Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 18 Ọgọọst
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 18 Ọgọọst 2027
Wenezdee · Izu nke 20 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Wenezdee nke izu nke 20 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
6Mgbe ahụ, ndị Shekem na ndị Bet Milo kpọrọ nzukọ nʼokpuru osisi ukwu dị nʼobodo ahụ nʼakụkụ ogidi e guzobere ọtọ na Shekem. Nʼebe ahụ ka ha nọ mee Abimelek eze Izrel. 7Mgbe Jotam nụrụ ya, o rigooro nʼugwu Gerizim guzo nʼebe ahụ tikuo ndị Shekem niile mkpu si ha, “Geenụ m ntị ka Chineke nwe ike gee unu ntị. 8Otu mgbe, osisi niile pụrụ ije ịga tee otu onye mmanụ ka ọ bụrụ eze ga-achị ha. Ha sịrị osisi oliv, ‘Bụrụ eze anyị.’ 9“Ma osisi oliv jụrụ ha ajụjụ sị, ‘O kwesiri ka m hapụ iwepụta mmanụ m a nke a na-esite na ya sọpụrụ Chineke na ụmụ mmadụ, nọọ ọnọdụ ifegharị alaka m nʼelu osisi ndị ọzọ?’ 10“Ọzọkwa, ha rịọrọ osisi fiig ka ọ bụrụ eze ha. 11“Ma osisi fiig sịrị, ‘Ọ bụrụ na m ekwere na m ga-abụ eze unu, ọ pụtara na m ga-akwụsị ịmịpụta mkpụrụ osisi na-atọ ụtọ, nọọ ọnọdụ ifegharị alaka m nʼelu osisi ndị ọzọ?’ 12“Ọzọkwa, ha rịọrọ osisi vaịnị ma ọ ga-ekwenye ịbụ eze ha. 13“Ma osisi vaịnị ahụ zara sị ha, ‘Ọ bụrụ na m ekwere ịbụ eze unu, ọ pụtara na m ga-akwụsị ịmịpụta mkpụrụ osisi e ji eme mmanya nke na-enye Chineke na ụmụ mmadụ obi ụtọ, nọọ ọnọdụ ifegharị alaka m nʼelu osisi ndị ọzọ?’ 14“Nʼikpeazụ, osisi niile jekwuuru ogwu ọhịa, ‘Bịa ka ị bụrụ eze anyị.’ 15“Ogwu ọhịa sịrị osisi niile, ‘Ọ bụrụ nʼezie na unu chọrọ ite m mmanụ ka m bụrụ eze unu, bịanụ zere ndụ nʼokpuru ndo m kpọkwanụ isiala nye m. Ọ bụrụ na unu ajụ ime nke a, ka ọkụ si nʼogwu ọhịa pụta rechapụ sida niile dị na Lebanọn!’
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, lee na eze na-aṅụrị ọṅụ nʼike gị. Obi na-atọkwa ya ụtọ nke ukwuu nʼihi mmeri niile i nyere ya! 2I nyela ya ihe obi ya chọrọ; i mekwaara ya ihe niile ọ rịọrọ gị! Sela 3I ji ngọzị bara ụba nabata ya, ọ bụkwa okpueze e ji ọlaedo a ṅụchara nke ọma kpụọ ka i kpukwasịrị ya nʼisi. 4Ọ rịọrọ ka i nye ya ndụ, i zara ekpere ya mekwaa ka o nwee ogologo ndụ nke ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 5Nsọpụrụ ya dị ukwuu site na mmeri niile i nyere ya, ebube na ịma mma bụ onyinye i nyere ya. 6Nʼezie, i nyela ya ngọzị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, i mere ka o nwee obi ụtọ nke na-esite nʼọṅụ nke nọnyere gị.
Oziọma
1“Ihe ọzọ a ga-eji tụnyere alaeze eluigwe bụ nwoke nwere ala ubi, onye pụrụ nʼisi ụtụtụ ịkpọta ndị ọrụ ga-arụ ọrụ nʼubi vaịnị ya. 2Ya na ndị ọrụ ahụ kwekọtara na ọ ga-akwụ ha otu denarị, nʼihi ọrụ ụbọchị ahụ. Emesịa o zigara ha nʼubi vaịnị ya. 3“Mgbe ọ pụrụ nʼihe dị ka elekere itoolu nke ụtụtụ, o sitere nʼebe a na-akpọta ndị ọrụ na-agafe hụ ndị ọzọ ka ha guzoro nʼọma ahịa na-enweghị ọrụ ha na-arụ. 4Ọ sịrị ha, ‘Unu onwe unu gaakwanụ rụọ ọrụ nʼubi vaịnị m, ihe ọbụla ziri ezi ka m ga-akwụ unu.’ 5Ya mere ha gara. “Ọ pụkwara nʼelekere iri na abụọ na elekere atọ nke ehihie, ma meekwa otu ihe ahụ. 6Mgbe o ruru elekere ise nke anyasị, ọ pụrụ hụ ndị ọzọ ka ha guzoro. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, ‘Gịnị mere unu ji guzoro nʼebe a taa niile na-arụghị ọrụ?’ 7“Ha zara sị ya, ‘Nʼihi na ọ dịghị onye kpọrọ anyị ọrụ.’ “Ọ gwara ha sị, ‘Unu onwe unu gaakwanụ rụọ ọrụ nʼubi vaịnị m. Aga m akwụkwa unu ihe dị mma.’ 8“Mgbe o ruru oge anyasị, onye nwe ubi vaịnị ahụ gwara onye na-elekọtara ya ndị ahụ anya sị, ‘Kpọkọta ndị ọrụ ahụ kwụọ ha ụgwọ, site na ndị ikpeazụ bịara ọrụ ruo na ndị bu ụzọ.’ 9“Mgbe ndị a kpọrọ ọrụ nʼelekere ise anyasị naara ego ha, a kwụrụ ha otu denarị, otu denarị. 10Ma mgbe ndị a kpọrọ ọrụ nʼisi ụtụtụ bịara ịnara ego ha, ha lere anya na a ga-akwụ ha karịa. Ma a kwụkwara ha niile otu denarị. 11Mgbe ha naara ego ahụ, ha tamuru ntamu megide nna nwe ụlọ, 12na-asị, ‘Ndị a bịara nʼikpeazụ rụrụ ọrụ naanị otu awa, ma i meela ka anyị na ha hara. Anyị bụ ndị buru ihe mgbu nke ọrụ ma okpomọkụ nke anwụ niile chara nʼụbọchị taa.’ 13“Ma ọ zara otu nʼime ha sị, ‘Enyi m, emeghị m gị ihe ọjọọ ọbụla. Ọ bụ na mụ na gị ekwughị na m ga-akwụ gị otu denarị nʼụbọchị? 14Nara nke ruru gị laa. A chọrọ m ịkwụ ndị a bịara nʼikpeazụ ụgwọ dị ka m si kwụọ gị. 15Ọ bụ na m enweghị ike iji ihe m nwere mee otu ọ masịrị m? Ọ bụ anya ukwu ka ị na-enwe nʼihi afọ ofufu m?’ 16“Ya mere, onye ikpeazụ ga-abụ onye bu ụzọ, ma onye bu ụzọ ga-abụkwa onye ikpeazụ.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike