Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 24 Epreel
Kalenda Ọtọdọks · 11 Eprel (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 24 Epreel 2027
Satọdee · Izu nke 6 nke Lent Ukwu
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee Lazarọs
Oge Lent Ukwu
E kwere akwa azụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
28Ya mere, ebe anyị na-anata alaeze nke na-apụghị ịgbanwe, ka anyị jiri obi ekele, egwu na nsọpụrụ fee Chineke ofufe nʼụzọ ọ ga-anabata. 29Nʼihi na Chineke anyị bụ ọkụ na-erepịa erepịa. 13:1Ka ịhụnanya unu nwere nʼetiti unu na-adịgide. 2Unu echefula ịnabata ndị ọbịa, nʼihi na ụfọdụ ndị mere nke a lekọtara ndị mmụọ ozi ma ha amataghị. 3Chetanụ ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ dị ka a ga-asị na unu so ha nọdụ nʼụlọ mkpọrọ. Chetakwanụ ndị a na-ata ahụhụ, dịka a ga-asị na unu onwe unu so ha na-ahụ ahụhụ nʼahụ unu. 4Ka ọlụlụ dị na nwunye bụrụ ihe onye ọbụla na-akwanyere ugwu, ka ihe ndina unu bụrụkwa nke a na-emerụghị emerụ. Nʼihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị ụrụ ikpe. 5Debenụ ndụ unu pụọ nʼịhụnanya nke ego, ka afọ ju unu nʼihe unu nwere, nʼihi na o kwuola, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbakụta gị azụ.” 6Ya mere anyị pụrụ iji obi ike na-atụghị egwu kwuo, “Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka. Agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?” 7Chetanụ ndịisi unu, ndị gwara unu okwu Chineke. Tuleenụ otu ndụ siri dị, na-eṅomikwanụ okwukwe ha. 8Otu Jisọs Kraịst dị ụnyaahụ, ka ọ dị taa, otu a ka ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.
Oziọma
1Nʼoge ahụ, ahụ adịghị otu nwoke a na-akpọ Lazarọs onye Betani, nke bụ obodo nta nke Meri na Mata nwanne ya nwanyị. 2Nke a bụ Meri ahụ weere mmanụ otite dị oke ọnụahịa tee Onyenwe anyị, ma jirikwa agịrị isi ya hichaa ụkwụ ya. Ọ bụ nwanne ya nwoke Lazarọs bụ onye nọ nʼọrịa. 3Nke a mere ụmụnne ya nwanyị zigara Jisọs ozi sị, “Onyenwe anyị, onye ahụ nke ị hụrụ nʼanya nọ nʼọrịa.” 4Mgbe Jisọs nụrụ ya, ọ sịrị, “Ọrịa a abụghị nke ọnwụ kama ọ bụ iji nye Chineke otuto nakwa ka e site na ya nye Ọkpara Chineke otuto.” 5Jisọs hụrụ Mata, na nwanne ya nwanyị na Lazarọs nʼanya. 6Mgbe ọ nụrụ na Lazarọs nọ nʼọrịa, ọ nọkwuru mkpụrụ ụbọchị abụọ nʼebe ahụ ọ nọ. 7Ya mere, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, “Ngwanụ ka anyị laghachi azụ na Judịa.” 8Ma ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onye ozizi, nʼoge nta gara aga ka ndị Juu chọrọ ịtụ gị nkume. Ị na-agakwa ebe ahụ ọzọ?” 9Jisọs zara, “Ọ bụghị awa iri na abụọ dị nʼotu ehihie nke ụbọchị? Onye na-ejegharị nʼehihie anaghị asụ ngọngọ, nʼihi na ọ na-eji ìhè nke ụwa a ahụ ụzọ. 10Ma ndị na-ejegharị nʼabalị na-azọhie ụkwụ, nʼihi na ìhè adịghị nʼime ha.” 11Mgbe o kwusiri nke a, ọ gwakwara ha, “Enyi anyị Lazarọs na-arahụ ụra, ma ana m aga ịkpọte ya nʼụra.” 12Ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ na-arahụ ụra, ọ ga-adị mma.” 13Ihe Jisọs na-ekwu bụ banyere ọnwụ ya ma ha chere na ọ na-ekwu banyere ịrahụ ụra efu. 14Mgbe ahụ, Jisọs gwaghere ha ọnụ, “Lazarọs anwụọla. 15Ma nʼihi unu, obi dị m ụtọ na anọghị m nʼebe ahụ, ka unu nwe ike kwere. Ma bịanụ ka anyị gakwuru ya.” 16Tọmọs, onye a na-akpọ Didimọs, gwara ndị na-eso ụzọ ibe ya, “Ka anyị gakwanụ ka anyị soro ya nwụọ.” 17Mgbe Jisọs rutere, ọ chọpụtara na Lazarọs anọọlarị nʼili ụbọchị anọ. 18Betani dị Jerusalem nso, ihe dị ka kilomita atọ. 19Ma ọtụtụ ndị Juu bịakwutere Mata na Meri ịkasị ha obi nʼihi ọnwụ nwanne ha nwoke. 20Mgbe ozi ọbịbịa Jisọs ruru Mata ntị, ọ gara izute ya, ma Meri nọdụrụ nʼụlọ. 21Mata sịrị Jisọs, “Onyenwe m, a sị na ị nọ nʼebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ. 22Ma ugbu a, amara m na Chineke ga-enye gị ihe ọbụla ị rịọrọ.” 23Jisọs sịrị ya, “Nwanne gị nwoke ga-ebili ọzọ.” 24Mata sịrị ya, “Amara m na ọ ga-ebili ọzọ nʼụbọchị mbilite nʼọnwụ nʼoge ikpeazụ.” 25Jisọs gwara ya, “Mụ onwe m bụ mbilite nʼọnwụ na ndụ. Onye ọbụla kwere na m, a sịkwarị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ. 26Ma onye ọbụla dị ndụ nke na-ekwere na m agaghị anwụ. Ị kwere nke a?” 27Ọ sịrị ya, “E, Onyenwe m, ekwere m na ị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke, onye ga-abịa nʼụwa.” 28Mgbe o kwuchara nke a, ọ gara kpọọ nwanne ya nwanyị bụ Meri, jiri nwayọọ sị ya, “Onye ozizi abịala, ọ na-akpọ gị.” 29Mgbe ọ nụrụ nke a, ọ biliri ọsịịsọ ga zute ya. 30Ruo mgbe a, Jisọs abịarutebeghị nʼobodo nta ahụ, ma ọ ka nọ nʼebe ahụ Mata zutere ya. 31Ndị Juu nọ nʼụlọ na-akasị Meri obi hụrụ ya ka ọ pụrụ ngwangwa. Ha sochiri ya nʼazụ nʼihi na ha chere na ọ na-aga nʼili ibe akwa nʼebe ahụ. 32Mgbe Meri rutere nʼebe Jisọs nọ, ọ dara nʼụkwụ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị nọ nʼebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.” 33Mgbe Jisọs hụrụ ya ka ọ na-ebe akwa ya na ndị Juu ahụ so ya ka ha na-ebekwa akwa, o metụrụ ya nʼime mmụọ ya. O nwere ọmịiko dị ukwuu. 34Ọ sịrị, “Olee ebe unu liri ya?” Ha sịrị ya, “Onyenwe anyị bịa ka ị hụ.” 35Jisọs ebee akwa. 36Mgbe ahụ ndị Juu na-asị, “Lee ka o si hụ ya nʼanya.” 37Ma ụfọdụ nʼime ha sịrị, “Nwoke a meghere anya onye kpuru ìsì, ọ garaghị enwe ike mee ka nwoke a hapụ ịnwụ?” 38Ọzọkwa, Jisọs sụrụ ude nʼime onwe ya nke ukwuu, bịarute nʼili ahụ nso. Ili ahụ bụ ọgba e jiri nkume dị ukwuu mechie ọnụ ya. 39Jisọs sịrị, “Bupunụ nkume ahụ!” Ma Mata, nwanne nwanyị onye ahụ nwụrụ anwụ, sịrị ya, “Onyenwe anyị, ọ ga na-esi isi ugbu a, nʼihi na nke a bụ abalị anọ ọ nwụrụ.” 40Ma Jisọs sịrị ya, “Ọ bụ na m agwaghị gị sị na ọ bụrụ na ị kwere ị ga-ahụ ọrụ ebube Chineke?” 41Ya mere, ha bupụrụ nkume ahụ. Jisọs lere anya nʼelu sị, “Nna, ana m ekele gị nʼihi na ị nụla olu m. 42Amaara m na ị na-anụ olu m mgbe niile. Ana m ekwu nke a nʼihi ndị a gbara m gburugburu nʼebe a, ka ha kwere na ọ bụ gị zitere m.” 43Mgbe o kwusiri nke a, o jiri oke olu tie mkpu, “Lazarọs, pụta!” 44Onye ahụ nwụrụ anwụ pụtara, e jikwa akwa ozu kekọta aka ya na ụkwụ ya, werekwa akwa ịchafu kechie ihu ya. Jisọs sịrị ha, “Tọpụnụ ya, hapụ ya ka ọ laa.” 45Ọtụtụ ndị Juu bịakwutere Meri bụ ndị hụrụ ihe a o mere, kwere na ya.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 11 Epreel na kalenda nzukọ bụ 24 Epreel na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike