Bible Explorer Nweta ngwa

Nyochaa › Ụzọ njem › Njem Samsịn

Ụzọ njem

Njem Samsịn

Timna, Ashkelọn, Gaza na ndagwurugwu Sorek · Ebe nkwụsị 9 · ≈ 300 km nʼahịrị kwụ ọtọ

JUDỊAFILISTIAZoraTimnaAshkelọnLehiGazaHebrọn20 km12345678

© OpenStreetMap contributors

Ebe nkwụsị

  1. ZoraNkp 13:2Nʼoge ahụ, o nwere otu nwoke onye Zora aha ya bụ Manoa. Nwoke a si nʼagbụrụ Dan, nwunye ya bụ nwanyị aga nke mere na ọ mụtaghị nwa.
  2. TimnaNkp 14:1Samsin gbadara nʼobodo Timna ebe ọ hụrụ otu nwaagbọghọ onye Filistia.
  3. AshkelọnNkp 14:19Otu mgbe ahụ kwa, Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị ya. O sitere nʼebe ahụ pụọ, gaa nʼobodo Ashkelọn. Nʼebe ahụ ka ọ nọ tigbuo iri mmadụ atọ, napụ ha uwe ha niile, chịrị ha chịnye ndị ahụ kọwaara ya ilu ahụ. Ma site nʼoke iwe, o laghachiri nʼụlọ nna ya.
  4. EtamNkp 15:8Ya mere, ọ pụkwuru ha ọzọ, site nʼoke iwe, gbuo ọtụtụ mmadụ nʼime ha. Mgbe nke a gasịrị, ọ gara biri nʼime otu ọgba nkume nke Etam.
  5. LehiNkp 15:9Ndị Filistia gara maa ụlọ ikwu ha nʼala Juda, gbasaa nʼala ahụ ruo obodo Lehi.
  6. GazaNkp 16:1Otu ụbọchị, Samsin gara nʼotu obodo ndị Filistia a na-akpọ Gaza, soro otu nwanyị akwụna bi nʼebe ahụ hie ụra abalị.
  7. HebrọnNkp 16:3Ma Samsin dinara nʼụlọ nwanyị akwụna ahụ ruo nʼetiti abalị ahụ. Mgbe ọ pụtara, ọ gara ruo nʼọnụ ụzọ obodo ahụ, foro ibo ọnụ ụzọ obodo ahụ, ya na ibo ya abụọ, bukwasị ya nʼubu ya, buru ha gaa nʼelu ugwu chere obodo Hebrọn ihu.
  8. Ndagwurugwu SorekNkp 16:4Ọ dịghị anya, Samsin hụrụ otu nwaagbọghọ, onye ọ hụrụ nʼanya. Aha nwaagbọghọ a bụ Delaịla, onye si nʼobodo dị na Ndagwurugwu Sorek.
  9. GazaNkp 16:21Ndị Filistia jidere ya, ghụpụ ya anya ya abụọ, duru ya gbadata Gaza. Nʼebe ahụ, ha jiri ụdọ bronz kee ya agbụ, nye ya ọrụ ịnyagharị igwe na-akwọ ọka nʼụlọ mkpọrọ ha tinyere ya.

Ahịrị na-ejikọ ebe nkwụsị n’usoro ederede. Ebe ahịrị na-eso ala, ọ bụ ụzọ e chere na ha gara dịka otu ọkà mmụta si wughachi ya; ebe ndị ọzọ ọ kwụ ọtọ — amaghị ụzọ ahụ. Anya dị n’etiti ebe nkwụsị bụ ahịrị kwụ ọtọ. Ahịrị kpụkọrọ: n’ụgbọ mmiri. Ndị na-adịghị ike: ebe ahụ ejighị n’aka.

Ntụpọ ọ bụla bụ ebe kachasị ike ịbụ; ntụpọ na-acha mmịrị mmịrị pụtara na amaghị nke ọma ebe ọ bụ. Ebe a na-amaghị ebe ha dị anọghị na maapụ.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · UBS Bible Routes, Dr Leen Ritmeyer © United Bible Societies 2023, CC BY-SA 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike