Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 26 Maachị

Kalenda Ọtọdọks · 13 Maachị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 26 Maachị 2027

Fraịdee · Izu nke 2 nke Lent Ukwu · Olu 1

Mmemme na ndị nsọ

Translation of the relics of St Nicephorus the Patriarch of Constantinople (846)

Oge Lent Ukwu

Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Elekere nke 6

Aịz 7:1–14

1Mgbe Ehaz, nwa Jotam, nwa nwa Ụzaya bụ eze na Juda, Rezin eze Aram, na Peka eze Izrel, nwa Remalaya, busoro Jerusalem agha. Ma ha emerighị ya; obodo ahụ guzosiri ike. 2Ma mgbe e mesịrị, ozi ruru ụlọ Devid ntị sị, “Ndị Aram na Ifrem ejikọọla onwe ha ọnụ”; nke a mere ka ụlọeze, na obi ndị ọ na-achị maa jijiji, dịka osisi dị nʼọhịa si ama jijiji mgbe oke ifufe na-efe. 3Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Aịzaya okwu sị ya, “Jekwuru Ehaz bụ eze. Mgbe ị na-aga, kpọrọ Shịa-Jashub nwa gị nwoke. Unu ga-ahụ Ehaz nʼakụkụ Elu elu olulu ọdọ mmiri nke dị nʼụzọ ahụ gawara nʼAla ọsụ akwa. 4Gwa ya ka ọ ghara inye ndụ ya nsogbu, ka ọ gharakwa ịtụ egwu. Sị ya, ‘Lezie anya, nọ jụụ, echegbula onwe ya banyere icheku ọkụ abụọ ahụ na-anyụ anyụ. Atụla egwu nʼihi iwe Rezin nwa Aram, na iwe Peka nwa Remalaya. 5E, Aram, na Ifrem, na nwa nwoke Remalaya, agbaala izu ibuso gị agha ịla gị nʼiyi. Ha ekwuola sị, 6“Ka anyị wakpo Juda, ka anyị dọwaa ya ma kee ya nʼetiti onwe anyị, mee nwa Tabeel ka ọ bụrụ eze ya.” 7Ma otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Ọ gaghị adị ire! Ọ gaghị emezukwa. 8Nʼihi isi obodo Aram bụ Damaskọs. Onyeisi Damaskọs bụ naanị Rezin. Ma tupu afọ iri isii na ise agafee a ga-etikpọkwa Ifrem. 9Isi obodo Ifrem bụ Sameria. Onyeisi Sameria bụ naanị nwa Remalaya. Ọ bụrụ na unu eguzosighị ike nʼokwukwe unu, unu agaghị eguzo ma ọlị.’ ” 10Ọ dịghị anya, Onyenwe anyị ziri Ehaz ozi ndị a sị, 11“Jụọ m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, ka m meere gị ihe ịrịbama nke ga-egosi gị na m ga-ebibi ndị iro gị niile dịka m kwuru. Rịọọ m ihe masịrị gị, nʼebe dị elu nʼeluigwe maọbụ nʼebe kachasị omimi nʼụwa.” 12Ma Ehaz zara sị, “Mba, agaghị arịọ, agaghị m anwakwa Onyenwe anyị m otu a.” 13Ma Aịzaya sịrị, “Ṅaanụ ntị unu ụlọ Devid. Ọ bụ na o zurughị unu ime ka ike gwụ mmadụ? Unu ga-emekwa ka ike gwụ Chineke nʼonwe ya? 14Ya mere, Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-enye gị ihe ịrịbama! Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ọ ga-akpọ aha ya Ịmanụel, nke pụtara, Chineke nọnyeere anyị.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jen 5:32–6:8

32Mgbe Noa gbara narị afọ ise ọ ghọrọ nna Shem, Ham na Jafet. 6:1Mgbe ndị mmadụ bidoro mụbaa nʼụwa, mgbe a mụtakwaara ha ọtụtụ ụmụ ndị inyom, 2ka ụmụ ndị ikom Chineke bidoro ilekwasị ụmụ ndị inyom ndị mmadụ anya, hụ na ha mara mma. Ha duuru ndị inyom ọbụla masịrị ha ka ha bụrụ nwunye ha. 3Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Mmụọ m na mmadụ agaghị anọgide nʼịgba mgba nʼime mmadụ ruo ebighị ebi, nʼihi na mmadụ efu ka ọ bụ. Ọnụọgụgụ ndụ ya ga-abụ narị afọ na iri afọ abụọ.” 4Ndị Nefilim nọ nʼụwa nʼoge ahụ, ma nʼoge sotere ya mgbe ahụ, ụmụ ndị ikom Chineke na-abakwuru ndị inyom ụmụ mmadụ, site na mmekọrịta dị otu a mụọ ụmụ. Ndị a bụ ndị dike mgbe ochie ahụ, ndị a ma ama. 5Onyenwe anyị hụrụ otu ịba ụba nke ajọ omume mmadụ si dị ukwuu, hụkwa na echiche uche nke obi ya niile dị naanị nʼime ihe ọjọọ, mgbe niile. 6O wutere Onyenwe anyị nke ukwuu na o kere mmadụ, mkpụrụobi ya jupụtakwara nʼihe mgbu. 7Nʼihi ya, Onyenwe anyị sịrị, “Aga m esi nʼụwa kpochapụ mmadụ niile m kere eke. E e, mmadụ na anụmanụ niile, na ihe e kere eke na-akpụgharị nʼelu ala, na anụ ufe niile. Nʼihi na o wutere m na m kere ha.” 8Ma Noa nwetara ihuọma nʼanya Onyenwe anyị.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ilu 6:20–7:1

20Nwa m, debe ihe nna gị nyere gị nʼiwu, ahapụkwala iwu nke nne gị. 21Ka ndụmọdụ ha dịrị gị nʼobi mgbe niile, ka ị ghara ichefu ha. 22Mgbe ị na-ejegharị, ọ ga na-edu gị; mgbe ị na-arahụ ụra, ọ ga na-eche gị. Mgbe i tetakwara, ha ga-akpanyere gị ụka. 23Nʼihi na iwu a bụ oriọna, Ihe ozizi a bụkwa ìhè, otu a kwa ịdọ aka na ntị na ịba mba bụ ụzọ ezi ndụ, 24idebe gị ka ị pụọ nʼebe nwunye onye agbataobi gị nọ, sitekwa nʼire ụtọ nke nwanyị ọjọọ. 25Ekwela ka agụ nʼezighị ezi gụọ gị nʼime obi nʼihi ịma mma ya, ma ọ bụkwanụ ka o jiri ile anya ya rata gị. 26Nʼihi na nwanyị akwụna ka enwere ike iji otu ogbe achịcha nweta, ma nwunye nwoke ọzọ na-achụ nta ndụ gị ịla ya nʼiyi. 27Mmadụ ọ pụrụ ịgụrụ ọkụ tụkwasị nʼahụ ya, ma uwe ya ereghị ọkụ? 28Mmadụ ọ pụrụ ije ije nʼelu icheku ọkụ ma ụkwụ ya ahapụ igbuchapụ? 29Otu a ka ọ na-adịrị nwoke na-abakwuru nwunye mmadụ ibe ya; o nweghị onye ọbụla na-emetụ ya aka nke a na-agaghị ata ahụhụ. 30Ndị mmadụ adịghị eleda onye ohi anya ma ọ bụrụ na o zuo ohi ka o were gboo mkpa agụụ nke na-agụsị ya ike. 31Ma ọ bụrụ na ejide ya ọ ga-akwụghachi ụgwọ ihe niile ahụ o zuru okpukpu asaa. Nʼagbanyeghị na nke a ga-eme ka o ree ihe niile o ji biri nʼụlọ ya. 32Ma nwoke ahụ na-akwa iko bụ onye nzuzu, amamihe kọrọ ya, nʼihi na ọ bụ onwe ya ka ọ na-ala nʼiyi. 33A ga-eti ya ezi ihe otiti, a ga-elelikwa ya anya, ihere ya agaghị ekwe ihichapụ. 34Nʼihi na di nwanyị ahụ ga-esite nʼekworo wee iwe dị ọkụ; ọ gakwaghị enwe obi ebere nʼebe ọ nọ nʼụbọchị ọ ga-abọ ọbọ. 35Ọ gaghị anara ihe ọbụla nʼọnọdụ ihe nkwụghachi nʼihi ihe ọjọọ o mere ya. O nwekwaghị ihe a ga-enye ya pụrụ ime ka iwe ya dajụọ. 7:1Na-agbaso okwu m nwa m, nọgide na ya, dokwaa iwu m niile nʼime obi gị.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 13 Maachị na kalenda nzukọ bụ 26 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike