Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 19 Ọgọọst
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 19 Ọgọọst 2027
Tọọzdee · Izu nke 20 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tọọzdee nke izu nke 20 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Onye nsọ Jọn Eudes, Onye ụkọchukwu · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
29Nʼoge ahụ, mmụọ Onyenwe anyị dakwasịrị Jefta. Site nʼike mmụọ ahụ, o duuru ndị agha Izrel gafee obodo Gilead na Manase, gafeekwa Mizpa, nke dị nʼime Gilead, gaa lụso ndị Amọn agha. 30Jefta kwere Onyenwe anyị nkwa sị ya, “Ọ bụrụ na ị ga-enyefe ndị Amọn nʼaka m, 31ihe ọbụla sitere nʼọnụ ụzọ ụlọ m pụta izute m mgbe m lọghachiri nʼọnọdụ mmeri megide ndị Amọn, ga-abụ nke Onyenwe anyị. Aga m eji ya chụọ aja nsure ọkụ.” 32Jefta duuru ndị agha ya gaa ibuso Amọn agha. Onyenwe anyị nyekwara ya mmeri dị ukwuu. 33O bibiri iri obodo abụọ site nʼAroea ruo nso nso Minit, ruokwa Ebel-Keramim. Otu a ka Izrel si merie ndị Amọn. 34Mgbe Jefta lọghachiri nʼụlọ ya na Mizpa, ma lee ada ya nwanyị onye ji iti egwu na ite egwu pụta izute ya. Ọ bụ naanị ya ka nna ya mụtara. Ewezuga ya, nna ya amụtaghị nwa nwoke maọbụ nwa nwanyị ọzọ. 35Mgbe Jefta hụrụ ya, ọ dọwara uwe ya, tie mkpu sị, “Ewoo, nwa m nwanyị! I wetarala obi m ihe mgbu, nʼihi na ekwela m Onyenwe anyị nkwa, nke m na-aghaghị imezu.” 36Ọ zara, “Nna m, lee, ị ghaghị imezu ihe i kwere Onyenwe anyị na nkwa. Jiri m mee ihe i kwere Onyenwe anyị na nkwa, nʼihi na o nyela gị mmeri dị ukwuu nʼebe ndị Amọn, ndị iro gị nọ. 37Ma ọ dị otu ihe m chọrọ ịrịọ gị, biko kwere ka m soro ụmụ agbọghọ ibe m gaa wagharịa nʼugwu ndị a, ka mụ na ha kwaa akwa ọnwa abụọ, nʼihi na agaghị m alụ di.” 38Nna ya zara sị ya, “E, nwa m, i nwere ike ịga.” Ọ pụrụ gaa, jegharịa, kwaakwa akwa, ya na ụmụ agbọghọ ndị enyi ya, ruo mgbe ọnwa abụọ ahụ zuru. 39Mgbe ọnwa abụọ gasịrị, ọ laghachikwutere nna ya, onye ji ya mezuo nkwa ahụ o kwere. Ọ bụ nwaagbọghọ na-amatabeghị nwoke. Malite nʼoge ahụ ka ọ ghọrọ omenaala ndị Izrel,
Abụ Ọma nzaghachi
4Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye na-eme Onyenwe anyị ebe ntụkwasị obi ya; onye na-adịghị ele ndị mpako anya maọbụ ndị na-atụgharị gbasoo arụsị. 6Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọ ma ị megheela ntị abụọ; aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie abụghị ihe ị chọrọ. 7Mgbe ahụ, ekwuru m sị, “Lee m, abịala m, e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta. 8O Chineke m, ọ bụ ọchịchọ m ime ihe ị na-achọ, iwu gị dị nʼime obi m.” 9Ana m anọ nʼetiti ọgbakọ ukwuu na-ekwusa ihe ziri ezi; dịka ị maara, o Onyenwe anyị, anaghị m emechi ọnụ m.
Oziọma
1Jisọs gwara ha okwu ọzọ nʼilu sị, 2“Alaeze eluigwe dị ka otu eze, nke kwadoro oke oriri ọlụlụ di na nwunye, nʼihi nwa ya nwoke. 3O zipụrụ ndị ohu ya ka ha gaa chetara ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa. Ma ha niile achọghị ịbịa. 4“O zipụkwara ndị ohu ya ọzọ na-ejere ya ozi ka ha gaa gwa ndị ahụ a kpọrọ oriri sị, ‘E dozichaala ihe oriri ugbu a, egburu m oke ehi, na anụ ọzọ gbara abụba. Edoziela ihe niile. Bịanụ nʼoriri ọlụlụ di na nwunye.’ 5“Ma ndị ahụ niile a kpọrọ oriri gawaara mkpa ha nʼihi na ha akpọghị ya ihe ọbụla. Otu onye gara nʼala ubi ya, nke ọzọ nʼụlọ ahịa ya. 6Ndị fọdụrụ jidere ndị ohu ya, mee ha ihe ihere ma gbukwaa ha. 7Onye eze ahụ were iwe nke ukwuu, zipụ ndị agha ya ka ha gaa laa ndị ogbu mmadụ ahụ nʼiyi, rechapụkwa obodo ha nʼọkụ. 8“Mgbe ahụ ọ gwara ndị ohu ya sị, ‘E doziela m oriri ọlụlụ di na nwunye, ma ndị a kpọrọ oku ekwesighị ekwesi. 9Ugbu a, gaanụ nʼakụkụ ụzọ niile, kpọbatanụ ndị niile unu hụrụ, ka ha bịa nʼoriri ọlụlụ di na nwunye a.’ 10Ndị ohu ahụ pụrụ gaa nʼokporoụzọ niile kpọbata mmadụ niile ha hụrụ. Ha kpọbatara ndị bụ ezi mmadụ na ndị bụ ajọ mmadụ. Ụlọ oriri ahụ jupụtakwara na ndị a kpọrọ. 11“Ma mgbe eze ahụ batara ileta ndị niile nọ na nri, ọ hụrụ otu nwoke nke na-eyighị uwe ọlụlụ nwunye. 12Ọ jụrụ ya ajụjụ sị, ‘Enyi m, i si aṅaa bata nʼebe a mgbe ị na-eyighị uwe ọlụlụ di na nwunye?’ O mechiri ọnụ ya nʼihi na o nweghị ihe ọ ga-asa. 13“Eze ahụ nyere ndị ozi ya iwu sị ha, ‘Keenụ ya eriri, aka na ụkwụ, tụpụkwanụ ya nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.’ 14“Nʼihi na akpọrọ ọtụtụ mmadụ oku, maọbụ mmadụ ole na ole ka a họọrọ.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Jọn Eudes, Onye ụkọchukwu
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike