Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 15 Epreel
Kalenda Ọtọdọks · 2 Eprel (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 15 Epreel 2027
Tọọzdee · Izu nke 5 nke Lent Ukwu · Olu 4
Mmemme na ndị nsọ
Kanọn Ukwu nke Onye nsọ Andru nke Kriit
Oge Lent Ukwu
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Elekere nke 6
5Nke a bụ ihe Chineke bụ Onyenwe anyị kwuru, onye ahụ kere eluigwe niile, onye gbasapụkwara ha, onye gbasapụkwara ụwa nʼihe niile nke si nʼime ya apụta, onye na-enye ndị niile bi nʼime ya ume, na-enyekwa ndị na-agagharị nʼime ya ndụ. 6“Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, akpọla gị ka i gosi ezi omume m. Aga m echebe gị, gbaa gị ume, nʼihi na eweere m gị nye ndị m ka ị bụrụ ihe imesi ọgbụgba ndụ m ike. Ị ga-abụkwa ìhè nye mba niile. 7Ị ga-emeghe anya ndị kpuru ìsì, gbapụtakwa ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ, meekwa ka ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ gbara ọchịchịrị nwere onwe ha. 8“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị! Nke a bụkwa aha m. Agaghị m enye onye ọzọ ugwu na nsọpụrụ m. Mụ na arụsị a pịrị apị agakwaghị azọ otuto m. 9Lee ihe ochie emezuola ma nke ọhụrụ ka m na-ekwupụta. Tupu ha pụta ìhè ana m akpọsa ha nye unu.” 10Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ; tookwanụ ya, unu ndị niile bi na nsọtụ niile nke ụwa, unu ndị na-arịda nʼosimiri, na ihe niile bi nʼime ya. Toonu ya unu ndị bi nʼala ebe mmiri gbara gburugburu. 11Ka ọzara na obodo niile dị nʼime ya welie olu ha elu, ka ndị bi na Keda ṅụrịa ọṅụ. Ka ndị bi na Sela tie mkpu ọṅụ, ka ha si nʼelu ugwu niile tisie mkpu ọṅụ ike. 12Ka ha nye Onyenwe anyị ebube, kpọsaakwa otuto ya nʼala niile mmiri gbara gburugburu. 13Onyenwe anyị ga-apụta buo agha dịka dike. Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke onye agha ka ọ ga-eji buo agha. Ọ ga-eti mkpu agha megide ndị iro ya, ma merie ha. 14“Ọ dịla anya kemgbe m gbara nkịtị; ejidesịrị m onwe m aka ike. Ma ugbu a, aga m egosi iwe m; aga m asụ ude, kwaa akwa dị ka nwanyị ime na-eme. 15Aga m eme ka ugwu ukwu na ugwu nta niile dị larịị, meekwa ka ihe ọkụkụ ha niile kpọnwụọ. Aga m eme ka osimiri ghọọ ọzara, meekwa ka ọdọ mmiri niile takpọọ. 16Aga m edu ndị kpuru ìsì, site nʼụzọ nke ha na-amaghị, nʼokporoụzọ ha agatụbeghị ka m ga-edu ha; Aga m eme ka ọchịchịrị ghọọ ìhè nʼihu ha, meekwa ka ebe niile gbagọrọ agbagọ guzozie. Ihe ndị a niile ka m ga-eme. Agaghị m agbakụta ha azụ.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
20Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kwuru sị, “Mkpu akwa m na-anụ site na Sọdọm na Gọmọra dị ukwuu, otu a kwa, mmehie ha jọbigara njọ oke. 21Ugbu a, ana m aga ka m jiri anya m hụ ma ihe ha mere ọ dị njọ dịka mkpu akwa m na-anụ si dị. Ma o sighị otu ahụ dịrị, aga m amata.” 22Mgbe ahụ, ndị ikom abụọ nʼime ha gawara Sọdọm. Ma Ebraham nọ na-eguzo nʼihu Onyenwe anyị. 23Ebraham jeruru Onyenwe anyị nso jụọ ya sị, “Uche gị ọ bụ ikpochapụ ndị ezi omume na ndị ajọ omume? 24Ọ bụrụ na ị chọta iri ndị ezi omume ise nʼime obodo ahụ, ị ga-ekpochapụ obodo ahụ? Ị gaghị agbaghara ya nʼihi iri ndị ezi omume ise nọ nʼime ya? 25Ọ bụghị ezi ihe na ị ga-ala ndị ezi omume na ndị ajọ omume nʼiyi. Nʼihi na ị gaghị emeso ndị ezi omume dịka i si mesoo ndị na-eme ajọ ihe. O kwesighị ka onye ga-ekpe ụwa niile ikpe, kpee ikpe ziri ezi?” 26Mgbe ahụ, Onyenwe anyị zara sị ya, “Ọ bụrụ na m achọta iri ndị ezi omume ise nʼobodo Sọdọm, aga m agbaghara obodo ahụ niile nʼihi ha.” 27Ebraham kwukwara ọzọ sị, “Ugbu a m nwere ike kwuwapụta okwu nʼihu Onyenwe anyị, mụ onye bụ naanị aja na ntụ. 28Eleghị anya ọ bụrụ na e nweta naanị iri ndị ezi omume anọ na ise, ị ga-emebi obodo ahụ?” Onyenwe anyị zara sị, “Agaghị m ebibi ya ma ọ bụrụ na m achọta iri mmadụ anọ na ise nʼime ya.” 29Ọzọkwa, ọ sịrị ya, “Ọ bụrụkwanụ na a ga-achọta naanị iri mmadụ anọ?” Onyenwe anyị zara sị ya, “Nʼihi iri mmadụ anọ, agaghị m ebibi ya.” 30Mgbe ahụ ọ sịrị, “Biko, ka iwe hapụ iwe Onyenwe anyị ma m kwuo okwu. Eleghị anya, achọta naanị iri mmadụ atọ nʼebe ahụ?” Onyenwe anyị zaghachiri sị ya, “Agaghị m emebi ya, ma ọ bụrụ na m achọta iri mmadụ atọ nʼime ya.” 31O kwuru sị, “Ebe ọ bụ na m amalitela ịgwa gị, Onyenwe anyị okwu, biko kwere ka m gaa nʼihu. Ọ bụrụ na a ga-achọta naanị iri mmadụ abụọ?” Onyenwe anyị zara sị, “Nʼihi iri mmadụ abụọ ahụ agaghị m emebi ya.” 32Nʼikpeazụ, Ebraham kwuru sị, “Ka iwe hapụ iwe Onyenwe anyị. Ka m kwuo naanị otu ugboro a. Ọ bụrụkwanụ na a chọta naanị mmadụ iri nʼebe ahụ?” Onyenwe anyị zara sị, “Nʼihi mmadụ iri ahụ, agaghị m ebibi ya.” 33Mgbe Onyenwe anyị gwachara Ebraham okwu, ọ hapụrụ ya gawa ebe ọ na-aga. Ebraham laghachiri azụ nʼụlọ ya.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
17Ụzọ dị larịị nke onye ziri ezi bụ iwezuga onwe ya pụọ nʼihe ọjọọ, ndị na-echebe ụzọ ha niile na-echebekwa ndụ ha. 18Nganga na-eweta ịla nʼiyi, mpako na-ewetakwa ọdịda. 19Ọ ka mma ịbụ onye ogbenye nwere obi umeala karịa ịbụ onye nganga, na onye so ndị nganga keta oke nʼihe ha kwatara nʼagha. 20Onye ọbụla na-aṅa ntị na ndụmọdụ ka ihe na-agara nke ọma, onye a gọziri agọzi bụ onye ahụ nke na-atụkwasị Onyenwe anyị obi. 21A na-amata onye nwere uche site nʼụdị nghọta o nwere. Okwu dị ụtọ na-eme ka mmadụ mụta ihe nke ọma. 22Inwe uche bụ isi iyi ndụ nye ndị niile nwere ya, ma enweghị uche na-ewetara ndị nzuzu ntaramahụhụ. 23Obi onye maara ihe na-eme ka e tinye uche nʼokwu ọnụ ya, egbugbere ọnụ ha na-emekwa ka mmụta gaa nʼihu. 24Okwu dị nro na-atọ ụtọ ka mmanụ aṅụ, ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ, na-enyekwa ọkpụkpụ ahụ ike. 25Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ, ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ. 26Agụụ ihe oriri nke onye ọrụ na-arụpụtara ya ọrụ; agụụ na-akpali mmụọ ya ịga nʼihu. 27Ndị ọjọọ na-atụpụta echiche ọjọọ, egbugbere ọnụ ha dị ka ọkụ nke na-ekpochapụ ahụ. 28Onye na-emebi iwu na-agbasa ise okwu; ha na-akpali nsogbu, na-ekewa enyi na enyi. 29Ndị ọjọọ na-arafu ndị agbataobi ha, na-edubakwa ha nʼụzọ ga-ewetara ha mbibi. 30Onye ji ikuanya ya ekwu okwu na-atụ atụmatụ ọjọọ, onye na-atabi egbugbere ọnụ ya abụọ ekpebiela ime mmehie. 31Isi awọ bụ okpueze nke mara mma, a na-enweta ya nʼụzọ ezi omume. 32Onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ karịrị onye a maara aha ya. Onye nwere ogologo ntachiobi karịrị onye na-adọta obodo nʼagha. 33A na-efe nza, nʼihi ịchọpụta uche Onyenwe anyị, maọbụ Chineke nʼonwe ya na-ekpebi ihe a ga-efeta na nza ahụ. 17:1Ọ ka mma ịta iberibe achịcha kpọrọ nkụ ma ịnọ nʼudo adị ya, karịa nʼụlọ jupụtara nʼoke oriri na ịlụ ọgụ. 2Ohu nwere uche ga-achị nwa nna ya ukwu na-eweta ihere ma ketakwa oke nʼihe nketa dịka otu nʼime ndị ezinaụlọ ahụ. 3Ite eji anụcha ihe dịrị ọlaọcha, oke ọkụ dịkwara ọlaedo ma Onyenwe anyị na-anwale obi. 4Ajọ mmadụ na-aṅa ntị nʼegbugbere ọnụ na-eduhie, onye ụgha na-aṅakwa ntị nye ire na-ekwu okwu ịla nʼiyi. 5Onye ọbụla na-akwa ogbenye emo ọ bụ Chineke kere ha ka ọ na-elelị anya. Ndị niile na-aṅụrị ọṅụ nʼihi ihe ike dakwasịrị ha aghaghị ịta ahụhụ. 6Ụmụ ụmụ bụ okpueze ndị okenye. Nne na nna bụ ịnya isi nke ụmụ ha. 7Egbugbere ọnụ na-ekwu okwu dị mma abụghị nke onye nzuzu, otu a kwa, egbugbere ọnụ na-agha ụgha ekwesighị ịbụ nke onye na-achị achị. 8Nʼanya onye na-enye ngarị ọ na-ahụta ya dịka ọgwụ ịrata mmadụ, ha na-eche nʼebe ọbụla ha chere ihu ihe ga-aga nke ọma. 9Onye ọbụla na-akwado ịhụnanya na-ekpuchi njehie, ma onye na-ekwu ihe mere mgbe na mgbe na-ekewa ezi enyi. 10Ịba mba ntakịrị a baara onye nwere nghọta bara uru karịa narị ụtarị nke a pịara onye nzuzu. 11Onye ọjọọ na-ebi naanị ndụ nnupu isi megide Chineke. Ọ bụkwa onyeozi nke ọnwụ ka a ga-eziga imegide ya. 12Ọ ka mma izute nne Bịa a napụrụ ụmụ ya karịa izute onye nzuzu uche ya gbagọrọ agbagọ. 13Ọ bụrụ na i jiri ihe ọjọọ kwụọ ụgwọ ihe ọma, ọbụbụ ọnụ dịrị ezinaụlọ gị. 14Esemokwu malite ọ na-esi ike imedo ya, nʼihi ya ekwela ka ọ malite. 15Onye na-asị onye ikpe maara na ikpe amaghị ya na-amakwa onye aka ya dị ọcha ikpe, Onyenwe anyị na-akpọ omume abụọ a asị. 16Uru gịnị ka ego bara nʼaka onye nzuzu; ebe ọ bụ na o nweghị ike ịchọ amamihe. 17Ezi enyi na-egosi ịhụnanya ya nʼoge ọbụla. Otu a kwa, nwanne na-aba uru nʼoge mkpa.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 2 Epreel na kalenda nzukọ bụ 15 Epreel na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike