Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 27 Epreel
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 27 Epreel 2027
Tiuzdee · Izu nke 5 nke Oge Ista
Mmemme na ndị nsọ
Tiuzdee nke izu nke 5 nke Oge Ista
Ụbọchị izu · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
19Ma ndị Juu sitere nʼAntiọk na Aikoniọm bịara kpalie obi igwe mmadụ ahụ. Nʼihi ya, ha tụrụ Pọl nkume, dọkpụrụ ya pụọ nʼobodo, chee na ọ nwụọla. 20Ma mgbe ndị na-eso ụzọ bịara gbaa ya gburugburu, o bilitere, laghachikwa nʼime obodo ahụ. Ma nʼechi ya, ya na Banabas sooro gaa Debi. 21Ha zisasịrị oziọma nʼime obodo ahụ, nke mere ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Ha lọghachiri nʼobodo Listra site ya gaa Aikoniọm na Antiọk. 22Nʼebe ahụ ha gbara ndị na-eso ụzọ ume kasịekwa ha obi sị ha jidesie okwukwe ahụ ike. Ha sịrị, “Anyị ga-agabiga ọtụtụ mkpagbu dị iche iche tupu anyị abaa nʼalaeze Chineke.” 23Mgbe ha họpụtachara ndị okenye nʼime nzukọ niile. Ha sitere nʼobubu ọnụ na ekpere tinye ha nʼaka Onyenwe anyị, bụ onye ha kwenyere na ya. 24Ha sitere nʼakụkụ Pisidia garuo Pamfilia. 25Mgbe ha zisachara oziọma nʼobodo Pega, ha gbadara gaa Atalia. 26Site nʼebe ahụ, ha sooro ụgbọ mmiri jeruo Antiọk bụ ebe a nọ nyefee ha nʼamara Chineke nʼihi ọrụ ndị a ha rụzuru. 27Mgbe ha bịaruru, ha kpọkọtara nzukọ kọwara ha ihe niile Chineke sitere nʼaka ha mee, na otu o siri meghe ọnụ ụzọ nke okwukwe nye ndị mba ọzọ. 28Ha na ndị na-eso ụzọ nọgidere nʼebe ahụ ruo oge dị anya.
Abụ Ọma nzaghachi
10O Onyenwe anyị, ihe niile i kere eke ga-eto gị; ndị nsọ gị na-aja gị mma. 11Ha ga-ekwupụta banyere ebube nke alaeze gị. Kwupụtakwa maka ịdị ike gị, 12ka mmadụ niile mata ihe banyere ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche na ebube nke ịdị mma alaeze gị. 13Alaeze gị bụ alaeze na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọchịchị gị na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Onyenwe anyị na-emezu nkwa ya niile na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya. 21Ọnụ m ga-ekwupụta otuto Onyenwe anyị; ka ihe niile e kere eke too aha nsọ ya ruo mgbe ebighị ebi.
Oziọma
27Udo ka m na-ahapụrụ unu. Udo m ka m na-enyekwa unu. Ọ bụghị dị ka ụwa si enye ka m na-enye unu. Unu ekwela ka obi lọọ unu mmiri, ka ụjọ hapụkwa ịtụ unu. 28“Unu anụla na m gwara unu, ‘Ana m ala, ma lọghachikwutekwa unu.’ Ọ bụrụ na unu hụrụ m nʼanya, unu gaara aṅụrị ọṅụ na m na-alakwuru Nna, nʼihi na Nna dị ukwuu karịa m. 29Ugbu a, agwala m unu ihe a tupu o mezuo, ka ọ ga-abụ mgbe o mezuru, unu enwee ike kwere. 30Agaghị m agwa unu ọtụtụ okwu ọzọ nʼihi na eze na-achị ụwa a na-abịa. O nwekwaghị ike ọbụla nʼebe m nọ. 31Ana m eme dịka Nna m nyere m nʼiwu, ka ụwa mara na m hụrụ Nna m nʼanya. “Bilienụ ugbu a ka anyị si ebe a pụọ.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike