Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 1 Mee
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 1 Mee 2027
Satọdee · Izu nke 5 nke Oge Ista
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee nke izu nke 5 nke Oge Ista
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: ọcha
Onye nsọ Josef Onye ọrụ · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Pọl bịaruru Debi na Listra, ebe otu onye na-eso ụzọ Jisọs a na-akpọ Timoti bi. Nne ya bụ onye Juu bụrụkwa onye kwere ekwe, ma nna ya bụ onye Griik. 2Ụmụnna ndị bi na Listra na Aikoniọm gbara ezi ama banyere ya. 3Pọl chọrọ ka Timoti soro ya nʼije ya. Ma nʼihi ndị Juu bi nʼakụkụ ebe ahụ, o biri ya ugwu nʼihi na mmadụ niile maara na nna ya bụ onye Griik. 4Dịka ha na-eme njem site nʼobodo ruo nʼobodo, ha na-akọwara ha ihe banyere mkpebi ndị ozi na ndị okenye kpebiri na Jerusalem ka ha nwe ike idebe ha. 5Ihe ndị a niile mere ka nzukọ sie ike nʼokwukwe ma baakwa ụba nʼọnụọgụgụ kwa ụbọchị. 6Ha gara mpaghara Frigia na Galeshịa. Ma Mmụọ Nsọ ekweghị ka ha kwusaa oziọma nʼakụkụ Eshịa nʼoge ahụ. 7Mgbe ha ruru nʼakụkụ obodo Misia, ha chere ihu ịbanye nʼakụkụ obodo Bitinia. Ma Mmụọ Nsọ nke Jisọs akwagideghị ka ha gaa. 8Ka ha si nʼakụkụ Misia gafee, ha batara Troas. 9Nʼabalị ahụ, Pọl hụrụ ọhụ ebe ọ hụrụ otu nwoke onye Masidonia ka o guzo na-arịọ ya sị, “Bịa na Masidonia nyere anyị aka.” 10Mgbe ọ hụchara nke a, anyị jikeere ngwangwa ịga Masidonia ebe anyị mara na Chineke akpọọla anyị ịgbasara ha oziọma.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma maka ikele ekele afọ ojuju. Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile. 2Jiri obi ụtọ fee Onyenwe anyị ofufe; jirinụ ịbụ abụ ọṅụ bịa nʼihu ya 3Matanụ na Onyenwe anyị bụ Chineke. Ọ bụ ya onwe ya kere anyị, ọ bụkwa ya nwe anyị, anyị bụ ndị ya, igwe atụrụ nke ọ na-azụ. 5Nʼihi na Onyenwe anyị dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ruo ọgbọ niile ka ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgidekwa.
Oziọma
18“Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, chetanụ na o buru ụzọ kpọọ m asị. 19A sị na unu bụ nke ụwa, ụwa ga-ahụ unu nʼanya dịka ndị nke ya. Ma otu ọ dị unu abụghị nke ụwa. Kama, esi m nʼime ụwa họrọ unu. Ọ bụkwa nʼihi ya ka ụwa ji akpọ unu asị. 20Chetakwanụ ihe m gwara unu, ‘Ohu adịghị adị ukwuu karịa Onyenwe ya.’ Ya mere, ebe ha kpagburu m, ha ga-akpagbukwa unu. Ọ bụrụ na ha debere okwu m, ha ga-edebekwa nke unu. 21Ee, ha ga-eme unu ihe niile ndị a nʼihi aha m, na nʼihi na ha amaghị onye ahụ zitere m.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Josef Onye ọrụ
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike