Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 17 Ọgọọst
Kalenda Ọtọdọks · 4 Ọgọst (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 17 Ọgọọst 2027
Tiuzdee · Izu nke 9 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7
Mmemme na ndị nsọ
Holy Seven Youths of Ephesus (Seven Sleepers): Maximilian, Jamblichus, Martinian, John, Dionysius, Exacustodianus (Constantine) and Antoninus († c. 250 and 408-450)
Obubu ọnụ Ndaba ụra
Obubu ọnụ: nri esiri esi na-enweghị mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
12Dịka ahụ anyị si nwe akụkụ dị iche iche, ma bụrụkwa otu ahụ, nʼagbanyeghị na o nwere ọtụtụ akụkụ, otu a ka anụ ahụ Kraịst dịkwa. 13Site nʼotu Mmụọ Nsọ ahụ ka e mere anyị niile baptizim nʼotu nʼotu, ma ndị Juu ma ndị Griik, ma ohu ma ndị nwe onwe ha. E meela ka anyị ṅụọ ọbara ya, nʼime njikọ nke otu Mmụọ Nsọ ahụ. 14Ahụ mmadụ abụghị naanị otu akụkụ, kama o nwere ọtụtụ akụkụ ahụ. 15Ọ bụrụ na ụkwụ asị, “Nʼihi na-abụghị m aka, esoghị nʼahụ,” nke a agaghị egbochi ya ka ọ gharakwa ịbụ otu nʼakụkụ anụ ahụ. 16Otu a kwa, ọ bụrụ na ntị asị, “Ebe m na-abụghị anya abụghị m otu akụkụ anụ ahụ.” Okwu a kwa agaghị eme ka ntị ghara ịbụ akụkụ anụ ahụ. 17Ọ bụrụ na ahụ niile bụ anya, olee ka ahụ ga-esi nụ ihe? Ọ bụrụkwa na ahụ mmadụ bụ naanị ntị ọ ga-esi aṅaa nụ isisi ihe ọbụla? 18Ma otu ihe si dị, Chineke debere nʼotu nʼotu akụkụ niile dị nʼahụ dịka o si chọọ. 19A sị na akụkụ niile dị nʼahụ bụ otu ihe, kedụ ebe ahụ ga-adị? 20Otu ọ dị, ọ bụ ezie na ihe dị nʼahụ dị ọtụtụ, ma ha niile bụ otu ahụ. 21Nʼihi nke a, anya enweghị ike ịgwa aka sị, “Achọghị m gị, nʼihi na ị dịghị m mkpa.” Isi agakwaghị agwa ụkwụ sị, “Achọghị m inyeaka gị.” 22Kama ọ bụ akụkụ ahụ anyị ndị na-esighị ike bụ ndị dị anyị mkpa karịa. 23E e, akụkụ ndị ahụ anyị na-eche na ha adịghị mkpa ka anyị na-eji nsọpụrụ na-elekọta. Akụkụ ndị ahụ na-ekwesighị ile anya ka anyị na-enye ugwu, ma na-ekpuchi ha. 24Ma anyị adịghị esi otu a elekọta akụkụ ahụ ndị ahụ anya na-ahụ nʼụzọ pụrụ iche, nʼihi na Chineke kpachapụrụ anya mee ka akụkụ ndị ahụ dịkarịsịrị nta bụrụ nke anyị kwesiri inye nsọpụrụ karịa. 25Nʼụzọ dị otu a, nkewa ọbụla adịghị nʼahụ mmadụ. Akụkụ ọbụla maara mkpa ibe ya, ha na-egborịtakwara onwe ha mkpa ha. 26Ọ bụrụ na otu akụkụ enwe nsogbu, akụkụ ndị ọzọ ga-eketa oke na nsogbu ahụ. Ọ bụrụkwa na otu akụkụ emee ihe ga-eweta otuto ọ bụ ahụ niile na-enwe otuto ahụ.
Oziọma
18“Nʼezie, asị m unu, na ihe ọbụla unu kere agbụ nʼụwa a, e keela ya rịị agbụ nʼeluigwe. Ihe ọbụla kwa unu tọpụrụ nʼụwa, a tọpụkwala ya rịị nʼeluigwe. 19“Ọzọ, ana m agwa unu nʼezie a sị, ọ bụrụ na mmadụ abụọ nʼetiti unu ekwekọrịta nʼụwa banyere ihe ọbụla unu na-arịọ nʼekpere Nna m bi nʼeluigwe ga-emezuru unu ihe ahụ. 20Nʼihi na ebe ọbụla mmadụ abụọ maọbụ atọ zukọtara nʼaha m, mụ onwe m nọ nʼetiti ha.” 21Mgbe ahụ Pita bịakwutere ya jụọ ya ajụjụ sị, “Onyenwe anyị, ọ bụ ugboro ole ka m ga-agbaghara nwanne m nke mehiere megide m? Ọ bụ ugboro asaa?” 22Jisọs zara sị ya, “Ọ bụghị ugboro asaa. Kama ị ga-agbaghara ya ruo iri ugboro asaa ụzọ asaa. 19:1Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, o hapụrụ Galili gaa na mpaghara Judịa, nke dị nʼofe osimiri Jọdan. 2Igwe mmadụ dị ukwuu sooro ya. Ọ gwọkwara ndị ahụ na-esighị ike nʼetiti ha nʼebe ahụ. 13Mgbe ahụ e kuteere ya ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka, kpeekwara ha ekpere. Ma ndị na-eso ụzọ ya baara ndị kutere ha mba. 14Ma Jisọs sịrị ha, “Kweenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m, unu egbochikwala ha. Nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ndị dị otu a.” 15O bikwasịrị ha aka nʼisi gọzie ha niile tupu ọ hapụ ha pụọ.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 4 Ọgọọst na kalenda nzukọ bụ 17 Ọgọọst na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike