Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 15 Maachị

Kalenda Ọtọdọks · 2 Maachị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 15 Maachị 2027

Mọnde · Izu nke 1 nke Lent Ukwu · Olu 8

Mmemme na ndị nsọ

Mmalite Lent Ukwu

Oge Lent Ukwu

Izere nri kpamkpam

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Elekere nke 6

Aịz 1:1–20

1Ọhụ Aịzaya nwa Emọz, nke ọ hụrụ banyere Juda na Jerusalem nʼoge ọchịchị Ụzaya, Jotam, Ehaz na Hezekaya, bụ ndị eze Juda. 2Gee ntị, gị eluigwe, gee ntị, gị ụwa! Nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola okwu: “Azụrụ m ụmụntakịrị, zụlite ha, ma ha enupula isi megide m. 3Ehi maara onyenwe ya, ịnyịnya ibu makwaara ebe onyenwe ya na-anọ azụ ya nri, ma Izrel amaghị m, ndị m adịghị aghọtakwa.” 4Ahụhụ dịrị mba ndị mmehie, ndị ajọ omume riri ahụ, ụmụ ndị ajọ omume, ụmụ ndị nyefere onwe ha na mmerụ! Ha agbakụtala Onyenwe anyị azụ, ha elelịala Onye dị Nsọ nke Izrel, ha agbakụtala ya azụ ha. 5Gịnị mere a ga-eji nọgide na-eti unu ihe? Gịnị mere unu ji nọgide na nnupu isi? Lee ọnya juru unu isi, leekwa na ọrịa na-arịa obi unu. 6O nweghị akụkụ ahụ unu zuruoke, site nʼọbọ ụkwụ unu ruo nʼopi isi unu; ọnya, na ntihịa ahụ, na ọnya mmerụ ahụ, jupụtara unu nʼahụ; e kechikwaghị ha, e tekwaghị ha mmanụ. 7Ala unu tọgbọrọ nʼefu, agbaakwala obodo unu ọkụ. Ndị mbịarambịa ewerechaala ihe dị nʼubi unu nʼihu unu, ha emeela ka ọ tọgbọrọ nʼefu dịka mgbe onye ọbịa kpochapụrụ ihe dị nʼime ya. 8Ada Zayọn ka a hapụrụ dịka ụlọ nche dị nʼubi vaịnị, dịka ụlọ nta dị nʼubi kukumba, dịka obodo ndị iro gbara gburugburu. 9Ọ bụrụ na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile emeghị ka mmadụ ole na ole fọdụ ndụ nʼime anyị, anyị gara adị ka Sọdọm, anyị gaara adịkwa ka Gọmọra. 10Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị na-achị Sọdọm; geenụ ntị nʼozizi Chineke anyị, unu ndị Gọmọra. 11“Nʼihi gịnị ka unu ji na-achụrụ m ọtụtụ aja, gịnị ka ihe ndị a bụ nye m?” ka Onyenwe anyị sịrị. “Afọ ejula m nʼaja nsure ọkụ niile nke eji ebule na anụmanụ e mere ka ha gbaa abụba chụọ; Ọbara oke ehi na nke ụmụ atụrụ na mkpi adịghị atọkwa m ụtọ. 12Mgbe unu na-abịa ka ahụ unu nʼihu m, onye chọrọ nke a nʼaka unu? Kwụsịnụ ịzọtọ ogige m. 13Kwụsị iweta onyinye niile na-enweghị isi. Ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ unu bụrụ m ihe arụ. Mmemme ọnwa ọhụrụ, na nke ụbọchị izuike, na nzukọta unu niile, apụghị m ịnagide mkpọkọta unu nke na-abaghị uru. 14Mkpụrụobi m kpọrọ mmemme ọnwa ọhụrụ, na mmemme unu ndị ọzọ a kara aka asị. Ha bụụrụ m ibu arọ, ike agwụkwala m ibu ha. 15Mgbe unu na-agbasa aka unu nʼekpere, agaghị m aṅa unu ntị; ọ bụladị mgbe unu na-ekpe ọtụtụ ekpere, agaghị m aṅa ntị.” Nʼihi na aka unu jupụtara nʼọbara! 16Sachapụnụ onwe unu, dịkwanụ ọcha. Wezuganụ ajọ omume unu niile site nʼihu m; kwụsịnụ ime ihe na-adịghị mma. 17Mụtanụ otu e si eme ihe ziri ezi; chọọnụ ikpe ziri ezi, nyerenụ ndị a na-emegbu aka. Werenụ ọnọdụ nna nʼebe ndị na-enweghị nna nọ, ma kwuchitenụ ọnụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ. 18“Bịanụ ka anyị kparịtaa ụka,” bụ ihe Onyenwe anyị na-asị. “A sịkwarị na mmehie unu dị ka uwe uhie, ha ga-adị ọcha dịka akụmmiri igwe, a sịkwa na ha dị uhie uhie dịka ogho uhie, ha ga-adịkwa ka ajị anụ ọcha. 19Ọ bụrụ na unu ga-ekwenye, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi, aga m eme ka unu nwee ezi ihe nke unu ga-eri nʼala a. 20Ma ọ bụrụ na unu ajụ ma nupu isi, ọ bụ mma agha ka a ga-eji gbuchapụ unu.” Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwula ya.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jen 1:1–13

1Na mmalite Chineke kere eluigwe na ụwa. 2Ụwa bụ ihe na-enweghị ụdịdị ọbụla, bụrụkwa ihe tọgbọrọ nʼefu. Ọchịchịrị gbara nʼelu ogbu mmiri dị omimi. Mmụọ nke Chineke na-erugharị nʼelu ogbu mmiri ahụ. 3Mgbe ahụ Chineke kwuru sị, “Ka ìhè dị,” ìhè dịkwara. 4Chineke hụrụ na ìhè ahụ mara mma. Ọ kpara oke nʼetiti ìhè na ọchịchịrị. 5Chineke kpọrọ ìhè ahụ Ehihie, kpọọ ọchịchịrị ahụ Abalị. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke mbụ. 6Chineke kwukwara sị, “Ka mbara pụta nke ga-ekewapụ mmiri dị nʼelu mbara ahụ site na mmiri nke dị nʼokpuru mbara ahụ” 7Ya mere, Chineke mere mbara, kewapụ mmiri dị nʼokpuru mbara ahụ site na mmiri nke dị nʼelu mbara ahụ. O sikwa otu a dịrị. 8Mbara ahụ ka Chineke kpọrọ mbara eluigwe. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke abụọ. 9Chineke kwuru sị, “Ka mmiri dị nʼokpuru mbara eluigwe chịkọta onwe ha ọnụ nʼotu ebe, ka ala akọrọ pụta.” O sikwa otu a dịrị. 10Chineke kpọrọ ala akọrọ ahụ “ala,” kpọọ mmiri ahụ chịkọtara onwe ha ọnụ “osimiri.” Chineke lere anya hụ na ha dị mma. 11Chineke kwuru sị, “Ka ala pupụta ahịhịa ndụ dị iche iche: ahịhịa na-amịpụta mkpụrụ, na osisi dị nʼelu ala nke na-amịpụta mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ya, dịka ụdịdị ha dị iche iche si dị.” O sikwa otu a dịrị. 12Ala puputara ahịhịa ndụ dị iche iche: ahịhịa na-amịpụta mkpụrụ dịka ụdịdị ha si dị, na osisi na-amịpụta mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ya, dịka ụdịdị ha si dị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma. 13Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke atọ.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ilu 1:1–20

1Ndị a bụ ilu Solomọn nwa Devid, eze Izrel. 2Ọ bụ maka amamihe na ntụziaka, maka ịghọta okwu niile kwesiri ịghọta nke ọma, 3nʼihi inweta ntụziaka nʼinwe uche, ime ezi omume na ikpe ziri ezi nke aghụghọ na-adịghị. 4Nʼihi ime ka ndị na-enweghị uche nwee ezi uche, ka ndị na-eto eto nweta ihe ọmụma na izuzu ọma. 5Ka onye maara ihe gee ntị, tụkwasịkwa ihe nʼihe ọ maara, ka ndị nwere nghọta nwetakwa ezi ndụmọdụ. 6Ka ha ghọta ilu niile na okwu niile na-esi nʼọnụ ndị maara ihe. 7Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite ihe ọmụma. Ọ bụkwa naanị ndị nzuzu bụ ndị na-adịghị anabata amamihe na ịdọ aka na ntị. 8Nwa m, na-aṅa ntị na ntụziaka nke nna gị ahapụkwala ndụmọdụ nne gị. 9Nʼihi na okpu amara ka ha ga-abụrụ isi gị, bụrụkwa ihe ịnya nʼolu nye gị. 10Nwa m, ọ bụrụ na ndị mmehie ara gị ụra, ekwenyerela ha, Ekwela! 11Ọ bụrụ na ha asị gị, “Bịa soro anyị; ka anyị zoo onwe anyị, tigbuo onye ọbụla anyị hụrụ, bụ onye na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla. 12Ka anyị loo ha na ndụ, dịka ala ili, loo ha kpamkpam dịka ndị na-arịda nʼolulu. 13Anyị ga-enwetakwa ọtụtụ ihe dị oke ọnụahịa, nke anyị ga-akwaju nʼụlọ anyị. 14Soro anyị fee nza gị ka anyị nwaa ike anyị, ihe ọbụla kwa anyị nwetara, anyị na gị ga-ekekọta ya ọnụ.” 15Nwa m, ejela ije nʼụzọ ndị dị otu a, a zọọkwala ụkwụ nʼokporoụzọ ha; 16nʼihi na ụkwụ ha na-agba ọsọ ime ihe ọjọọ, na-emekwa ngwangwa iwufu ọbara. 17Ọ bụ ihe abaghị uru ịgbasa ụgbụ, nʼebe nnụnụ ọbụla na-ahụ ya anya. 18Ma ndị a na-esi ọnya nke na-ama ha. Ha onwe ha ka ọnya ahụ ga-ejide. 19Otu a ka ọ na-adịkwara ndị ọ na-agụsị agụụ ike inweta akụnụba nʼụzọ na-ezighị ezi. Nʼihi na ịgbaso ụzọ dị otu a na-ewetara ndị na-eso ya ọnwụ. 20Amamihe na-eti mkpu nʼezi ka mmadụ nụ. Olu ya na-ada ụda nʼama.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 2 Maachị na kalenda nzukọ bụ 15 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike