Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 1 Maachị
Kalenda Ọtọdọks · 16 Febụwarị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 1 Maachị 2027
Mọnde · Izu ịhapụ anụ · Olu 6
Mmemme na ndị nsọ
Mọnde nke Izu ịhapụ anụ
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
18Ụmụ m, nke a bụ oge awa nke ikpeazụ. Dịka unu nụrụ na otu onye na-emegide Kraịst na-abịa, ọ bụladị ugbu a, ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst abịala. Otu a ka anyị si amata na ọ bụ oge awa nke ikpeazụ. 19Ha si nʼetiti anyị pụọ, ma ha abụghị ndị nke anyị nʼezie. Nʼihi na a sị na anyị na ha bụ otu, ha gaara aga nʼihu soro anyị nọdụ. Ma ọpụpụ ha pụrụ na-egosi na ọ dịghị onye nʼime ha sonyere anyị. 20Ma unu nwere otite mmanụ sitere nʼOnye Nsọ ahụ, unu niile matakwara ihe niile. 21Ya mere, anaghị m edegara unu akwụkwọ a dịka ndị na-amaghị eziokwu kama nʼihi na unu maara ya na nʼihi na ọ dịghị okwu ụgha ọbụla na-esi nʼeziokwu ahụ apụta. 22Onye bụ onye okwu ụgha? Ọ bụ onye ahụ na-asị na Jisọs abụghị Kraịst ahụ. Onye dị otu a bụ onye na-emegide Kraịst, nʼihi na ọ nabataghị Nna ahụ na Ọkpara ya. 23Onye ọbụla jụrụ Ọkpara ahụ enwekwaghị Nna ahụ; ma onye ọbụla nabatara Ọkpara ahụ nwekwara Nna ahụ. 24Hụnụ na ihe unu nụrụ site na mmalite na-anọgide nʼime unu. Ọ bụrụ na ihe unu nụrụ na mbido ebiri nʼime unu, unu ga-anọgide nʼime Ọkpara ahụ na nʼime Nna ahụ. 25Ihe o kwere anyị na nkwa bụ nke a, ndụ ebighị ebi. 26Ana m edere unu ihe ndị a banyere ndị ahụ na-agbalị iduhie unu. 27Ma unu onwe unu, otite mmanụ ahụ unu natara nʼaka ya na-anọgide nʼime unu, nʼihi nke a, onye ozizi ọzọ adịghị unu mkpa. Dịka otite mmanụ ya na-ezi unu ihe banyere ihe niile, bụrụkwa eziokwu, ọ bụghị okwu ụgha. Ya mere, dịka o zikwara unu, na-anọgidenụ nʼime ya. 28Ugbu a ụmụntakịrị m, nọgidesienụ ike nʼime ya, ka ọ ga-abụ mgbe e mere ka ọ pụta ìhè, anyị ga-abụ ndị obi siri ike, ndị ihere na-agaghị eme, nʼihu ya mgbe ọ bịara. 29Ọ bụrụ na unu matara na ọ bụ onye ezi omume, unu maara na onye ọbụla nke na-eme ihe ziri ezi bụ onye a mụrụ site na ya. 3:1Lee ụdị oke ịhụnanya nke Nna ahụ nwere nʼebe anyị nọ, na-aga akpọ anyị ụmụ Chineke. Nʼezie, nke a bụ ihe anyị bụ. Ihe mere na ụwa amaghị anyị bụ nʼihi na ọ maghị ya. 2Ndị hụrụ nʼanya, ugbu a anyị abụrụla ụmụ Chineke. Ọ bụ ezie na anyị enweghị ike ịghọta ihe ọnọdụ anyị ga-abụ nʼoge dị nʼihu, ma anyị maara nke ọma na mgbe a ga-eme ka ọ pụta ìhè, a ga-emekwa ka anyị bụrụ ndị yiri ya, nʼihi na anyị ga-ahụ ya dịka ọ dị. 3Onye ọbụla nwere olileanya dị otu a kwesiri idebe onwe ya ọcha, dị ka ya onwe ya dị ọcha. 4Onye ọbụla na-eme mmehie na-emebi iwu. Nʼezie mmehie bụ mmebi iwu. 5Unu maara na e mere ka ọ pụta ìhè iwepụ mmehie. Ọ dịkwaghị mmehie ọbụla dị nʼime ya. 6Onye ọbụla na-anọgide nʼime ya adịghị ebi ndụ ime mmehie, onye ọbụla nke na-ebi ndụ mmehie ahụbeghị ya anya mgbe ọbụla, ọ matabekwaghị ya. 7Ezigbo ụmụ m, unu ekwela ka onye ọbụla duhie unu, onye ọbụla na-eme ezi ihe bụ onye ezi omume dị ka ya onwe ya bụ onye ezi omume. 8Onye ọbụla na-eme mmehie bụ nwa ekwensu, nʼihi na ekwensu bụ onye mmehie site na mmalite. Ihe mere Ọkpara Chineke jiri pụta ìhè bụ ka ọ laa ọrụ niile nke ekwensu nʼiyi. 9Onye a mụrụ site na Chineke adịghị anọgide na-eme mmehie, nʼihi na mkpụrụ Chineke na-anọgide nʼime ya, ha enweghị ike ịnọgide na-eme mmehie, nʼihi na a mụrụ ha site na Chineke. 10Otu a ka anyị si amata ndị bụ ụmụ Chineke, na ndị bụ ụmụ ekwensu: Onye ọbụla na-adịghị eme ihe ziri ezi abụghị nwa Chineke, otu a ka ọ dịkwa onye na-adịghị ahụ ụmụnna ha nʼanya.
Oziọma
1Mgbe ha na-abịaru Jerusalem nso, ha rutere Betfeji na Betani nʼUgwu Oliv. Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya. 2Ọ gwara ha sị, “Gaanụ nʼime obodo nta dị nʼihu unu. Mgbe unu na-abanye nʼime ya, unu ga-ahụ nwa ịnyịnya e kedoro nʼebe ahụ nke onye ọbụla na-arịkwasịbeghị nʼelu ya. Tọpụnụ ya nʼagbụ, kpụtaranụ m ya. 3Ọ bụrụ na onye ọbụla asị unu, ‘Gịnị mere unu ji na-atọpụ ya nʼagbụ?’ sịnụ onye ahụ, ‘Ọ dị Onyenwe anyị mkpa, ọ ga-akpụghachitekwa ya ngwangwa.’ ” 4Ha ruru ma hụ otu nwa ịnyịnya e kedoro nʼakụkụ ụzọ, nʼihu otu ụlọ nke dị nʼama. Dị ka ha na-atọpụ ya, 5ụfọdụ mmadụ guzo nʼebe ahụ sịrị ha, “Gịnị ka unu na-eme, unu na-atọpụ nwa ịnyịnya a?” 6Ha gwara ha ihe Jisọs kwuru, ha hapụkwara ha ka ha tọrọ ịnyịnya ibu ahụ. 7Ha kpụtaara Jisọs nwa ịnyịnya ahụ, ma wụkwasịkwa uwe ha nʼelu ya, ọ nọkwasịrị nʼelu ya. 8Ọtụtụ mmadụ tụsara uwe ha nʼokporoụzọ, ma ndị ọzọ tụsara alaka osisi ha gbutere nʼọhịa. 9Ndị na-aga nʼihu na ndị na-esokwa nʼazụ, tiri mkpu na-asị, “Hozanna!” “Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!” 10“Ngọzị dịrị alaeze ahụ na-abịa nke nna anyị Devid!” “Hozanna nʼebe kachasị ihe niile elu!” 11Mgbe ọ batara na Jerusalem, ọ gara nʼime nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Mgbe o legharịchara anya nʼihe niile dị nʼebe ahụ, ma ebe ọ bụ na chi ejiela, ya na ndị na-eso ụzọ ya pụrụ gaa Betani.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 16 Febrụwarị na kalenda nzukọ bụ 1 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike