Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 27 Febrụwarị
Kalenda Ọtọdọks · 14 Febụwarị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 27 Febrụwarị 2027
Satọdee · Izu nke Onye ọna ụtụ na Onye Farisii · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Venerable Auxentius of Bithynia († 470)
Izu na-enweghị obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
1Ma mara nke a, na nʼoge dị oke egwu ga-adị mgbe ikpeazụ. 2Nʼihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ naanị onwe ha nʼanya, na ndị na-ahụ ego nʼanya. Ha ga-abụ ndị mpako, na ndị na-anya isi, ndị na-ekwujọ ibe ha, ndị na-adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha, maọbụ ikele ha ekele, na ndị na-adịghị ọcha nʼobi ha. 3Ndị na-enweghị ịhụnanya nʼobi ha, ndị na-enweghị obi mgbaghara, ndị na-agba asịrị, ndị na-emebiga ihe ọjọọ oke, ndị na-eme dị ka anụ ọhịa, na ndị ihe ọma na-adịghị atọ ụtọ. 4Ndị na-arara ibe ha nye nʼaka ndị iro ha, ndị isiike, ndị onwe ha juru afọ; ndị na-ahụ ihe ụtọ nke ụwa a nʼanya, kama ịhụ Chineke nʼanya. 5Ha bụ ndị na-ebi ndụ ndị nke Chineke ma ha adịghị egosipụta ike dị na ndụ ahụ. Zere onwe gị nʼebe ndị dị otu a nọ. 6Ụfọdụ nʼime ha bụ ndị na-abanye nʼime ụlọ ndị mmadụ na-eduhiekwa ụmụ nwanyị na-enweghị uche, ndị ibu mmehie ha na-anyịgbu, na ndị a pụrụ iduhie nʼihi ọtụtụ ihe ọjọọ na-agụ mkpụrụobi ha agụụ. 7Ndị a na-akụziri ihe oge niile, ma ha apụghị inweta amamihe nke eziokwu. 8Dị ka Jenas na Jembaras si lụso Mosis ọgụ, otu a ka ndị a na-alụsokwa eziokwu ahụ ọgụ. Ha bụ ndị nwere obi rụrụ arụ, na ndị ndụ ha mere ka ha bụrụ ndị a jụrụ ajụ nʼebe okwukwe anyị dị. 9Ma ha agaghị aga nʼihu nʼihi na nzuzu ha ga-apụta ihe nʼihu mmadụ niile, dịka nke mmadụ abụọ ahụ.
Oziọma
45Mgbe ndị mmadụ na-ege ntị, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, 46“Kpacharanụ anya nʼebe ndị ozizi iwu nọ. Ndị iyi uwe mwụda na-ejegharị ebe niile na-amasị, ndị hụrụ ekele pụrụ iche bụ nke a na-ekele ha nʼọma ahịa nʼanya. Ndị ọ na-amasịkwa ịnọkwasị nʼoche kachasị elu nʼụlọ ekpere nakwa nʼoche pụrụ iche na mmemme oriri ọbụla. 47Ha na-eripịa ihe niile dị nʼụlọ ndị inyom ndị di ha nwụrụ anwụ, nʼekpe ogologo ekpere ka a hụta ha. Ndị dị otu a ka a ga-ata ahụhụ dị ukwuu.” 21:1Ọ leliri anya elu hụ ka ndị ọgaranya si etinye onyinye ha nʼime igbe onyinye. 2Ọ hụkwara otu nwanyị di ya nwụrụ anwụ ka ọ bịara tinye naanị mkpụrụ ego kọpa abụọ. 3Ọ sịrị, “Nʼezie, agwa m unu, nwanyị ogbenye a di ya nwụrụ etinyela ego karịa ndị ọzọ niile. 4Nʼihi na ndị ọzọ niile nyere onyinye ha site nʼego mapụtaara ha nʼakụnụba ha, ma ya onwe ya sitere nʼogbenye ya tinye ihe niile o ji biri.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 14 Febrụwarị na kalenda nzukọ bụ 27 Febrụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike