Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 21 Epreel

Kalenda Ọtọdọks · 8 Eprel (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 21 Epreel 2027

Wenezdee · Izu nke 6 nke Lent Ukwu · Olu 5

Mmemme na ndị nsọ

Apostles of the Seventy Herodion (Rodion), Agabus, Asyncritus, Rufus, Phlegon and Hermes (1st C)

Oge Lent Ukwu

Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Elekere nke 6

Aịz 58:1–11

1“Welie olu gị tie mkpu, egbochikwala iti mkpu. Welie olu gị dịka opi ike. Gwa ndị m nnupu isi ha, gwakwa ụlọ Jekọb mmehie ha. 2Kwa ụbọchị ka ha na-achọ m ha na-eme dịka ọ na-agụ ha agụ ịmara ụzọ m niile, dịka a ga-asị na ha bụ mba na-eme ihe ziri ezi, ndị na-agbakụtaghị iwu Chineke ha azụ. Ha na-ajụ m maka ikpe ziri ezi, na-eme dịka ọ na-agụ ha agụụ ka Chineke bịaruo ha nso. 3Ha na-asị, ‘Nʼihi gịnị ka anyị ji ebu ọnụ, ma ị dịghị ahụta ya? Nʼihi gịnị ka anyị ji weda onwe anyị nʼala, ma ị dịghị ahụta nke a?’ “Ma nʼụbọchị unu na-ebu ọnụ, unu na-eme ihe masịrị unu, unu na-eji anya ike nara ndị na-arụrụ unu ọrụ ihe ha rụpụtara. 4Nʼoge ahụ, ọ bụ ise okwu na ịlụ ọgụ, ya na iti ibe unu ọkpọ nʼihi ajọọ obi ka unu ji emechi ụbọchị ibu ọnụ unu. Unu apụghị ibu ọnụ otu unu si eme taa na-ele anya ka anụ olu unu nʼelu. 5Nke a ọ bụ ụdị obubu ọnụ nke m họpụtara, naanị ụbọchị nke ndị mmadụ ji eweda onwe ha nʼala? Ọ bụ naanị nke mmadụ ji ehulata isi ya nʼala dịka osisi achara, nke i dina nʼakwa mkpe na ntụ? Ọ bụ nke a ka unu na-akpọ obubu ọnụ, ụbọchị nke Onyenwe anyị nabatara? 6“Nke a ọ bụghị ụdị obubu ọnụ m họpụtara: Ịtọpụ agbụ niile nke ikpe na-ezighị ezi, na ịtọpụ ụdọ niile nke mmegbu, na ime ka ndị a na-emegbu nwere onwe ha na itiji yoku ọbụla? 7Ka i kenye ndị agụụ na-agụ ihe oriri gị, ka ị kpọbata nʼime ụlọ gị ndị na-enweghị onye inyeaka, ma ndị ogbenye. Ka i nye ndị na-agba ọtọ uwe, ka ị hapụ izo onwe gị nʼebe ndị ikwu gị chọrọ inyeaka gị nọ. 8Ọ bụrụ na i mee ihe ndị a, aga m eme ka ihuọma m chakwasị gị dịka ìhè isi ụtụtụ. A ga-agwọkwa ọrịa gị niile. Mgbe ahụ, ezi omume gị ga-edu gị, ebube Onyenwe anyị ga-echekwa gị nʼazụ. 9Mgbe ahụ, ị ga-akpọ, Onyenwe anyị ga-azakwa, ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka, ọ ga-asị gị, Lekwa m nʼebe a. “Ọ bụrụ na ị wezuga yoku mmegbu, ọ bụrụkwa na ịkwụsị ịtụ mkpịsịaka, na ịgbasa okwu ịkpọ asị, 10ọ bụrụ na inye ndị agụụ na-agụ nri, nyere ndị nọ na mkpa aka, mgbe ahụ, ìhè gị ga-achawapụta, ọchịchịrị niile gbara gị gburugburu ga-aghọ ìhè, na-achakwa ka ehihie. 11Onyenwe anyị ga na-edu gị mgbe niile. Ọ ga-eme ka afọ jụ gị nʼala kpọrọ nkụ, meekwa ka ị nọrọ nʼahụ isiike. Ị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke a na-agba mmiri nke ọma, dịka isi iyi na-adịghị ata ata.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jen 43:26–31; 45:1–16

26Mgbe Josef lọtara ụlọ, ha wetaara ya onyinye dị nʼaka ha, daa nʼala, kpọọ isiala nye ya. 27Josef jụrụ ha ajụjụ banyere ọdịmma ha, jụọkwa ha sị, “Agadi nna unu, nke unu gwara m ihe banyere ya, ahụ ọ dịkwa ya? Ọ ka dịkwa ndụ.” 28Ha zaghachiri sị ya, “Ahụ dị ohu gị bụ nna anyị. Ọ ka nọ ndụ.” Ha hulatara isi ha, kpọọ isiala nye ya. 29Mgbe Josef welitere anya ya elu hụ nwanne ya Benjamin, onye bụ nwanne afọ ya, ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Onye a ọ bụ nwanne unu nke nta ahụ unu gwara m ihe banyere ya?” Tupu ha asaa ya ihe ọbụla, o lere Benjamin anya sị ya, “Ka amara Chineke dịrị gị, nwa m nwoke.” 30Mgbe ahụ kwa Josef mere ọsịịsọ pụọ nʼezi ịchọ ebe ọ ga-akwa akwa nʼihi na ọhụhụ ọ hụrụ nwanne ya anya ọzọ metụrụ ya nnọọ nʼobi. Ọ pụrụ banye nʼime ụlọ ya kwaa akwa. 31Emesịa, ọ sara ihu ya, pụta, jisie onwe ya ike nye odibo ya iwu ka o bute nri ahụ. 45:1Nʼoge a, Josef enwekwaghị ike ijite onwe ya aka nʼihu ndị na-ejere ya ozi. O welitara olu sị, “Zipụnụ onye ọbụla site nʼebe m nọ.” Ya mere, o nweghị onye ya na Josef nọ mgbe ọ kọọrọ ụmụnne ya onye ọ bụ. 2O tiri mkpu akwa nke ndị Ijipt nụrụ, na nke ndị ụlọ Fero nụkwara. 3Josef gwara ụmụnne ya sị, “Mụ onwe m bụ Josef. Nna m ọ ka nọ ndụ ugbu a?” Ma ụmụnne ya enweghị ọnụ ha ji asa ya, nʼihi na oke egwu jidere ha nʼihu ya. 4Mgbe ahụ, Josef sịrị ụmụnne ya, “Biko, bịanụ m nso.” Mgbe ha bịara ya nso, ọ sịrị ha, “Abụ m nwanne unu, Josef, onye unu rere ree gaa Ijipt. 5Ma otu ọ dị, ka ọ ghara iwute unu, unu atakwala onwe unu ụta nʼihi orure unu rere m. Nʼihi na ọ bụ nʼihi ichebe ndụ unu ka Chineke ji buru ụzọ zite m nʼebe a. 6Oge ụnwụ agwụchabeghị. Ọ bụ ezie na afọ abụọ nke oke ụnwụ agafeela, ma ọ fọdụrụ afọ ise ọzọ nʼihu, oge a na-agaghị akọ ihe ọbụla nʼala, maọbụ iwere ihe ọbụla nʼubi. 7Chineke zitere m ka m buru ụzọ bịa nʼebe a nʼihi ime ka ndụ fọdụrụ unu nʼụwa, na ịzọpụta ndụ unu site nʼụzọ nnapụta dị oke egwu. 8“Ya mere, ọ bụghị unu zitere m nʼebe a, kama ọ bụ Chineke. Ya onwe ya emeela ka m ghọọrọ Fero nna, na onyeisi ezinaụlọ ya niile, na onye na-achị ala Ijipt niile. 9Ugbu a, meenụ ngwa lakwuru nna m, sị ya, ‘Ihe ndị a ka Josef nwa gị nwoke kwuru, Chineke emeela m onye na-achị Ijipt niile. Egbula oge ịbịakwute m. 10Ị ga-ebi nʼala Goshen, ka i nwee ike ịnọ m nso, gị na ụmụ gị, na ụmụ ụmụ gị, na igwe ewu na atụrụ gị, na igwe ehi gị, na ihe niile i nwere. 11Nʼebe ahụ ka m ga-enyekwa gị ihe ị chọrọ, nʼihi na ụnwụ afọ ise ka dị nʼihu na-abịa. Ọ bụrụ na i meghị otu a, gị na ezinaụlọ gị na ihe niile bụ nke gị ga-ada ụkpa.’ 12“Nʼezie, anya unu na nʼanya nwanne m Benjamin, ahụla na mụ onwe m ji ọnụ m na-agwa unu okwu ndị a. 13Unu ga-akọrọ nna m maka nsọpụrụ niile a na-enye m nʼala Ijipt na ihe niile unu hụrụ. Kpọtakwanụ nna m ọsịịsọ ebe a.” 14Ugbu a, ọ dakwasịrị nʼolu Benjamin, nwanne ya, kwaa akwa. Benjamin jidekwara ya nʼolu kwaa akwa. 15Emesịa, o suturu ụmụnne ya niile ọnụ, bekwasịkwa ha akwa. Nʼikpeazụ, ụmụnne ya kpanyeere ya ụka. 16Mgbe akụkọ a ruru ụlọ Fero na ụmụnne Josef bịara, ọ tọrọ Fero na ndịisi ozi niile ya ụtọ.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ilu 21:23–22:4

23Onye na-echekwa ire ya na ọnụ ya na-egbochiri onwe ya ọdachi. 24Onye nganga na onye mpako, onye na-akwa emo bụ aha ya. Ọ na-eji oke nganga eme ihe niile. 25Oke ọchịchọ nke onye umengwụ na-ewetara ya ọnwụ nʼihi na ọ jụrụ ịrụ ọrụ. 26Kwa ụbọchị ka ọ na-achọ inwe karịa, ma onye ezi omume na-enye na-akpaghị oke. 27Chineke kpọrọ aja ndị na-emebi iwu asị, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ha na-enye onyinye a site na nzube ọjọọ. 28Onyeama ụgha ga-ala nʼiyi, ma onye ọbụla na-ege ya ntị ka a ga-ebibi ruo ebighị ebi. 29Ndị ajọ omume na-ebi ndụ atụghị egwu, ma ndị omume ha ziri ezi na-atụgharị uche nʼụzọ ha niile. 30O nweghị amamihe dị, o nweghị nghọta dị, o nwekwaghị atụmatụ ọbụla, nke pụrụ iguzosi ike megide Onyenwe anyị. 31E nwere ike jikere ịnyịnya, kwadokwaa maka agha, maọbụ naanị Onyenwe anyị na-enye mmeri. 22:1Ihe nhọrọ dị ezi mma ka aha ọma bụ karịa ọtụtụ akụ, ịnata amara ihuọma ka mma karịa ọlaọcha na ọlaedo. 2Ma ogbenye ma ọgaranya bụ otu nʼihu Onyenwe anyị onye kere ha niile. 3Onye nwere uche na-ahụ nsogbu nke na-abịa nʼihu ma zobe onwe ya, ma onye na-enweghị uche anaghị ele anya, ọ na-adaba nʼime nsogbu ahụ taa ahụhụ so ya. 4Obi umeala bụ egwu Onyenwe anyị, ụgwọ ọ na-akwụ bụ akụnụba, na nsọpụrụ na ndụ ogologo.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 8 Epreel na kalenda nzukọ bụ 21 Epreel na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike