Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 23 Epreel

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 23 Epreel 2027

Fraịdee · Izu nke 4 nke Oge Ista

Mmemme na ndị nsọ

Fraịdee nke izu nke 4 nke Oge Ista

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: ọcha

Onye nsọ Adalbert, Bishọp na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ

Onye nsọ Joj, Onye nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ

Obubu ọnụ na nchegharị

Ụbọchị nchegharị

Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọrụ 13:26–33

26“Ya mere, ụmụnna m, ndị si nʼagbụrụ Ebraham na ndị niile na-atụ egwu Chineke, ozi nke nzọpụta a dịrị anyị niile. 27Ndị bi na Jerusalem na ndị na-achị ha amataghị ya, nke ha ji aghọta okwu ndị amụma nke a na-agụpụtara ha kwa izu, bụ nʼụbọchị izuike. Ma ha mere ka okwu ahụ mezuo, mgbe ha mara ya ikpe ọnwụ. 28Ọ bụ ezie na ha achọtaghị ihe kwesiri ọnwụ nʼaka ya. Ma ha rịọrọ Pailet ka o nye ike ka e gbuo ya. 29Mgbe ha mezuru ihe niile e dere banyere ya, ha budatara ya site nʼelu obe, lie ya. 30Ma Chineke mere ka o si nʼọnwụ bilie. 31Ndị niile soro ya jegharịa site na Galili ruo Jerusalem hụkwara ya anya ọtụtụ ụbọchị. Ndị a bụkwa ndị na-agba ama nʼihu ndị mmadụ banyere ya. 32“Anyị na-ezikwa unu oziọma a, nke nkwa ahụ Chineke kwere ndị nna nna anyị ha. 33O mezuola ha nye anyị bụ ụmụ ha, site na-ime ka Jisọs site nʼọnwụ bilie, dịka e dere ya nʼakwụkwọ Abụ ọma, “ ‘Ị bụ ọkpara m, taa abụrụla m nna gị.’

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 2:6–11

6“Mụ onwe m eguzobela m eze m na Zayọn, ugwu m dị nsọ.” 7Aga m ekwusa iwu Onyenwe anyị: Ọ sịrị m, “Ị bụ Ọkpara m; taa abụrụla m nna gị. 8Rịọọ m, aga m enye gị mba niile nke ụwa ka ha bụrụ ihe nketa gị. 9Ị ga-eji mkpara igwe chịa ha, tipịa ha dịka onye na-akpụ ite si etipịa ite ndị ọ kpụrụ na-adịghị mma.” 10Nʼihi nke a, unu ndị eze, bụrụnụ ndị nwere uche; ka nke a bụrụkwa ihe ịdọ aka na ntị nye ndị na-achị achị nʼụwa. 11Jirinụ ịtụ egwu fee Onyenwe anyị ofufe; jirikwanụ ịma jijiji ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya.

Oziọma

Jọn 14:1–6

1“Ka obi ghara ịlọ unu mmiri. Kwerenụ na Chineke; kwerekwanụ na m. 2Nʼụlọ Nna m, e nwere ọtụtụ ebe obibi. Ọ bụrụ na o sighị otu a dịrị, agaara m agwa unu na m na-aga kwadoro unu ebe obibi? 3Ọ bụrụ na m agaa dozichara unu ebe obibi, aga m alọghachi bịa kpọrọ unu, ka ebe m nọ bụrụkwa ebe unu ga-anọ. 4Unu maara ụzọ ebe m na-aga.” 5Tọmọs sịrị ya, “Onyenwe anyị, anyị amaghị ebe ị na-aga, olee otu anyị ga-esi mata ụzọ ya?” 6Jisọs sịrị ya, “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ. O nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụghị site na m.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike