Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 20 Ọgọọst

Kalenda Ọtọdọks · 7 Ọgọst (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 20 Ọgọọst 2027

Fraịdee · Izu nke 9 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7

Mmemme na ndị nsọ

Afterfeast of the Transfiguration of the Lord

Obubu ọnụ Ndaba ụra

Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

1Kọ 14:26–40

26Ugbu a, ụmụnna m, kedụ otu o kwesiri ịdị? Mgbe ọbụla unu zukọrọ, ụfọdụ kwesiri ịbụ abụ, onye ọzọ ga-ezi unu ihe; maọbụ gwa unu ozi dị mkpa e gosiri ya, maọbụ jiri asụsụ nke ọ na-amụghị gwa unu okwu, ka onye ọzọ kọwaa ihe onye ji asụsụ a dị iche kwuo okwu kwuru. Ma ka ihe ọbụla e mere nʼime ụlọ chọọchị bụrụ ihe ga-ewuli onye ọbụla elu. 27A sịkwa na ọ dị ndị chọrọ iji asụsụ dị iche kwuo okwu, ka mmadụ abụọ maọbụ atọ kwuo. Kama ka ha kwuo nʼotu nʼotu nʼusoro. Ka onye ga-akọwa ihe ha kwuru nọrọkwa nʼebe ahụ. 28Ọ bụrụ na ọ dịghị onye ga-akọwa ihe ha na-asụ, ka onye ahụ na-asụ asụsụ dị iche na chọọchị mechie ọnụ ya. Ya na Chineke sụrịta ya. 29Ka mmadụ abụọ maọbụ atọ nwere onyinye ibu amụma kwuo okwu nʼotu nʼotu, ka ndị ọzọ tulee ihe ha kwuru. 30Ọ bụrụ na-ekpughere onye ọzọ nọdụ nʼakụkụ ya ihe, ka onye mbụ mechie ọnụ ya. 31Nʼihi na unu nwere ike ibu amụma nʼotu nʼotu, ka mmadụ niile nwee ike ịmụta ihe ma bụrụkwa ndị a gbara ume. 32Mmụọ niile nke ndị amụma ka a na-edokwa nʼokpuru ndị amụma. 33Nʼihi na Chineke abụghị Chineke nke aghara, kama ọ bụ nke udo. Otu a ka ọ dị nʼime ọgbakọ niile nke ndị nsọ. 34Ụmụ nwanyị ekwesighị ikwu okwu nʼime chọọchị. Ha ekwesighị itinye ọnụ na ntụgha ụka ọbụla, nʼihi na iwu kwuru ka ha debe onwe ha nʼokpuru ndị ọchịchị. 35Ọ bụrụ na ọ dị ihe ha chọrọ ịmata, ha jụọ di ha mgbe ha lara nʼụlọ. Nʼihi na ọ bụ ihe ihere na nwanyị ga-ekwu okwu nʼime ọgbakọ chọọchị. 36Unu chere na okwu Chineke malitere nʼaka unu? Unu chekwara na ọ ga-akwụsị nʼaka unu? Ụgha! 37Ọ bụrụ na ọ dị onye na-eche na ya bụ onye amụma, maọbụ na ya nwere onyinye nke Mmụọ Nsọ, naanị ihe m na-achọ ka ọ ghọta bụ na ihe m na-edere unu bụ iwu Onyenwe anyị nʼonwe ya nyere m. 38Ọ bụrụ na ọ dị onye nọgidere jụ ịnabata ihe ndị a, unu aṅala ya ntị. 39Ya mere, ụmụnna m, ka ibu amụma bụrụ ihe na-agụ unu agụụ, unu egbochikwala onyinye nke ịsụ nʼire dị iche iche. 40Ma meenụ ihe niile nʼụzọ dị mma, ka ha dịkwa nʼusoro.

Oziọma

Mat 21:12–14, 17–20

12Jisọs banyere nʼụlọnsọ ukwu dị na Jerusalem, malite ịchụpụ ndị niile na-ere ahịa na ndị na-azụ ahịa nʼime ụlọnsọ ahụ. O kpuru tebul ndị na-agbanwe ego ihu nʼala, kwatuokwa oche ndị na-ere nduru. 13Ọ sịrị ha, “E dere ya nʼakwụkwọ nsọ, ‘Ụlọ m ka a ga-akpọ ụlọ ekpere,’ ma unu emeela ya ‘ọgba ndị na-apụnarị mmadụ ihe nʼike.’ ” 14Ndị ìsì na ndị ngwụrọ bịakwutere ya nʼụlọnsọ ahụ. Ọ gwọkwara ha. 17Ọ hapụrụ ha, si nʼobodo ahụ pụọ gaa Betani, ebe ọ nọrọ nʼabalị ahụ niile. 18Nʼụtụtụ, mgbe ọ laghachiri nʼobodo ahụ, agụụ gụrụ ya nke ukwuu. 19Ọ hụrụ otu osisi fiig nke dị nʼakụkụ ụzọ. Mgbe o rutere nʼukwu ya, ọ hụghị ihe ọbụla nʼelu ya karịa naanị akwụkwọ ndụ. Ya mere, ọ sịrị ya, “Malite taa gaa nʼihu, ị gaghị amịkwa mkpụrụ ọzọ!” Otu mgbe ahụ kwa, osisi ahụ kpọnwụrụ. 20Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, o juru ha anya, ha jụọ sị, “Gịnị mere osisi fiig a ji kpọnwụọ ngwangwa otu a?”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 7 Ọgọọst na kalenda nzukọ bụ 20 Ọgọọst na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike