Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 10 Febrụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 10 Febrụwarị 2027

Wenezdee · Lent: ụbọchị ndị na-eso Wenezdee Ntụ

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee Ntụ

Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo

Obubu ọnụ na nchegharị

Obubu ọnụ na izere anụ

Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Jul 2:12–18

12“Ọ bụladị ugbu a,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “Jirinụ obi unu niile lọghachikwute m. Werekwanụ obubu ọnụ, na ịkwa akwa, na iru ụjụ, lọghachikwutenụ m.” 13Dọwakwaanụ obi unu, ọ bụghị uwe unu. Lọghachikwutenụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼihi na ọ bụ onye na-eme amara, na onye obi ebere. Ọ bụ onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ. O jupụtara nʼịhụnanya. Ọ naghị eme ọsịịsọ nʼinye ntaramahụhụ. 14Onye maara? Ma eleghị anya ọ ga-alọghachite azụ tụgharịa obi ya, hapụrụ anyị ngọzị ya, kwe ka eweta onyinye mkpụrụ ubi na onyinye ihe ọṅụṅụ maka Onyenwe anyị bụ, Chineke unu. 15Fụọ opi ike nʼime Zayọn. Kpọsaa obubu ọnụ dị nsọ. Kpọkọta nzukọ dị nsọ. 16Chịkọtaa onye ọbụla, doo nzukọ ahụ nsọ, ma ndị okenye, ma ụmụntakịrị, ma ụmụ na-aṅụ ara. Kpọpụta nwoke lụrụ nwunye ọhụrụ site nʼụlọ ya, ya na nwaagbọghọ lụrụ dị ọhụrụ site nʼebe nzuzo ya. 17Ka ndị nchụaja, bụ ndị na-ejere Onyenwe anyị ozi, nọọ nʼetiti ebe ịchụ aja, na mpụta ọnụ ụlọ kwaa akwa. Ha kpeekwa ekpere sị, “Zọpụta ndị gị, Onyenwe anyị. Ekwela ka ihe nketa gị bụrụ ihe ịta ụta, nʼetiti mba dị iche iche. Ekwela ka ha sị, ‘Olee ebe Chineke ha nọ?’ ” 18Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kworo ekworo nʼihi ala ya, nwee ọmịiko nʼebe ndị ya nọ.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 51:1–4, 10–12, 15

1Abụ dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Mgbe Netan bụ onye amụma bịakwutere Devid nʼoge ya na Batsheba kwara iko. O Chineke, meere m ebere, nʼihi ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide; nʼihi oke ọmịiko gị, hichapụ njehie m niile. 2Sachapụ mmehie m niile, ma mee m ka m dị ọcha. 3Nʼihi na amaara m njehie m niile, mmehie m dịkwa nʼihu m mgbe niile. 4Ọ bụkwa naanị gị ka m mehiere megide, mee ihe ahụ bụ ihe ọjọọ nʼihu gị, nke mere na ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe ị na-ekwu okwu, na onye ezi omume mgbe ị na-ekpe ikpe. 10Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke, nwogharịa ezi mmụọ nʼime m. 11Achụpụla m nʼihu gị, anapụkwala m Mmụọ Nsọ gị. 12Nyeghachikwa m ọṅụ nke nzọpụta gị, ma jiri ezi mmụọ kwagide m. 15O, Onyenwe m, meghee ọnụ m, ka m kwupụta otuto gị.

Ihe ọgụgụ nke abụọ

2Kọ 5:20–6:2

20Ya mere, anyị bụ ndị na-anọchi anya Kraịst ijere ya ozi nʼụwa. Chineke ji anyị na-agwa unu okwu. Anyị na-arịọ unu dịka ọ bụ Kraịst nʼonwe ya na-arịọ unu. Biko, bịanụ ka unu na Chineke dịrị nʼudo. 21Nʼihi na o mere ka onye ahụ na-amaghị mmehie bụrụ mmehie nʼọnọdụ anyị, ka esi otu a mee ka anyị nwee oke nʼime ezi omume Chineke site na ya. 6:1Dịka ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ nʼotu, anyị na-arịọ arịrịọ sị unu ahapụla ịnara amara a Chineke na-enye unu nʼefu. 2Nʼihi na ọ na-ekwu, “Nʼoge m na-anara mmadụ nke ọma anụrụ m olu unu. Ọ bụkwa ụbọchị nzọpụta ka m nyeere unu aka.” Lee, ugbu a bụ oge a na-anabata mmadụ nke ọma, ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta.

Oziọma

Mat 6:1–6, 16–18

1“Kpacharanụ anya ka unu ghara ime ezi omume unu naanị ka ndị mmadụ hụ unu. Nʼihi na unu mee nke a, unu agaghị enweta ụgwọ ọrụ ọbụla site nʼaka Nna unu bi nʼeluigwe. 2“Unu afụla opi mgbe unu na-enye ndị nọ na mkpa onyinye, nʼihi na otu a ka ndị ihu abụọ na-eme nʼụlọ nzukọ na nʼokporoụzọ, ka ndị mmadụ too ha. Nʼezie, ana m agwa unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha nʼizuoke. 3Mgbe unu chọrọ ịrụ ọrụ ebere, meenụ ya na nzuzo. Ekwela ka aka ekpe gị mata ihe aka nri gị na-achọ ime. 4Ka onyinye gị bụrụ na nzuzo. Mgbe ahụ, Nna gị, onye na-ahụ ihe dị na nzuzo ga-akwụghachi gị. 5“Mgbe ọbụla unu chọrọ ikpe ekpere, unu emela dị ka ndị ihu abụọ, nʼihi na ha hụrụ iguzo nʼime ụlọ ekpere, nakwa nʼakụkụ ụzọ nʼanya na-ekpe ekpere, ebe ndị mmadụ ga-ahụ ha. Nʼezie, agwa m unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha nʼebe o zuruoke. 6Kama, mgbe unu chọrọ ikpe ekpere, baanụ nʼime ime ụlọ unu. Mechiekwanụ ụzọ unu, kpọkuonụ Nna unu nʼekpere na nzuzo. Mgbe ahụ Nna unu, onye na-ahụ ihe e mere na nzuzo, ga-enye unu ụgwọ ọrụ unu. 16“Ọzọ, mgbe ọbụla unu na-ebu ọnụ, unu agbarụla ihu unu dịka ndị ihu abụọ na-eme. Nʼihi na ha na-agbarụ ihu ha ka ndị ọzọ hụ na ha na-ebu ọnụ. Nʼezie agwa m unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha. 17Mgbe ị na-ebu ọnụ, tee isi gị mmanụ, ma saakwa ihu gị mmiri, 18ka ndị ọzọ ghara ịhụta na ị na-ebu ọnụ kama ka ọ bụrụ naanị nye Nna gị, onye anya na-adịghị ahụ. Nna gị, onye na-ahụ ihe niile na-eme na nzuzo, ga-akwụ gị ụgwọ.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike