Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 20 Epreel

Kalenda Ọtọdọks · 7 Eprel (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 20 Epreel 2027

Tiuzdee · Izu nke 6 nke Lent Ukwu · Olu 5

Mmemme na ndị nsọ

Venerable George the Confessor, Metropolitan of Mitylene († after 820)

Oge Lent Ukwu

Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Elekere nke 6

Aịz 49:6–10

6Ọ sịrị, “Ọ bụ ihe dị nta karịa, gị ị bụrụ m ohu, ịkpọghachita ebo niile nke Jekọb na ịkpọghachita ndị Izrel ndị m chebere. Aga m emekwa ka ị bụrụ ìhè nye ndị mba ọzọ, ka nzọpụta m site nʼaka gị ruo ndị bi na nsọtụ ụwa niile.” 7Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, Onye mgbapụta na Onye nsọ Izrel na-agwa onye ahụ a na-elelị anya, onye ahụ mba kpọrọ ihe arụ, e, onye ahụ ndị na-achị achị mere ka ọ ghọọ ohu ha, “Ndị eze ga-eguzo ọtọ mgbe ị na-agafe. Ndịisi na-achị achị ga-akpọ isiala nye gị, nʼihi na Onyenwe anyị, Onye kwesiri ntụkwasị obi, Onye nsọ Izrel, ahọpụtala gị.” 8Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: “Nʼoge amara m, aga m aza unu, nʼụbọchị nzọpụta aga m enyere unu aka. Aga m echebe unu, mee ka unu bụrụ ọgbụgba ndụ nye ndị mmadụ, iweghachite ala ahụ na ikegharịkwa ihe nketa ya nke tọgbọrọ nʼefu; 9na-asị ndị mkpọrọ, ‘Pụtanụ,’ na-asịkwa ndị nọ nʼọchịchịrị, ‘Pụtanụ nʼihe.’ “Ha ga-adịkwa ka atụrụ m, nọọ nʼakụkụ ụzọ, ndị na-ata ahịhịa nʼebe ịta nri nke ahịhịa ndụ, nʼakụkụ ugwu nta niile. 10Agụ agaghị agụ ha, akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ. Oke anwụ otiti nke ọzara agaghị acha ha ọzọ. Nʼihi na Onyenwe anyị ga-esite nʼobi ebere ya duo ha nʼakụkụ isi iyi jupụtara na mmiri.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jen 31:3–16

3Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Jekọb, “Laghachi nʼala nna gị ha, lakwuru ụmụnna gị, aga m anọnyere gị.” 4Ya mere, Jekọb ziri Rechel na Lịa ozi ka ha bịakwute ya nʼọhịa ebe ọ nọ na-elekọta igwe anụ ụlọ ya. 5Ọ sịrị ha, “Ahụla m na omume nna unu nʼebe m nọ adịghịkwa otu ọ dị na mbụ. Ma Chineke nna m ha nọnyeere m. 6Unu maara na eji m ike m niile rụọra nna unu ọrụ. 7Ma nna unu ghọgburu m, gbanwee ụgwọ ọrụ m ugboro iri. Otu ọ dị, Chineke ekweghị ka nna unu merụọ m ahụ. 8Ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ndị tụrụ agwa agwa ga-abụ ụgwọ ọrụ gị,’ mgbe ahụ, igwe anụ ụlọ niile na-amụ ụmụ na-abụ ndị tụrụ agwa. Ma ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ndị niile nwere ntụpọ ga-abụ ụgwọ ọrụ gị,’ mgbe ahụ, igwe anụ ụlọ niile na-amụ ụmụ na-enwe ntụpọ ọcha nʼahụ ha. 9Chineke napụrụ nna unu anụ ụlọ ya ma nye m ha. 10“Nʼoge ụmụ anụ ụlọ ji atụ ime, eweliri m anya hụ na nrọ na ụmụ mkpi niile na-agba igwe nne ewu bụ ụmụ mkpi ndị tụrụ agwa agwa, ndị nwere akara maọbụ ndị nwere ntụpọ ọcha nʼahụ ha. 11Mgbe ahụ, mmụọ ozi Chineke sịrị m na nrọ, ‘Jekọb.’ Azara m sị, ‘Lee m nʼebe a.’ 12Ọ sịrị m, ‘Lelie anya gị elu, lee ka ị hụ na mkpi niile na-agba igwe nne ewu ndị a bụ mkpi ndị ahụ tụrụ agwa agwa, ndị nwere akara maọbụ ndị nwere ntụpọ ọcha. Nʼihi na ahụla m ihe niile Leban na-eme gị. 13Mụ onwe m bụ Chineke nke Betel, ebe ị wụkwasịrị mmanụ nʼogidi nkume ahụ, ebe ị kwekwara m nkwa. Ugbu a, kulie, hapụ obodo a, laghachi nʼala a nọ mụọ gị.’ ” 14Rechel na Lịa zara sị ya, “Anyị ka nwere oke nʼihe nketa nʼụlọ nna anyị? 15Ọ bụghị dịka ndị ọbịa ka ọ gụnyeziri anyị? Nʼihi na o reela anyị, ripịakwa ụgwọ isi anyị. 16Nʼezie, akụ ndị ahụ Chineke napụrụ nna anyị bụ nke anyị na nke ụmụ anyị. Ya mere, mee ihe ọbụla Chineke sị gị mee.”

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ilu 21:3–21

3Ime ezi omume na ihe ziri ezi ka Onyenwe anyị na-anabata karịa ịchụ aja. 4Nganga na mpako na agụụ ihe ọjọọ nke bụ ọrụ ndị ajọ omume, bụ mmehie. 5Echiche niile nke onye na-arụsị ọrụ ike na-eweta uru, dịka echiche onye ome ngwangwa na-enweta naanị ụkọ. 6Uru niile enwetara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị adịgide, ha bụ nkuume ifufe na-efesa, ndị na-achọ ya na-achọ ọnwụ. 7Nʼihi na ndị na-emebi iwu anaghị eme ihe ọma, ihe ọjọọ ha na-eme na-alaghachi laa ha nʼiyi. 8Ụzọ onye na-emebi iwu bụ ihe gbagọrọ agbagọ, ma omume onye aka ya dị ọcha ziri ezi. 9Ọ ka mma ibi nʼotu akụkụ elu ụlọ karịa ibinyere nwanyị na-ese okwu. 10Ihe na-atọ onye ọjọọ ụtọ bụ imerụ ndị ọzọ ahụ; ọ maghị imere mmadụ ibe ya ebere. 11Mgbe a na-ata onye na-akwa emo ahụhụ, onye na-enweghị uche na-enweta amamihe, ma mgbe a na-akụziri onye maara ihe ihe ọ na-enweta ihe ọmụma. 12Onye ezi omume na-amụta ihe site nʼile ụlọ onye ajọ omume anya na-emekwa ka ndị ajọ omume laa nʼiyi. 13Onye na-adịghị ege ntị na mkpu onye ogbenye, ya onwe ya ga-akpọkwa mkpu ma agaghị aza ya. 14Onyinye enyere na nzuzo na-eme ka iwe dajụọ, otu a kwa, ngarị ezonyere nʼime uwe na-eme ka oke ọnụma dajụọ. 15Onye ezi omume na-aṅụrị ọṅụ mgbe e kpere ikpe ziri ezi, ma bụrụ ihe oke egwu dịrị ndị na-eme ajọ ihe. 16Onye ọbụla si nʼụzọ nghọta wezuga onwe ya ga-eso nʼotu ndị nwụrụ anwụ. 17Nwoke hụrụ ibi ndụ nganga nʼanya na-ada ụkpa; ịṅụ mmanya na oke oriri abụghị ụzọ esi akpata akụ. 18Onye ajọ omume ga-abụ ihe mgbapụta maka onye ezi omume, onye aghụghọ ga-abụkwa ihe mgbapụta maka onye ndụ ya ziri ezi. 19Ọ ka mma ibi nʼọzara karịa ibinyere nwanyị na-atamu ntamu na-esekwa okwu. 20Onye maara ihe na-edebe ezi ihe oriri na mmanụ oliv nʼụlọ ya, ma onye nzuzu na-eloda ihe niile nʼọnụ ya. 21Onye na-achụso ezi omume na ịhụnanya ga-achọta ndụ, na ugwu na ọganihu.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 7 Epreel na kalenda nzukọ bụ 20 Epreel na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike