Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 19 Jun

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 19 Jun 2027

Satọdee · Izu nke 11 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee nke izu nke 11 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Onye nsọ Romuald, Onyeisi ndị mọnk · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

2Kọ 12:1–10

1Aghaghị m ịnya isi, ọ bụ ezie na ọ baghị uru, ugbu a ka m gwa unu ihe banyere ọhụ m hụrụ, na ihe niile Onyenwe anyị kpughere gosi m. 2Amaara m otu nwoke nọ nʼime Kraịst, onye e duuru gaa nʼeluigwe nke atọ ihe dị ka afọ iri na anọ gara aga, maọbụ nʼanụ ahụ, maọbụ nʼime mmụọ amaghị m, ma Chineke ma. 3Amatakwara m nwoke dị otu a, maọbụ nʼanụ ahụ, maọbụ nʼime mmụọ amaghị m, ma Chineke maara 4onye a, nke a kpọọrọ banye na paradaịs, ebe ọ nụrụ ihe ọnụ mmadụ na-apụghị ịkọwa, nke e nyeghịkwa mmadụ ọbụla ike ikwu ihe banyere ya. 5Ekwesiri m ịnya isi nʼihi nwoke dị otu a ma agaghị m anya isi maka mụ onwe m, ma ọ bụghị maka adịghị ike m. 6A sị na m chọrọ ịnya isi, agaghị m abụ onye nzuzu, nʼihi na aga m ekwu naanị eziokwu. Otu ọ dị, agaghị m anya isi ka onye ọbụla ghara ịgụ ọnọdụ m karịa ihe ọ hụrụ nʼime m, maọbụ karịa ihe ọ nụrụ nʼọnụ m. 7Ma nʼihi na ọtụtụ ihe ndị a m ji anya m hụ bụ ihe pụrụ ime ka m bulie onwe m elu karịa ka o si kwesi. E tinyere ihe mgbu nʼanụ ahụ m ka ọ na-adụ m dịka ogwu. Ihe mgbu a dị nʼanụ ahụ m na-eti m aka dịka onyeozi nke ekwensu, na-eme ka m ghara ịfụlị onwe m elu karịa. 8Ekpeela m ekpere ugboro atọ rịọ Onyenwe anyị ka o wepụrụ m ahụ mgbu a. 9Ma ọ sịrị m, “Amara m ezuorola gị. Nʼihi na ike m na-ezu oke nʼime adịghị ike.” Ugbu a, obi dị m ụtọ ịnya isi banyere adịghị ike m. Nʼihi na ọ bụ site nʼọnọdụ adịghị ike m ka ike ebube Kraịst ga-esi nọgide nʼahụ m. 10Ọ bụ nʼihi Kraịst ka m na-anọgide nʼadịghị ike m niile, mkparị ndị mmadụ, ihe isi ike niile, mkpagbu niile na ihe ndakwasị dị iche iche. Nʼihi na mgbe m na-adịghị ike ka m na-enwe ike karịa.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 34:7–12

7Mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agba ndị niile na-atụ egwu ya gburugburu na-anapụtakwa ha. 8Jiri aka gị tulee ma hụkwa na Onyenwe anyị dị mma; onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye nke na-agbaba nʼime ya. 9Tụọnụ egwu Onyenwe anyị, unu ndị nsọ ya, nʼihi na ọ dịghị ihe na-akọ ndị niile na-atụ egwu ya. 10Agụụ nwere ike ịgụ ụmụ ọdụm, ike pụkwara ịgwụ ha, ma ihe ọbụla bụ ihe ọma agaghị akọ ndị niile na-achọ Onyenwe anyị. 11Ụmụ m, bịanụ gee m ntị; aga m ezi unu ihe ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ. 12Onye ọbụla nʼime unu hụrụ ndụ nʼanya, ma nwee ọchịchọ ihu ọtụtụ ụbọchị ndị dị mma,

Oziọma

Mat 6:24–34

24“Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ife nna ukwu abụọ, nʼihi na ọ ga-achọ ịhụ otu nʼime ha nʼanya, kpọkwa nke ọzọ asị, maọbụ sọpụrụ otu ma lelịa nke ọzọ anya. Otu a kwa i nweghị ike ife Chineke na akụ otu mgbe ahụ. 25“Nʼihi nke a ka m ji na-asị unu, unu echegbula onwe unu banyere ndụ unu, ihe unu ga-eri, maọbụ ihe unu ga-aṅụ, maọbụ banyere ahụ unu, ihe unu ga-eyi nʼahụ. Ọ bụ ndụ akarịghị nri eji azụ ya, ka ọ bụ ahụ akarịghị ihe e ji ekpuchi ya? 26Werenụ ụmụ nnụnụ dị ka ihe ịmaatụ. Ha adịghị akụ mkpụrụ nʼubi maọbụ ewe ihe ubi. Ha adịghị achịkọtakwa ihe debe nʼọba. Ma Nna unu nke bi nʼeluigwe na-azụ ha. Ọ bụ na unu adịghị oke ọnụahịa karịa ha? 27Onye nʼetiti unu pụrụ itinye otu nkeji nʼogologo ụbọchị nke ndụ ya site nʼichegbu onwe ya? 28“Gịnị mekwaranụ unu ji na-anọ nʼechiche oge niile maka uwe? Leenụ okoko osisi nke ọhịa. Ha adịghị arụ ọrụ maọbụ dọgbuo onwe ha nʼọrụ. 29Ma asị m unu, ọ bụladị Solomọn nʼebube nke ịbụ eze ya niile, eyighị uwe ọbụla mara mma dị ka otu nʼime okoko osisi nke ọhịa ndị a. 30Ma ọ bụrụ na Chineke si otu a chọọ ahịhịa efu nke ubi mma, nke pụrụ ịdị ndụ taa ma echi atụba ha nʼite ọkụ, ọ bụ na ọ gaghị a chọọ unu mma karịa. Unu ndị okwukwe nta? 31Nʼihi nke a, unu echegbukwala onwe unu na-asị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ maọbụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ maọbụ, ‘Gịnịkwa ka anyị ga-eyi?’ 32Ọ bụ ihe ndị a ka ndị na-amaghị Chineke na-achọsi ike. Ma Nna unu bi nʼeluigwe maara na ọ dị unu mkpa. 33Ma burunu ụzọ chọọ alaeze ya na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a niile. 34Ya mere, unu echegbula onwe unu banyere echi, nʼihi na echi ga-echere onwe ya. Nsogbu nke ụbọchị taa ezuorola ụbọchị taa.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike