Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 25 Epreel
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 25 Epreel 2027
Sọnde · Izu nke 5 nke Oge Ista
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 5 nke Oge Ista
Sọnde · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
26Mgbe o rutere Jerusalem, ọ gbalịrị ịdịnyere ndị na-eso ụzọ Jisọs nọ nʼebe ahụ, ma ha tụrụ egwu. Ha ekwenyeghị na ọ ghọọla ezi onye na-eso ụzọ Jisọs dịka ha. 27Ma Banabas duuru ya gaa nʼebe ndị ozi nọ. Ọ kọọrọ ha akụkọ otu o siri hụ Onyenwe anyị na otu o siri gwakwa ya okwu. Na otu o siri kwusaa oziọma nʼaha Jisọs na Damaskọs na-atụghị egwu. 28O soro ha na-agagharị na Jerusalem. Ọ na-ekwusakwa okwu nʼaha Onyenwe anyị na-atụghị egwu. 29Ya na ndị Juu na-asụ asụsụ Griik rụrịtakwara ụka. Nʼihi ya ndị a gbara izu igbu ya. 30Mgbe ndị kwere ekwe nụrụ banyere nzube ha, ha duuru ya gaa Sizaria site nʼebe ahụ zipụ ya ka ọ laa obodo Tasọs. 31Mgbe ahụ, nzukọ niile ndị nọ na Judịa, Galili na Sameria, nọọrọ nʼudo, guzosiekwa ike. Ha na-amụba nʼọnụọgụgụ site nʼịtụ egwu nke Onyenwe anyị na ịgbaume nke Mmụọ Nsọ.
Abụ Ọma nzaghachi
25Isiokwu otuto m nʼetiti ọha mmadụ sitere na gị; aga m emezukwa nkwa niile m kwere gị nʼihu ndị ahụ na-atụ egwu gị. 26Ndị ogbenye ga-eri nri, rijuo afọ ha, ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ga-eto ya ka mkpụrụobi unu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. 27Nsọtụ elu ụwa niile ga-echeta, ma laghachikwute Onyenwe anyị. Ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche ga-akpọ isiala nʼihu ya. 29Ndị ọgaranya niile nke elu ụwa ga-eri oriri ma fee ya; ihe niile na-anwụ anwụ ga-akpọ isiala nʼihu ya; ndị na-apụghị idebe onwe ha ndụ. 30Agbụrụ anyị ga-ejere ya ozi; a ga-akọrọ ọgbọ ndị na-abịa nʼihu ihe banyere onyenwe anyị. 31Ha ga-ekwusa ezi omume ya nye ọgbọ niile na-abịa nʼihu, bụ ndị a na-amụbeghị nʼihi na o meela ya.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
18Ụmụntakịrị m, ka ịhụnanya anyị ghara ịbụ naanị nʼegbugbere ọnụ maọbụ nke okwu efu, kama ka ọ bụrụ nke sitere nʼeziokwu nakwa nʼomume anyị. 19Anyị ga-esitekwa na nke a mata na anyị bụ ndị nke eziokwu ahụ ma matakwa otu anyị ga-esi mee ka obi anyị kwenye nʼihu ya. 20Nʼihi na ọ bụrụ na obi anyị amaa anyị ikpe, Chineke dị ukwuu karịa obi anyị, ọ mazukwara ihe niile. 21Ndị m hụrụ nʼanya, ọ bụrụ na obi anyị amaghị anyị ikpe, anyị nwere nkwuwa okwu nʼihu Chineke 22na-anatakwa ya ihe ọbụla anyị rịọrọ nʼihi na anyị na-erube isi nʼiwu ya, na-emekwa ihe na-atọ ya ụtọ. 23Nke a bụkwa iwu ya: ka anyị kwere nʼaha Ọkpara ya Jisọs Kraịst, ya na ịhụrịta ibe anyị nʼanya dịka o nyere anyị nʼiwu. 24Ndị niile na-erube isi nye iwu ya na-anọgidesikwa ike nʼime ya, ya onwe ya na-anọgidesikwa ike nʼime ndị ahụ! Otu a ka anyị si mara na ọ na-anọgidesike nʼime anyị: Ọ bụ site na Mmụọ nke o nyere anyị.
Oziọma
1“Mụ onwe m bụ ezigbo osisi vaịnị ahụ. Nna m bụkwa onye ọrụ ubi. 2Ọ na-egbuda alaka ọbụla dị nʼime m nke na-adịghị amị mkpụrụ. Ma alaka ọbụla na-amị mkpụrụ ka ọ na-egbucha, ka o nwee ike mịa mkpụrụ dị ọtụtụ. 3Ugbu a, e meela ka unu dịrị ọcha nʼihi okwu m gwara unu. 4Nọgidenụ nʼime m, ka mụ onwe m nọgidekwa nʼime unu. Dịka alaka ọbụla apụghị ịmị mkpụrụ nʼonwe ya ma ọ bụrụ na ọ nọgideghị nʼosisi vaịnị. Otu a, unu apụghịkwa ịmị mkpụrụ ma ọ bụrụ na unu anọgideghị nʼime m. 5“Mụ onwe m bụ osisi vaịnị ahụ; unu bụkwa alaka ya. Onye ọbụla na-anọgide nʼime m, nke mụ onwe m na-anọgidekwa nʼime ya, na-amị ọtụtụ mkpụrụ. Nʼihi na ewezuga m, unu enweghị ike ime ihe ọbụla. 6Onye ọbụla na-adịghị anọgide nʼime m dị ka alaka e gbuturu, tụpụ ya, ọ kpọnwụọ. A ga-achịkọta ya, chịnye ya nʼọkụ, o repịa. 7Ọ bụrụ na unu anọgide nʼime m, okwu m anọgidekwa nʼime unu, rịọọnụ ihe ọbụla unu chọrọ, a ga-emere unu ya. 8Nke a ga-abụrụ Nna m otuto na unu mịrị ọtụtụ mkpụrụ hie nne, ọ na-egosikwa na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Mak, Onye dere Oziọma
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike