Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 23 Epreel

Kalenda Ọtọdọks · 10 Eprel (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 23 Epreel 2027

Fraịdee · Izu nke 6 nke Lent Ukwu · Olu 5

Mmemme na ndị nsọ

Martyrs Terence, Pompius, and with them Africanus, Macarius, Xeno, Alexander and the other 33 beheaded at Carthage († c.249-251)

Oge Lent Ukwu

Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Elekere nke 6

Aịz 66:10–24

10“Soronụ Jerusalem ṅụrịa ọṅụ, soronụ ya nwee obi ụtọ, unu ndị niile hụrụ ya nʼanya; soronụ ya ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, unu ndị ruru ụjụ nʼihi ya. 11Nʼihi na ihe banyere Jerusalem ga-atọ unu ụtọ. Unu ga-aṅụjukwa ara nkasiobi ya afọ, ọ bụladị dịka nwantakịrị si enwe obi ụtọ mgbe ọ na-aṅụ ara nne ya nke na-agba nke ọma.” 12Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Aga m eme ka udo bara ya ụba dịka osimiri, mee ka akụnụba niile nke ndị mba ọzọ dịrị ka mmiri na-asọbiga oke. Ọ ga-elekọta gị, kurukwa gị, makụọkwa gị nʼaka ya, wugharịakwa gị nʼikpere ya. 13Dịka nne si akasị nwa ya obi, otu a ka m ga-esi kasịe unu obi. Ọ bụ nʼime Jerusalem ka a ga-akasị unu obi.” 14Mgbe ị hụrụ ihe ndị a, obi gị ga-aṅụrị ọṅụ, ịga awasa dịka ahịhịa ọhụrụ; a ga-emekwa ka aka Onyenwe anyị pụta ìhè nʼebe ndị ohu ya nọ, ma a ga-egosi ndị iro ya oke iwe ya. 15Nʼihi na lee, Onyenwe anyị ga-eji ọkụ bịa. Ụgbọala ya ga-adịkwa ka oke ifufe. Ọ ga-eji ọnụma gosi iwe ya, werekwa ọkụ na-enwu enwu baa mba. 16Nʼihi na Onyenwe anyị ga-eji ọkụ na mma agha ya kpee ndị mmadụ niile ikpe. Ọ ga-egbukwa ọtụtụ mmadụ. 17“Ndị ahụ niile na-edo onwe ha nsọ, ndị na-eme onwe ha ka ha dị ọcha nʼihi ịbanye nʼubi a gbara ogige, ndị ahụ na-eso onye ahụ nọ nʼetiti ndị ahụ na-eri anụ ezi, na oke, na ihe ndị ọzọ ahụ niile rụrụ arụ, ga-ezute ọnwụ nke nọ na-eche ha niile.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 18“Ma mụ onwe m, amaara m nke ọma ihe ha zubere ma meekwa, ana m abịa ịchịkọta mba niile na-asụ asụsụ dị iche iche. Ha niile ga-abịakwa hụ ebube m. 19“Aga m edokwa ihe ịrịbama nʼetiti ha, zipụkwa ndị fọdụrụ ndụ nʼetiti ha ka ha gaa nʼobodo Tashish, na Libiya, na Lidiya (ndị na-agba àkụ nʼụta nke ọma) na Tubal, na Griis. E, ha ga-eje na mba niile nke dị anya, nʼofe osimiri, ebe ndị bi nʼime ya na-anụbeghị ihe banyere ịdị ukwuu nke m, maọbụ hụ ebube m. Ha ga-ekwusakwa ihe banyere ebube m nʼetiti mba niile dị iche iche. 20Ha ga-akpọghachi ụmụnne unu niile site na mba niile, bịa nʼugwu nsọ m dị na Jerusalem, dịka onyinye a na-ewetara Onyenwe anyị. Ha ga-ebute ha nʼelu ịnyịnya, nʼụgbọ agha, nʼelu ụgbọala a na-adọkpụ adọkpụ, nʼelu ịnyịnya muul na nʼelu ịnyịnya kamel,” ka Onyenwe anyị na-ekwu. “Ha ga-ebubata ha dịka mgbe ndị Izrel na-ewebata onyinye mkpụrụ ha nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼefere mmemme dị ọcha. 21Aga m ahọrọkwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị nchụaja na ndị Livayị,” ka Onyenwe anyị kwuru. 22“Dịka eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ahụ nke m ga-eke ga-esi dịgide nʼihu m, otu a ka aha unu na agbụrụ unu ga-adịgide, ka Onyenwe anyị kwubiri. 23Ọ ga-abụkwa na site nʼotu Ọnwa ọhụrụ ruo nke ọzọ, sitekwa nʼotu ụbọchị izuike ruo na nke ọzọ ya, anụ ahụ niile bụ mmadụ ga-abịa, daa, kpọọ isiala nʼihu m,” ka Onyenwe anyị kwuru. 24“Ha ga-apụ, jee, lekwasị ozu ndị ahụ niile nwụrụ anwụ anya, bụ ndị ahụ niile nupuru isi megide m. Nʼihi na ikpuru ha agaghị anwụ anwụ, ọkụ a kwanyere agakwaghị anyụ anyụ. Ha ga-abụkwara mmadụ niile ihe na-asọ oyi.”

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jen 49:33–50:26

33Mgbe Jekọb kwuchara okwu ndụmọdụ ikpeazụ ndị a nye ụmụ ya ndị ikom, ọ chịkọtara ụkwụ ya nʼelu akwa, kuo ume ikpeazụ. A chịkọtara ya na ndị ya. 50:1Josef dakwasịrị nʼihu nna ya, kwaa akwa, sutukwa ya ọnụ. 2Josef nyere iwu, ka ndị dibịa na-ejere ya ozi gbasie ozu nna ya. Ya mere, ndị dibịa ahụ gbasikwara Izrel. 3O were ha iri ụbọchị anọ ịgbasi ozu, nʼihi na nke a bụ oge o kwesiri iwe ha ime ya. Mgbe nke a gasịrị, a kwara ya nʼala Ijipt iri ụbọchị asaa. 4Mgbe oge iru ụjụ gafesịrị, Josef gwara ndị ụlọ Fero sị ha, “Ọ bụrụ na m ahụtala amara nʼihu unu, biko, gwaranụ m Fero otu a, sị ya, 5‘Nna m mere ka m ṅụọra ya iyi mgbe ọ na-anwụ, sị, “Lee, agala m ịnwụ, ị ga-eli m nʼili m, nke m gwuuru onwe m nʼala Kenan.” Ugbu a, biko ka m gaa lie nna m, ma lọghachikwa.’ ” 6Fero zara sị ya, “Gaa lie nna gị dịka o mere ka ị ṅụọ iyi na ị ga-eme.” 7Ya mere, Josef gara ili nna ya. Ọtụtụ ndị mmadụ sokwa ya. Ndịisi ọchịchị Fero, na ndị okenye ụlọ ya, na ndị okenye a ma ama nʼala Ijipt. 8Ndị ọzọ bụkwa ndị ụlọ Josef niile, ụmụnne ya, na ndị ụlọ nna ya. Naanị ụmụntakịrị, na igwe ewu na atụrụ ha, na igwe ehi ha, ka ha hapụrụ nʼala Goshen. 9Ma ịnyịnya ụgbọ na ndị na-agba ịnyịnya, so ya gaa. Igwe mmadụ gara ije a buru ibu nke ukwuu. 10Mgbe ha ruru ebe ịzọcha ọka nke Atad, nʼofe ọzọ nke Jọdan, ha weere iti aka nʼobi dị ukwuu tie aka nʼobi ha nʼebe ahụ. Josef ruru ụjụ ụbọchị asaa maka nna ya nʼebe ahụ. 11Mgbe ndị bi nʼala Kenan hụrụ oke iru ụjụ nke ebe ịzọcha ọka nke Atad ahụ, ha sịrị, “Nke a bụụrụ ndị Ijipt iru ụjụ dị ukwuu.” Nʼihi nke a, ha kpọrọ ebe ahụ dị nso na Jọdan Ebel-Mizraim. 12Ụmụ Jekọb mere dịka nna ha gwara ha. 13Nʼihi na ha buuru ozu ya laa nʼala Kenan, lie ya nʼọgba ahụ dị nʼọhịa Makipela, nke bụ ala ubi Ebraham zụrụ dịka ala olili ozu, site nʼaka Efrọn, onye Het; nʼakụkụ Mamre. 14Emesịa, Josef laghachiri Ijipt ya na ụmụnne ya, na ndị niile sooro ya gaa olili ozu nna ya, ngwangwa elichara nna ya. 15Mgbe ụmụnne Josef hụrụ na nna ha anwụọla, ha sịrị, “Eleghị anya Josef ga-akpọ anyị asị, kwụghachi anyị ụgwọ ihe ọjọọ niile anyị mere ya?” 16Nʼihi nke a, ha zipụrụ Josef ozi sị, “Nna gị nyere iwu a tupu ọ nwụọ. 17‘Gwa Josef sị ya, Arịọọ m gị, gbaghara ihe ọjọọ niile ụmụnne gị mere, na mmehie ha mere megide gị.’ Ugbu a, gbaghara mmehie anyị bụ ndị ohu Chineke nna gị.” Mgbe Josef nụrụ ihe ha kwuru, ọ kwara akwa. 18Ụmụnne ya bịakwara daa nʼihu ya, sị, “Anyị bụ ndị ohu gị.” 19Ma Josef sịrị ha, “Unu atụla egwu. Abụ m Chineke onye na-ekpe ikpe nke m ga-eji taa unu ahụhụ? 20Ọ bụ ezie na unu chere ime m ihe ọjọọ, ma Chineke chere ya ka ọ bụrụ ezi ihe, iji debe ọtụtụ ndụ dịka ọ na-eme taa. 21Ya mere, ụjọ atụla unu. Mụ onwe m ga-azụ unu na ụmụntakịrị unu.” Ọ kasịrị ha obi, gwa ha okwu bara ha nʼobi. 22Josef biri nʼIjipt, ya na ụmụnne ya, na ndị ụlọ ha. Josef gbara narị afọ na iri. 23Josef hụrụ ụmụ Ifrem, na ụmụ ụmụ ya. Ọ nọkwa ndụ hụ ụmụ Makia nwa Manase, ndị e kukwasịrị nʼikpere ya. 24Mgbe ahụ, Josef sịrị ụmụnne ya, “Agala m ịnwụ, ma Chineke ga-abịa ileta unu. Ọ ga-esi nʼala a kpọpụta unu kpọgakwa unu nʼala ahụ ọ ṅụụrụ Ebraham na Aịzik na Jekọb iyi, na ọ ga-enye ha.” 25Mgbe ahụ, Josef mere ka ụmụ Izrel ṅụọrọ ya iyi sị, “Mgbe Chineke bịara ileta unu, unu aghaghị ị site nʼebe a chịkọrọ ọkpụkpụ m.” 26Josef nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ na iri. Ha gbasiri ozu ya, tinye ya nʼime igbe ozu, nʼala Ijipt.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ilu 31:8–31

8Jisie ike kwuchite ọnụ ndị ahụ na-enweghị ike ikwuru ọnụ onwe ha; kwuchitekwa ọnụ ndị niile ọnọdụ ha dị ala. 9Kwusie okwu ike, kpeekwa ikpe ziri ezi. Gbooro ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa ọgụ site nʼaka ndị na-emegbu ha. 10Nwanyị nwere ugwu onye ga-achọtali ya? Ọ dị oke ọnụ karịa nkume rubi. 11Di nwanyị dị otu a na-atụkwasị obi ya niile nʼime ya, ọ dịghị ihe dị mkpa nke na-akọ ya. 12Ihe nwanyị dị otu a na-ewetara di ya bụ naanị ihe ọma. Ihe ọjọọ ọbụla adịghị esi nʼaka ya abịakwasị di ya ụbọchị niile nke ndụ ya. 13Ọ na-ahọrọ ajị anụ na flakisi jiri ya na-arụ ọrụ na-atọ aka ya ụtọ. 14Ọ na-esite nʼebe dị anya na-ebubata ihe oriri nʼụlọ ya dịka a ga-asị na ọ bụ ụgbọ mmiri. 15Tupu chi abọzie, nwanyị a esitelarị nʼihe ndina bilie kwadooro ezinaụlọ ya ihe oriri, ma debekwara odibo ndị inyom na-ejere ya ozi oke ihe oriri nke ha. 16Ọ na-apụ nyochapụta ịdị mma ala ubi, ma zụpụta ya. Ọ bụ ego ọ rụpụtara nʼonwe ya ka o ji arụ ọrụ ubi vaịnị. 17Ike ịrụ ọrụ adịghị agwụ ya. Ọ dị nnọọ ike, bụrụkwa onye na-arụpụta ihe dị iche iche. 18Ọ na-elezi anya hụ na ihe ahịa o mepụtara dị ezi oke ọnụahịa; ọ bụ nke a mere o ji na-arụ ọrụ ruo nʼime ime abalị. 19Nʼọbụaka ya ka o jidere osisi ịtụ ogho akwa; mkpịsịaka ya na-ejidesikwa ozele e ji na-ekwe akwa ike. 20Ọ na-agbasapụ aka inyere ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa aka. 21Udu mmiri maọbụ oge oke oyi adịghị eche ya uche nʼihi na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya nwere uwe ha ga-eji chụọ oyi. 22Ọ na-akpa akwa a na-agbasa nʼelu ihe ndina, ma ya onwe ya na-eyikwa uwe e ji ezi akwa ọcha na akwa odo odo dụọ. 23Di ya bụ onye a na-asọpụrụ nʼọnụ ụzọ ama obodo ebe ọ na-ewere ọnọdụ nʼetiti ndị okenye nke ala ahụ. 24Ọ na-akpa ma na-adụkwa akwa dị iche iche, ya na ihe ike nʼukwu, ndị ọ na-eresi ndị ahịa ndị ọzọ. 25Ọ bụ nwanyị dị ike, onye a na-asọpụrụ asọpụrụ. Ụjọ adịghị atụkwa ya maka ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu. 26Ọ na-eji amamihe na-ekwu okwu ntụziaka kwesiri dịkwa nʼire ya. 27Ọ na-etinye uche nʼihe niile banyere ezinaụlọ ya, ọ naghị arụ ọrụ umengwụ. 28Ụmụ ya na-ebili gọzie ya; otu a kwa di ya ga-eto ya ezi otuto. 29Ọ ga-asị; “E nwere ọtụtụ ndị inyom ndị bụ ezi nwunye nye di ha, ma gị onwe gị kachasị ha niile mma.” 30Ịma mma nke elu ahụ adịghị egosi ihe mmadụ bụ, nʼihi na ịma mma adịghị adịgide ogologo oge. Ma nwanyị ọbụla nke na-atụ egwu Onyenwe anyị bụ onye e kwesiri ito. 31E kwesiri ito ya nʼihi ọrụ ọma niile nke aka ya rụpụtara. Ka ọrụ ya niile wetara ya otuto nʼọnụ ụzọ ama nke obodo.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 10 Epreel na kalenda nzukọ bụ 23 Epreel na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike