Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 25 Maachị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 25 Maachị 2027
Tọọzdee · Triduum nke Ista
Mmemme na ndị nsọ
Tọọzdee Nsọ
Triduum nke Ista · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu nʼala Ijipt sị ha, 2“Ọnwa a ga-abụrụ unu isi ọnwa. Ọ ga-abụ ọnwa mbụ nke ọnwa niile nʼafọ unu. 3Gwa ọgbakọ ụmụ Izrel niile okwu sị ha, Nʼafọ ọbụla, nʼabalị iri nke ọnwa a, nwoke ọbụla ga-eweta nwa atụrụ nʼisi ezinaụlọ ọbụla. 4Ezinaụlọ ọbụla nke dịkarịrị nta, nke na-enweghị ike iweta na iricha otu nwa atụrụ, ga-ejekwuru ezinaụlọ ọzọ dịkwa nta, ka ha jikọtaa onwe ha ọnụ weta nwa atụrụ. Ndị ga-ejikọta onwe ha ọnụ aghaghị ibu ụzọ pịa mmadụ ole ha ga-adị nwee ike richaa otu atụrụ. 5Nwa atụrụ a ga-eweta ga-abụ oke gbara naanị otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ ọbụla nʼahụ ya. Unu nwere ike họrọ atụrụ maọbụ ewu. 6Unu ga-elekọta ya anya ruo nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa a. Nʼabalị ụbọchị ahụ ka ọgbakọ Izrel niile ga-egbu ya. 7Ha ga-ewere ọbara ya tee nʼelu na nʼakụkụ ibo ọnụ ụzọ nke dị nʼezinaụlọ ha niile, ebe ha ga-anọ rie anụ atụrụ ahụ. 8Ha ga-eri anụ atụrụ a, nke a ga-ahụ nʼọkụ nʼabalị ahụ, ya na achịcha na-ekoghị eko, na ahịhịa ndụ na-elu ilu. 11Otu a ka unu ga-esi rie ya: yirinụ uwe unu, na akpụkpọụkwụ unu. Jirikwanụ mkpara unu. Jikerenụ dịka ndị na-aga njem dị anya. Unu ga-eri anụ atụrụ a na achịcha na-ekoghị eko ngwangwa. A ga-akpọ oriri a Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị. 12“Aga m agafe nʼala Ijipt nʼabalị ahụ, igbu ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, ma mmadụ, ma anụmanụ. Aga m emekwa ka ikpe ọmụma bịakwasị chi ndị ọzọ ahụ niile Ijipt na-efe ofufe. Abụ m Onyenwe anyị. 13Ọbara ahụ unu ga-ete nʼọnụ ibo ụlọ unu ga-abụ ihe ama igosi ebe unu bi, nʼihi na mgbe m hụrụ ọbara ahụ, aga m agafe unu. Ọ nwekwaghị ihe otiti ga-abịakwasị unu mgbe m ga-egbu ndị Ijipt. 14“Ụbọchị a ga-abụrụ unu ihe ncheta nye ọgbọ niile ndị na-eso nʼazụ. Unu ga-emekwa ya ka ọ bụrụ mmemme nye Onyenwe anyị. Ụkpụrụ nke na-adịgide adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Abụ Ọma nzaghachi
12Gịnị ka m ga-enyeghachi Onyenwe anyị nʼihi mmeso ọma niile o mesoro m? 13Aga m eweli iko nke nzọpụta m elu kpọkuokwa aha Onyenwe anyị. 15Ọnwụ nke ndị nsọ ya dị oke ọnụahịa nʼanya Onyenwe anyị. 16O Onyenwe anyị, nʼezie, abụ m ohu gị; abụ m ohu gị, nwa nwoke nke ohu gị nwanyị; ị zọpụtala m site na agbụ e kere m. 17Aga m achụrụ gị aja ekele kpọkuokwa aha Onyenwe anyị. 18Ọ bụkwa nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ kwụghachi Onyenwe anyị nkwa m kwere,
Ihe ọgụgụ nke abụọ
23Nʼihi na ihe m ziri unu bụ ihe Onyenwe anyị ziri m. Nʼabalị ụbọchị ahụ a rara ya nye, Onyenwe anyị Jisọs weere otu ogbe achịcha. 24Mgbe o nyechara ekele, ọ nyawara ya sị, “Nke a bụ ahụ m nke a na-enye maka unu. Na-emenụ nke a iji cheta m.” 25Nʼụzọ dị otu a kwa, o bulitere otu iko mmanya mgbe ha risiri nri sị, “Iko a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ nʼọbara m. Oge ọbụla unu na-aṅụ ya, na-emenụ nke a iji na-echeta m.” 26Nʼihi na mgbe ọbụla unu na-eri achịcha ahụ na-aṅụkwa iko a, unu na-ekwusa ọnwụ Onyenwe anyị ruo mgbe ọ ga-abịa ọzọ.
Oziọma
1Tupu oge Mmemme Ngabiga eruo, Jisọs amatala na oge ọ ga-ahapụ ụwa lakwuru Nna ya eruola. Ọ hụrụ ndị nke ya nọ nʼụwa nʼanya, hụkwa ha nʼanya ruo ọgwụgwụ. 2Mgbe a na-eri nri anyasị, ekwensu etinyelarị ya nʼime obi Judas Iskarịọt, nwa Saimọn ka ọ rara ya nye. 3Jisọs matara na Nna enyefeela ya ihe niile nʼaka. Ọ maara na ya si nʼebe Chineke nọ bịa, matakwa na ya ga-alaghachikwuru Chineke. 4Ya mere, o sitere nʼoche ọ nọkwasịrị bilie ọtọ, yipụ uwe nke elu ya, chiri akwa mmiri e ji ehicha ahụ kee nʼukwu ya. 5Ọ wụnyere mmiri nʼime efere ịsa aka, bido ịsa ndị na-eso ụzọ ya ụkwụ, jirikwa akwa mmiri ahụ o kere nʼukwu ya na-ehicha ụkwụ ha. 6Ọ bịakwutere Saimọn Pita, onye sịrị ya, “Onyenwe m, ị ga-asa m ụkwụ?” 7Ma Jisọs zara sị ya, “Ị ghọtaghị ihe m na-eme ugbu a, ma emesịa ị ga-aghọta ya.” 8Pita sịrị ya, “Ị gaghị asaa m ụkwụ ma ọlị.” Jisọs zara ya, “Ọ bụrụ na m asachaghị gị ụkwụ, mụ na gị enweghị oke ọbụla.” 9Saimọn Pita sịrị ya, “Onyenwe m, ọ bụghị naanị ụkwụ m ka ị ga-asa, kama saakwa aka m na isi m.” 10Jisọs sịrị ya, “Onye ọbụla sara ahụ agaghị asakwa ya ọzọ, ọ bụ naanị ịsa ụkwụ ya dịrị ya nʼihi na ahụ ya niile dị ọcha. Unu dị ọcha, kama ọ bụghị unu niile.” 11Nʼihi na ọ maararị onye ahụ ga-arara ya nye. Ya mere o ji sị, “Ọ bụghị unu niile dị ọcha.” 12Mgbe ọ sachasịrị ha ụkwụ, o yiiri uwe ya, nọdụkwa ala ọzọ, ọ sịrị ha, “Unu ghọtara ihe m meere unu? 13Unu na-akpọ m Onyenwe unu na Nna unu ukwu, unu mere nke ọma nʼihi na nke a ka m bụ. 14Ebe ọ bụ na mụ onwe m, bụ Nna unu ukwu na Onyenwe unu sachara unu ụkwụ, unu kwesikwara ịsachakwa ụkwụ ibe unu. 15Nke a bụ ihe nṅomi m nyere unu, meenụ dị ka mụ onwe m mere unu.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike