Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 17 Mee
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 17 Mee 2027
Mọnde · Izu nke 7 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Mọnde nke izu nke 7 nke Oge Nkịtị
Ncheta · Agba ofufe: ọcha
Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi, Nne nke Chọọchị · Ncheta
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
ma ọ bụ: Ọrụ 1:12–14
9Ma Onyenwe anyị Chineke kpọrọ nwoke ahụ oku sị ya, “Ebee ka ị nọ?” 10Ọ zara si, “Anụrụ m ụda ụkwụ gị nʼogige, nʼihi ya, atụrụ m ụjọ, ebe ọ bụ na m gba ọtọ. Ezokwara m onwe m.” 11Onyenwe anyị Chineke jụrụ ya sị, “Onye gwara gị na ị gba ọtọ? I riela mkpụrụ si nʼosisi ahụ m nyere gị iwu sị gị erila?” 12Nwoke ahụ sịrị, “Nwanyị ahụ i mere ka mụ na ya nọdụ, ọ bụ ya nyere m mkpụrụ sitere nʼosisi ahụ, m rie.” 13Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke sịrị nwanyị ahụ, “Gịnị bụ ihe a i mere?” Nwanyị ahụ zara sị, “Ọ bụ agwọ ghọgburu m, mee m ka m rie ya.” 14Ya mere, Onyenwe anyị Chineke gwara agwọ ahụ sị, “Nʼihi ihe a i mere, “Ihe a bụrụ ọnụ ka ị bụ nʼetiti anụ ụlọ niile na nʼetiti anụ ọhịa niile. Afọ gị ka ị ga-eji na-aga ije, aja ka ị ga na-eri ogologo ụbọchị ndụ gị niile. 15Aga m eme ka iro dịrị nʼetiti gị na nwanyị ahụ, nʼetiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya, mkpụrụ ya ga-etipịa gị isi, gị onwe gị ga-ata ya arụ nʼikiri ụkwụ.” 20Adam gụrụ nwunye ya Iiv, nʼihi na ọ bụ nne mmadụ niile dị ndụ.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma ụmụ Kora. Otu Abụ. Chineke atọọla ntọala ya nʼelu ugwu nsọ ahụ; 2Onyenwe anyị hụrụ ọnụ ụzọ ama Zayọn nʼanya, karịa ebe obibi niile nke Jekọb. 3Ihe dị iche iche nke dị ebube ka a na-ekwu banyere gị, O obodo Chineke; Sela 5Nʼezie, a ga-ekwu okwu banyere Zayọn sị, “A mụrụ nke a na nke ọzọ nʼime ya, ya onwe ya, bụ Onye kachasị ihe niile elu, ga-eme ka o guzosie ike.” 6Onyenwe anyị ga-ede nʼime akwụkwọ usoro nke ndị mmadụ: “A mụrụ onye a na Zayọn.” 7Dịka ha na-eti egwu, ha ga-abụ abụ sị, “Isi iyi m niile dị na gị.”
Oziọma
25Nne ya, nwanne ya nwanyị, bụ Meri nwunye Klopas, na Meri Magdalin guzo nso nʼakụkụ obe Jisọs. 26Mgbe Jisọs hụrụ nne ya na onye na-eso ụzọ ya ọ hụrụ nʼanya ka o guzo nʼakụkụ ya, ọ sịrị nne ya, “Nwanyị lee nwa gị nwoke.” 27Ọ sịrị onye ahụ nke na-eso ụzọ ya, “Lee nne gị.” Site nʼoge ahụ, onye ahụ na-eso ụzọ ya kpọọrọ ya laa nʼụlọ nke ya.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike