Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 18 Ọgọọst
Kalenda Ọtọdọks · 5 Ọgọst (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 18 Ọgọọst 2027
Wenezdee · Izu nke 9 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7
Mmemme na ndị nsọ
Forefeast of the Transfiguration of the Lord
Obubu ọnụ Ndaba ụra
Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
4Ịhụnanya na-enwe ogologo ntachiobi, na-enwekwa obi ebere. Ọ dịghị ekwo ekworo, ọ naghị enwe anya ukwu, ọ naghị anya isi. Ọ nakwaghị ebuli onwe ya elu. 5Ọ naghị eme ihe na-akpasu iwe, ọ naghị achọ ihe nke naanị ya, ọ naghị ewe iwe ọsịịsọ. Ọ nakwaghị agụkọ ihe ọjọọ niile e mere ya. 6Ọ dịghị aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ, kama ọ na-aṅụrị nʼeziokwu. 7Ọ na-edi ihe niile, ọ na-ekwerekwa ihe niile, ọ na-enwekwa olileanya na-anagide ihe ọbụla dapụtara. 8Ịhụnanya adịghị agwụ agwụ. Ma ibu amụma niile ga-emesịa kwụsị, onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche ga-akwụsịkwa. Otu a, ihe ọmụma niile ga-agabiga. 9Nʼihi na ọmụma anyị ezughị oke, ibu amụma anyị ezukwaghị oke. 10Ma mgbe anyị ruru nʼizuoke, ezughị oke agaghị adịkwa. 11Mgbe m bụ nwata, ekwuru m okwu dịka nwata, echiche m niile bụ echiche nwata. Izuzu obi m niile bụkwa nke nwata. Ma mgbe m toro ghọọ dimkpa, adịghịkwa m akpa agwa dịka nwata ọzọ. 12Ugbu a, anyị na-ahụ inyogho inyogho dịka anyị na-ele anya nʼenyo ma mgbe ahụ anyị ga-ahụ ihu na ihu. Ugbu a, ihe m mara ezughị oke, ma mgbe ahụ aga m amazu, dịka m bụ onye a mazuru. 13Ọ dị ihe atọ na-adịgide adịgide. Ha bụ okwukwe, olileanya, na ịhụnanya. Ma nʼime ha niile, ihe kachasị ha niile bụ ịhụnanya. 14:1Ka ịhụnanya bụrụ isi ihe unu na-achọ. Chọsienụ onyinye nke Mmụọ Nsọ ike, nke ka nke onyinye inwe ike ibu amụma. 2Onye ọbụla na-asụ asụsụ ọ na-amụghị amụ, bụ Chineke ka ọ na-agwa okwu, ọ bụghị mmadụ. Nʼezie, ọ dịghị onye na-aghọta ihe ọ na-ekwu; nʼihi na okwu ọ na-ekwu bụ ihe omimi site nʼike Mmụọ Nsọ. 3Ma onye ọbụla na-ebu amụma na-ezisa ozi na-enyere ndị mmadụ aka ito eto. Ọ na-agwakwa ha okwu nkasiobi na okwu na-ebuli mmụọ ha elu. 4Ya mere, onye ahụ na-ebu amụma na-enyere chọọchị aka, ma onye ahụ na-asụ asụsụ ọzọ, na-enyere naanị onwe ya aka. 5Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na unu niile nwere onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche; ma ọ ga-atọ m karịa ma ọ bụrụ na unu niile enwee onyinye ibu amụma. Nke a bụ nʼihi na onye ahụ na-ebu amụma bara uru karịa onye na-asụ asụsụ dị iche iche. Ịsụ asụsụ ya ga-aba uru ma ọ bụrụ na ọ dị onye na-aghọta ihe ọ na-asụ, ka e nwee ike wulie chọọchị.
Akwụkwọ ozi (maka Tọọzdee)
6Ụmụnna m ọ bụrụ na m bịakwutere unu malite ịsụ asụsụ unu na-adịghị aghọta, ole uru m baara unu, ma ọ bụghị ma m na-ekwu okwu banyere ihe ekpughere gosi m, maọbụ ihe niile m maara, maọbụ ihe gaje ime, maọbụ ihe nkuzi? 7Ọ bụkwa otu a ka ọ dị nʼetiti ihe niile na-enweghị ndụ, nke na-ada ụda, dịka ọja, maọbụ ụbọ akwara. Ọ bụrụ na ha enyeghị ụda dị iche site na nke ọzọ, olee ụzọ mmadụ ga-eji mara maọbụ ọja ka a na-afụ, maọbụ ụbọ akwara ka a na-akpọ. 8Ọ bụrụkwa na opi ike e ji akpọ ndị agha oku adapụtaghị ụda nke ọma, onye ga-ejikere ije agha? 9Nʼotu aka ahụ kwa, ọ bụrụ na ị na-agwa mmadụ okwu nʼasụsụ ọ na-adịghị anụ, olee otu ọ ga-esi ghọta ihe ị na-ekwu? Nʼoge ahụ, ifufe ka unu na-agwa okwu. 10Asụsụ a na-asụ nʼụwa a dị ukwuu, ma ha niile bara uru nye ndị na-anụ ha. 11Ọ bụrụ na m aghọtaghị ihe onye na-asụ otu nʼime asụsụ ndị a na-ekwu, aga m abụ ọbịa nʼebe onye na-asụ asụsụ ahụ nọ, ya onwe ya ga-abụkwa ọbịa nʼebe m nọ. 12Ebe ọ na-agụ unu agụụ inweta onyinye nke Mmụọ Nsọ, chọọnụ onyinye ndị ahụ ga-enyere unu aka iwuli nzukọ elu. 13Onye ọbụla na-asụ asụsụ nʼolu dị iche iche, ga-ekpe ekpere ka e nye ya onyinye ịkọwa olu dị iche iche. 14Ọ bụrụ na m ji asụsụ dị iche na-ekpe ekpere, mmụọ m ga-eso m na-ekpe ekpere ahụ, ma uche m agaghị aghọta ekpere m na-ekpe. 15Ọ bụrụ na ọ dị otu a, olee ihe m ga-eme? Aga m eji mmụọ m kpee ekpere, jirikwa uche kpee ekpere. Aga m ejikwa mmụọ m bụọ abụ, jirikwa uche m bụọ abụ. 16Ma o bụghị otu a, mgbe i ji asụsụ ọzọ nke a na-amaghị na-eto Chineke nʼime mmụọ, olee otu ndị niile nọ nʼụlọ nzukọ ahụ na-aghọtaghị ihe ị na-ekwu ga-esi zaa Amen? 17Ọ bụ ezie na ị na-enye ekele nke ọma, ma ọ naghị ewuli onye ọbụla elu. 18Ana m ekele Chineke nʼihi na ana m asụ asụsụ dị iche iche karịa unu niile. 19Ma mgbe ọbụla a gbakọrọ na nzukọ ife ofufe, ọ na-akara m mma ikwu naanị mkpụrụ okwu ise nke mmadụ niile ga-aghọta na nke ga-abakwara ha uru, karịa na m kwuru puku mkpụrụ okwu iri nʼasụsụ dị iche iche nke onye ọbụla na-apụghị ịghọta.
Oziọma
1“Ihe ọzọ a ga-eji tụnyere alaeze eluigwe bụ nwoke nwere ala ubi, onye pụrụ nʼisi ụtụtụ ịkpọta ndị ọrụ ga-arụ ọrụ nʼubi vaịnị ya. 2Ya na ndị ọrụ ahụ kwekọtara na ọ ga-akwụ ha otu denarị, nʼihi ọrụ ụbọchị ahụ. Emesịa o zigara ha nʼubi vaịnị ya. 3“Mgbe ọ pụrụ nʼihe dị ka elekere itoolu nke ụtụtụ, o sitere nʼebe a na-akpọta ndị ọrụ na-agafe hụ ndị ọzọ ka ha guzoro nʼọma ahịa na-enweghị ọrụ ha na-arụ. 4Ọ sịrị ha, ‘Unu onwe unu gaakwanụ rụọ ọrụ nʼubi vaịnị m, ihe ọbụla ziri ezi ka m ga-akwụ unu.’ 5Ya mere ha gara. “Ọ pụkwara nʼelekere iri na abụọ na elekere atọ nke ehihie, ma meekwa otu ihe ahụ. 6Mgbe o ruru elekere ise nke anyasị, ọ pụrụ hụ ndị ọzọ ka ha guzoro. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, ‘Gịnị mere unu ji guzoro nʼebe a taa niile na-arụghị ọrụ?’ 7“Ha zara sị ya, ‘Nʼihi na ọ dịghị onye kpọrọ anyị ọrụ.’ “Ọ gwara ha sị, ‘Unu onwe unu gaakwanụ rụọ ọrụ nʼubi vaịnị m. Aga m akwụkwa unu ihe dị mma.’ 8“Mgbe o ruru oge anyasị, onye nwe ubi vaịnị ahụ gwara onye na-elekọtara ya ndị ahụ anya sị, ‘Kpọkọta ndị ọrụ ahụ kwụọ ha ụgwọ, site na ndị ikpeazụ bịara ọrụ ruo na ndị bu ụzọ.’ 9“Mgbe ndị a kpọrọ ọrụ nʼelekere ise anyasị naara ego ha, a kwụrụ ha otu denarị, otu denarị. 10Ma mgbe ndị a kpọrọ ọrụ nʼisi ụtụtụ bịara ịnara ego ha, ha lere anya na a ga-akwụ ha karịa. Ma a kwụkwara ha niile otu denarị. 11Mgbe ha naara ego ahụ, ha tamuru ntamu megide nna nwe ụlọ, 12na-asị, ‘Ndị a bịara nʼikpeazụ rụrụ ọrụ naanị otu awa, ma i meela ka anyị na ha hara. Anyị bụ ndị buru ihe mgbu nke ọrụ ma okpomọkụ nke anwụ niile chara nʼụbọchị taa.’ 13“Ma ọ zara otu nʼime ha sị, ‘Enyi m, emeghị m gị ihe ọjọọ ọbụla. Ọ bụ na mụ na gị ekwughị na m ga-akwụ gị otu denarị nʼụbọchị? 14Nara nke ruru gị laa. A chọrọ m ịkwụ ndị a bịara nʼikpeazụ ụgwọ dị ka m si kwụọ gị. 15Ọ bụ na m enweghị ike iji ihe m nwere mee otu ọ masịrị m? Ọ bụ anya ukwu ka ị na-enwe nʼihi afọ ofufu m?’ 16“Ya mere, onye ikpeazụ ga-abụ onye bu ụzọ, ma onye bu ụzọ ga-abụkwa onye ikpeazụ.”
Oziọma (maka Tọọzdee)
17Mgbe Jisọs na-aga Jerusalem, ọ kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nʼakụkụ sị ha, 18“Lee, anyị na-aga Jerusalem ebe a ga-arara Nwa nke Mmadụ nyefee nʼaka ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu. Ha ga-ama ya ikpe ọnwụ, 19nyefekwa ya nʼaka ndị mba ọzọ, ndị ga-eji ya mee ihe ọchị, pịa ya ihe, ma kpọgide ya nʼobe. Ma nʼụbọchị nke atọ, a ga-eme ka ọ site nʼọnwụ bilie.” 20Mgbe ahụ, nne ụmụ Zebedi, duuru ụmụ ya ndị ikom abụọ bịakwute ya, o gburu ikpere nʼala nʼihu ya, rịọ ya ihe ọ chọrọ ka o meere ha. 21Ọ sịrị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Ọ zara ya sị, “Kwee m nkwa na ụmụ abụọ ndị a ga-anọdụ otu nʼaka nri gị, nke ọzọ nʼaka ekpe gị nʼalaeze gị.” 22Ma Jisọs zara sị, “Unu amaghị ihe unu na-arịọ. Unu pụrụ ịṅụ iko ahụ nke mụ onwe m ga-aṅụ?” Ha zara ya sị, “Ee, anyị nwere ike ịṅụ ya.” 23Jisọs sịrị ha, “Nʼezie unu ga-aṅụ iko m ga-aṅụ, ma ịnọdụ nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe m, abụghị ihe dịrị m inye, kama ọ dịịrị ndị ahụ Nna m kwadooro ya.” 24Mgbe mmadụ iri ndị ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu megide ụmụnne abụọ a. 25Ma Jisọs kpọkọtara ha niile, sị ha, “Nʼetiti ndị na-ekweghị ekwe, ndịisi ha na-emeso ndị ha na-achị mmeso dị ka o si dị ha mma nʼuche. Ndị ukwu nʼetiti ha na-ejikwa aka ike na-achị ndị nọ nʼokpuru ha. 26Ma nʼetiti unu ọ gaghị adị otu a. Kama, onye ọbụla nʼetiti unu chọrọ ịbụ onyeisi, ga-ebu ụzọ bụrụ onye na-ejere unu niile ozi. 27Ma onye ọbụla nke chọrọ ịbụ onye mbụ nʼetiti unu ga-abụ ohu unu niile. 28Ọ bụladị dị ka Nwa nke Mmadụ na-abịaghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi, ma nyekwa ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta nke ọtụtụ mmadụ.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 5 Ọgọọst na kalenda nzukọ bụ 18 Ọgọọst na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike