Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 28 Febrụwarị

Kalenda Ọtọdọks · 15 Febụwarị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 28 Febrụwarị 2027

Sọnde · Olu 6

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke Nwa nwoke mefuru ihe

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Oziọma ofufe ụtụtụ nke 6

Luk 24:36–53

36Mgbe ha ka na-ekwu banyere nke a, ya onwe ya guzooro nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.” 37Oke egwu tụrụ ha, obi lọkwara ha mmiri nʼihi na ha chere na ha ahụla mmụọ. 38Ma ọ sịrị ha, “Gịnị mere ụjọ ji atụ unu, gịnị mere unu ji nwee obi abụọ? 39Leenụ m anya nʼaka na nʼụkwụ. Ọ bụ mụ onwe m! Metụnụ m aka ka unu hụrụ, nʼihi na mmụọ adịghị enwe anụ ahụ na ọkpụkpụ dị ka unu hụrụ m nwere.” 40Mgbe o kwuchara nke a, o gosiri ha aka ya na ụkwụ ya. 41Ma dị ka o siiri ha ike ikwere nʼihi ọṅụ na oke mgbagwoju anya, ọ sịrị ha, “Ọ dị ihe oriri unu nwere ebe a?” 42Ha nyere ya otu ntakịrị azụ a mịkpọrọ amịkpọ. 43Ma ọ naara ya rie ya nʼihu ha. 44Mgbe ahụ, ọ sịrị ha, “Okwu ndị a ka m gwara unu mgbe mụ na unu nọ, na ihe niile e dere nʼiwu Mosis na ndị Amụma na nʼAbụ Ọma banyere m ga-emezucha.” 45Mgbe ahụ, o meghere akọnuche ha ka ha ghọta akwụkwọ nsọ. 46Ọ sịrị ha, “Nke a bụ ihe e dere na, Kraịst ahụ ga-ahụ ahụhụ ma sitekwa nʼọnwụ bilie nʼụbọchị nke atọ. 47Na a ga-ekwusa nchegharị na mgbaghara mmehie site nʼaha ya nye mba niile, malite na Jerusalem. 48Unu bụ ndị akaebe nke ihe ndị a. 49Ma lee, agaje m izitere unu ihe ahụ Nna m kwere na nkwa. Ya mere, nọrọnụ nʼime obodo ruo mgbe a ga-eyikwasị unu ike nke si nʼelu.” 50O duuru ha garuo na Betani, chilie aka ya abụọ elu gọzie ha. 51Dị ka ọ na-agọzi ha, ọ sitere nʼebe ha nọ pụọ, e weliri ya elu, baa nʼeluigwe. 52Mgbe ahụ, ha fere ya ofufe jiri oke ọṅụ laghachi na Jerusalem. 53Ha nọgidere nʼụlọnsọ ukwu ahụ na-eto Chineke oge niile.

Akwụkwọ ozi

1Kọ 6:12–20

12Ị na-asị, “Enwere m ike ime ihe niile m maara na m kwesiri ime,” ma ọ bụghị ihe niile ga-abara m uru. “Enwere m ike ime ihe niile m maara ziri ezi,” ma a gaghị ekwe ka ihe ọbụla na-achị m. 13Unu na-asị, “E mere ihe oriri maka afọ, meekwa afọ maka ihe oriri, ma Chineke ga-emebi ma afọ ma ihe oriri.” Ekeghị ahụ anyị maka ịkwa iko, kama o mere ya maka Onyenwe anyị, Onyenwe anyị dịkwa maka ahụ anyị. 14Chineke mere ka Onyenwe anyị site nʼọnwụ bilie, ọ ga-ejikwa ike ya mee ka anyị si nʼọnwụ bilie. 15Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ akụkụ ahụ Kraịst? Ọ dị mma na m ga-eji ahụ Kraịst mee ka e jikọtaa ya na ahụ nwanyị akwụna? Tụfiaa! 16Ọ bụ na unu amataghị na onye ya na nwanyị akwụna na-enwe mmekọrịta, ya na nwanyị ahụ bụ otu ahụ? Nʼihi na e kwuru, “Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.” 17Ma onye ọbụla e jikọtara ya na Onyenwe anyị, ya na onye ahụ ga-abụ otu nʼime mmụọ. 18Gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. Ọ dịghị mmehie ọzọ na-emetụta anụ ahụ mmadụ dịka mmehie ịkwa iko. Ọ bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya. 19Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọnsọ nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, onye bi nʼime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke. 20E jiri oke ọnụahịa zọpụta unu. Ya mere jirinụ anụ ahụ unu nye Chineke otuto.

Oziọma

Luk 15:11–32

11O kwukwaara sị, “Otu nwoke mụtara ụmụ nwoke abụọ. 12Nwa ya nke nta sịrị nna ya, ‘Nna, kenye m oke ruuru m nʼihe niile i nwere.’ Ya mere, o kenyere ya oke nke ya site nʼihe o nwere. 13“Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, nwokorobịa ahụ kwakọtara ihe niile o nwere gaa biri nʼotu obodo dị anya. Nʼebe ahụ, o mefuchara ihe niile o nwere nʼibi ndụ ọjọọ. 14Mgbe o mefuchara ihe niile o nwere, oke ụnwụ dara nʼala ahụ. Ọ malitere ịnọ nʼụkọ. 15Nʼihi nke a, ọ gara binyere otu onye obodo ahụ nyere ya ọrụ ilekọta ezi ya na inye ha nri. 16Ma ọ na-agụ ya ka o site na nri ọ na-enye ezi rijuo afọ, ma ọ dịghị onye nyere ya ụdị nri ahụ. 17“Mgbe ọ ghọtara onwe ya, ọ sịrị, ‘Mmadụ ole bụ ndị ọrụ e goro ego nna m nwere, ndị nri na-ezuru ma mapụtakwa, ma agụụ na-egbu m nʼebe a. 18Aga m ebili lakwuru nna m, sị ya, Nna, emehiela m megide eluigwe na gị onwe gị. 19Ekwesikwaghị m ka a kpọọ m nwa gị ọzọ, were m dị ka otu nʼime ndị i goro ọrụ.’ 20Ya mere, o biliri laghachikwuru nna ya. “Ma mgbe ọ nọrịị nʼebe dị anya, nna ya hụrụ ya, nwee ọmịiko nʼahụ ya, gbaara ọsọ ga makụọ ya, sutukwa ya ọnụ. 21“Nwa ya nwoke ahụ sịrị ya, ‘Nna, emehiela m megide eluigwe na gị onwe gị. Ekwesighị m ka a kpọọ m nwa gị ọzọ.’ 22“Ma nna ya gwara ndị ohu ya sị, ‘Meenụ ngwangwa weta uwe kachasị mma yikwasị ya. Gbanye ya ọlaaka nʼaka, yinyekwanụ ya akpụkpọụkwụ nʼụkwụ. 23Gaanụ kpụpụta nwa ehi gbara abụba, gbuo ya, ka anyị rie ma ṅụrịakwa. 24Nʼihi na nwa m a, nwụrụ anwụ ma ọ dịla ndụ ọzọ. O fukwara efu ma a chọtala ya.’ Ha bidoro na-eri, na-aṅụ na-aṅụrịkwa ọṅụ. 25“Ọ dịghị anya, nwa ya nke okenye, onye jere ịrụ ọrụ nʼubi, mgbe ọ na-abịaru ụlọ nso, ọ nụrụ ụda egwu na ịgba egwu. 26Ọ kpọrọ otu nʼime ndị ohu jụọ ya ihe na-eme. 27Ọ sịrị ya, ‘Nwanne gị nwoke alọtala. Nna gị egbuola nwa ehi gbara abụba nʼihi na ọ lọtara nʼudo na ahụ ike.’ 28“Iwe were ya, ọ jụrụ ịbata nʼime ụlọ. Nna ya pụtara nʼezi rịọ ya arịrịọ. 29Ma ọ zara nna ya sị, ‘Lee ọtụtụ afọ niile ndị a ka m nọọ na-ejere gị ozi, enupukwaghị m isi nʼiwu gị nʼụzọ ọbụla. Ma o nweghị oge i nyere m ọ bụladị nwa ewu sị mụ na ndị enyi m jiri ya mee oriri. 30Ma ugbu a, nwa gị a, onye ya na ndị akwụna mefuru akụ gị alọtala, ya ka i gburu nwa ehi gbara abụba.’ 31“Ma ọ sịrị ya, ‘Nwa m, mụ na gị nọ mgbe niile, ihe niile m nwere bụkwa nke gị. 32Ma anyị kwesiri ịṅụrị ọṅụ, kpọọkwa oriri, nʼihi na nwanne gị nwoke a nwụrụ anwụ ma ọ dịla ndụ ọzọ. O fukwara efu ma a chọtala ya. ’ ”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 15 Febrụwarị na kalenda nzukọ bụ 28 Febrụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike