Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 15 Mee
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 15 Mee 2027
Satọdee · Izu nke 7 nke Oge Ista
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee nke izu nke 7 nke Oge Ista
Ụbọchị izu · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
16Mgbe anyị bịaruru Rom, e nyere Pọl ohere ibiri onwe ya dịka o si chọọ nʼebe masịrị ya. Ma otu onye agha na-eche ya nche. 17Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ọ kpọrọ ndịisi ndị Juu. Mgbe ha zukọrọ, ọ gwara ha, “Ụmụnna m, ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere megide ndị nke anyị, maọbụ megide omenaala nna nna anyị ha, ha jidere m na Jerusalem were m nyefee m nʼaka ndị Rom. 18Ndị ọchịchị Rom lenyere anya nʼikpe m chọọ ịhapụ m ka m laa nʼihi na ha achọtaghị ihe kwesiri ịma m ikpe ọnwụ dịka ndị anyị chọrọ. 19Ma mgbe ndị Juu jụrụ, ahụrụ m na ọ dị mkpa ibutere Siza ikpe m. Ma o nweghị ihe ọjọọ m bu nʼuche megide ndị obodo m. 20Nʼihi nke a, ka m jiri rịọọ ka mụ na unu hụ ma kwurịtakwa okwu. Ọ bụ nʼihi olileanya nke Izrel ka e ji kee m nʼagbụ igwe a.” 30O biri obi nke onwe ya afọ abụọ nʼụlọ ọ na-akwụ ụgwọ ya. Ọ na-anabatakwa ndị niile bịara ileta ya, 31o ji mkwuwa okwu na-ekwusa ihe banyere alaeze Chineke na-akụzikwa ihe banyere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ọ dịkwaghị onye ọbụla gbalịrị igbochi ya.
Abụ Ọma nzaghachi
4Onyenwe anyị nọ nʼụlọnsọ ukwuu ya; Onyenwe anyị nọkwa nʼelu ocheeze ya dị nʼeluigwe. Ọ na-ahụzu ihe niile ụmụ mmadụ na-eme; anya ya na-anwalekwa ụzọ ha. 5Onyenwe anyị na-ele onye ezi omume ule, ma onye ajọ omume na ndị niile hụrụ imebi iwu nʼanya, ka ọ na-akpọ asị nke ukwuu. 7Nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye ezi omume, ọ hụkwara ikpe ziri ezi nʼanya; ndị ezi omume niile ga-ahụkwa ihu ya anya.
Oziọma
20Pita chigharịrị hụ onye ahụ na-eso ụzọ ya nke Jisọs hụrụ nʼanya ka ọ na-esokwa ha nʼazụ. (Ọ bụ onyeozi ahụ dabeere ya nʼobi na nri anyasị, nke sịrị, “Onyenwe anyị, onye ga-arara gị nye?”) 21Mgbe Pita hụrụ ya, ọ sịrị Jisọs, “Onyenwe anyị kedụ maka onye a?” 22Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na m achọọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-alọghachi gịnị ka nke a bụ nye gị? Soro m.” 23Ya mere, akụkọ a gbasara nʼetiti ụmụnna na onye a na-eso ụzọ ya agaghị anwụ. Ma Jisọs asịghị ya na ọ gaghị anwụ anwụ, kama, “Ọ bụrụ na m chọrọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-abịa, ọ gbasara gị?” 24Nke a bụ onye ahụ na-eso ụzọ ya onye na-agba ama ihe ndị a niile, ma deekwa ha nʼakwụkwọ. Anyị makwaara na ama ya bụ eziokwu. 25Ma ọ dị ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jisọs mere. Ọ bụrụ na e dee ha niile nʼakwụkwọ, ọ dịghị m ka ụwa niile ọ ga-aba akwụkwọ a ga-ede banyere ha.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike