Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 19 Jun

Kalenda Ọtọdọks · 6 Jun (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 19 Jun 2027

Satọdee · Izu nke 7 nke Ista · Olu 6

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee ncheta ndị nwụrụ anwụ

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi (maka ndị nwụrụ anwụ)

1Te 4:13–17

13Ụmụnna m, anyị chọrọ ka unu mata ihe banyere ndị otu anyị ndị dara nʼụra ọnwụ, ya ewutela unu dịka o si ewute ndị ọzọ ndị na-enweghị olileanya. 14Nʼihi na ebe ọ bụ na anyị kweere na Jisọs nwụrụ ma sitekwa nʼọnwụ bilie, nʼotu aka ahụ, anyị kwenyekwara na site na Jisọs, Chineke ga-akpọlite ndị niile nwụrụ anwụ. 15Nʼihi na okwu nke Onyenwe anyị nke anyị na-akụziri unu bụ nke a, na anyị ndị dị ndụ ruo ọbịbịa Onyenwe anyị agaghị ebu ndị dara nʼụra ọnwụ ụzọ. 16Nʼihi na Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-esi nʼeluigwe rịdata, ọ ga-ewere olu ike kpọọ oku, werekwa olu nke onyeisi ndị mmụọ ozi na ụda opi ike nke Chineke. Mgbe ahụ ndị niile nwụrụ nʼime Kraịst ga-ebu ụzọ bilie. 17Mgbe ahụ, anyị onwe anyị, ndị dị ndụ, ndị fọdụrụ nʼụwa, ka a ga-eweli anyị na ha elu nʼime igwe ojii, ịga izute Onyenwe anyị na mbara eluigwe, ebe anyị na Onyenwe anyị ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi.

Akwụkwọ ozi

Ọrụ 28:1–31

1Mgbe a pụtara nʼọnụ mmiri ahụ nʼudo, anyị chọpụtara na aha agwa etiti ahụ bụ Malta. 2Ndị obodo ahụ gosiri anyị obiọma nʼụzọ pụrụ iche. Ha kwanyere anyị ọkụ ma nabatakwa anyị nʼihi na mmiri nọ na-ezo, oyi na-atụkwa. 3Nʼoge Pọl na-achịkọta nkụ itinye nʼọkụ a, otu agwọ ajụala sitere nʼime nkụ na-enwu ọkụ mapụta nʼihi okpomọkụ tụhịkọ onwe ya nʼaka ya. 4Mgbe ndị obodo ahụ hụrụ agwọ ahụ ka ọ tụhịkọtara onwe ya nʼaka ya, ha gwarịtara onwe ha, “nʼezie a, nwoke a bụ ogbu mmadụ, a naghị eji ọkụ enyo ya. Ọ bụ ezie na azọpụtara ya site oke mmiri, ma ikpe ziri ezi ekweghị ka ọ dị ndụ.” 5Ma Pọl fepụrụ agwọ ahụ nʼaka ya, mee ka ọ daba nʼọkụ, ọ dịghịkwa ihe mere ya. 6Ha na-ele anya ma aka ya ọ ga-aza, maọbụ na ọ ga-ada nwụọ. Ma mgbe ha chegidere hụ na o nweghị ihe mere ya, ha gbanwere obi ha bido na-ekwu, na ọ bụ chi. 7Na nso ọnụ mmiri a ebe anyị kwụsịrị, otu ubi dị ya. Ọ bụ ubi Pobilios otu nwoke onyeisi na-achị agwa etiti ahụ. Ọ nabatara anyị nke ọma, lee anyị ọbịa ụbọchị atọ. 8Nʼoge ahụ, nna Pobilios nwere ahụ ọkụ na afọ ọsịsa, Pọl banyere nʼime obodo gaa leta ya, kpeere ya ekpere, bikwasịkwa ya aka. Ahụ dịkwara ya mma. 9Mgbe nke a mechara, ndị niile nwere nrịa nrịa nʼagwa etiti ahụ bịakwara, a gwọkwara ha. 10Ha wetaara anyị ọtụtụ ihe onyinye. Mgbe oge ịnyapụ ụgbọ anyị ruru, ha nyere anyị ọtụtụ ihe dị anyị mkpa nke pụrụ idu anyị nʼije ahụ. 11Anyị nọrọ ihe dịka ọnwa atọ nʼoge oyi, nʼagwa etiti ahụ tutu anyị anyalie ụgbọ. Ọ bụ ụgbọ ndị Alegzandria nke bu ihe a tụrụ atụ a na-akpọ ejima, bụ chi Kastọ na Polụkus. 12Anyị bịaruru obodo Sirakọs ebe anyị nọrọ ụbọchị atọ. 13Site nʼebe ahụ, anyị gara gburugburu tutu rute Rejiọm. Mgbe otu ụbọchị gafere, ikuku bidoro ife site na ndịda. Nʼụbọchị nke abụọ ya, anyị rutere Pọteọlị. 14Nʼebe a anyị chọpụtara ndị kwere ekwe ndị rịọrọ ka anyị nọnyere ha ụbọchị asaa. Site nʼebe a, anyị rutere Rom. 15Mgbe ụmụnna anyị nọ nʼebe ahụ nụrụ na anyị na-abịa. Ha pụtara zute anyị nʼụzọ Apiọs na nʼụlọ ndị Ije atọ. Mgbe Pọl hụrụ ha, o kelere Chineke ma bụrụ onye a gbara ume. 16Mgbe anyị bịaruru Rom, e nyere Pọl ohere ibiri onwe ya dịka o si chọọ nʼebe masịrị ya. Ma otu onye agha na-eche ya nche. 17Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ọ kpọrọ ndịisi ndị Juu. Mgbe ha zukọrọ, ọ gwara ha, “Ụmụnna m, ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere megide ndị nke anyị, maọbụ megide omenaala nna nna anyị ha, ha jidere m na Jerusalem were m nyefee m nʼaka ndị Rom. 18Ndị ọchịchị Rom lenyere anya nʼikpe m chọọ ịhapụ m ka m laa nʼihi na ha achọtaghị ihe kwesiri ịma m ikpe ọnwụ dịka ndị anyị chọrọ. 19Ma mgbe ndị Juu jụrụ, ahụrụ m na ọ dị mkpa ibutere Siza ikpe m. Ma o nweghị ihe ọjọọ m bu nʼuche megide ndị obodo m. 20Nʼihi nke a, ka m jiri rịọọ ka mụ na unu hụ ma kwurịtakwa okwu. Ọ bụ nʼihi olileanya nke Izrel ka e ji kee m nʼagbụ igwe a.” 21Ha sịrị, “Anyị anataghị akwụkwọ ozi ọbụla site na Judịa banyere gị. Ọ dịghịkwa ụmụnna anyị ọbụla nke si ebe ahụ bịa nke kọrọ maọbụ kwuo okwu ọjọọ ọbụla banyere gị. 22Otu ọ dị, anyị ga-achọ ịnụta ihe i chere, nʼihi na anyị maara na a na-ekwujọ otu a nʼebe niile.” 23Ha yiri agba mgbe ha na ya ga-ezukọta nʼụbọchị ọzọ. Ọtụtụ mmadụ karịrị bịara nʼụlọ ebe ọ na-anọ. Ọ gbara ama banyere alaeze Chineke site nʼakwụkwọ iwu Mosis na nke ndị amụma, ọ gbalịrị ime ka ha kwenye nʼihe banyere Jisọs. O bidoro izi ha ihe site nʼụtụtụ ruo anyasị. 24Ụfọdụ ka e mere ka ha kweere, ma ụfọdụ mechiri ntị ha na obi ha. 25Ha nwe nghọtahie nʼetiti onwe ha ma malite ịla mgbe Pọl kwusiri okwu nke ikpeazụ a, “Mmụọ Nsọ Chineke kwuru eziokwu mgbe o sitere nʼọnụ Aịzaya onye amụma kwuo okwu nye nna nna anyị ha, 26“ ‘Jekwuru ndị a gwa ha okwu, “Unu ga na-anụ, nụkwa, ma unu agaghị aghọta ihe ọbụla, unu ga na-ele anya, hụkwa, ma unu agaghị ahụ ihe ọbụla.” 27Nʼihi na obi ndị a amaala abụba, dịkwa arọ; ha adịghị ejikwa ntị ha anụ ihe, ha mechikwara anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ. Ma ọ bụghị otu a, ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ, jirikwa ntị ha nụ ihe sitekwa nʼobi ha nwe nghọta ma chigharịa bịakwute m, ka m gwọọ ha.’ 28“Ya mere, a chọrọ m ka unu ghọta na nzọpụta a nke si nʼaka Chineke bịa, dịkwa nye ndị mba ọzọ, ha ga-egekwa ntị.” 29Mgbe o kwusiri nke a, ndị Juu ahụ lara na-arụrịta ụka nke ukwu nʼetiti onwe ha. 30O biri obi nke onwe ya afọ abụọ nʼụlọ ọ na-akwụ ụgwọ ya. Ọ na-anabatakwa ndị niile bịara ileta ya, 31o ji mkwuwa okwu na-ekwusa ihe banyere alaeze Chineke na-akụzikwa ihe banyere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ọ dịkwaghị onye ọbụla gbalịrị igbochi ya.

Akwụkwọ ozi (maka ndị nwụrụ anwụ (ihe ọgụgụ ọzọ))

1Kọ 15:47–57

47Mmadụ nke nwoke sitere nʼala, ejikwa aja kpụọ ya; mmadụ nke abụọ si nʼeluigwe bịa. 48Dị ka mmadụ nke mbụ ahụ e jiri aja kpụọ dị, otu a ka ndị niile si nʼaja pụta dịkwa. Ma dị ka mmadụ nke eluigwe ahụ dị, otu a ka ndị niile bụ ụmụ eluigwe dịkwa. 49Dịka anyị niile yikwasịrị onyinyo nke nwoke e jiri aja kpụọ, otu ahụkwa ka anyị ga-esi yikwasị onyinyo nke nwoke nke eluigwe. 50Ihe m na-ekwu, ụmụnna m, bụ na anụ ahụ na ọbara enweghị ike iketa alaeze Chineke. Ihe na-ere ure agaghịkwa eketa ereghị ure. 51Ma geenụ ntị ka m gwa unu ihe omimi a! Ọ bụghị anyị niile na-aga ịnwụ, kama, a ga-enye anyị anụ ahụ ọhụrụ nke pụrụ iche. 52Nʼotu mgbe, nʼotu ntabi anya, mgbe a ga-afụ opi ike ikpeazụ. Nʼihi na opi ga-ada, a ga-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilite na-ereghị ure. A ga-agbanwekwa anyị. 53Nʼihi na a ghaghị ịgbanwe anụ ahụ anyị a nke na-anwụ anwụ, nyekwa anyị ahụ nke na-agaghị anwụ ọzọ. 54Mgbe ahụ nke a pụrụ ire ure ga-eyikwasị ereghị ure, nke a pụrụ ịnwụ anwụ ga-eyikwasị anwụghị anwụ. Mgbe ahụ, okwu ahụ e dere nʼakwụkwọ nsọ ga-emezu, okwu ahụ sịrị, “Elomiela ọnwụ, meriekwa ike ya niile.” 55“Ọnwụ, olee ebe mmeri gị dị? Ọnwụ, olee ebe ihe ụfụ gị dị?” 56Nʼihi na ihe ahụ ọnwụ ji agbata mmadụ bụ mmehie, ma ihe na-enye mmehie ike bụ iwu. 57Ka ekele dịrị Chineke onye na-enye anyị mmeri site nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.

Oziọma (maka ndị nwụrụ anwụ)

Jọn 5:24–30

24“Nʼezie, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla na-anụ okwu m ma kwerekwa nʼonye zitere m nwere ndụ ebighị ebi, a gaghị amakwa ya ikpe, ọ gafeela site nʼọnwụ banye na ndụ. 25Nʼezie, nʼezie agwa m unu, oge na-abịa, ọ bịakwala ugbu a mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-anụ olu Ọkpara Chineke, ndị ahụ nụrụ ya ga-adịkwa ndụ. 26Dị ka Nna ahụ nwere ndụ nʼime onwe ya, otu a ka o nyekwara Ọkpara ahụ ike inwe ndụ nʼime onwe ya. 27O nyekwala ya ikike ikpe ikpe nʼihi na ọ bụ Nwa nke Mmadụ. 28“Ka nke a hapụ iju unu anya, nʼihi na oge na-abịa, mgbe ndị niile nọ nʼili ha ga-anụ olu ya 29ma pụta, ndị mere ihe dị mma ga-ebili dịrị ndụ. Ma ndị mere ihe ọjọọ ga-ebili bụrụ ndị a ga-ama ikpe. 30Enweghị m ike ime ihe ọbụla nʼonwe m, ikpe m na-ekpe bụ naanị dị ka m nụrụ, ikpe m bụkwa nke ziri ezi, nʼihi na anaghị m eme ihe ga-amasị m, kama ọ bụ ihe ga-amasị onye ahụ zitere m.

Oziọma

Jọn 21:15–25

15Mgbe ha risiri nri ụtụtụ, Jisọs sịrị Saimọn Pita, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya karịa ndị a niile?” Ọ sịrị ya, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.” Jisọs sịrị ya, “Na-azụ ụmụ atụrụ m.” 16Jisọs sịrị ya nke ugboro abụọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.” Ọ sịrị ya, “Na-elekọta atụrụ m.” 17Ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?” O wutere Pita na ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị mazuru ihe niile, ị makwaara na m hụrụ gị nʼanya.” Jisọs sịrị ya, “Na-azụ atụrụ m. 18Nʼezie, nʼezie asị m gị, mgbe ị bụ okorobịa ị na-eke ajị nʼukwu, gaa ebe ị chọrọ ịga. Ma mgbe ị ghọrọ agadi, ị ga-esetipụ aka gị, onye ọzọ ga-ekee gị ihe okike nʼukwu ma duru gị gaa ebe ị na-achọghị ịga.” 19O kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ ọ ga-anwụ iji nye Chineke otuto. Mgbe nke a mesịrị, ọ sịrị ya, “Soro m.” 20Pita chigharịrị hụ onye ahụ na-eso ụzọ ya nke Jisọs hụrụ nʼanya ka ọ na-esokwa ha nʼazụ. (Ọ bụ onyeozi ahụ dabeere ya nʼobi na nri anyasị, nke sịrị, “Onyenwe anyị, onye ga-arara gị nye?”) 21Mgbe Pita hụrụ ya, ọ sịrị Jisọs, “Onyenwe anyị kedụ maka onye a?” 22Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na m achọọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-alọghachi gịnị ka nke a bụ nye gị? Soro m.” 23Ya mere, akụkọ a gbasara nʼetiti ụmụnna na onye a na-eso ụzọ ya agaghị anwụ. Ma Jisọs asịghị ya na ọ gaghị anwụ anwụ, kama, “Ọ bụrụ na m chọrọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-abịa, ọ gbasara gị?” 24Nke a bụ onye ahụ na-eso ụzọ ya onye na-agba ama ihe ndị a niile, ma deekwa ha nʼakwụkwọ. Anyị makwaara na ama ya bụ eziokwu. 25Ma ọ dị ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jisọs mere. Ọ bụrụ na e dee ha niile nʼakwụkwọ, ọ dịghị m ka ụwa niile ọ ga-aba akwụkwọ a ga-ede banyere ha.

Oziọma (maka ndị nwụrụ anwụ (ihe ọgụgụ ọzọ))

Jọn 6:35–39

35Jisọs sịrị ha, “Abụ m achịcha ahụ na-enye ndụ. Onye ọbụla na-abịakwute m, agụụ agaghị agụ ya. Onye ọbụla kwa kweere na m, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ. 36Ma agwa m unu, unu ahụla m ma unu ekweghịkwa. 37Onye ọbụla Nna ahụ nyere m ga-abịakwute m, onye ọbụla na-abịakwute m, agaghị m achụpụ ya. 38Nʼihi na esi m nʼeluigwe rịdata nʼụwa ime uche onye ahụ zitere m, ọ bụghị ime uche nke m. 39Nke a bụkwa uche onye ahụ zitere m, na o nweghị onye ọbụla o nyere m ga-efunarị m, kama m ga-eme ka ha site nʼọnwụ bilie nʼụbọchị ikpeazụ.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 6 Jun na kalenda nzukọ bụ 19 Jun na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike