Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 28 Febrụwarị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 28 Febrụwarị 2027
Sọnde · Izu nke 3 nke Lent
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 3 nke Lent
Sọnde · Agba ofufe: odo odo
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Chineke kwuru okwu ndị a niile sị: 2“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼIjipt, bụ ala nke ibu ohu. 3“Ị gaghị enwe chi ọzọ tinyere m. 4Gị emerela onwe gị arụsị a pịrị apị, nʼoyiyi nke ụdị ọbụla nke yiri ihe dị nʼeluigwe maọbụ nke yiri ihe dị nʼụwa, nʼokpuru ya maọbụ nʼime mmiri, nʼokpuru ụwa. 5Gị akpọla isiala nye ha, efekwala ha ofufe, nʼihi na Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, abụ m Chineke ekworo. Onye na-ata ụmụ na ụmụ ụmụ ahụhụ, nʼihi ajọ omume nke ndị mụrụ ha, ọ bụladị ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ, nke ndị ahụ kpọrọ m asị. 6Ma na egosi ịhụnanya nye puku ọgbọ niile nke ndị hụrụ m nʼanya, bụ ndị na-edebe ihe niile m nyere nʼiwu. 7Gị ejikwala aha Onyenwe anyị bụ Chineke gị eme ihe efu, nʼihi na Onyenwe anyị agaghị agụ onye ji aha ya eme ihe efu dịka onye ikpe na-amaghị. 8Cheta ụbọchị izuike site nʼido ya nsọ. 9Nʼime ụbọchị isii ka ị ga-eje ozi gị niile. Ọ bụkwa nʼime ha ka ị ga-arụzu ọrụ gị niile. 10Ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izuike nke Onyenwe anyị Chineke gị. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, gị onwe gị, nwa gị nwoke na nwa gị nwanyị, onye ọrụ gị nwoke, onye ọrụ gị nwanyị, maọbụ anụ ụlọ gị ọbụla, ọbụladị onye ọbịa bi nʼobodo gị. 11Nʼihi na ọ bụ nʼime ụbọchị isii ka Onyenwe anyị kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri, na ihe niile dị nʼime ha. O zuru ike nʼụbọchị nke asaa. Nʼihi nke a Onyenwe anyị gọziri ụbọchị nke asaa doo ya nsọ, ka ọ bụrụ ụbọchị izuike. 12Sọpụrụ nne gị na nna gị, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu, ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo nʼala ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị. 13Gị egbula mmadụ. 14Gị akwala iko. 15Gị ezula ohi. 16Agbala ama ụgha megide onye agbataobi gị. 17Gị enwela anya ukwu nʼebe ụlọ onye agbataobi gị dị. Gị enwekwala anya ukwu nʼebe nwunye onye agbataobi gị dị, maọbụ ohu ya nwoke maọbụ ohu ya nwanyị, ehi ya maọbụ ịnyịnya ibu ya, ma ọ bụkwanụ nʼihe ọbụla nke onye agbataobi gị nwere dị.”
Abụ Ọma nzaghachi
7Iwu Onyenwe anyị zuruoke; ọ na-eweghachi mkpụrụobi. Ụkpụrụ Onyenwe anyị niile kwesiri ntụkwasị obi; ọ na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe. 8Iwu Onyenwe anyị ziri ezi, ọ na-enye mkpụrụobi ọṅụ. Iwu Onyenwe anyị na-amụke amụke, ọ na-enye anya ìhè. 9Ịtụ egwu Onyenwe anyị dị ọcha, ọ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị na-eguzosi ike, ha niile bụkwa ihe ziri ezi. 10Ha dị oke ọnụ karịa ọlaedo, karịa ọlaedo a nụchara anụcha; ha na-atọkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ, karịa mmanụ aṅụ si nʼụbụbọ aṅụ.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
22Ndị Juu chọrọ ịhụ ihe ịrịbama, ndị Griik na-achọkwa amamihe. 23Ma anyị onwe anyị na-ekwusa Kraịst, onye a kpọgburu nʼobe, onye bụ ihe mgbochi nʼebe ndị Juu nọ, ma na ntị ndị mba ọzọ, ọ dị ka okwu nzuzu. 24Ma nye ndị niile a kpọrọ, ma ndị Juu ma ndị Griik, Kraịst bụ ike nke Chineke bụrụkwa amamihe nke Chineke. 25Nʼihi na nzuzu Chineke dị mma karịa amamihe niile nke mmadụ, adịghị ike Chineke dịkwa ukwuu karịa ike niile nke mmadụ.
Oziọma
13Mgbe mmemme oriri Ngabiga nke ndị Juu na-abịaru nso, Jisọs gara Jerusalem. 14Nʼime ụlọnsọ ukwu, ọ hụrụ ndị na-ere ehi, na atụrụ na nduru. Hụkwa ndị nọdụrụ na tebul na-agbanwe ego. 15Ya mere, o jiri eriri mere ụtarị chụpụsịa ndị niile nọ na-ere ahịa nʼụlọnsọ ukwu ahụ, tinyekwara ehi na atụrụ ha. Ọ kwafusịrị mkpụrụ ego ndị ahụ na-agbanwe ego, kpugharịakwa tebul ha ihu. 16Ọ sịrị ndị ahụ na-ere nduru, “Wepụnụ ihe ndị a nʼebe a. Kwụsịnụ ime ụlọ Nna m ka ọ bụrụ ebe a na-azụ ahịa.” 17Ndị na-eso ụzọ ya chetara na e dere ya rịị nʼakwụkwọ nsọ, “Ihe banyere ụlọ gị na-anụ m ọkụ nʼobi.” 18Ma ndị Juu sịrị ya, “Olee ihe ịrịbama ị pụrụ igosi anyị na ikike i ji eme ihe ndị a.” 19Jisọs zara sị, “Kwatuonụ ụlọnsọ ukwu a, aga m ewughachikwa ya nʼabalị atọ.” 20Ndị Juu kwuru, “Ụlọnsọ ukwu a were anyị iri afọ anọ na isii ịrụ ya, ị ga-ewughachi ya nʼabalị atọ?” 21Ma ụlọnsọ o kwuru maka ya bụ ahụ ya. 22Ndị na-eso ụzọ ya chetara okwu ya a mgbe o siri nʼọnwụ bilie. Mgbe ahụkwa, ha kweere akwụkwọ nsọ ya na okwu niile Jisọs kwuru. 23Mgbe ọ nọ na Jerusalem nʼoge Mmemme Ngabiga, ọtụtụ mmadụ hụrụ ihe ịrịbama o mere kweere na ya. 24Ma Jisọs atụkwasịghị ha obi nʼihi na ọ matara mmadụ niile nke ọma. 25Ọ dịghị ya mkpa ka onye ọbụla gbaa akaebe banyere ụmụ mmadụ, nʼihi na ya onwe ya maara ihe dị nʼime mmadụ.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike