Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 16 Mee
Kalenda Ọtọdọks · 3 Mee (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 16 Mee 2027
Sọnde · Olu 2
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 3 nke Ista
Sọnde nke Ụmụ nwanyị bu ọjịa ụtụ
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 3
9Mgbe Jisọs biliri nʼọnwụ nʼisi ụtụtụ nʼụbọchị mbụ nke izu, onye mbụ o gosiri onwe ya bụ Meri Magdalin, onye ahụ o siri nʼahụ ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa. 10Ọ lara gaa kọrọ ndị ya na ha na-anọ na mbụ, bụ ndị nọrịị na-ebe akwa ma na-erukwa ụjụ. 11Mgbe ha nụrụ na ọ dị ndụ, na ọ hụkwala ya, ha ekweghị. 12Mgbe ihe ndị a gasịrị, o gosiri mmadụ abụọ nʼime ha onwe ya nʼụdị ọzọ, mgbe ha na-abanye nʼime obodo. 13Ndị a laghachiri bịa kọọrọ ndị nke ọzọ ma ha ekwetakwaghị. 14Emesịa, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya iri na otu ahụ onwe ya, mgbe ha nọkọrọ na-eri nri. Ọ baara ha mba nʼihi enweghị okwukwe ha nakwa mkpọchi obi ha, nʼihi na ha jụrụ ikwenye nʼihe ndị ọzọ hụrụ ya gwara ha mgbe e mesịrị ka ọ si nʼọnwụ bilite. 15Ọ gwara ha sị, “Gaanụ nʼime ụwa niile kwusaara ihe niile e kere eke oziọma. 16Onye ọbụla kweerenụ na onye e mekwara baptizim ka a ga-azọpụta. Ma a ga-ama onye ọbụla na-ekwereghị ikpe. 17Ihe ịrịbama ndị a ga-esokwa ndị kwerenụ. Site nʼaha m, ha ga-achụpụ mmụọ ọjọọ; kwuokwa okwu nʼasụsụ ọhụrụ dị iche iche. 18Ha ga-eji aka ha abụọ atụtụlie agwọ, ṅụọkwa nsi ma ọ gaghị emerụ ha ahụ ma otu. Ha ga-ebikwasị ndị ọrịa aka, ahụ ga-adịkwa ha mma.” 19Mgbe Onyenwe anyị Jisọs gwasịrị ha okwu ndị a, e weliri ya elu, baa nʼeluigwe, ebe ọ nọdụ ala nʼakụkụ aka nri Chineke. 20Ha pụrụ kwusaa oziọma nʼebe niile. Onyenwe anyị nọnyekwaara ha, mee ka okwu ya guzosie ike site nʼihe ịrịbama dị iche iche nke na-eso ya.
Akwụkwọ ozi
1Nʼoge ahụ mgbe ọnụọgụgụ ndị na-eso ụzọ ya bidoro ịmụba, ndị Juu na-asụ asụsụ Griik mere mkpesa megide ndị Juu na-asụ asụsụ Hibru nʼihi na a na-elefuru ndị inyom ha, ndị di ha nwụrụ anwụ anya na nri a na-eke kwa ụbọchị. 2Nʼihi nke a, ndị ozi iri na abụọ ahụ kpọrọ ọgbakọ ndị niile na-eso ụzọ ya sị, “O zighị ezi na anyị ga-ahapụ ikwusa oziọma Chineke bido na-eke nri. 3Ụmụnna anyị, sitenụ nʼetiti unu họpụta ndị ikom asaa ndị a na-agbara ezi ama na ha jupụtara na Mmụọ Nsọ na amamihe. Anyị ga-enyefe ha ọrụ a nʼaka. 4Ebe anyị onwe anyị, ga-enyefe onwe anyị nʼọrụ ikpe ekpere, na ọrụ niile metụtara izisa oziọma.” 5Mmadụ niile nabatara atụmatụ a nke ọma. Ha họpụtara Stivin, nwoke jupụtara nʼokwukwe na Mmụọ Nsọ. Ha họpụtakwara Filip, Prokorọs, Nikanọ, Timọn, Pamenas na Nikolas, onye Antiọk na-eso ụzọ ofufe ndị Juu. 6Ha chere mmadụ ndị a nʼihu ndị ozi, ndị kpeere ha ekpere, bikwasịkwa ha aka nʼisi. 7Okwu Chineke gbasara nnọọ. Ọnụọgụgụ ndị na-eso ụzọ ya na Jerusalem bakwara ụba. Nʼoge a, ọtụtụ ndị nchụaja nabatara na-erubekwa isi nʼokwukwe.
Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Teodosiọs)
7Chetanụ ndịisi unu, ndị gwara unu okwu Chineke. Tuleenụ otu ndụ siri dị, na-eṅomikwanụ okwukwe ha. 8Otu Jisọs Kraịst dị ụnyaahụ, ka ọ dị taa, otu a ka ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. 9Unu ekwela ka e jiri ozizi ọhụrụ nke dịkwa iche duhie unu. Nʼihi na ọ bụ ihe dị mma ka e were amara mee ka obi sie ike, ọ bụghị site nʼidebe iwu banyere nri nke na-enweghị uru ọ bara ndị na-edebe ya. 10Anyị nwere ebe ịchụ aja, ebe ndị niile na-eje ozi ha nʼụlọ ikwu a enweghị ike iri aja a chụrụ nʼelu ya. 11Onyeisi nchụaja na-ewebata ọbara ụmụ anụ ndị ahụ nʼEbe Kachasị Nsọ dịka aja maka mmehie, ma a na-erepịa anụ ahụ ha ọkụ na mpụga ụlọ ikwu. 12Nʼotu aka ahụ, Jisọs nʼonwe ya tara ahụhụ na mpụga ọnụ ụzọ ama obodo ka o jiri ọbara ya mee ka ndị nke ya dị nsọ. 13Ya mere, ka anyị gakwuru ya nʼazụ ụlọ ikwu soro ya die mkparị o diri. 14Nʼihi na ụwa abụghị ụlọ anyị, ma anyị na-ele anya obodo nke gaje ịbịa. 15Site na ya, ka anyị na-achụrụ Chineke aja otuto mgbe niile, nke bụ mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta aha ya. 16Unu echefula ime ihe ọma, meekwanụ ka ndị ọzọ soro unu kekọọ ihe unu nwere. Nke a bụ ụdị aja na-atọ Chineke ụtọ.
Oziọma
43Josef onye Arimatia, otu nʼime ndị otu nʼụlọ nzukọ, onye a na-asọpụrụ, onye na-echere ọbịbịa nke alaeze Chineke, ji obi ike jekwuru Pailet rịọ ya ka o bunye ya ahụ Jisọs. 44Ọ juru Pailet anya ịnụ na ọ nwụọla. Ọ kpọrọ ọchịagha ahụ jụọ ya ma ọ nwụọla. 45Mgbe ọchịagha ahụ gwara ya na ọ nwụọla, o kwere ka Josef buru ahụ ya. 46Josef zụtara akwa ọcha linin, wedata ahụ ya jiri akwa ahụ fụchie ya. O buuru ya buba ya nʼime ili nke o gwuru nʼime nkume. Emesịa o nuketara otu nkume buru ibu, jiri ya mechie ọnụ ụzọ ili ahụ. 47Meri Magdalin na Meri nne Josef hụkwara ebe e bubara ahụ ya. 16:1Mgbe ụbọchị izuike gafere, Meri Magdalin na Meri nne Jemis na Salomi zụtara ụda dị iche iche ha ga-eji tee ahụ ya mmanụ. 2Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu, mgbe anyanwụ wara, ha biliri gawa nʼili ahụ. 3Ha jụrịtara onwe ha na-asị, “Onye ga-enupuru anyị nkume ahụ dị nʼọnụ ụzọ ili ahụ?” 4Ma mgbe ha leliri anya, ha hụrụ na e nupụla nkume ukwu ahụ. 5Mgbe ha banyere nʼime ili ahụ, ha hụrụ otu nwokorobịa yi uwe ọcha ka ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ aka nri nke ili ahụ. Ha tụrụ oke egwu. 6Ma ọ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Unu na-achọ Jisọs onye Nazaret a kpọgidere nʼobe. E meela ka o site nʼọnwụ bilie! Ọ nọkwaghị nʼebe a. Lee ebe e nibere ya. 7Ma gaanụ gwa ndị na-eso ụzọ ya nakwa Pita, ‘O burula unu ụzọ gawa Galili. Ebe ahụ ka unu ga-ahụ ya dị ka ọ gwararịị unu.’ ” 8Ha gbapụtara site nʼili ahụ, nʼọnọdụ mgbagwoju anya na ahụ ịma jijiji. Ha akọrọghị onye ọbụla ihe ọbụla, nʼihi na egwu jupụtara ha obi.
Oziọma (maka Onye nsọ Teodosiọs)
27“Nna m enyefeela m ihe niile nʼaka. Ọ dịghị onye maara Ọkpara ahụ ma ọ bụghị Nna ya. Ọ dịkwaghị onye maara Nna karịa Ọkpara ahụ na ndị Ọkpara ahụ kwadoro igosi Nna ya. 28“Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike. 29Nyaranụ yoku nke m nʼolu unu, mụtakwanụ ihe site nʼaka m. Nʼihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nʼobi. Unu ga-achọtakwara mkpụrụobi unu izuike. 30Nʼihi na yoku m dị mfe, ibu m adịghịkwa arọ.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 3 Mee na kalenda nzukọ bụ 16 Mee na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike