Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 1 Mee
Kalenda Ọtọdọks · 18 Eprel (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 1 Mee 2027
Satọdee · Izu Nsọ
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee Ukwu na Nsọ
Oge Lent Ukwu
Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe ụtụtụ (amụma)
1Aka nke Onyenwe anyị dịkwasịrị m, o sitekwara nʼike Mmụọ nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bulie m, debe m nʼetiti ndagwurugwu nke jupụtara nʼọkpụkpụ. 2O mere ka m jegharịa nʼetiti ha. Ahụrụ m ọkpụkpụ kpọrọ nkụ, nke dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, ka ha ghasa na ndagwurugwu ahụ. 3Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ọkpụkpụ ndị a ha pụrụ ịdị ndị ọzọ?” Asịrị m, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ọ bụ naanị gị onwe gị maara.” 4Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Buo amụma nye ọkpụkpụ ndị ahụ, gwa ha, ‘Unu ọkpụkpụ niile kpọrọ nkụ, geenụ ntị nʼokwu nke Onyenwe anyị. 5Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-agwa ọkpụkpụ ndị a. Lee, aga m eme ka ume baa nʼime unu, unu ga-adịkwa ndụ. 6Aga m etinyekwasị unu akwara, na anụ ahụ, werekwa akpụkpọ ahụ kpuchie unu. Aga m etinye ume nʼime unu, unu ga-adịkwa ndụ. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ” 7Ya mere, eburu m amụma dịka e sị nye m nʼiwu. Mgbe m nọ na-ebu amụma ahụ, anụrụ m ụzụ, ụzụ mkpọtụ. Ma lee, ọkpụkpụ ndị ahụ niile bịara ibe ha nso; ọkpụkpụ malitekwara ijikọta onwe ha ọnụ. 8Mgbe m nọkwa na-ele anya, lee, ahụrụ m ka akwara na anụ ahụ malitere ịbịakwasị nʼelu ọkpụkpụ ndị ahụ, akpụkpọ ahụ kpuchikwara elu ha. Ma nʼoge a ume ọbụla adịghị nʼime ha. 9Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Buo amụma nye ifufe; buo amụma, nwa nke mmadụ, sị ifufe, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: site nʼakụkụ anọ nke ụwa bịa, gị ume na-enye ndụ, kukwasị ndị a e gburu egbu ka ha dịkwa ndụ ọzọ.’ ” 10Ya mere, eburu m amụma dịka o si nye m nʼiwu. Ume ndụ banyekwara nʼime ha. Ha niile dịịrị ndụ, bilie ọtọ, guzo nʼụkwụ ha, ghọọ usuu ndị agha dị ukwuu nʼọnụọgụgụ. 11Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, ọkpụkpụ ndị a nọchiri anya ụlọ Izrel niile. Ha na-asị, ‘Anyị aghọọla ọkpụkpụ kpọrọ nkụ, olileanya niile agwụkwala, anyị abụrụla ndị e bipụrụ.’ 12Nʼihi ya, buo amụma gwa ha, ‘otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ndị m, aga m emeghe ili unu, si nʼebe ahụ wepụta unu. Aga m eme ka unu lọghachitakwa nʼala Izrel. 13Nʼikpeazụ, mgbe m meghere ili unu mee ka unu si nʼime ya pụta, unu bụ ndị m ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. 14Aga m etinye Mmụọ m nʼime unu, unu ga-adị ndụ, lọghachikwa nʼala unu ọzọ. Unu ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, ekwuola ya, meekwa ya, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.’ ”
Ofufe ụtụtụ: Akwụkwọ ozi
6Ịnya isi unu ezighị ezi. Ọ bụ unu amaghị na nwantakịrị yiist a gwakọrọ nʼụtụ ọka na-eme ka o koo? 7Wepụnụ ihe nʼeko achịcha a nọ nʼetiti unu, ka unu bụrụ ndị dị ọhụrụ, na ndị dị ọcha. Nʼihi na a chụọlarị Kraịst, bụ aja nwa atụrụ, nke Ngabiga anyị. 8Nʼihi ya ka anyị mee mmemme a na-ejighị ihe na-eko achịcha nke bụ ihe ọjọọ na obi ọjọọ, kama ka anyị jiri achịcha na-ekoghị eko nke bụ obi ọcha na eziokwu. 3:13Ma Kraịst agbapụtala anyị site nʼọbụbụ ọnụ ahụ nke idebe iwu gaara ewetara anyị. Ọ ghọrọ ọbụbụ ọnụ nʼihi anyị. Nʼihi na e deela ya nʼakwụkwọ nsọ, “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke a kwụbara nʼelu osisi.” 14Ọ dị otu a ka ngọzị ahụ e nyere Ebraham bụrụkwa nke ndị mba ọzọ site na Kraịst Jisọs. Ka anyị niile site nʼokwukwe nata nkwa ahụ, bụ Mmụọ Nsọ.
Ofufe ụtụtụ: Oziọma
62Nʼechi ya, nke bụ ụbọchị na-eso ụbọchị Nkwadebe, ndịisi nchụaja na ndị Farisii zukọrọ jekwuru Pailet. 63Ha kwuru sị, “Nna anyị ukwu, anyị na-echeta na mgbe onye ụgha ahụ dị ndụ, ọ sịrị na ya ga-esi nʼọnwụ bilie mgbe ụbọchị atọ gasịrị. 64Ya mere, nye iwu ka ndị agha gị na-eche ili ya nche, ruo mgbe ụbọchị atọ gasịrị. Nke a ga-egbochi ndị na-eso ụzọ ya ịga zuru ozu ya. Ka ha ghara ị sịkwa ndị mmadụ na o sitela nʼọnwụ bilie. Ọ bụrụ na ha agha ụgha dị otu a, ọ ga-ajọrọ anyị njọ mgbe ahụ karịa na mbụ.” 65Pailet gwara ha sị, “Unu nwere otu ndị agha na-eche nche, kpọrọnụ ha gaa mechisie ili ahụ ike dị ka unu si maara eme.” 66Ya mere, ha kpọrọ ndị agha gaa mechizie ọnụ ili ahụ. Ha kakwara akara nʼelu nkume ahụ.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (Ihe ọgụgụ nke 1)
1Na mmalite Chineke kere eluigwe na ụwa. 2Ụwa bụ ihe na-enweghị ụdịdị ọbụla, bụrụkwa ihe tọgbọrọ nʼefu. Ọchịchịrị gbara nʼelu ogbu mmiri dị omimi. Mmụọ nke Chineke na-erugharị nʼelu ogbu mmiri ahụ. 3Mgbe ahụ Chineke kwuru sị, “Ka ìhè dị,” ìhè dịkwara. 4Chineke hụrụ na ìhè ahụ mara mma. Ọ kpara oke nʼetiti ìhè na ọchịchịrị. 5Chineke kpọrọ ìhè ahụ Ehihie, kpọọ ọchịchịrị ahụ Abalị. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke mbụ. 6Chineke kwukwara sị, “Ka mbara pụta nke ga-ekewapụ mmiri dị nʼelu mbara ahụ site na mmiri nke dị nʼokpuru mbara ahụ” 7Ya mere, Chineke mere mbara, kewapụ mmiri dị nʼokpuru mbara ahụ site na mmiri nke dị nʼelu mbara ahụ. O sikwa otu a dịrị. 8Mbara ahụ ka Chineke kpọrọ mbara eluigwe. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke abụọ. 9Chineke kwuru sị, “Ka mmiri dị nʼokpuru mbara eluigwe chịkọta onwe ha ọnụ nʼotu ebe, ka ala akọrọ pụta.” O sikwa otu a dịrị. 10Chineke kpọrọ ala akọrọ ahụ “ala,” kpọọ mmiri ahụ chịkọtara onwe ha ọnụ “osimiri.” Chineke lere anya hụ na ha dị mma. 11Chineke kwuru sị, “Ka ala pupụta ahịhịa ndụ dị iche iche: ahịhịa na-amịpụta mkpụrụ, na osisi dị nʼelu ala nke na-amịpụta mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ya, dịka ụdịdị ha dị iche iche si dị.” O sikwa otu a dịrị. 12Ala puputara ahịhịa ndụ dị iche iche: ahịhịa na-amịpụta mkpụrụ dịka ụdịdị ha si dị, na osisi na-amịpụta mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ya, dịka ụdịdị ha si dị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma. 13Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke atọ.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (Ihe ọgụgụ nke 2)
1“Bilie, mụkee, nʼihi na ìhè gị abịala, ebube Onyenwe anyị awaakwala nʼahụ gị dịka anyanwụ. 2Lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa niile, oke ọchịchịrị na-ekpuchi ndị niile bi nʼụwa, ma Onyenwe anyị ga-awa dịka anyanwụ nʼahụ gị ebube ya ga-achakwa ka ihe nʼebe i nọ. 3Mba niile dị iche iche ga-abịakwute ìhè gị, ndị eze niile ga-abịaru mmụke nke ọwụwa gị. 4“Welienụ anya unu abụọ elu legharịa gburugburu unu, ha niile na-ezukọta na-abịakwute gị; ụmụ gị ndị ikom na-esi nʼebe dị anya bịa, ụmụ gị ndị inyom ka a ga-ekukwa nʼụkwụ. 5Mgbe ahụ, ị ga-elepụ anya ma chakee, obi gị ga-atọ gị ụtọ, saa mbara nʼihi ọṅụ, nʼihi na akụ niile nke osimiri ka a ga-ewebatara gị, akụnụba nke ọtụtụ mba ga-abịara gị. 6Ọtụtụ igwe ịnyịnya kamel nke si Midia na Efaa ga-ejupụta nʼala gị, ma ndị sikwa nʼobodo Sheba ga-ebutere gị ọlaedo na ụda na-esi isi ụtọ. Ha ga-ekwusakwa otuto Onyenwe anyị. 7A ga-enye gị igwe ewu na atụrụ niile nke ndị Keda. Ebule niile nke Nebaiot ga-abụ nke gị. A ga-anabata ha dịka onyinye nʼelu ebe ịchụ aja m. Aga m edozi ụlọnsọ m dị ebube, mee ya ka ọ maa mma karịa. 8“Olee ndị bụ ndị a na-efegharị dịka igwe ojii, ndị na-efegharị dịka ụmụ nduru na-efeba nʼakwụ ha? 9Nʼezie, mụ ka ala ndị ahụ mmiri gbara gburugburu na-echere; ụgbọ niile nke Tashish ga-ebukwa ụzọ, na-ebughachi ụmụ gị site nʼebe dị anya, ha na ọlaọcha na ọlaedo ha niile. Inye Onyenwe anyị bụ Chineke gị nsọpụrụ, Onye nsọ nke Izrel, nʼihi na ọ jirila ịma mma gọzie gị. 10“Ndị mba ọzọ ga-abịa wuziere unu mgbidi unu niile. Ndị na-achị achị na ndị eze ha niile ga-ejere unu ozi. Ọ bụ ezie na m tikpọrọ gị nʼiwe m, ma site nʼamara m, aga m emere gị ebere. 11Ọnụ ụzọ ama gị ga-eghe oghe oge niile site nʼụtụtụ ruo nʼụtụtụ, ịnabata akụ niile si na mba dị iche iche. A ga-edurukwa ndị eze dị iche iche bata nʼime ya nʼọnọdụ ndị a dọtara nʼagha. 12Mba ọbụla jụrụ ijere gị ozi ga-ala nʼiyi; a ga-ekpochapụ ha. 13“Otuto niile na ịma mma niile nke Lebanọn ga-abụ nke gị. Osisi junipa, na osisi fịa, na osisi junipa, na osisi saipres, ka a ga-eji chọọ ụlọnsọ m mma. Aga m emekwa ka ebube jupụta nʼebe ahụ ụkwụ m na-adị mgbe niile. 14Ụmụ ndị na-emegbu gị ga-abịa kpọọ isiala nye gị. Ndị ahụ niile na-elelị gị ga-abịa daa nʼala nʼihu gị sutu ụkwụ gị ọnụ. Ha ga-akpọ Jerusalem, Obodo Onyenwe anyị, Zayọn nke Onye nsọ Izrel. 15“Ọ bụ ezie na ọ dị mgbe ị bụ onye a kpọrọ asị, onye a na-emegbu, onye mmadụ niile na-eweda nʼala, ma ugbu a, ị ga-ama mma ruo ebighị ebi; ị ga-abụ ihe na-ewetara ọgbọ niile nke ụwa ọṅụ, nʼihi na otu a ka m ga-eme gị. 16Ị ga-aṅụ mmiri ara nke mba dị iche iche, ọ bụkwa ara ndị eze ka a ga-eji zuo gị. Mgbe ahụ, ị ga-amata nʼezie na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nzọpụta gị na Onye mgbapụta gị, Onye dị ike nke Jekọb.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (Ihe ọgụgụ nke 3)
1Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu nʼala Ijipt sị ha, 2“Ọnwa a ga-abụrụ unu isi ọnwa. Ọ ga-abụ ọnwa mbụ nke ọnwa niile nʼafọ unu. 3Gwa ọgbakọ ụmụ Izrel niile okwu sị ha, Nʼafọ ọbụla, nʼabalị iri nke ọnwa a, nwoke ọbụla ga-eweta nwa atụrụ nʼisi ezinaụlọ ọbụla. 4Ezinaụlọ ọbụla nke dịkarịrị nta, nke na-enweghị ike iweta na iricha otu nwa atụrụ, ga-ejekwuru ezinaụlọ ọzọ dịkwa nta, ka ha jikọtaa onwe ha ọnụ weta nwa atụrụ. Ndị ga-ejikọta onwe ha ọnụ aghaghị ibu ụzọ pịa mmadụ ole ha ga-adị nwee ike richaa otu atụrụ. 5Nwa atụrụ a ga-eweta ga-abụ oke gbara naanị otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ ọbụla nʼahụ ya. Unu nwere ike họrọ atụrụ maọbụ ewu. 6Unu ga-elekọta ya anya ruo nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa a. Nʼabalị ụbọchị ahụ ka ọgbakọ Izrel niile ga-egbu ya. 7Ha ga-ewere ọbara ya tee nʼelu na nʼakụkụ ibo ọnụ ụzọ nke dị nʼezinaụlọ ha niile, ebe ha ga-anọ rie anụ atụrụ ahụ. 8Ha ga-eri anụ atụrụ a, nke a ga-ahụ nʼọkụ nʼabalị ahụ, ya na achịcha na-ekoghị eko, na ahịhịa ndụ na-elu ilu. 9A gaghị eri nwa atụrụ ọbụla na ndụ, a gaghị esikwa ya esi, kama a ga-ahụ ya nʼọkụ. A ga-ahụ akụkụ ahụ nwa atụrụ ọbụla nʼọkụ, tinyere isi ya, ụkwụ ya na ihe dị nʼime afọ ya. 10Unu agaghị erifọdụ ya ruo nʼụtụtụ echi ya. Nke ọbụla ga-afọdụ nʼabalị ahụ, a ga-akpọ ya ọkụ. 11Otu a ka unu ga-esi rie ya: yirinụ uwe unu, na akpụkpọụkwụ unu. Jirikwanụ mkpara unu. Jikerenụ dịka ndị na-aga njem dị anya. Unu ga-eri anụ atụrụ a na achịcha na-ekoghị eko ngwangwa. A ga-akpọ oriri a Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (Ihe ọgụgụ nke 4)
1Okwu Onyenwe anyị bịakwutere Jona nwa Amitai, na-asị, 2“Bilie, gaa Ninive, bụ obodo ukwu ahụ, kwusaa okwu megide ya, nʼihi na ajọ omume ha abịarutela nʼihu m.” 3Ma Jona gbapụrụ ọsọ site nʼihu Onyenwe anyị chee ihu ya ije Tashish. O biliri jee Jopa, nʼebe ọ hụrụ ụgbọ mmiri nke na-aga Tashish. Ọ kwụrụ ụgwọ ije ụgbọ, banye isoro gaa Tashish ka o nwee ike gbapụ site nʼihu Onyenwe anyị. 4Ma Onyenwe anyị mere ka ifufe dị egwu malite ife nʼelu osimiri ahụ, ebili mmiri bidokwara na-amagharị, chọọ itiwasị ụgbọ mmiri ahụ. 5Mgbe ahụ, ndị niile na-arụ ọrụ nʼụgbọ ahụ tụrụ oke egwu, malite itiku chi ha. Ha malitekwara itufu ihe niile dị nʼụgbọ mmiri ahụ, ime ka ụgbọ ahụ dị mfe. Ma nʼoge ihe ndị a na-eme, Jona nọrịị nʼala ala ụgbọ mmiri ahụ ebe o dinara ala na-arahụ ụra. 6Onyeisi ụgbọ jekwuru Jona sị ya, “Gịnị ka ị nọ nʼebe a na-eme, ị na-arahụ ụra? Bilie, kpọkuo chi gị, ma eleghị anya o nwere ike ileta anyị anya, meere anyị ebere, zọpụta anyị.” 7Mgbe ahụ, ndị nọ nʼụgbọ sịrịtara ibe ha, “Bịanụ ka anyị fee nza mata onye ihe ọjọọ dị otu a sị nʼaka ya bịakwasị anyị.” Ya mere, ha fere nza, nza ahụ a maa Jona. 8Nʼihi ya, ha sịrị ya, “Gwa anyị, onye mere ka ihe dị otu a bịakwasị anyị. Gịnị bụ ọrụ gị? Ebee ka i si bịa? Ị bụ onye obodo ebee? Ole agbụrụ i si na ya pụta?” 9Ọ sịrị, “Abụ m onye Hibru, na onye na-akpọ isiala nye Onyenwe anyị, bụ Chineke nke eluigwe, onye kere osimiri na ala akọrọ.” 10Egwu dị ukwuu tụrụ ụmụ nwoke ahụ, ha sịrị ya, “Gịnị ka i mere?” Nʼihi na ha matara na o si nʼihu Onyenwe anyị na-agbapụ ọsọ, nʼihi na ọ gwala ha rịị na ọ bụ otu o si dị. 11Ma ebili mmiri ahụ gara nʼihu na-amali nʼike nʼike. Nʼihi ya, ha sịrị, “Gịnị ka anyị ga-eme gị, nke ga-eme ka osimiri dajụọ?” 12Ọ gwara ha, “Bulienụ m tụnye nʼime osimiri. Nke a ga-emekwa ka ọ dajụọ. Nʼihi na amaara m na ọ bụ nʼihi m ka ebili mmiri ọjọọ a ji na-abịakwasị unu.” 13Kama, ndị ikom ahụ ji ike nyasie ụgbọ ahụ ichigharị ya laghachi nʼelu ala, ma ha enweghị ike. Nʼihi na oke osimiri ahụ na-amali elu karịa ka ọ dị na mbụ. 14Mgbe ahụ, ha tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa sị, “ Onyenwe anyị, biko ekwela ka anyị nwụọ nʼihi ọnwụ nwoke a. Biko, atụkwasịkwala ọbara nwoke a na-emeghị ihe ọjọọ nʼisi anyị, nʼihi na gị Onyenwe anyị emeela dịka i si chọọ.” 15Ya mere, ha buliri Jona elu tụnye ya nʼime osimiri ahụ, ebili mmiri ahụ dajụkwara. 16Mgbe nke a mere ndị ikom ahụ tụrụ egwu Onyenwe anyị nke ukwuu. Ha chụụrụ Onyenwe anyị aja, kwekwa ya nkwa dị iche iche. 17Ma Onyenwe anyị akwadolarị otu azụ buru ibu ka o loo Jona. Ya mere, Jona nọrọ nʼafọ azụ ahụ ụbọchị atọ, ehihie na abalị. 2:1Mgbe ahụ, Jona sitere nʼafọ azụ ahụ kpeere Onyenwe anyị Chineke ekpere. 2Ọ sịrị, “Esitere m nʼahụhụ m kpọkuo Onyenwe anyị, ọ zakwara m. Nʼafọ ala mmụọ ka m si tikuo gị, ị nụkwara olu akwa m. 3Ị tụnyere m nʼime mmiri dị omimi, nʼetiti oke osimiri. Osimiri dịkwa m gburugburu, ebili mmiri gị na mmali mmiri gị gabigakwara m nʼisi. 4Mgbe ahụ, asịrị m, ‘E sitela nʼihu gị chụpụ m; ma otu ọ dị, aga m elegidekwa anya m ọzọ nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị.’ 5Mmiri gbara m gburugburu, ruo nʼolu m, ogbu mmiri na-erikpu m. Achara mmiri kekụkwara m nʼisi. 6Arịdaruola m nʼala ugwu ugwu nke osimiri, ala ahụ ihe ntụchi ya niile kpachitara m ruo mgbe ebighị ebi. Ma i meela ka m si nʼolulu pụta na ndụ, Onyenwe anyị, bụ Chineke m. 7“Mgbe mmụọ m na-ada mba nʼike nʼike, e chetara m gị Onyenwe anyị, ma ekpere m bịakwutere gị, nʼime ụlọnsọ ukwu gị dị nsọ. 8“Ndị na-arapara nʼarụsị dị iche iche na-enweghị uru ha bara, na-agbakụta ebere Chineke azụ. 9Ma ọ bụ olu abụ ekele ka mụ onwe m ga-eji chụọrọ gị aja. Aga m akwụghachi nkwa niile m kwere. Nʼihi na ‘Nzọpụta bụ nke Onyenwe anyị.’ ” 10Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere azụ ahụ iwu, nke mere ka ọ gbọpụta Jona nʼala akọrọ. 3:1Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jona ntị nke ugboro abụọ na-asị, 2“Bilie, jee nʼobodo ukwu ahụ bụ Ninive, kwusaara ya ozi ahụ m ziri gị.” 3Jona biliri gaa Ninive dịka okwu nke Onyenwe anyị si dị. Ninive bụ nnọọ obodo dị ukwuu, nke ga-ewe ụbọchị atọ ịga ya gburugburu. 4Jona malitere ịba nʼobodo ahụ, ma mgbe ọ gara ije otu ụbọchị, o kwusara sị, “Iri ụbọchị anọ ka ọ fọdụrụ tupu alaa Ninive nʼiyi.” 5Ndị Ninive kwenyeere na Chineke, kpọsaa obubu ọnụ, ha niile site nʼonye ukwu ruo nʼonye nta, onye ọbụla yikwasịrị uwe mkpe. 6Mgbe akụkọ a rutere eze Ninive ntị, o sitere nʼocheeze ya rituo, wezuga uwe eze ya, yikwasị uwe mkpe, nọkwasịkwa na ntụ. 7Nke a bụ nkwusa ya nʼime Ninive: Nke a bụ iwu sitere nʼaka eze na ndị a maara aha ha: “Ka mmadụ ọbụla, maọbụ anụmanụ, igwe ehi maọbụ anụ ụlọ ọbụla, ghara idetu ihe ọbụla nʼọnụ, ka ha ghara iri ihe maọbụ ṅụọ mmiri. 8Kama ka onye ọbụla yiri akwa mkpe, ma mmadụ ma anụmanụ, ka ha kpọkusikwaa Chineke ike, ka ha sikwa nʼụzọ ọjọọ ha chegharịa, sikwa nʼọrụ ọjọọ ha na ime ihe ike ha niile chegharịa. 9Onye maara? Ma eleghị anya, Chineke ga-ejide oke iwe ya, ma site nʼọmịiko ya wezuga iwe ọkụ ya si otu a mee ka anyị ghara ịla nʼiyi.” 10Mgbe Chineke hụrụ ihe niile ha mere, na otu ha siri site nʼụzọ ọjọọ ha niile chegharịa, Chineke chegharịrị uche banyere ịla ha nʼiyi. O mekwaghị ka nzube ya ibibi obodo ahụ mezuo. 4:1Ma ihe a jọrọ Jona njọ nʼobi nke ukwuu, iwe ya dịkwa ọkụ. 2Nʼihi ya, o kpeere Onyenwe anyị ekpere sị, “O, Onyenwe anyị, nke a ọ bụghị ihe m kwuru, mgbe m nọ nʼala m? Ọ bụ ya mere m ji chọọ ịgbalaga na Tashish na mbụ nʼihi na amaara m na ị bụ Chineke onye na-eme amara, na onye jupụtara nʼobi ebere, na onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, nke bara ụba nʼịhụnanya, onye na-anaghị ata mmadụ ahụhụ dịka mmehie ya siri dị. 3Ugbu a, O, Onyenwe anyị napụ m ndụ m. Ọ ga-adị m mma ịnwụ anwụ karịa ịdị ndụ.” 4Ma Onyenwe anyị sịrị, “O ziri ezi na ị ga-esi otu a wee oke iwe dị ọkụ?” 5Mgbe ahụ, Jona si nʼebe ahụ pụọ jee nọdụ ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke obodo ahụ. O weere ahịhịa meere onwe ya ụlọ ndo, nọdụ nʼime ya, chere ka ọ hụ ihe gaje ime obodo ahụ. 6Ma Onyenwe anyị Chineke rọpụtara otu osisi nwere akwụkwọ sara mbara, nke tolitere nʼelu isi Jona, ka o ghọọrọ ya ndo ịnapụta ya nʼọnọdụ ahụ mgbakasị. Jona ṅụrịrị ọṅụ maka osisi ahụ. 7Ma nʼisi ụtụtụ echi ya, Chineke mere ka otu ikpuru pụta nke riri osisi ahụ site nʼogwe ya, si otu a mee ka ọ kpọnwụọ. 8O ruo, mgbe anyanwụ wara, Chineke mere ka ifufe na-ekpo ọkụ site nʼọwụwa anyanwụ, anyanwụ a chara Jona nʼisi nke ukwuu nke mere nʼike gwụsịrị ya. Ọ rịọrọ ka ọnwụ gbuo ya, na-asị, “ọ ga a kaara m mma na m nwụrụ anwụ, karịa na m dị ndụ.” 9Ma Chineke sịrị Jona, “Ọ bụ ihe ziri ezi ka i wee iwe maka osisi a?” Ọ sịrị, “E, ana m ewe oke iwe, ọ bụladị na m chọrọ ịnwụ.” 10Mgbe ahụ Onyenwe anyị kwuru, “I nwere obi ebere nʼebe osisi a dị, nke ị na-akụghị na nke i mekwaghị ka o too, bụ nke toro nʼanyasị, nwụọkwa nʼanyasị. 11Mụ onwe m, m ga-aghara inwe obi ebere nʼahụ obodo ukwu a dịka Ninive, nke nwere ihe karịrị narị puku ndị mmadụ na iri puku mmadụ abụọ, bụ ndị na-amaghị nke bụ aka nri ha maọbụ aka ekpe ha, na nke ọtụtụ anụmanụ dịkwa nʼime ya?”
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (Ihe ọgụgụ nke 5)
10Mgbe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha na Gilgal nʼala ihe nʼadịghị nke Jeriko, ha mere Mmemme Ngabiga nʼuhuruchi nke ụbọchị iri na anọ nke ọnwa ahụ. 11Nʼụbọchị sotere ụbọchị ngabiga, nʼotu ụbọchị ahụ, ha riri ụfọdụ ihe ubi nke ala Kenan. Ọ bụ achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, na ọka ahụrụ nʼọkụ ka ha tara. 12Mánà kwụsịkwara nʼechi ya mgbe ha riri nri sitere nʼala ahụ. Ụmụ Izrel ahụkwaghị mánà anya ọzọ, ma nʼafọ ahụ ha riri ihe omume ubi si nʼala Kenan. 13Mgbe Joshua nọ nso obodo Jeriko, o weliri anya ya elu hụ otu nwoke ka o guzo nʼihu ya. Nwoke a mịpụtara mma agha ya jide ya nʼaka ya. Joshua jekwuru ya jụọ ya sị ya, “Ị dịnyeere anyị ka ị dịnyeere ndị iro anyị?” 14Nwoke ahụ zaghachiri ya sị, “Ọ dịghị onye m dịnyeere, kama abịara m ugbu a dịka ọchịagha usuu ndị agha Onyenwe anyị.” Joshua dara nʼala kpuo ihu ya nʼala kpọọ isiala nye ya, sị ya, “Ejikerela m ime ihe ọbụla i nyere nʼiwu. Onyenwe m, gịnị ka ị chọrọ ka m mee?” 15Ọchịagha usuu ndị agha Onyenwe anyị zara sị Joshua, “Yipụ akpụkpọụkwụ gị, nʼihi na ebe ahụ i guzo bụ ala dị nsọ.” Joshua mere dịka ọ gwara ya.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (Ihe ọgụgụ nke 6)
20Ha si Sukọt bilie ije, maa ụlọ ikwu ha na Etam, na nsọtụ ọzara. 21Onyenwe anyị ji ogidi igwe ojii na-eje nʼihu ha nʼehihie, idu ha nʼụzọ ha niile. Nʼabalị, o ji ogidi ọkụ, inye ha ìhè ka ha nwee ike ịga njem nʼehihie nakwa nʼabalị. 22Ma ogidi igwe ojii nʼehihie na ogidi ọkụ ahụ nʼabalị, ọ dịghị nke hapụrụ ọnọdụ ya nʼihu ha. 14:1Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis, 2“Gwa ụmụ Izrel ka ha chigharịa azụ jee maa ụlọ ikwu ha na ncherita ihu Pi Hahirot, nke dị nʼetiti Migdol na osimiri. Ọ bụ nʼakụkụ osimiri, na ncherita ihu obodo Baal-Zefọn ka ha ga-ama ụlọ ikwu ha. 3Fero ga-asị banyere ụmụ Izrel, ‘Ha na-awagharị gburugburu ala ahụ nʼọnọdụ mgbagwoju anya ebe ọzara riri ha.’ 4Aga m eme ka obi Fero sie ike ka ọ chụso unu ọsọ nʼazụ, ma m ga-ewetara onwe m otuto site na Fero na ndị agha ya niile. Ndị Ijipt niile ga-ama na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.” Ndị Izrel mekwara otu ahụ. 5Mgbe a gwara eze Ijipt na ndị a agbaala ọsọ, obi Fero na ndị ozi ya gbanwere megide ndị Izrel. Ha sịrị, “Gịnị bụ ihe anyị mere, site na izipụ ndị Izrel nʼọrụ ife anyị?” 6Na-atụfughị oge, Fero rigoro nʼelu ụgbọ agha ya, duru ndị agha ya ịchụso ha. 7Ọ chịịrị ụgbọ agha dị narị isii e leziri anya họpụta, tinyere ụgbọ agha Ijipt niile. Ndịisi agha ndị Ijipt nọcha nʼelu ha niile. 8Onyenwe anyị mere ka obi Fero eze Ijipt sie ike. Ọ chụsoro ụmụ Izrel, ndị na-aga nʼihu nʼije ha, na-atụghị egwu maọbụ ịda mba. 9Ndị Ijipt chụsoro ha ọsọ, ịnyịnya Fero na ụgbọ agha, na ndị na-agba ịnyịnya na ndị agha ndị ọzọ chụsoro ndị Izrel ọsọ chụkwute ha nʼebe ha na-ezu ike nʼakụkụ osimiri dị nso na Pi Hahirot na ncherita ihu Baal-Zefọn. 10Mgbe ndị agha Fero na-abịa nso, ndị Izrel lere anya nʼazụ, hụ ndị Ijipt ka ha na-abịa nso. Ha tụrụ egwu, tie mkpu akwa, kpọkuo Onyenwe anyị. 11Ha jụrụ Mosis sị, “Ọ bụ na o nweghị ili dị nʼala Ijipt, i ji kwagide anyị ka anyị niile bịa nwụọ nʼebe a nʼọzara? Gịnị mere i ji kwagide anyị ka anyị hapụ Ijipt? 12Ọ bụ na anyị agwaghị gị nʼala Ijipt si gị, ‘Hapụ anyị ka anyị nọgide na-ejere ndị Ijipt ozi?’ Ọ gara akara anyị mma ị bụ ohu ndị Ijipt karịa ịnwụ nʼọzara.” 13Mosis zaghachiri ha sị, “Unu atụla egwu. Guzosienụ ike. Unu ga-ahụ ụzọ dị ebube Onyenwe anyị ga-esi zọpụta unu taa. Ndị Ijipt a unu na-ahụ taa, unu agaghị ahụkwa ha ọzọ. 14Nọrọnụ jii. Onyenwe anyị ga-alụrụ unu ọgụ.” 15Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Gịnị mere i ji na-akpọku m. Gwa ụmụ Izrel ka ha gaa nʼihu. 16Welie mkpanaka gị elu. Setịpụ ya nʼelu osimiri ahụ ka o kewaa abụọ. Ụzọ ga-adịkwa nʼetiti osimiri ahụ. Ụmụ Izrel ga-esitekwa nʼala akọrọ gafee. 17Aga m eme ka obi ndị Ijipt sie ike, ka ha sorokwa unu nʼazụ banye. Aga m ewetara onwe m otuto site na Fero, na ndị agha niile, na ụgbọ agha niile nakwa ndị na-agba ịnyịnya ya. 18Nʼoge ahụ, ndị Ijipt ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. M ga-enweta nsọpụrụ site na Fero, na ụgbọ agha ya niile, na ndị na-agba ịnyịnya ya.” 19Mgbe ahụ, mmụọ ozi Chineke, onye na-aga nʼihu ndị agha Izrel, sitere nʼihu pụọ gaa nọdụ nʼazụ ha. Otu a kwa, ogidi igwe ojii ahụ sitere nʼihu gaa nʼazụ ha. 20Nke a mere ka ogidi igwe ojii ahụ dịrị nʼetiti ụmụ Izrel na ndị Ijipt. Nʼabalị ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị mere ka ogidi igwe ojii ahụ nye ụmụ Izrel ìhè, ma ndị Ijipt nọgidere nʼọchịchịrị. Otu a, ndị Ijipt enweghị ike bịarute nʼebe ụmụ Izrel nọ. 21Mgbe ahụ, Mosis setịpụrụ aka ya nʼelu Osimiri Uhie ahụ. Onyenwe anyị ji oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ, nke fere nʼabalị ahụ niile, nughachi osimiri ahụ, mee ka osimiri ahụ kebie ụzọ abụọ, ka ụzọ pụta nʼala osimiri ahụ. 22Ụmụ Izrel sitere nʼetiti osimiri ahụ gafee. Mmiri osimiri ahụ ghọọrọ mgbidi nʼaka nri ha ma nʼaka ekpe ha. 23Mgbe ndị agha Ijipt na-achụ ha ọsọ hụrụ ha ka ha na-agafe, ha sogidere ha baa, ọ bụladị nʼetiti osimiri ahụ. Ndị agha Ijipt niile sooro ha, ya bụ, ụgbọ agha Fero, ndị agha ya na ndị na-agba ịnyịnya ya niile. 24Nʼisi ụtụtụ echi ya, Onyenwe anyị ledatara anya site nʼogidi igwe ojii ahụ na-enye ihe. O legidere ndị agha Ijipt anya, tinyekwa ha ụjọ nʼobi nke mere na ha amakwaghị onwe ha. 25O mebiri ụkwụ ụgbọ agha ha mee ka o siere ịnyịnya ha ike ịdọkpụ ụgbọ agha ndị ahụ. Mgbe ahụ, ndị Ijipt kwuru sị, “Ka anyị sinụ nʼịchụ ndị Izrel gbapụ, nʼihi na Onyenwe anyị na-alụrụ ha ọgụ, na-emegidekwa anyị.” 26Mgbe ụmụ Izrel gafesịrị ruo nʼakụkụ nke ọzọ nke osimiri ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Setịpụ aka gị ọzọ ka mmiri ahụ kpuchigide ndị Ijipt, na ụgbọ agha ha niile, na ndị na-agba ịnyịnya ya.” 27Mosis setịpụrụ aka nʼelu osimiri ahụ. Nʼụtụtụ ya, mmiri osimiri ahụ sọghachiri gaa ebe ọ nọ na mbụ. Ndị Ijipt chọsịrị ụzọ ha si agbapụ ike, ma Onyenwe anyị mere ka osimiri ahụ kpuchie ha. 28Osimiri ahụ kpuchigidere ụgbọ agha ha niile, na ndị na-agba ịnyịnya, na ndị agha Fero niile ndị chụụrụ ụmụ Izrel baa nʼime osimiri ahụ. O nweghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ. 29Ma ụmụ Izrel esitelarị nʼala nke mmiri kọrọ gafee osimiri ahụ. Mgbe ha na-agafekwa, akụkụ abụọ nke osimiri ahụ guzoro ọtọ dịka mgbidi, nʼaka nri ha ma nʼaka ekpe ha. 30Site nʼụzọ dị otu a, Onyenwe anyị zọpụtara ụmụ Izrel site nʼaka ndị Ijipt. Ụmụ Izrel hụkwara ozu ndị Ijipt nʼikpere mmiri osimiri ahụ. 31Ụmụ Izrel tụrụ egwu Onyenwe anyị mgbe ha hụrụ ihe ịrịbama ndị a Onyenwe anyị ji zọpụta ha site nʼaka ndị Ijipt. Ha kwenyere na Onyenwe anyị, kwenyekwa na Mosis ohu ya. 15:1Mgbe ahụ, Mosis na ụmụ Izrel bụkuru Onyenwe anyị abụ dị otu a sị, “Aga m abụku Onyenwe anyị abụ nʼihi na o buliela onwe ya elu nke ukwuu. Ọ tụnyela ịnyịnya na onye na-agba ya nʼosimiri. 2“ Onyenwe anyị bụ ike m na abụ m. Ọ ghọrọla m nzọpụta. Ọ bụ Chineke m, aga m etokwa ya, Chineke nke nna m, aga m ebulikwa ya elu. 3Onye na-ebu agha ka Onyenwe anyị bụ. Nʼezie, aha ya bụ Onyenwe anyị. 4Ụgbọ agha Fero na usuu ndị agha ya, ka ọ tụnyere nʼosimiri ahụ. Ndịisi agha Fero, ndị ahọrọ ahọ, ka o mere ka Osimiri Uhie rie. 5Ogbu osimiri ahụ ekpuchiela ha. Nʼime mmiri ahụ dị omimi ka ha rịdaruru dịka nkume. 6Aka nri gị Onyenwe anyị, dị ike, dịkwa ebube. Aka nri gị, Onyenwe anyị na-etipịasị ndị iro. 7“Nʼoke ike nke ịdị elu gị, Ị lụgbuola ndị niile na-ebili imegide gị. I zipụrụ iwe gị dị ọkụ, o repịara ha dịka igbugbo ọka. 8I sitere na nkuume nke oghere imi gị, mee ka mmiri osimiri guzoro ọtọ. Mmiri ahụ na-erugharị erugharị guzoro nʼotu ebe dịka mgbidi; ogbu mmiri kpụkọtara rahụ nʼala ala nsọtụ nke osimiri. 9Onye iro nyara isi sị, ‘Aga m achụso ha, gafee ha. Aga m ekesa ihe a kwatara nʼagha. Nyejuo onwe m afọ site na ha. Aga m amịpụta mma agha m. Jiri aka m laa ha nʼiyi.’ 10Ma i kupụrụ ikuku si gị nʼimi pụta, osimiri riri ha, ha mikpuru nʼime osimiri ukwu ahụ dịka igwe. 11Onye dịka gị Onyenwe anyị, nʼetiti chi niile? Onye dịka gị? Onye dị ebube nʼịdị nsọ. Onye otuto ya na-eyi egwu. Onye na-arụ ọrụ dị ebube? 12“I setịpụrụ aka nri gị, ala meghere ọnụ ya loo ndị iro gị niile. 13Site nʼebere gị, i dupụtara ndị ị zọpụtara. Sitekwa nʼike gị dị ebube, i duru ha ruo nʼebe obibi gị dị nsọ. 14Ụwa niile nụrụ ya, maa jijiji. Ndị Filistia ka oke ihe mgbu bịakwasịrị. 15Ndị eze Edọm ga-anọ nʼọnọdụ obi ịlọ mmiri. Ndị ndu Moab niile ga-abụ ndị ọma jijiji ga-ejidekwa, ndị Kenan niile nʼọnọdụ ịtụ egwu ga-agbaze; 16oke egwu na oke ụjọ ejidela ha. Site nʼike nke aka gị, ha ga-anọ jụụ dịka nkume, tutu ruo mgbe ndị gị, Onyenwe anyị, gafechara, tutu ruo mgbe ndị gị, ndị ị zụtara nye onwe gị, gafechara. 17Gị onwe gị ga-akpọbata ha, kụọ ha dịka mkpụrụ, nʼelu ugwu nke ihe nketa gị. Nʼebe ahụ, Onyenwe anyị, i mere ka ọ bụrụ ebe obibi gị, ebe nsọ ahụ, Onyenwe anyị, nke i ji aka gị tọọ ntọala ya. 18“ Onyenwe anyị ga-abụ eze ruo mgbe niile ebighị ebi.” 19Mgbe ịnyịnya Fero, na ụgbọ agha ya, na ndị na-agba ịnyịnya, gbabanyere nʼosimiri, Onyenwe anyị mere ka mgbidi mmiri ahụ dagbuo ha. Ma ụmụ Izrel sitere nʼala mmiri kọrọ gafee.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (Ihe ọgụgụ nke 7)
8Nʼihi nke a, cherenụ m,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “nʼụbọchị ahụ m ga-ebili ịgba akaebe. Mkpebi m bụ ịchịkọta mba niile dị iche iche, na ịkpọkọta alaeze niile, ịwụkwasị ha oke iwe m, ọ bụladị ọnụma niile nke iwe m. Ọkụ, nke iwe si nʼekworo m, ka a ga-eji rechapụ ụwa niile. 9“Mgbe ahụ, aga m anụcha egbugbere ọnụ ndị niile dị iche iche mee ka ọ bụrụ ihe dị ọcha, ka ha niile nwee ike ịkpọku aha Onyenwe anyị, ma jikọta aka fekwaa ya ofufe. 10Site nʼofe osimiri niile nke Kush, bụ ndị m a chụsasịrị achụsasị, ndị na-akpọ isiala nye m, ga-ewetara m onyinye dị iche iche. 11Nʼụbọchị ahụ, gị bụ Jerusalem, agaghị eme ka ihere mee gị, nʼihi omume njehie niile i jere megide m, nʼihi na aga m esite nʼetiti gị wezuga ndị gị niile na-aṅụrị ọṅụ na mpako ha. A gaghị ahụkwa ndị na-afụli onwe ha elu nʼugwu nsọ m. 12Ma aga m eme ka ndị dị nwayọọ nʼobi, na ndị dị umeala nʼobi fọdụ nʼetiti ndị Izrel, ha ga-agbabakwa nʼaha Onyenwe anyị. 13Ha agaghị emekwa ihe ọjọọ, ha agaghị ekwu okwu ụgha. Ire na-ekwu okwu aghụghọ agaghị adịkwa nʼọnụ ha. Ha ga-akpa nri ma dinakwa ala, ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ha tụọ egwu.” 14Bụọ abụ, gị nwaada Zayọn; tie mkpu, gị Izrel. Ṅụrịa ọṅụ, e, jiri obi gị niile ṅụrịa ọṅụ, gị nwaada Jerusalem. 15Nʼihi na Onyenwe anyị ewezugala ahụhụ dịrị gị, chụghachikwa ndị iro gị azụ. Onyenwe anyị, onye bụ Eze Izrel, nọ nʼetiti gị. Ị gaghị atụkwa egwu ihe ọjọọ ọzọ.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (Ihe ọgụgụ nke 8)
8Okwu Onyenwe anyị bịakwutere ya, 9“Bilie, jee Zarefat, obodo dị Saịdọn nso, biri nʼebe ahụ. O nwere otu nwanyị di ya nwụrụ, onye m nyere iwu ka o nye gị nri.” 10Ịlaịja biliri jee Zarefat. Mgbe o ruru ọnụ ụzọ ama e si abanye obodo ahụ, ọ hụrụ otu nwanyị di ya nwụrụ ka ọ nọ na-achịkọta nkụ. Ịlaịja kpọrọ ya oku sị ya, “Biko, kutere m ntakịrị mmiri nʼiko ka m ṅụọ.” 11Mgbe nwanyị ahụ na-aga ikute mmiri ahụ, Ịlaịja kpọrọ ya oku ọzọ sị ya, “Biko, wetara m otu iberibe achịcha ka m taa.” 12Ma nwanyị ahụ zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị Chineke na-adị ndụ, enweghị m achịcha ọbụla nʼụlọ m. Naanị ihe m nwere bụ otu njuaka ụtụ ọka dị nʼite, na mmanụ ntakịrị dị na karama. Ugbu a, ana m achịkọta nkụ ka m baa ga siere onwe m siekwara nwa m nri, ka anyị rie, chere ọnwụ ga-abịa egburu anyị.” 13Ịlaịja sịrị ya, “Atụla egwu! Gaa mee dịka i kwuru. Ma naanị buru ụzọ meere m ogbe achịcha ntakịrị site nʼihe i nwere, wetara m ya. Emesịa, mee nke gị na nwa gị ga-eri. 14Nʼihi na nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Ụtụ ọka dị nʼite ahụ agaghị agwụ, mmanụ ahụ dị nʼite ahụ agakwaghị akọ tutu ruo ụbọchị ahụ Onyenwe anyị ga-ezite mmiri ozuzo nʼala a.’ ” 15Nwanyị ahụ mere dịka Ịlaịja kwuru. Sitekwa nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ihe oriri akọkwaghị Ịlaịja na nwanyị ahụ, na ezinaụlọ ya. 16Nʼihi na ụtụ ọka ahụ agwụghị, mmanụ akọkwaghị nwanyị ahụ, dịka okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ Ịlaịja, onye amụma. 17Mgbe ihe ndị a gasịrị, nwa nwanyị ahụ nwe ụlọ rịara ọrịa. Ọrịa a bịara sie ike nke ukwuu na ume afọdụghị nʼime ya. 18Mgbe ahụ, nwanyị ahụ kwaara akwa bịakwute Ịlaịja sị ya, “Ewoo, onye nke Chineke, gịnị ka i nwere megide m? Ị bịara ka i chetara m mmehie m, na igbu nwa m nwoke?” 19Ịlaịja zara sị ya, “Kunye m nwa gị nwoke.” Ịlaịja kuuru ya site nʼaka nne ya rigoo nʼụlọ elu ebe ya onwe ya na-edina, nibe ya nʼelu ihe ndina ya. 20Ọ kpọkuru Onyenwe anyị sị ya, “ Onyenwe anyị Chineke m, gịnị mere i ji wetara nwanyị a m bi nʼụlọ ya ihe mgbu site nʼikwe ka nwa nwoke ya nwụọ?” 21Ịlaịja gbatịrị onwe ya nʼahụ nwantakịrị ahụ ugboro atọ, kpọkuo Onyenwe anyị, sị, “Biko, Onyenwe anyị Chineke m, kwere ka mkpụrụobi nwantakịrị a laghachikwute ya.” 22Onyenwe anyị nụrụ ekpere Ịlaịja, ndụ nwantakịrị ahụ laghachikwutere ya, ọ dịkwara ndụ ọzọ. 23Mgbe ahụ, Ịlaịja kuuru ya si nʼụlọ elu ahụ rịdata, kunye ya nne ya, gwa ya okwu sị, “Lee, nwa gị dị ndụ!” 24Nwanyị ahụ sịrị Ịlaịja, “Ugbu a, amatala m na ị bụ onye nke chineke, na okwu Onyenwe anyị si nʼọnụ gị apụta bụ eziokwu.”
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (Ihe ọgụgụ nke 9)
10Obi na-atọ m ụtọ nke ukwuu nʼime Onyenwe anyị, mkpụrụobi m ga-etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke m. Nʼihi na o werela uwe nzọpụta kpuchie m, werekwa uwe oke ọṅụ nke ezi omume ya yikwasị m nʼahụ. Adị m ka nwoke na-alụ nwanyị ọhụrụ, onye na-emezi isi ya ka ọ dịrị ka nke onye nchụaja. E, adị m ka nwaagbọghọ na-alụ di, nke ji ọla ọma dị iche iche chọọ onwe ya mma. 11Dịka aja dị nʼubi si eme ka ihe a kụrụ nʼubi pupụta, dịka ubi a gbara ogige si eme ka mkpụrụ ubi too, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-esi mee ka ezi omume na otuto pupụta nʼihu mba niile. 62:1Nʼihi Zayọn agaghị m emechi ọnụ, nʼihi Jerusalem agaghị m anọ jii, ruo mgbe ezi omume ya ga-enwuwa dịka ihe ụtụtụ; mgbe nzọpụta ya kwa ga-enwukwa dịka ọwaọkụ na-enwu enwu. 2Mba niile ga-ahụ ezi omume gị. Ndị eze niile ga-ahụkwa ebube gị. A ga-akpọkwa gị aha ọhụrụ ahụ nke ọnụ Onyenwe anyị ga-agụ gị. 3Ị ga-aghọ okpueze nke ịma mma nʼaka Onyenwe anyị, ihe iyi nʼisi nke ndị ụlọeze nʼaka Chineke gị. 4A gakwaghị akpọ gị onye ahapụrụ ahapụ, maọbụ kpọọ ala gị ala tọgbọrọ nʼefu. Ma a ga-akpọ gị Hefziba, kpọkwa ala gị Beula, nʼihi na ihe gị ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ, a ga-alụkwa ala gị dịka nwunye. 5Dịka nwokorobịa si alụrụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, otu a ka Onye na-ewu gị ga-alụ gị, dịka onye lụrụ nwunye ọhụrụ sị aṅụrị ọṅụ nʼebe nwunye ọhụrụ ya nọ, otu a ka Chineke gị ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi gị.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (Ihe ọgụgụ nke 10)
1Mgbe ihe ndị a gasịrị, Chineke nwara Ebraham. Ọ sịrị ya, “Ebraham.” Ebraham zara sị, “Lekwa m.” 2Chineke sịrị, “Duru nwa gị nwoke, naanị otu nwa gị nwoke, Aịzik onye ị hụrụ nʼanya, gaa nʼala Mọrịa. Jiri ya chụọrọ m aja nsure ọkụ nʼelu otu nʼime ugwu dị nʼebe m ga-egosi gị.” 3Nʼisi ụtụtụ echi ya, Ebraham biliri kwadoo ịnyịnya ibu ya. O duuru ndị ikom abụọ na-ejere ya ozi, na nwa ya nwoke Aịzik. O gbutere nkụ ga-ezuru ya ịchụ aja nsure ọkụ, bilie gawa ebe ahụ Chineke gwara ya maka ya. 4Nʼụbọchị nke atọ, Ebraham lepụrụ anya hụ ebe ahụ nʼebe dị anya. 5Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi sị, “Nọdụnụ nʼebe a, unu na ịnyịnya ibu anyị, ka mụ na nwokorobịa a gaa nʼebe ahụ. Anyị feecha ofufe, anyị ga-alọghachikwute unu ọzọ.” 6Ebraham boro nwa ya nwoke Aịzik ukwu nkụ ahụ e ji achụ aja nsure ọkụ nʼisi, ma ya onwe ya jidere ọkụ na mma. 7Aịzik gwara nna ya Ebraham sị, “Nna m.” Ebraham zara, “Ehee, nwa m.” Aịzik sịrị, “Ọkụ na nkụ dị nʼebe a, olee nwa atụrụ e ji achụ aja nsure ọkụ?” 8Ebraham zara, “Nwa m, Chineke nʼonwe ya ga-eweta nwa atụrụ e ji achụ aja nsure ọkụ.” Ha abụọ gakwara nʼihu nʼije ha. 9Mgbe ha ruru ebe ahụ Chineke gwara ya maka ya, Ebraham wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ, doo nkụ ndị ahụ niile nʼusoro nʼelu ya. O kere nwa ya Aịzik agbụ, tụkwasị ya nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, na nʼelu nkụ ndị ahụ. 10Mgbe ahụ Ebraham setịpụrụ aka ya, welite mma ka o gbuo nwa ya nwoke. 11Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị si nʼeluigwe kpọọ ya oku sị ya, “Ebraham! Ebraham!” Ebraham zara, “Lekwa m nʼebe a.” 12Ọ sịrị ya, “Emetụkwala nwokorobịa ahụ aka. Emekwala ya ihe ọbụla. Nʼihi na amatala m ugbu a na ị na-atụ egwu Chineke, ebe ọ bụ na i kwenyere iji nwa gị nwoke, naanị otu nwa nwoke i nwere chụọrọ m aja.” 13Ebraham leliri anya hụ otu ebule nke eriri ọhịa jidere na mpi ya. Ebraham gara jide ebule ahụ, were ya chụọ aja nsure ọkụ nʼọnọdụ nwa ya nwoke. 14Ya mere, Ebraham kpọrọ ebe ahụ, “ Onyenwe anyị ga-arọpụta.” Ya mere ruo taa a na-asị, “Nʼugwu Onyenwe anyị, a ga-arọpụta.” 15Mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe kpọọ Ebraham oku nke ugboro abụọ, 16sị, “Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, ji onwe m na-aṅụ iyi na-ekwupụta sị, ebe ọ bụ na i mere ihe dị otu a, na i kwenyere iji nwa gị nwoke, naanị otu nwoke i nwere chụọrọ m aja, 17aga m agọzi gị nʼezie, mekwa ka ụmụ ụmụ gị mụbaa nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando nke mbara eluigwe na dịka aja dị nʼọnụ mmiri osimiri. Ụmụ ụmụ gị ga-enwetara onwe ha ọnụ ụzọ ama ndị iro ha. 18Sitekwa na mkpụrụ gị ka a ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa, nʼihi na i rubeere m isi.”
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (Ihe ọgụgụ nke 11)
1Mmụọ nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dị nʼahụ m, nʼihi na Onyenwe anyị eteela m mmanụ ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye. O zitela m ịkasị ndị obi ha tiwara etiwa obi, ikwupụta inwere onwe nye ndị a dọtara nʼagha, na ntọghapụ site nʼọchịchịrị nye ndị mkpọrọ. 2O zitere m ikwupụta afọ mgbe Onyenwe anyị ga-eji ihuọma leta ndị mmadụ, na ụbọchị ịbọ ọbọ nke Chineke anyị. O zitekwara m ịkasị ndị niile na-eru ụjụ obi, 3na igboro ndị niile na-eru ụjụ na Zayọn ihe na-akpa ha. O zitere m inye ha okpueze mara mma nʼọnọdụ ntụ, inye ha ọṅụ, nʼọnọdụ ịkwa akwa, na iyikwasị ha mmụọ otuto nʼọnọdụ mmụọ ịda mba. Nʼihi na Chineke akụọla ezi omume nʼime ha, dịka osisi ook siri ike, igosi ịma mma Onyenwe anyị. 4Ha ga-ewugharịkwa ebe niile e tikpọrọ etikpọ nʼoge ochie, doziekwa ebe niile tọgbọrọ nʼefu site nʼoge dị anya; ha ga-eme ka obodo e tikpọrọ etikpọ dị ọhụrụ, bụ ebe tọgbọrọrị nʼefu nke ọtụtụ ọgbọ gara aga. 5Ndị ọbịa ga-azụrụ gị igwe ewu na atụrụ unu; ndị mba ọzọ ga-akọrọ unu ala ubi unu, lekọtakwa ubi vaịnị unu niile. 6A ga-akpọ unu ndị nchụaja Onyenwe anyị, kpọkwa unu ndị ozi Chineke anyị. A ga-eji akụ niile si na mba dị iche iche zụọ unu. Ọ bụkwa akụnụba ha ka unu ga-eji nyaa isi. 7Nʼọnọdụ ihere dịịrị ha ugbu a, ndị m ga-enweta ngọzị okpukpu abụọ, nʼọnọdụ nkọcha dịịrị ha ha ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi ihe nketa ha nwetara. Ha ga-enweta okpukpu ihe nketa ala abụọ, ketakwa ọṅụ nke ga-adịgidere ha ruo mgbe ebighị ebi. 8“Nʼihi na mụ onwe m, Onyenwe anyị, na-ahụ ikpe ziri ezi nʼanya. Ma ana m akpọ izu ohi na ajọ omume niile asị. Aga m esite nʼikwesị ntụkwasị obi m kwụghachi ndị m nʼihi ahụhụ ha tara, mụ na ha ga-agbakwa ndụ ebighị ebi. 9Mkpụrụ ha ga-abụ ndị a ma ama, a ga-asọpụkwara ha nʼetiti mba niile. Ndị niile hụrụ ha ga-amata, kwupụtakwa na ha bụ ndị Onyenwe anyị gọziri.”
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (Ihe ọgụgụ nke 12)
8Otu ụbọchị, Ịlaisha gara nʼobodo Shunem. Otu nwanyị nwere ugwu bi nʼebe ahụ. Nwanyị ahụ rịọsiri ya ike ka o rie nri. Nʼihi ya, mgbe ọbụla Ịlaisha si nʼebe ahụ gafee, ọ na-akwụsị nʼebe ahụ rie ihe. 9Ma nwanyị ahụ gwara di ya okwu sị, “O doro m anya nke ọma na nwoke a na-akwụsị nʼụlọ anyị mgbe niile bụ onye nsọ nke Chineke. 10Biko, ka anyị doziere ya otu ọnụụlọ nta nʼime ụlọ elu anyị, ka anyị tinyere ya ihe ndina na tebul, na oche, na oriọna, ka o nwee ebe ọ ga na-anọ mgbe ọbụla ọ bịakwutere anyị.” 11Otu ụbọchị, mgbe Ịlaisha bịakwara nʼebe ahụ, ọ bara nʼọnụụlọ ahụ, dinaa nʼebe ahụ. 12Ọ sịrị Gehazi onye na-ejere ya ozi, “Gaa kpọọ onye Shunem a,” Ya mere, ọ kpọrọ ya, ọ bịara guzo nʼihu ya, 13Ịlaisha gwara Gehazi, “Gwa nwanyị ahụ, sị, ‘Lee, otu i si enye onwe gị nsogbu niile ndị a maka anyị. Ugbu a, gịnị ka a ga-emere gị? Ọ bụ ka anyị gwa eze okwu banyere gị, ka ọ bụ ịgwa onyeisi ndị agha?’ ” Ọ zara, “Ebi m nʼetiti ndị m.” 14Ịlaisha jụrụ, “Gịnịkwa ka anyị ga-emere nwanyị a?” Gehazi sịrị, “Nʼezie, o nweghị nwa nwoke, di ya emeekwala agadi.” 15Ịlaisha sịrị, “Kpọọ ya.” Ya mere, Gehazi kpọrọ ya, ọ bịara guzo nʼọnụ ụzọ. 16Ịlaisha sịrị, “Na mgbe dị otu a nʼafọ ọzọ, ị ga-eku nwa nwoke nʼaka gị abụọ.” Ọ sịrị, “Mba, onyenwe m, biko, gị onye nke Chineke, agwala ohu gị nwanyị okwu ụgha.” 17Ma dịka Ịlaisha si kwuo, nwanyị ahụ tụụrụ ime, na mgbe ahụ nʼafọ ọzọ ya, ọ mụrụ nwa nwoke. 18Nwata ahụ toputara, otu ụbọchị ọ pụrụ jekwuru nna ya nʼubi, ebe ha nọ na-aghọ ọka. 19O tikuru nna ya sị ya, “Isi m o, isi m o!” Nna ya sịrị otu nʼime ndị ohu ya, “Kuru ya kulaara nne ya.” 20O kuuru ya, kulaara ya nne ya, nwantakịrị nwoke ahụ nọdụrụ nʼapata nne ya ruo etiti ehihie, mgbe ọ nwụrụ. 21Nne ya kuuru ya rigoo nʼelu ụlọ ahụ, tọgbọ ya nʼelu ihe ndina ahụ onye nke Chineke ahụ na-edina, mechie ụzọ pụọ. 22O ziri ozi kpọọ di ya sị ya, “Biko, zitere m otu okorobịa na otu ịnyịnya ibu, ka m jekwuru onye Chineke ahụ. Aga m alọtakwa ọsịịsọ.” 23Ọ sịrị, “Gịnị mere i ji ejekwuru ya taa? Ọ bụghị Ọnwa ọhụrụ, ọ bụghịkwa ụbọchị izuike.” Ọ zara sị, “Udo dị.” 24Mgbe ahụ, ọ nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya ibu ahụ, nye nwokorobịa ahụ iwu sị ya, “Gbasie ọsọ ike. Akwụsịkwala ịgba ọsọ ma ọ bụghị mgbe m gwara gị kwụsị.” 25Ya mere, o buliri ije, gakwuru onye nke Chineke nʼugwu Kamel. Mgbe o lepụrụ anya hụ ya ka ọ na-abịa, onye nke Chineke sịrị odibo ya bụ Gehazi, “Lee nwanyị Shunem ahụ. 26Gbara ọsọ gaa zute ya jụọ ya sị ya, ‘Ọ dịkwa mma? Dị gị ọ nọkwa nʼudo? Nwa gị ọ nọkwa nʼudo?’ ” Mgbe Gehazi zutere ya jụọ ajụjụ ndị a, nwanyị ahụ zara Gehazi sị ya, “E, anyị niile nọ nʼudo, ihe niile na-aga nke ọma.” 27Ma mgbe ọ bịakwutere onye nke Chineke, ọ dara nʼala nʼihu ya, jide ya nʼụkwụ ya abụọ. Gehazi bịaruru nso inupu ya, ma onyeozi Chineke sịrị ya, “Hapụ ya aka, nʼihi na ọ dị ihe na-enye ya nsogbu nʼime mmụọ ya, ma Onyenwe anyị zonarịrị m ya, ọ gwaghịkwa m ihe mere.” 28Nwanyị ahụ sịrị, “Onyenwe m, arịọrọ m gị nye m nwa nwoke? Ọ bụ na m asịghị gị, ‘emeela m ka m nwee olileanya’?” 29Ịlaisha sịrị Gehazi, “Ngwa, were ihe ike nʼukwu jikọta uwe mwụda gị, werekwa mkpanaka m nʼaka gị, bilie gaa Shunem. Mgbe ị na-aga ekelekwala onye ọbụla ekele. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla ekelee gị, azala ekele ya. Gaa nʼụlọ ahụ. I ruo, tụkwasị mkpanaka m nʼihu nwantakịrị nwoke ahụ.” 30Ma nne nwantakịrị ahụ zara sị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị laa.” Ịlaisha biliri soro ya bido ịla nʼụlọ ya. 31Ma Gehazi butere ụzọ rute nʼụlọ ahụ, were mkpanaka ahụ tụkwasị nʼihu nwantakịrị nwoke ahụ, ma nke a emeghị ka nwantakịrị ahụ teta ma ọ bụkwanụ kuo ume. Ya mere, Gehazi laghachiri izute Ịlaisha, gwa ya sị, “Nwata ahụ etetaghị.” 32Mgbe Ịlaisha rutere nʼụlọ ahụ, ọ hụrụ ka nwantakịrị ahụ nwụrụ anwụ dina nʼelu ihe ndina ya. 33Ọ banyere nʼime ọnụụlọ ahụ, mechibido ha abụọ ụzọ, kpee ekpere, kpọkuo Onyenwe anyị. 34Emesịa, ọ makpuuru nʼelu nwantakịrị ahụ, tụkwasị ọnụ ya nʼọnụ nwantakịrị ahụ, na anya ya abụọ na nke nwantakịrị ahụ, na aka ya abụọ na nke ya. Mgbe o si otu a dinara nʼelu nwantakịrị ahụ, ahụ nwantakịrị ahụ malitere ikpo ọkụ ọzọ. 35Ịlaisha biliri jegharịa nʼime ụlọ ahụ ugboro ole na ole, laghachikwa makpuru nʼelu nwantakịrị ahụ ọzọ. Emesịa, nwantakịrị ahụ zere uzere ugboro asaa, meghe anya ya abụọ. 36Ịlaisha kpọrọ Gehazi sị ya, “Kpọọ nwanyị Shunem.” Ya mere, ọ kpọrọ ya. Mgbe ọ bịakwutere ya, ọ sịrị, “Kuru nwa gị.” 37Ọ batara, daa nʼala nʼụkwụ ya, kpọọ isiala. Emesịa, o kuuru nwa ya nwoke pụọ.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (Ihe ọgụgụ nke 13)
11Mgbe ahụ, ndị ya chetara ụbọchị ndị ahụ gara aga, ụbọchị Mosis na ndị nke ya. Olee ebe onye ahụ nọ nke mere ka ha si nʼoke osimiri rigopụta, ya na onye ọzụzụ atụrụ nke igwe atụrụ ya? Olee ebe onye ahụ tinyere Mmụọ Nsọ ya nʼetiti ha nọ. 12Olee onye ahụ ike ya mere ka osimiri kewaa abụọ nʼihu ha, mgbe Mosis weliri aka ya elu, meekwa ka aha ya dịgide ruo ebighị ebi? 13Onye duuru ha gafee mmiri dị oke omimi? Dịka ịnyịnya na-agba ọsọ nʼọzara, ike agwụghị ha. 14Dịka ehi na-ata ahịhịa na ndagwurugwu, Mmụọ Onyenwe anyị nyere ha izuike. Otu a ka i si duo ndị gị, ime ka aha gị bụrụ ihe a na-asọpụrụ asọpụrụ. 15Onyenwe anyị, biko site nʼeluigwe, ebe obibi nsọ gị, lee anyị anya. Olee ebe nʼịnụ ọkụ nʼobi na ike gị dị? Olee ebe obi ebere gị na ọmịiko gị dịkwa? 16Ma gị onwe gị, bụ Nna anyị, a sịkwarị na Ebraham amaghị anyị maọbụ Izrel agọnarị anyị, gị onwe gị, Onyenwe anyị, bụ Nna anyị, onye Mgbapụta anyị ka ị na-azakwa siterị na mgbe ochie. 17Onyenwe anyị, gịnị mere i ji na-eme ka anyị si nʼụzọ gị kpafuo na-eme ka obi anyị sie ike otu a, na anyị adịghị atụ egwu gị? Lọghachi nʼihi ndị ohu gị, nʼihi ebo ndị ahụ bụ ihe nketa gị. 18Ọ bụ naanị nwa oge nta ka ndị gị nwetara ebe nsọ gị, ma ugbu a, ndị iro anyị azọdala ebe nsọ gị. 19Anyị bụ nke gị site na mgbe ochie, ma ị naghị achị nʼebe ha nọ, ha bụ ndị a na-akpọkwasịghịkwa aha gị. 64:1Ọ gaara adị mma ma asị na ị ga-adọwa eluigwe rịdata nʼala, ma asị nʼugwu ukwu niile ga-ama jijiji nʼihu gị! 2Dịka mgbe ọkụ na-agba ụmụ osisi, na-eme ka mmiri e sikwasịrị nʼọkụ gbọọ. Si nʼelu rịdata bịa mee ka ndị iro gị niile maara aha gị, meekwa ka mba niile dị iche iche maa jijiji nʼihu gị. 3Nʼihi na ọ bụ mgbe i mere ọtụtụ ihe egwu dị iche iche nke anyị na-atụghị anya ya ka ị rịdatara mee ka ugwu ukwu niile maa jijiji nʼihu gị. 4Nʼihi na site na mgbe ochie, ọ dịbeghị onye nụrụ, ọ dịbeghị ntị ghọtara, o nwebeghị anya hụrụ Chineke ọzọ karịa gị, onye na-emejupụtara ndị na-echere ya ihe na-akpa ha. 5Ị na-enyere ndị na-eme ezi ihe aka, bụ ndị ji ọṅụ na-echeta ụzọ gị nʼechiche uche ha. Ma mgbe anyị nọgidere na-emehie megide ha, iwe were gị. A ga-esikwanụ aṅaa zọpụta anyị?
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (Ihe ọgụgụ nke 14)
31“Lee, oge na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị nʼetiti mụ na ụlọ Izrel, nakwa ụlọ Juda. 32Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụ mụ na nna nna ha gbara, mgbe ahụ m jidere ha nʼaka site nʼala Ijipt dupụta ha, nʼihi na ha mebie ọgbụgba ndụ m, ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ di nye ha,” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 33“Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ụlọ Izrel ga-agba mgbe oge ndị ahụ gasịrị,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Aga m etinye iwu m nʼime obi ha, aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha. Aga m abụ Chineke ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị m. 34Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe, maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’ nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha, agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.”
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (Ihe ọgụgụ nke 15)
Akwụkwọ ozi
3Ọ bụ na unu amataghị na mgbe ahụ e jikọtara anyị na Kraịst Jisọs na baptizim ka e jikọtakwara anyị na ya nʼọnwụ. 4Ya mere, esitere na baptizim likọọ anyị na ya nʼọnwụ, dịka e mere ka Kraịst site nʼọnwụ bilie nʼebube nke Nna, ka anyị sikwa otu a keta oke na ndụ ọhụrụ. 5Ọ bụrụkwa na e jikọtaala anyị na ya nʼọnwụ, e jikọtakwala anyị na ya na mbilite nʼọnwụ. 6Nʼihi na anyị maara na a kpọgidekọtara ndụ nke ochie anyị na Kraịst nʼelu obe, iji mee ka anụ ahụ nke mmehie ahụ bụrụ ihe a lara nʼiyi, ka anyị bụrụkwa ndị nwere onwe ha site nʼịbụ ohu nke mmehie. 7Nʼihi na onye nwụrụ anwụ agụọla ya dịka onye nwere onwe ya site nʼebe mmehie dị. 8Ọ bụrụkwa nʼeziokwu na anyị na Kraịst nwụkọrọ ọnwụ, anyị makwara na anyị na ya ga-adịkọkwa ndụ ọzọ. 9Nʼihi na anyị maara na ebe e mere ka Kraịst site nʼọnwụ bilie, ọ gaghị anwụkwa ọzọ. Ọnwụ enwekwaghị ike ọbụla nʼebe ọ nọ ọzọ. 10Ọ nwụrụ naanị otu mgbe nʼihi mmehie. Ma ndụ ọ na-adị ugbu a bụ nke ọ na-adị nye Chineke. 11Ya mere, gụọ onwe unu ugbu a dịka ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị. Gụọkwa onwe gị dịka ndị dị ndụ nʼebe Chineke nọ nʼime Kraịst, site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.
Oziọma
1Mgbe ụbọchị izuike gasịrị, nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nʼime izu ụka, Meri Magdalin na Meri nke ọzọ, gara ka ha lee ili ahụ. 2Na mberede, oke ala ọma jijiji malitere. Nʼihi na mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe rịdata, kpụgharịa nkume ahụ e ji mechie ọnụ ili ahụ, nọkwasịkwa nʼelu ya. 3Ihu ya na-enwu dị ka amụma. Uwe ya na-achakwa ọcha dị ka akụmmiri igwe. 4Nʼihi egwu ya, ndị nche makwara jijiji. Daa nʼala nọrọ dị ka ndị nwụrụ anwụ. 5Ma mmụọ ozi ahụ gwara ụmụ nwanyị ahụ sị ha, “Unu atụla egwu, nʼihi na amaara m na ọ bụ Jisọs onye a kpọgburu nʼelu obe ka unu na-achọ. 6Ọ nọkwaghị nʼebe a. O sitela nʼọnwụ bilie, dị ka o si kwuo. Bịanụ lee ebe ọ tọgbọburu. 7Gaanụ ngwangwa gwa ndị na-eso ụzọ ya na e meela ka o si nʼọnwụ bilie. Lee, o burula unu ụzọ gawa Galili. Ebe ahụ ka unu ga-ahụ ya. Chetakwanụ ihe m gwara unu.” 8Ha ji oke egwu na ọṅụ pụọ ọsịịsọ site nʼili ahụ, gbara ọsọ gawa ịkọrọ ndị na-eso ụzọ ya. 9Na mberede, Jisọs zutere ha sị ha, “Ndeewonụ!” Ha bịakwutere ya, jide ụkwụ ya abụọ aka, kpọọkwa isiala nye ya. 10Ya mere Jisọs gwara ha sị, “Unu atụla egwu. Gaanụ, gwanụ ụmụnne m ka ha gaa Galili. Ha ga-ahụ m nʼebe ahụ.” 11Mgbe ha na-aga, ụfọdụ ndị agha chere ili ahụ nche batara nʼime obodo. Ha gara kọọrọ ndịisi nchụaja ihe niile mere. 12Emesịa, ndị nchụaja na ndị okenye zukọtara kwekọrịtaa inye ndị agha ahụ ọkpụrụkpụ ego, 13sị ha, “Ihe a ka unu ga-ekwu, ‘Ndị na-eso ụzọ ya bịara nʼabalị zuru ya nʼohi mgbe anyị nọ na-arahụ ụra.’ 14Ọ bụrụ na nke a eruo gọvanọ ntị, anyị ga-emeta ya mma, ma mee ka unu pụọ na nsogbu.” 15Ha naara ego ahụ, meekwa dị ka e ziri ha. Akụkọ a ka a gbasara nʼetiti ndị Juu ruo taa. 16Ma ndị ikom iri na otu ahụ bụ ndị na-eso ụzọ ya gara Galili, nʼelu ugwu ebe Jisọs gwara ha gaa. 17Mgbe ha hụrụ ya, ha kpọrọ isiala nye ya. Ma ụfọdụ nʼime ha nwere obi abụọ. 18Jisọs bịara ha nso, gwa ha sị, “E werela ikike niile dị nʼeluigwe na nke dị nʼelu ụwa nye m. 19Ya mere, gaanụ mee ka mba niile bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-emenụ ha baptizim nʼaha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ. 20Ziekwanụ ha ka ha na-eme ihe niile m nyere unu nʼiwu. Ma chetanụ na m na-anọnyere unu mgbe niile, ruo ọgwụgwụ oge.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 18 Epreel na kalenda nzukọ bụ 1 Mee na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike