Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 22 Epreel
Kalenda Ọtọdọks · 9 Eprel (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 22 Epreel 2027
Tọọzdee · Izu nke 6 nke Lent Ukwu · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Martyr Eupsychius of Cæsarea in Cappadocia († 362)
Oge Lent Ukwu
Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Elekere nke 6
8Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Dịka a na-achọta mmanya site nʼụyọkọ mkpụrụ vaịnị ndị mmadụ asị, ‘Ebibila ya, nʼihi na ngọzị ka dị nʼime ha,’ otu a ka m ga-eme nʼihi ndị ohu m; Agaghị m ebibicha ha niile. 9Aga m eme ka mkpụrụ site na Jekọb pụta, sitekwa na Juda nweta ndị ga-enweta ugwu m niile. Ndị m họpụtara ga-eketa ha, ndị ohu m ga-ebikwa nʼebe ahụ. 10Sharọn ga-aghọkwa ebe ịta nri nke igwe anụ ụlọ; Ndagwurugwu Akọ ga-abụkwa ebe izuike nye igwe ehi, na ndị m na-achọsi m ike. 11“Ma unu ndị wezugara onwe unu site nʼebe Onyenwe anyị nọ, ndị chezọrọ ugwu nsọ m, ndị na-edozi tebul maka Ihuọma, ndị na-agbaju mmanya agwara ọgwa nʼiko maka Akara aka. 12Aga m eme ka unu zute mma agha; unu niile ga-adakwa mgbe a na-egbu unu. Nʼihi na akpọrọ m unu ma unu azaghị; mgbe m gwara unu okwu, unu aṅaghị ntị. Unu kpachapụrụ anya mehie megide m nʼihu, họrọkwa ime ihe ndị ahụ unu maara nke ọma na m kpọrọ asị.” 13Ya mere, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, “Ndị ohu m ga-eriju afọ, ma unu ga-anọ agụụ, akpịrị ga-akpọkwa unu nkụ, ma ha ga-aṅụ mmiri. Unu ga-anọ nʼọnụma na ihere, ma ha ga-anọ nʼọṅụ. 14Ndị ohu m ga-abụ abụ nʼihi ọṅụ nke jupụtara nʼobi ha, ma unu ga-akwa akwa, nʼihi ihe mgbu nke obi unu, tiekwa mkpu akwa nʼihi obi ntiwa nke mmụọ unu. 15Unu ga-ahapụ aha unu nye ndị m họpụtara nye onwe m ka ọ bụrụ ihe ha ji abụ ọnụ; nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-etigbu unu, ma ọ ga-akpọ ndị ohu ya aha ọzọ. 16Onye ọbụla na-ekpe ekpere nʼala ahụ, ga-eme otu a nʼaha Chineke nke eziokwu, onye ọbụla na-aṅụkwa iyi nʼime ala ahụ ga-aṅụ iyi nʼaha Chineke nke eziokwu. Nʼihi na-echezolam nsogbu niile ndị gara aga, zokwa ha site nʼanya m.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
1Izrel biliri ije, ya na ihe niile o nwere rute Bịasheba. Ebe a, ọ chụrụ aja nye Chineke nke nna ya Aịzik. 2Chineke gwara Izrel okwu nʼọhụ nke abalị. Ọ sịrị, “Jekọb! Jekọb!” Ọ zara sị, “Lee m nʼebe a.” 3Chineke gwara ya sị, “Abụ m Chineke, Chineke nke nna gị. Atụla egwu ịgbada Ijipt nʼihi na aga m eme gị ka ị ghọọ mba dị ukwuu nʼebe ahụ. 4Mụ onwe m ga-eso gị agbada nʼala Ijipt. Mụ onwe m ga-akpọlatakwa gị ọzọ. Josef nʼonwe ya ga-eji aka ya ekpuchikwa gị anya.” 5Jekọb mechara si na Bịasheba pụta. Ụmụ Izrel kuuru Jekọb nna ha, na ụmụaka ha na ndị nwunye ha, kubanye nʼụgbọala ahụ Fero zitere ka ha ji bute ya. 6Ha buuru anụ ụlọ ha niile, na ihe onwunwe ha niile, nke ha kpatara nʼala Kenan, gaa Ijipt. Jekọb na agbụrụ ya niile so. 7Ụmụ ya ndị ikom niile, na ụmụ ụmụ ya ndị ikom niile, na ụmụ ya ndị inyom niile, na ụmụ ụmụ ya ndị inyom niile, na ndị niile bụ mkpụrụ afọ ya, ka ọ kpọrọ gaa Ijipt.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
15Nwa m, aga m aṅụrị ọṅụ nke ukwuu ma ọ bụrụ na ị ghọọ onye maara ihe. 16Mkpụrụobi m ga-aṅụrị ọṅụ mgbe egbugbere ọnụ gị abụọ kwuru ihe ziri ezi. 17Ekwela ka obi gị kwosa ndị mmehie ekworo, kama nọgide nʼịnụ ọkụ nʼobi nʼịtụ egwu Onyenwe anyị mgbe niile, 18nʼihi na i nwere ọtụtụ ihe ọma nʼihu gị. Olileanya dị ukwuu dịrị gị. 19Nwa m, nwee uche, gbasookwa ụzọ Chineke. 20Anọla nʼetiti ndị na-aṅụbiga mmanya oke, na ndị iri oke oriri na-atọ ụtọ, 21nʼihi na ihe niile ga-akọ ha. Ọ bụkwa nkịrịnka akwa ka onye oke ụra na-eyi nʼahụ. 22Ṅaa ntị nʼịdọ aka na ntị nna gị, akpọkwala ịdọ aka na ntị nne gị bụ agadi nwanyị asị. 23Zụta eziokwu, erekwala ya, zụtakwa amamihe, ntụziaka, na nghọta. 24Nna onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ. Ọ bụkwa ihe oke ọṅụ inweta nwa maara ihe. 25Ka nne na nna gị nwee obi ụtọ. Ka onye mụrụ gị ṅụrịa. 26Nwa m, nye m obi gị ka ụzọ m niile nyekwa anya gị ọṅụ. 27Nʼihi na onye akwụna bụ olulu miri emi, nwanyị nwe di na-akwa iko bụ olulu mmiri dị warawara. 28Dịka onye ohi ka ọ na-echere na-emekwa ka ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi baa ụba nʼetiti ụmụ nwoke. 29Onye ka obi ya jupụtara nʼahụhụ? Onye nọ na iru ụjụ? Olee onye nwere esemokwu? Onye nwere ọtụtụ ihe mkpesa? Onye nwere mmerụ ahụ nke na-abaghị uru? Onye nwere anya nke na-acha ọbara ọbara? 30Ọ bụ ndị na-anọ ogologo oge na-aṅụ mmanya, onye na-aga ịchọpụta mmanya agwara agwa. 31Elekwasịla mmanya anya mgbe ọ na-acha ọbara ọbara, mgbe ọ na-ezipụta ọdịdị ya nʼiko mgbe ọ na-asụgharị nke ọma nʼime iko. 32Nʼikpeazụ, ọ na-ata dịka agwọ na-atụkwa dịka ajụala. 33Anya gị abụọ ga-ahụ ihe ị na-amaghị isi ya na ọdụ ya, obi gị ga-atụlekwa ihe ndị na-agbagwoju anya. 34Ị ga-adị ka onye na-edina nʼetiti oke osimiri, nke na-edinakwa nʼelu ụdọ nʼejide ụgbọ. 35Ị ga-asị, “Ha tiri m ihe, ma emerụghị m ahụ. Ha pịara m ihe, ma amaghị m. Olee mgbe m ga-eteta, ka m pụọ ga chọọ mmanya ọzọ?” 24:1Ekwosola ndị ajọ omume ekworo, ka ihe banyere ha ghara ịtọ gị ụtọ. 2Nʼihi na-atụmatụ obi ha niile bụ otu ha ga-esi mee ihe ike, egbugbere ọnụ ha na-ekwu naanị maka ọgbaaghara. 3Ọ bụ amamihe ka e ji ewu ụlọ, ọ bụkwa nghọta ka e ji eme ka o guzosie ike. 4Sitekwa nʼihe ọmụma ka akụ niile ji ejupụta nʼime ya, bụ akụ ndị pụrụ iche ma dịkwa oke ọnụahịa. 5Onye maara ihe na-emeri site nʼịdị ike, ndị nwere ọmụma ihe na-akpali ike ha.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 9 Epreel na kalenda nzukọ bụ 22 Epreel na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike