-anọgide nʼụlọ ikwu nzute ahụ. 12Mgbe Mosis na Onyenwe anyị nọ na-ekwurịta okwu, ihe Mosis gwara ya bụ nke a, “Ọ dịla anya kemgbe ị na-agwa m sị m, ‘Duru ndị m baa nʼala ahụ e kwere na nkwa inye ha.’ Ma matakwa na ị gwabeghị m onye ị ga-edunyere m ga-eduzi m ụzọ. I kwuola na ị maara aha m, kwukwaa na achọtala m ihuọma nʼebe ị nọ. 13Biko, ọ bụrụ na o si otu a dị, zi m ụzọ gị, nke ga-eme ka m mata gị, gaakwa nʼihu inweta ihuọma site nʼebe ị nọ. Chetakwa na mba a dị ukwu bụ ndị gị.” 14Ọ zara sị, “Mụ onwe m ga-eso gị gaa, aga m enyekwa gị izuike.” 15Mgbe ahụ Mosis sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị gaghị eso anyị nʼije a, ekwela ka anyị si nʼebe a zọpụ ụkwụ. 16Ọ bụrụ na i soghị anyị, olee otu a ga-esi mata na mụ onwe m, na ndị gị achọtala ihuọma gị? Olee otu ọ ga-esi pụta ìhè na mụ na ndị gị bụ mba dị iche site na mba ndị ọzọ dị nʼụwa?” 17Ma Onyenwe anyị zara Mosis sị, “E, aga m eme ihe ị rịọrọ m, nʼihi na ị chọtala ihuọma m. Nʼezie, amara m onye ị bụ, marakwa aha gị.” 18Mgbe ahụ, Mosis rịọrọ sị, “Gosi m ebube gị.” 19Ma Onyenwe anyị zara sị, “Aga m eme ka ị hụ ịdị mma m, aga m akọwakwara gị ihe aha m bụ Onyenwe anyị pụtara. Onye m chọrọ imere ebere ka m ga-emere ebere, ọ bụkwa onye m chọrọ imere ọmịiko ka m ga-enwere ọmịiko. 20Ma ị pụghị ịhụ ihu m nʼihi na mmadụ ọbụla enweghị ike ịhụ ihu m ma dịrịkwa ndụ.” 21Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Lee, e nwere ebe dị nso nʼakụkụ m, nʼelu nkume, ebe i nwere ike iguzo. 22Mgbe ebube m ga-agafe, aga m ezo gị nʼokpuru nkume, werekwa aka m kpuchie gị, tutu ruo mgbe m gafechara. 23Emesịa, aga m eweli aka m, ka i nwee ike ịhụ azụ m anya, ma ị pụghị ịhụ ihu m.” 34:4Mosis biliri nʼisi ụtụtụ, waa mbadamba nkume abụọ dịka ndị nke mbụ, rigoro ugwu Saịnaị dịka Onyenwe anyị gwara ya. Ọ jikwa nkume abụọ ahụ nʼaka ya. 5Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị rịdatara nʼime ogidi igwe ojii, guzo nʼihu Mosis, kwupụta aha ya bụ Onyenwe anyị. 6O si nʼihu Mosis gafee na-ekwu na-asị, “ Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Chineke ọmịiko na onye amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, na onye babigara ụba oke nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi. 8Otu mgbe ahụ, Mosis hulatara kpọọ isiala,
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
3Ịlaịja tụrụ egwu, gbapụ ọsọ, nʼihi ichebe ndụ ya. Mgbe ọ bịaruru Bịasheba, dị na Juda, ọ hapụrụ nwokorobịa na-ejere ya ozi nʼebe ahụ. 4Ma ya onwe ya pụkwara jee ije otu ụbọchị nʼọzara naanị ya. Nʼikpeazụ, ọ kwụsịrị nọdụ ala nʼokpuru otu osisi brum, kpee ekpere rịọọ ka a napụ ya ndụ ya. Ekpere o kpere nʼoge a bụ, “O zuorela m Onyenwe anyị, biko napụ ndụ m. O nweghị ụzọ m si dị mma karịa nna nna m ha.” 5O dinara nʼokpuru osisi brum rahụ ụra. Ma lee, otu oge ahụ, mmụọ ozi metụrụ ya aka, sị ya, “Bilie, rie nri.” 6Ịlaịja biliri legharịa anya, hụ ogbe achịcha na ite mmiri nta nke dị nʼakụkụ ebe ọ tụkwasịrị isi ya. O riri ogbe achịcha ahụ a hụrụ nʼicheku ọkụ, ṅụọkwa mmiri ahụ. Emesịa, o dinakwara ọzọ. 7Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị bịaghachikwara nke ugboro abụọ, sị ya, “Bilie rie ihe, nʼihi na ije dị gị nʼihu dị ukwuu.” 8Ịlaịja biliri rie ihe, ṅụọkwa mmiri. Nri ahụ nyere ya ike ije ije iri ụbọchị anọ ọzọ, ehihie na abalị, tutu ruo mgbe ọ bịaruru nʼugwu Horeb nke bụ ugwu Chineke. 9Nʼebe ahụ, ọ banyere nʼotu ọgba nkume rahụ ụra abalị nʼime ya. Ma okwu Onyenwe anyị rutere ya sị, “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme nʼebe a?” 11Onyenwe anyị sịrị ya, “Pụọ gaa guzo nʼelu ugwu, nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na Onyenwe anyị na-aga isite nʼebe ahụ gafee.” Mgbe ahụ, oke ifufe dị ike gbawara ugwu ahụ, tipịasịa nkume ndị ahụ nʼihu Onyenwe anyị, ma Onyenwe anyị anọghị nʼime ifufe ahụ. Mgbe ifufe ahụ gasịrị, e nwere oke ala ọma jijiji nʼugwu ahụ, ma Onyenwe anyị anọkwaghị nʼala ọma jijiji ahụ. 12Mgbe ala ọma jijiji ahụ gasịrị, ọkụ nwuuru, ma Onyenwe anyị anọghị nʼime ọkụ ahụ. Ma mgbe ọkụ ahụ gasịrị, nwa olu nta dị nwayọọ dara. 13Mgbe Ịlaịja nụrụ ya, o ji uwe mwụda ya kpuchie ihu ya, pụọ gaa guzo nʼọnụ ụzọ ọgba nkume ahụ. Mgbe ahụ, ọ nụrụ olu jụrụ ya sị, “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme nʼebe a?” 15Onyenwe anyị sịrị ya, “Sikwa ụzọ i si bịa laghachi, gaa nʼọzara Damaskọs. Mgbe i ruru ebe ahụ, tee Hazael mmanụ ịbụ eze Aram. 16Teekwa Jehu, nwa Nimshi mmanụ ịbụ eze Izrel. Ị ga-etekwa Ịlaisha nwa Shafat, onye Ebel-Mehola mmanụ ịbụ onye amụma nʼọnọdụ gị.
Ofufe ụtụtụ: Oziọma
28Mgbe ụbọchị asatọ gasịrị, ọ kpọọrọ Pita na Jọn na Jemis gaa nʼelu ugwu ikpe ekpere. 29Mgbe ọ nọ na-ekpe ekpere, ụdịdị ihu ya gbanwere. Uwe ya bidoro ịchaa ọcha nke ukwuu. 30Nʼotu ntabi anya, ha hụrụ ndị ikom abụọ ka ha na ya na-ekwu okwu. Ha bụ Mosis na Ịlaịja. 31Ha pụtara nʼebube eluigwe dị ukwu na-ekwu banyere nlaghachi ya, nke ọ na-aga imezu na Jerusalem. 32Pita na ndị ya na ha nọ na-arahụ ụra. Mgbe ha tetara, ha hụrụ ebube ya na ndị ikom abụọ ya na ha nọ na-ekwurịta okwu. 33Mgbe ha na-ahapụ ya, Pita sịrị Jisọs, “Nna anyị ukwu, ọ ga-adị mma ka anyị nọrọ ebe a ka anyị wuo ụlọ ikwu atọ, otu ga-abụ nke gị, otu ga-abụ nke Mosis, otu ga-abụkwa nke Ịlaịja.” Ọ mataghị ihe ọ na-ekwu. 34Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, igwe ojii pụtara kpuchie ha. Egwu tụkwara ha dị ka ha na-aba nʼigwe ojii ahụ. 35Olu sitere nʼigwe ojii ahụ daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m họpụtara; geenụ ya ntị.” 36Mgbe olu ahụ kwusiri okwu, ha chọpụtara na Jisọs nọ naanị ya. Ndị na-eso ụzọ ya kpuchiri ọnụ ha, debe ihe niile nʼobi ha, ọ dịkwaghị onye ọbụla ha gwara ihe ha hụrụ.
Akwụkwọ ozi (maka Mgbanwe Ọdịdị nke Onyenwe anyị)
10Nʼihi ya ụmụnna m, gbalịsienụ ike iguzosike nʼọkpụkpọ na nhọpụta unu. Nke a ga-eme ka unu hapụ ịsọ ngọngọ maọbụ daa. 11Nʼụzọ dị otu a, a ga-enye unu ohere dị ukwuu iji bata nʼalaeze ebighị ebi nke Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst. 12Aga m na-aga nʼihu na-echetara unu ihe ndị a site nʼoge ruo nʼoge. Ọ bụ ezie na unu maara na ha na-eguzosikwa ike nʼeziokwu ahụ unu natara. 13Ana m agụ ya nʼihe ziri ezi ịkpọte mmụọ unu na uche unu site nʼichetara unu ihe ndị a ugbu a m dị ndụ nʼanụ ahụ a. 14Nʼihi na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst agwala m hoohaa, na m ga-eyipụ ya nʼoge na-adịghị anya. 15Aga m agbalịsi ike ịhụ na mgbe m hapụchara ụwa nke a, unu ga na-echeta ihe ndị a mgbe niile. 16Ihe niile anyị na-akọrọ unu abụghị akụkọ ifo mmadụ kọrọ site nʼamamihe ya. Nʼihi na anyị kọwaara unu ihe banyere ike Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ọbịbịa ọ ga-abịa ọzọ. Ọ bụ anya anyị abụọ ka anyị ji hụ ebube nke ịbụ eze ya. 17Nʼihi na ọ natara nsọpụrụ na ebube site nʼaka Chineke bụ Nna mgbe olu ahụ si nʼebube ahụ dị ukwuu daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, onye ihe ya dị m ezi mma.” 18Anyị onwe anyị nụrụ olu ahụ si nʼeluigwe daa mgbe anyị so ya nọdụ nʼelu ugwu nsọ ahụ. 19Anyị nwapụtara na okwu ndị amụma ahụ bụ ihe mezuru emezu. Unu onwe unu kwesikwara ilezi anya nʼokwu ndị ahụ, dịka a ga-asị na ha bụ ìhè na-enwu nʼebe ọchịchịrị gbara nke na-adị ruo mgbe chi bọrọ, mgbe e mere ka kpakpando ọtụtụ walie nʼobi unu.
Oziọma (maka Mgbanwe Ọdịdị nke Onyenwe anyị)
1Mgbe ụbọchị isii gasịrị, Jisọs kpọọrọ Pita, na Jemis na Jọn nwanne ya, rigoro nʼugwu dị elu ebe naanị ha nọdụrụ. 2Nʼebe ahụ a gbanwere ọdịdị ya nʼihu ha, ihu ya na-enwupụ dị ka anyanwụ, uwe ya chapụkwara dị ka ìhè. 3Nʼotu ntabi anya ahụ, ha hụrụ Mosis na Ịlaịja ka ha na ya na-ekwurịta okwu. 4Mgbe ahụ Pita sịrị Jisọs, “Onyenwe anyị. Ọ dị mma ka anyị niile nọdụ nʼebe a. Ọ bụrụ na ị ga-enye m ike, aga m ewu ụlọ ikwu atọ nʼebe a. Otu nʼime ụlọ ndị a ga-abụ nke gị, otu nke Mosis, nke ọzọ nke Ịlaịja.” 5Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, igwe ojii nke na-enwu enwu kpuchiri ha, olu sitere nʼigwe ojii ahụ daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, onye ihe ya dị m ezi mma. Geenụ ya ntị.” 6Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ olu a, ha dara nʼala nʼihi egwu. 7Ma Jisọs jekwuuru ha metụ ha aka sị ha, “Bilienụ, unu atụla egwu.” 8Mgbe ha lelitere anya ha, o nwekwaghị onye ọzọ ha hụrụ ma ọ bụghị naanị Jisọs. 9Ma mgbe ha si nʼelu ugwu ahụ na-arịdata, Jisọs nyere ha iwu, sị, “Unu agwala onye ọbụla ihe unu hụrụ tutu ruo mgbe Nwa nke Mmadụ ga-esi nʼọnwụ bilie.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 6 Ọgọọst na kalenda nzukọ bụ 19 Ọgọọst na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike