Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 27 Maachị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 27 Maachị 2027

Satọdee · Triduum nke Ista

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee Nsọ — Abalị nche Ista

Triduum nke Ista · Agba ofufe: ọcha

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Jen 1:1–2:2

1Na mmalite Chineke kere eluigwe na ụwa. 2Ụwa bụ ihe na-enweghị ụdịdị ọbụla, bụrụkwa ihe tọgbọrọ nʼefu. Ọchịchịrị gbara nʼelu ogbu mmiri dị omimi. Mmụọ nke Chineke na-erugharị nʼelu ogbu mmiri ahụ. 3Mgbe ahụ Chineke kwuru sị, “Ka ìhè dị,” ìhè dịkwara. 4Chineke hụrụ na ìhè ahụ mara mma. Ọ kpara oke nʼetiti ìhè na ọchịchịrị. 5Chineke kpọrọ ìhè ahụ Ehihie, kpọọ ọchịchịrị ahụ Abalị. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke mbụ. 6Chineke kwukwara sị, “Ka mbara pụta nke ga-ekewapụ mmiri dị nʼelu mbara ahụ site na mmiri nke dị nʼokpuru mbara ahụ” 7Ya mere, Chineke mere mbara, kewapụ mmiri dị nʼokpuru mbara ahụ site na mmiri nke dị nʼelu mbara ahụ. O sikwa otu a dịrị. 8Mbara ahụ ka Chineke kpọrọ mbara eluigwe. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke abụọ. 9Chineke kwuru sị, “Ka mmiri dị nʼokpuru mbara eluigwe chịkọta onwe ha ọnụ nʼotu ebe, ka ala akọrọ pụta.” O sikwa otu a dịrị. 10Chineke kpọrọ ala akọrọ ahụ “ala,” kpọọ mmiri ahụ chịkọtara onwe ha ọnụ “osimiri.” Chineke lere anya hụ na ha dị mma. 11Chineke kwuru sị, “Ka ala pupụta ahịhịa ndụ dị iche iche: ahịhịa na-amịpụta mkpụrụ, na osisi dị nʼelu ala nke na-amịpụta mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ya, dịka ụdịdị ha dị iche iche si dị.” O sikwa otu a dịrị. 12Ala puputara ahịhịa ndụ dị iche iche: ahịhịa na-amịpụta mkpụrụ dịka ụdịdị ha si dị, na osisi na-amịpụta mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ya, dịka ụdịdị ha si dị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma. 13Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke atọ. 14Chineke kwuru sị, “Ka ìhè nke na-enye ìhè dịrị na mbara eluigwe, ikewapụ ehihie site nʼabalị. Ka ha bụrụ ihe ama igosi oge dị iche iche, ụbọchị dị iche iche, na afọ dị iche iche. 15Ka ha bụrụ ìhè na mbara eluigwe inye ìhè nʼelu ụwa.” O si otu a dịrị. 16Chineke mere ìhè ukwu abụọ, nke kacha ịdị ukwu ka ọ bụrụ nke ga-achị ehihie, ma nke dị nta ka ọ bụrụ nke ga-achị abalị. O mekwara kpakpando dị iche iche. 17Chineke debere ha na mbara eluigwe inye ìhè nʼụwa, 18ịchị ehihie na abalị na ịkpa oke nʼetiti ìhè na ọchịchịrị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma. 19Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke anọ. 20Chineke kwuru sị, “Ka mmiri jupụta nʼihe ndị na-eku ume, ka ụmụ anụ ufe fegharịkwa nʼelu ụwa, ma nʼelu mbara igwe.” 21Ya mere Chineke kere anụ ukwu niile bi na mmiri, na anụ niile nwere ndụ bi na mmiri, na ụdị ihe ọbụla nwere ndụ na-akpụgharị akpụgharị ndị jupụtara na mmiri, dịka ụdịdị ha si dị, na anụ ufe niile dịka ụdịdị ha si dị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma. 22Chineke gọziri ha, sị ha, “Mụbaanụ, dịkwanụ ukwuu nʼọnụọgụgụ, jupụtanụ osimiri niile. Ka anụ ufe dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ nʼelu ụwa.” 23Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke ise. 24Chineke kwuru sị, “Ka ala wepụta ụmụ anụ dị iche iche nwere ndụ dịka ụdịdị ha si dị: anụ ụlọ, anụ na-akpụgharị nʼala, na anụ ọhịa, nke ọbụla dịka ụdịdị ya si dị.” O si otu a dịrị. 25Chineke mere ụmụ anụ ọhịa, dịka ụdịdị ha si dị, mee anụ ụlọ, dịka ụdịdị ha si dị, na anụ niile nwere ndụ nke na-akpụgharị nʼala dịka ụdịdị ha si dị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma. 26Mgbe ahụ, Chineke kwuru sị, “Ka anyị mee mmadụ nʼoyiyi anyị, dịka ụdịdị anyị si dị, ka ha chịa azụ niile nke osimiri, na anụ ufe niile nke eluigwe, na anụ ụlọ niile, na anụ ọhịa niile, na ihe niile e kere eke nwere ndụ nke na-akpụ akpụ nʼala.” 27Ya mere, Chineke kere mmadụ nʼoyiyi nke ya, nʼoyiyi Chineke ka o kere ha, nwoke na nwanyị ka o kere ha. 28Chineke gọziri ha sị ha, “Mịanụ mkpụrụ, mụbaanụ, jupụtanụ nʼụwa, meenụ ka ihe niile dịrị nʼokpuru unu. Chịanụ azụ niile nke osimiri na anụ ufe niile nke eluigwe na ihe niile e kere dị ndụ nke na-akpụgharị akpụgharị nʼala.” 29Mgbe ahụ, Chineke sịrị “Enyela m unu ahịhịa ubi niile na-amị mkpụrụ dị nʼelu ụwa, na osisi ọbụla mịrị mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ha, ka ha bụrụ ihe oriri gị. 30Ma ụmụ anụmanụ niile na anụ ufe niile, na anụ niile e kere eke na-akpụgharị akpụgharị nʼala, anụ ọbụla nwere ndụ nʼime ha ka m na-enye ahịhịa ndụ niile ka ọ bụrụ ihe oriri ha.” 31Chineke legharịrị anya nʼihe o kere, hụ na ọ dị ezi mma. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke isii. 2:1Otu a ka e si rụzuo ọrụ ike eluigwe na ụwa na ihe niile dị nʼime ha. 2Nʼụbọchị nke asaa, Chineke kwụsịrị ọrụ ya nke ọ na-arụ, o zukwara ike site nʼọrụ ya niile.

Abụ Ọma

Abụ 104:1–2, 5–6, 10, 12–14, 24, 35

1Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị. O Onyenwe anyị na Chineke m, ị dị ukwu nke ukwuu; ị na-eyikwasị ịma mma na ebube dịka uwe. 2Ọ na-eji ìhè kpuchie onwe ya dịka akwa; ọ na-agbasa eluigwe dịka ụlọ ikwu 5Ọ bụ ya tọrọ ntọala ụwa; agaghị ewezugakwa ya site nʼọnọdụ ya. 6I gbokwasịrị ogbu mmiri nʼelu ya dịka ọ bụ uwe ka i yikwasịrị ya, mmiri tokpukwara ugwu niile. 10Ọ na-eme ka mmiri, site nʼala na-asọpụta na ndagwurugwu, meekwa ka iyi niile site nʼetiti ugwu na-asọfe. 12Nʼosisi dị nʼakụkụ ha ka ụmụ anụ ufe nke eluigwe ga-anọ wuo akwụ ha; nọrọkwa nʼalaka ha bụọ abụ. 13Ọ na-esite nʼeluigwe na-ezidata mmiri ozuzo nʼelu ugwu niile; ụwa niile na-ejupụtakwa na mkpụrụ nke ọrụ aka ya. 14Ọ na-eme ka ahịhịa puputara anụ ụlọ, na-emekwa ka ihe a kụrụ nʼala puoro mmadụ nʼubi ya, ime ka nri site nʼala pupụta; 24Onyenwe anyị, ọrụ aka gị dị ọtụtụ. Ọ bụ site nʼamamihe ka i ji kee ha. Elu ụwa niile jupụtara nʼihe niile i kere eke. 35Ka e kpochapụ ndị mmehie niile site nʼụwa. Ka ndị niile na-emebi iwu gharakwa ịdị ọzọ. Too Onyenwe anyị gị mkpụrụobi m! Toonu Onyenwe anyị!

Ihe ọgụgụ nke abụọ

Jen 22:1–18

1Mgbe ihe ndị a gasịrị, Chineke nwara Ebraham. Ọ sịrị ya, “Ebraham.” Ebraham zara sị, “Lekwa m.” 2Chineke sịrị, “Duru nwa gị nwoke, naanị otu nwa gị nwoke, Aịzik onye ị hụrụ nʼanya, gaa nʼala Mọrịa. Jiri ya chụọrọ m aja nsure ọkụ nʼelu otu nʼime ugwu dị nʼebe m ga-egosi gị.” 3Nʼisi ụtụtụ echi ya, Ebraham biliri kwadoo ịnyịnya ibu ya. O duuru ndị ikom abụọ na-ejere ya ozi, na nwa ya nwoke Aịzik. O gbutere nkụ ga-ezuru ya ịchụ aja nsure ọkụ, bilie gawa ebe ahụ Chineke gwara ya maka ya. 4Nʼụbọchị nke atọ, Ebraham lepụrụ anya hụ ebe ahụ nʼebe dị anya. 5Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi sị, “Nọdụnụ nʼebe a, unu na ịnyịnya ibu anyị, ka mụ na nwokorobịa a gaa nʼebe ahụ. Anyị feecha ofufe, anyị ga-alọghachikwute unu ọzọ.” 6Ebraham boro nwa ya nwoke Aịzik ukwu nkụ ahụ e ji achụ aja nsure ọkụ nʼisi, ma ya onwe ya jidere ọkụ na mma. 7Aịzik gwara nna ya Ebraham sị, “Nna m.” Ebraham zara, “Ehee, nwa m.” Aịzik sịrị, “Ọkụ na nkụ dị nʼebe a, olee nwa atụrụ e ji achụ aja nsure ọkụ?” 8Ebraham zara, “Nwa m, Chineke nʼonwe ya ga-eweta nwa atụrụ e ji achụ aja nsure ọkụ.” Ha abụọ gakwara nʼihu nʼije ha. 9Mgbe ha ruru ebe ahụ Chineke gwara ya maka ya, Ebraham wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ, doo nkụ ndị ahụ niile nʼusoro nʼelu ya. O kere nwa ya Aịzik agbụ, tụkwasị ya nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, na nʼelu nkụ ndị ahụ. 10Mgbe ahụ Ebraham setịpụrụ aka ya, welite mma ka o gbuo nwa ya nwoke. 11Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị si nʼeluigwe kpọọ ya oku sị ya, “Ebraham! Ebraham!” Ebraham zara, “Lekwa m nʼebe a.” 12Ọ sịrị ya, “Emetụkwala nwokorobịa ahụ aka. Emekwala ya ihe ọbụla. Nʼihi na amatala m ugbu a na ị na-atụ egwu Chineke, ebe ọ bụ na i kwenyere iji nwa gị nwoke, naanị otu nwa nwoke i nwere chụọrọ m aja.” 13Ebraham leliri anya hụ otu ebule nke eriri ọhịa jidere na mpi ya. Ebraham gara jide ebule ahụ, were ya chụọ aja nsure ọkụ nʼọnọdụ nwa ya nwoke. 14Ya mere, Ebraham kpọrọ ebe ahụ, “ Onyenwe anyị ga-arọpụta.” Ya mere ruo taa a na-asị, “Nʼugwu Onyenwe anyị, a ga-arọpụta.” 15Mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe kpọọ Ebraham oku nke ugboro abụọ, 16sị, “Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, ji onwe m na-aṅụ iyi na-ekwupụta sị, ebe ọ bụ na i mere ihe dị otu a, na i kwenyere iji nwa gị nwoke, naanị otu nwoke i nwere chụọrọ m aja, 17aga m agọzi gị nʼezie, mekwa ka ụmụ ụmụ gị mụbaa nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando nke mbara eluigwe na dịka aja dị nʼọnụ mmiri osimiri. Ụmụ ụmụ gị ga-enwetara onwe ha ọnụ ụzọ ama ndị iro ha. 18Sitekwa na mkpụrụ gị ka a ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa, nʼihi na i rubeere m isi.”

Abụ Ọma

Abụ 16:5, 8–11

5Onyenwe anyị, i nyeela m oke m na iko m; ị na-elekọta ihe niile bụ nke m site nʼife nza. 8Ana m elekwasị Onyenwe anyị anya mgbe niile. Ebe ọ nọ nʼaka nri m, agaghị m ama jijiji. 9Nʼihi nke a, obi dị m ụtọ, ire m jupụtakwara nʼọṅụ; aga m anọkwa nʼudo. 10Nʼihi na ị gaghị ahapụ m nʼala mmụọ, ị gaghị ekwekwa ka Onye gị kwesiri ntụkwasị obi hụ ire ure. 11I gosila m ụzọ ndụ; ị ga-eji ọṅụ mejupụta obi m nʼihu gị; ya na ihe ụtọ ndị dị nʼaka nri gị ruo ebighị ebi.

Ihe ọgụgụ nke atọ

Ọpụ 14:15–15:1

15Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Gịnị mere i ji na-akpọku m. Gwa ụmụ Izrel ka ha gaa nʼihu. 16Welie mkpanaka gị elu. Setịpụ ya nʼelu osimiri ahụ ka o kewaa abụọ. Ụzọ ga-adịkwa nʼetiti osimiri ahụ. Ụmụ Izrel ga-esitekwa nʼala akọrọ gafee. 17Aga m eme ka obi ndị Ijipt sie ike, ka ha sorokwa unu nʼazụ banye. Aga m ewetara onwe m otuto site na Fero, na ndị agha niile, na ụgbọ agha niile nakwa ndị na-agba ịnyịnya ya. 18Nʼoge ahụ, ndị Ijipt ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. M ga-enweta nsọpụrụ site na Fero, na ụgbọ agha ya niile, na ndị na-agba ịnyịnya ya.” 19Mgbe ahụ, mmụọ ozi Chineke, onye na-aga nʼihu ndị agha Izrel, sitere nʼihu pụọ gaa nọdụ nʼazụ ha. Otu a kwa, ogidi igwe ojii ahụ sitere nʼihu gaa nʼazụ ha. 20Nke a mere ka ogidi igwe ojii ahụ dịrị nʼetiti ụmụ Izrel na ndị Ijipt. Nʼabalị ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị mere ka ogidi igwe ojii ahụ nye ụmụ Izrel ìhè, ma ndị Ijipt nọgidere nʼọchịchịrị. Otu a, ndị Ijipt enweghị ike bịarute nʼebe ụmụ Izrel nọ. 21Mgbe ahụ, Mosis setịpụrụ aka ya nʼelu Osimiri Uhie ahụ. Onyenwe anyị ji oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ, nke fere nʼabalị ahụ niile, nughachi osimiri ahụ, mee ka osimiri ahụ kebie ụzọ abụọ, ka ụzọ pụta nʼala osimiri ahụ. 22Ụmụ Izrel sitere nʼetiti osimiri ahụ gafee. Mmiri osimiri ahụ ghọọrọ mgbidi nʼaka nri ha ma nʼaka ekpe ha. 23Mgbe ndị agha Ijipt na-achụ ha ọsọ hụrụ ha ka ha na-agafe, ha sogidere ha baa, ọ bụladị nʼetiti osimiri ahụ. Ndị agha Ijipt niile sooro ha, ya bụ, ụgbọ agha Fero, ndị agha ya na ndị na-agba ịnyịnya ya niile. 24Nʼisi ụtụtụ echi ya, Onyenwe anyị ledatara anya site nʼogidi igwe ojii ahụ na-enye ihe. O legidere ndị agha Ijipt anya, tinyekwa ha ụjọ nʼobi nke mere na ha amakwaghị onwe ha. 25O mebiri ụkwụ ụgbọ agha ha mee ka o siere ịnyịnya ha ike ịdọkpụ ụgbọ agha ndị ahụ. Mgbe ahụ, ndị Ijipt kwuru sị, “Ka anyị sinụ nʼịchụ ndị Izrel gbapụ, nʼihi na Onyenwe anyị na-alụrụ ha ọgụ, na-emegidekwa anyị.” 26Mgbe ụmụ Izrel gafesịrị ruo nʼakụkụ nke ọzọ nke osimiri ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Setịpụ aka gị ọzọ ka mmiri ahụ kpuchigide ndị Ijipt, na ụgbọ agha ha niile, na ndị na-agba ịnyịnya ya.” 27Mosis setịpụrụ aka nʼelu osimiri ahụ. Nʼụtụtụ ya, mmiri osimiri ahụ sọghachiri gaa ebe ọ nọ na mbụ. Ndị Ijipt chọsịrị ụzọ ha si agbapụ ike, ma Onyenwe anyị mere ka osimiri ahụ kpuchie ha. 28Osimiri ahụ kpuchigidere ụgbọ agha ha niile, na ndị na-agba ịnyịnya, na ndị agha Fero niile ndị chụụrụ ụmụ Izrel baa nʼime osimiri ahụ. O nweghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ. 29Ma ụmụ Izrel esitelarị nʼala nke mmiri kọrọ gafee osimiri ahụ. Mgbe ha na-agafekwa, akụkụ abụọ nke osimiri ahụ guzoro ọtọ dịka mgbidi, nʼaka nri ha ma nʼaka ekpe ha. 30Site nʼụzọ dị otu a, Onyenwe anyị zọpụtara ụmụ Izrel site nʼaka ndị Ijipt. Ụmụ Izrel hụkwara ozu ndị Ijipt nʼikpere mmiri osimiri ahụ. 31Ụmụ Izrel tụrụ egwu Onyenwe anyị mgbe ha hụrụ ihe ịrịbama ndị a Onyenwe anyị ji zọpụta ha site nʼaka ndị Ijipt. Ha kwenyere na Onyenwe anyị, kwenyekwa na Mosis ohu ya. 15:1Mgbe ahụ, Mosis na ụmụ Izrel bụkuru Onyenwe anyị abụ dị otu a sị, “Aga m abụku Onyenwe anyị abụ nʼihi na o buliela onwe ya elu nke ukwuu. Ọ tụnyela ịnyịnya na onye na-agba ya nʼosimiri.

Abụ Ọma

Ọpụ 15:1–6, 17–18

1Mgbe ahụ, Mosis na ụmụ Izrel bụkuru Onyenwe anyị abụ dị otu a sị, “Aga m abụku Onyenwe anyị abụ nʼihi na o buliela onwe ya elu nke ukwuu. Ọ tụnyela ịnyịnya na onye na-agba ya nʼosimiri. 2“ Onyenwe anyị bụ ike m na abụ m. Ọ ghọrọla m nzọpụta. Ọ bụ Chineke m, aga m etokwa ya, Chineke nke nna m, aga m ebulikwa ya elu. 3Onye na-ebu agha ka Onyenwe anyị bụ. Nʼezie, aha ya bụ Onyenwe anyị. 4Ụgbọ agha Fero na usuu ndị agha ya, ka ọ tụnyere nʼosimiri ahụ. Ndịisi agha Fero, ndị ahọrọ ahọ, ka o mere ka Osimiri Uhie rie. 5Ogbu osimiri ahụ ekpuchiela ha. Nʼime mmiri ahụ dị omimi ka ha rịdaruru dịka nkume. 6Aka nri gị Onyenwe anyị, dị ike, dịkwa ebube. Aka nri gị, Onyenwe anyị na-etipịasị ndị iro. 17Gị onwe gị ga-akpọbata ha, kụọ ha dịka mkpụrụ, nʼelu ugwu nke ihe nketa gị. Nʼebe ahụ, Onyenwe anyị, i mere ka ọ bụrụ ebe obibi gị, ebe nsọ ahụ, Onyenwe anyị, nke i ji aka gị tọọ ntọala ya. 18“ Onyenwe anyị ga-abụ eze ruo mgbe niile ebighị ebi.”

Ihe ọgụgụ nke anọ

Aịz 54:5–14

5Nʼihi na onye kere gị ga-abụrụ gị di. Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile; Onye nsọ Izrel bụ Onye mgbapụta gị, Chineke nke ụwa niile ka a na-akpọ ya. 6Nʼihi na Onyenwe anyị ga-akpọghachi gị dịka a ga-asị na ị bụ nwunye a hapụrụ ahapụ, nke ọ na-ewutakwa nʼime mmụọ ya bụ nwunye alụtara na nwantakịrị, naanị ka ọ bụrụ onye ajụrụ ajụ,” ka Chineke gị na-ekwu. 7“Naanị nwa mgbe nta ka m hapụrụ gị. Ma aga m eji obi ebere ukwuu kpọghachikwa gị 8Na nwa oge, esitere m nʼoke iwe na-ewe m zonarị gị ihu m, ma site nʼịhụnanya m nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, aga m enwe ọmịiko nʼahụ gị.” Otu a ka Onyenwe anyị, onye mgbapụta gị kwuru. 9“Dịka m si ṅụọ iyi nʼoge Noa sị na m agaghị ekwekwa ka mmiri kpuchie ụwa ọzọ, bibie ndụ ndị dị nʼime ya, ana m aṅụkwa iyi ugbu a na mụ agaghị ekwe ka iwe m bịakwasị gị ọzọ. Agakwaghị m abasiri gị mba ike. 10Nʼihi na a pụrụ iwezuga ugwu ukwu niile, wezugakwa ugwu nta niile site nʼọnọdụ ha, ma obi ebere m agaghị esi nʼebe ị nọ pụọ, agaghị ewezugakwa ọgbụgba ndụ nke udo m,” ka Onyenwe anyị, onye nwere ọmịiko nʼahụ gị, kwuru. 11“Gị, onye a na-emekpa ahụ, onye oke ikuku ụwa a na-ebugharị, nke onye ọbụla na-adịghị akasị obi, lee, aga m e ji nkume tọkwọisi wugharịa gị, jirikwa nkume ọma safaia dị oke ọnụahịa tọọ ntọala gị niile. 12Aga m eji nkume rubi wugharịa akụkụ ụlọ gị niile, jiri nkume na-egbu nweghenweghe wuo ọnụ ụzọ ama gị niile. Aga m ejikwa nkume dị oke ọnụahịa wuo mgbidi obodo gị. 13Ụmụ gị niile ga-abụ ndị Onyenwe anyị ga-akụziri ihe. Udo ha ga-adịkwa ukwu. 14Nʼezi omume ka a ga-eme ka ị guzosie ike. Mmegbu ga-adịkwa anya site nʼebe ị nọ, nʼihi ya, ị gaghị atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla. Ọ dịghị ihe egwu ga-abịaru gị nso, nʼihi na a ga-ewezuga ha site nʼebe ị nọ.

Abụ Ọma

Abụ 30:1, 3–5, 10–12

1Abụ Ọma. Abụ nke ido obieze Devid nsọ. Aga m eto gị, O Onyenwe anyị, nʼihi na i sitere nʼebe dị omimi dọpụta m. I kweghị ka ndị iro m chịa m ọchị. 3O Onyenwe anyị, i si nʼala ili kpọpụta m, i mere ka m dịrị ndụ. 4Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ndị nsọ ya, toonu aha nsọ ya. 5Iwe ya adịghị adịgide tee anya, ma ime amara ya na-adị ruo ebighị ebi! Ịkwa akwa nwere ike dịrị ogologo abalị niile, ma iti mkpu ọṅụ ga-adị nʼụtụtụ. 10O Onyenwe anyị, gee m ntị ma meere m ebere; O Onyenwe anyị, bụụrụ m onye inyeaka. 11I meela ka iti mkpu akwa m ghọọ ite egwu; ị napụrụ m akwa mkpe m, ma yinye m ọṅụ dịka akwa mmemme. 12I mere nke a ka obi m bụọ maka otuto gị, ghara ịnọ nwayọọ. O Onyenwe anyị Chineke m, aga m eto gị ruo mgbe ebighị ebi.

Ihe ọgụgụ nke ise

Aịz 55:1–11

1Gee ntị, bịa onye ọbụla akpịrị na-akpọ nkụ, bịanụ na mmiri, unu ndị na-enweghị ego bịanụ zụọ, riekwa. Bịanụ, zuru mmanya na mmiri ara ehi na-ejighị ego na-arụghị ọnụahịa ọbụla. 2Nʼihi gịnị ka i ji na-atụfu ego gị ịzụ ihe na-abụghị ezi nri? Gịnị mere i ji na-adọgbu onwe gị nʼọrụ nʼihe na-apụghị iju gị afọ? Gee ntị, geenụ m ntị nke ọma, rie ezigbo nri mkpụrụobi gị ga-enwe afọ ojuju na nri dị ezi mma! 3“Tọọnụ ntị unu nʼala, bịakwute m! Gee ntị, ka inwe ike dị ndụ. Mụ na unu ga-aba nʼọgbụgba ndụ ebighị ebi, bụ ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi nke m kwere Devid na nkwa. 4Lee, emere m ya ka ọ ghọọrọ ndị niile dị iche iche onyeama, ka ọ bụrụ onyendu na onyeisi ọchịchị nye ndị niile dị iche iche. 5Nʼezie, gị onwe gị ga-akpọku mba dị iche iche na i maghị, mba ndị ahụ na-amaghị gị ga-ejikwa ọsọ gbakwute gị, nʼihi Onyenwe anyị Chineke gị, Onye nsọ nke Izrel, nʼihi na o meela ka ị bụrụ ihe dị oke mma.” 6Chọọnụ Onyenwe anyị mgbe a ga-achọta ya. Kpọkuonụ ya mgbe ọ nọ nso. 7Ka onye na-eme ihe ọjọọ hapụ ụzọ ya, ka onye ajọ omume hapụ echiche ọjọọ ya niile. Ka ha tụgharịa bịakwute Onyenwe anyị, ọ ga-emere ha ebere, ha bịakwute Chineke anyị, nʼihi na ọ ga-agbaghara ha mmehie ha niile. 8“Nʼihi na echiche m ha abụghị echiche unu, ụzọ unu niile, ha abụkwaghị ụzọ m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. 9“Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ụzọ m niile si dị elu karịa ụzọ unu niile, otu a kwa ka echiche m niile si dị elu karịa echiche unu niile. 10Dịka mmiri na mkpụrụ mmiri si esi nʼeluigwe ada nʼụwa na-alaghachighị nʼeluigwe ma ọ bụrụ na o meghị ka mmiri dee ala, mee ka ihe ubi pupụta, too eto, meekwa ka ọ mịa mkpụrụ nye onye na-akụ ihe ọkụkụ, bụrụkwa ihe oriri nye onye na-eri nri. 11Otu a ka okwu si m nʼọnụ pụọ si adị. Ana m ezipu ya, ọ gaghị alọghachikwute m nʼefu. Ọ ga-emezu ihe niile m chọrọ ka o mee, baakwa ụba ebe ọbụla m zigara ya.

Abụ Ọma

Aịz 12:2–6

2Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m; aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m. Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m, ọ ghọrọla m onye nzọpụta.” 3Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmiri site nʼolulu mmiri nke nzọpụta. 4Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwukwa sị, “Nyenụ Onyenwe anyị otuto, Kwupụtakwa aha ya; meenụ ka amata nʼetiti mba niile ihe niile ọ rụrụ; kwusaanụ na aha ya bu ihe e buliri elu. 5Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o meela oke ihe dị ebube. Meekwanụ ka ụwa niile mara ihe ọ rụrụ. 6Ka ndị niile bi na Zayọn tie mkpu ọṅụ, bụkwaa abụ. Nʼihi na Onye nsọ nke Izrel. dị ukwuu, e, ọ dị ike nke ukwuu, bụ Onye ahụ na-ebi nʼetiti unu.”

Ihe ọgụgụ nke isii

Ọ dịghị na nsụgharị a

Abụ Ọma

Abụ 19:7–10

7Iwu Onyenwe anyị zuruoke; ọ na-eweghachi mkpụrụobi. Ụkpụrụ Onyenwe anyị niile kwesiri ntụkwasị obi; ọ na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe. 8Iwu Onyenwe anyị ziri ezi, ọ na-enye mkpụrụobi ọṅụ. Iwu Onyenwe anyị na-amụke amụke, ọ na-enye anya ìhè. 9Ịtụ egwu Onyenwe anyị dị ọcha, ọ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị na-eguzosi ike, ha niile bụkwa ihe ziri ezi. 10Ha dị oke ọnụ karịa ọlaedo, karịa ọlaedo a nụchara anụcha; ha na-atọkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ, karịa mmanụ aṅụ si nʼụbụbọ aṅụ.

Ihe ọgụgụ nke asaa

Izk 36:16–28

16Ọzọkwa, okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị, sị, 17“Nwa nke mmadụ, mgbe ụmụ Izrel bi nʼala nke aka ha, ha merụrụ ya, site na ndụ ọjọọ ha, na omume ha. Ndụ ọjọọ ha nʼihu m, dị ka adịghị ọcha nke nwanyị nʼoge ọ nọ na nsọ ya, nʼọnwa niile. 18Nʼihi ya, awụkwasịrị m ha ọnụma m, nʼihi na ha na-awụsi ọbara nʼala ahụ, jirikwa arụsị ha na-emerụ ya. 19Achụsasịrị m ha na mba dị iche iche. Otu a ka m si kpee ha ikpe nʼihi ụzọ ọjọọ ha, na omume ọjọọ ha. 20Ma ebe niile ha gara nʼetiti mba niile, ha mere ka aha nsọ m gharakwa ịdị nsọ, nʼihi na a na-ekwu banyere ha, sị, ‘Ndị a bụ ndị nke Onyenwe anyị, ma agbanyeghị nke a, ha sitere nʼala ya pụọ.’ 21Ihe na-ewutekwa m bụ aha nsọ m, nke ụlọ Izrel mere ka ọ ghara ịdị nsọ nʼetiti mba niile bụ ebe ha gara. 22“Ya mere, gwa ụlọ Izrel, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ọ bụghị nʼihi na unu, ụlọ Izrel, ka m ji na-eme ihe ndị a, kama ọ bụ nʼihi aha nsọ m, nke unu mere ka ọ ghara ịdị nsọ nʼetiti mba niile dị iche iche ebe ndị unu gara. 23Aga m eme ka ịdị nsọ nke aha ukwuu m, nke unu mere ka ọ ghara ịdị nsọ nʼetiti mba niile, pụta ìhè. Mgbe ahụ, mba niile ga-amakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, mgbe a ga-edo m nsọ site nʼime unu nʼanya ha. 24“ ‘Nʼihi na aga m esi na mba niile dị iche iche kpọpụta unu. Aga m achịkọta unu site nʼala niile, mee ka unu bata nʼala unu. 25Aga m efekwasị unu mmiri dị ọcha, unu ga-adịkwa ọcha. Aga m eme ka unu dị ọcha site na-adịghị ọcha unu niile, na site nʼikpere arụsị unu niile. 26Aga m enye unu obi ọhụrụ, kenyekwa unu mmụọ ọhụrụ. Aga m ewepụ obi nkume nke mmehie dị nʼime unu, nye unu mkpụrụobi nke anụ ahụ. 27Aga m etinyekwa mmụọ m nʼime unu, mee ka unu gbaso ụkpụrụ m niile ma lezie anya mekwaa ihe niile m nyere nʼiwu. 28Unu ga-ebikwa nʼala ahụ nke m nyere nna unu ha. Unu ga-abụ ndị m, aga m abụkwa Chineke unu.

Abụ Ọma

Abụ 42:2, 4; 43:3–4

2Akpịrị nke ihe banyere Chineke, bụ Chineke ahụ dị ndụ, na-akpọ m nkụ. Olee mgbe m pụrụ ịga zute Chineke? 4Ihe ndị a ka m na-echeta mgbe m na-ekwupụta ihe mgbu nke obi m: ma m cheta mgbe mụ na igwe mmadụ so aga, mgbe m ji iti mkpu ọṅụ na ekele na-edu ha nʼetiti ọha kachasị ibe ya, ndị ọṅụ juru obi, na-aga nʼụlọ Chineke. 43:3Zipụ ìhè gị na eziokwu gị, ka ha duo m; ka ha kpọbata m nʼugwu nsọ gị, bụ ebe i bi. 4Mgbe ahụ, aga m aga nʼebe ịchụ aja Chineke, gakwuru Chineke, bụ ọṅụ m na obi ụtọ m. Aga m eji ụbọ akwara too gị, O Chineke, bụ Chineke m.

Akwụkwọ ozi

Rom 6:3–11

3Ọ bụ na unu amataghị na mgbe ahụ e jikọtara anyị na Kraịst Jisọs na baptizim ka e jikọtakwara anyị na ya nʼọnwụ. 4Ya mere, esitere na baptizim likọọ anyị na ya nʼọnwụ, dịka e mere ka Kraịst site nʼọnwụ bilie nʼebube nke Nna, ka anyị sikwa otu a keta oke na ndụ ọhụrụ. 5Ọ bụrụkwa na e jikọtaala anyị na ya nʼọnwụ, e jikọtakwala anyị na ya na mbilite nʼọnwụ. 6Nʼihi na anyị maara na a kpọgidekọtara ndụ nke ochie anyị na Kraịst nʼelu obe, iji mee ka anụ ahụ nke mmehie ahụ bụrụ ihe a lara nʼiyi, ka anyị bụrụkwa ndị nwere onwe ha site nʼịbụ ohu nke mmehie. 7Nʼihi na onye nwụrụ anwụ agụọla ya dịka onye nwere onwe ya site nʼebe mmehie dị. 8Ọ bụrụkwa nʼeziokwu na anyị na Kraịst nwụkọrọ ọnwụ, anyị makwara na anyị na ya ga-adịkọkwa ndụ ọzọ. 9Nʼihi na anyị maara na ebe e mere ka Kraịst site nʼọnwụ bilie, ọ gaghị anwụkwa ọzọ. Ọnwụ enwekwaghị ike ọbụla nʼebe ọ nọ ọzọ. 10Ọ nwụrụ naanị otu mgbe nʼihi mmehie. Ma ndụ ọ na-adị ugbu a bụ nke ọ na-adị nye Chineke. 11Ya mere, gụọ onwe unu ugbu a dịka ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị. Gụọkwa onwe gị dịka ndị dị ndụ nʼebe Chineke nọ nʼime Kraịst, site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.

Abụ Ọma

Abụ 118:1–2, 16–17, 22–23

1Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma; ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 2Ka ụmụ Izrel kwupụta nʼonwe ha sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.” 16Aka nri Onyenwe anyị bụ ihe e weliri elu; aka nri Onyenwe anyị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu!” 17Agaghị m anwụ, kama aga m adị ndụ kwusaara ndị ọzọ ọrụ ebube Onyenwe anyị rụrụ. 22Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, aghọọla nkume isi ntọala ụlọ; 23nke a bụ ọrụ aka Onyenwe anyị, ọ bụkwa ihe ịtụnanya nʼanya anyị.

Oziọma

Mak 16:1–7

1Mgbe ụbọchị izuike gafere, Meri Magdalin na Meri nne Jemis na Salomi zụtara ụda dị iche iche ha ga-eji tee ahụ ya mmanụ. 2Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu, mgbe anyanwụ wara, ha biliri gawa nʼili ahụ. 3Ha jụrịtara onwe ha na-asị, “Onye ga-enupuru anyị nkume ahụ dị nʼọnụ ụzọ ili ahụ?” 4Ma mgbe ha leliri anya, ha hụrụ na e nupụla nkume ukwu ahụ. 5Mgbe ha banyere nʼime ili ahụ, ha hụrụ otu nwokorobịa yi uwe ọcha ka ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ aka nri nke ili ahụ. Ha tụrụ oke egwu. 6Ma ọ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Unu na-achọ Jisọs onye Nazaret a kpọgidere nʼobe. E meela ka o site nʼọnwụ bilie! Ọ nọkwaghị nʼebe a. Lee ebe e nibere ya. 7Ma gaanụ gwa ndị na-eso ụzọ ya nakwa Pita, ‘O burula unu ụzọ gawa Galili. Ebe ahụ ka unu ga-ahụ ya dị ka ọ gwararịị unu.’ ”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike