Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 21 Epreel

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 21 Epreel 2027

Wenezdee · Izu nke 4 nke Oge Ista

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke izu nke 4 nke Oge Ista

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: ọcha

Onye nsọ Anselm nke Canterbury, Bishọp na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọrụ 12:24–13:5

24Ma okwu Chineke gara nʼihu na-aba ụba na-agbasakwa. 25Mgbe ha rụchara ọrụ ha, Banabas na Sọl si Jerusalem lọghachi. Ha kpọọrọ Jọn onye a na-akpọkwa Mak nʼije ha. 13:1Ndị amụma na ndị nkuzi ụfọdụ nọkwa na nzukọ dị nʼAntiọk. Ụfọdụ nʼime ha bụ Banabas na Simiọn onye a na-akpọ nwoke ojii, na Lusiọs onye Sirini, na Manaen (onye azụlitekọrọ ya na eze Herọd), na Sọl. 2Mgbe ha nọ na-efe Onyenwe anyị ofufe na-ebukwa ọnụ, Mmụọ Nsọ sịrị, “Kewapụtaranụ m Banabas na Sọl, nʼihi ọrụ ahụ nke m kpọrọ ha.” 3Ya mere, mgbe ha busiri ọnụ kpekwa ekpere, ha bikwasịrị ha aka nʼisi zipụ ha. 4Ebe Mmụọ Nsọ zipụrụ ha, ha gbadara Selusia, sitekwa ebe ahụ gbadaa Saiprọs. 5Mgbe ha bịaruru Salamis, ha banyere nʼụlọ nzukọ ndị Juu kwusaa okwu Chineke. Jọn sokwa ha dịka onye na-ejere ha ozi.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 67:1–2, 4–5, 7

1Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ Ọma. Otu Abụ. Ka Chineke meere anyị amara ma gọzie anyị, ma mee ka ihu ya chakwasị anyị, Sela 2Ka a mara ụzọ gị niile nʼụwa, marakwa nzọpụta gị nʼetiti mba niile. 4Ka mba niile ṅụrịa ma bụọ abụ ọṅụ, nʼihi na ị na-eji ikpe ziri ezi na-achị ndị mmadụ, na-edukwa mba niile nke ụwa. Sela 5Ka mmadụ niile too gị, O Chineke; ka mmadụ niile too gị. 7Chineke ga-agọzi anyị, nsọtụ niile nke ụwa ga-atụ egwu ya.

Oziọma

Jọn 12:44–50

44Jisọs tiri mkpu sị, “Onye ọbụla kwere na m, ọ bụghị na m ka o kwere, kama ọ bụ na onye nke zitere m. 45Nʼihi na onye ọbụla hụrụ m ahụla onye nke zitere m. 46Abịara m nʼime ụwa dị ka ìhè ka onye ọbụla nke kwere na m ghara ịnọ nʼọchịchịrị. 47“Ma ọ bụrụ na onye ọbụla anụ okwu m ma ju ime ya, ọ bụghị m na-ekpe ya ikpe. Nʼihi na abịara m ịzọpụta ụwa, ọ bụghị ikpe ụwa ikpe. 48Onye ọbụla jụrụ m ma jụkwa okwu m, nwere onye ga-ekpe ya ikpe. Okwu niile m kwuru ga-ama ya ikpe nʼụbọchị ikpeazụ. 49Okwu ndị a esiteghị nʼaka m. Ha sitere nʼaka Nna ahụ onye zitere m ma nyekwa m iwu ihe m ga-ekwu na otu m ga esi kwuo ya. 50Ama m na iwu ya bụ ndụ ebighị ebi, nʼihi ya, ihe ọbụla Nna gwara m ka m na-ekwu.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike