Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 14 Epreel

Kalenda Ọtọdọks · 1 Eprel (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 14 Epreel 2027

Wenezdee · Izu nke 5 nke Lent Ukwu · Olu 4

Mmemme na ndị nsọ

Venerable Mary of Egypt

Oge Lent Ukwu

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Elekere nke 6

Aịz 41:4–14

4Ọ bụ onye rụrụ ọrụ dị otu a mezukwa ya, na-akpọ ọgbọ niile site na mmalite? Ọ bụ mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, onye dị siterị na mbido ihe niile, onye ga-adịgidekwa ruo ọgwụgwụ ihe niile. Ọ bụ mụ onwe m bụ onye ahụ.” 5Mba niile bi nʼala mmiri gbara gburugburu ahụla ọrụ m rụrụ. Ha hụrụ ya tụọ egwu; ndị niile bi na nsọtụ ụwa na-amakwa jijiji. Ha zukọtara bịa nso. 6Onye ọbụla nʼime ha na-agba ibe ya ume na-asị, “Nwee obi ike.” 7Onye ọkpụ ụzụ ọla na-agba onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ume. Onye ji mkpirisi igwe eme ka ihe dị mụrụmụrụ, na-agba onye na-akụ osiama ume. Otu onye na-ekwu banyere nkpukọta ya, na-asị, “A kpụziri ya akpụzi.” Onye nke ọzọ, na-eji ǹtu kpọgidesie ihe ahụ apịrị apị ike ka ọ ghara ịda. 8“Ma gị onwe gị, Izrel, ohu m, Jekọb, onye m họpụtara, gị mkpụrụ Ebraham, bụ enyi m. 9Esitere m na nsọtụ niile nke ụwa kpọghachi unu, gwa unu na ohu m ka unu bụ, nʼihi na ahọpụtala m unu, agakwaghị m ahapụ unu. 10Ya mere, unu atụla egwu nʼihi na anọnyeere m unu. Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nʼihi na abụ m Chineke unu. Aga m eme ka unu dịrị ike; aga m enyere unu aka; aga m ejikwa aka nri nke ezi omume m kwagide unu. 11“Lee! A ga-etinye ndị niile iwe ha dị ọkụ megide unu nʼọnọdụ ihe ihere, ihere ga-emekwa ha. Ndị niile na-eguzogide unu ga-aghọ ihe efu, bụrụ ndị lara nʼiyi. 12Unu ga-ele anya ha, chọọ ha, ma ọ dịghị onye ọbụla nʼime ha ga-afọdụ ndụ. Ndị a na-ebuso unu agha ga-abụ naanị ihe efu. 13Nʼihi na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị Chineke gị, onye na-ejidesi aka nri gị ike bụ onye na-asị gị, ‘Atụla egwu; aga m enyere gị aka.’ 14Atụla egwu, gị idide, bụ Jekọb, unu Izrel dị nta, atụla egwu, nʼihi na mụ onwe m ga-enyere gị aka,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, Onye mgbapụta gị, bụ Onye nsọ nke Izrel.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jen 17:1–9

1Mgbe Ebram gbara iri afọ itoolu na itoolu, Onyenwe anyị gosiri ya onwe ya sị ya, “Abụ m Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. Jegharịa ije nʼihu m, bụrụ onye na-enweghị ịta ụta ọbụla. 2Aga m eme ka ọgbụgba ndụ m dịrị nʼetiti mụ na gị, mekwa ka ị mụbaa nke ukwuu nʼọnụọgụgụ.” 3Ebram dara nʼala, kpudo ihu ya nʼala. Chineke gwara ya sị, 4“Lee, nke a bụ ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na gị. Ị ga-abụ nna ọtụtụ mba. 5Aha gị agaghị abụkwa Ebram, kama ọ ga-abụ Ebraham, nʼihi na emeela m gị nna nke ọtụtụ mba. 6Aga m eme gị ka ị mụbaa nke ukwuu. Aga m eme ka ị ghọọ ọtụtụ mba dị iche iche, ndị eze ga-esitekwa na gị pụta. 7Aga m eme ka ọgbụgba ndụ mụ na gị gbara guzosie ike, ka ọ dịkwara ụmụ ụmụ ndị ga-esote gị nʼọgbọ niile na-abịa. Ọ bụ ọgbụgba ndụ na-egosi na m bụ Chineke gị, na Chineke ụmụ ụmụ gị niile ga-eso gị. 8Ala Kenan niile, ebe ị nọ ugbu a dịka ọbịa ka m ga-enye gị na ụmụ ụmụ gị ga-esote gị dịka ihe nketa ebighị ebi. Aga m abụ Chineke ha.” 9Chineke gwara Ebraham okwu sị ya, “Ma nʼebe ị nọ, ị ghaghị irube isi imezu ihe ọgbụgba ndụ m kwuru, gị onwe gị na ụmụ ụmụ gị ndị ga-esote gị, ruo ọgbọ niile.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ilu 15:20–16:9

20Nwa nke maara ihe na-eme ka obi tọọ nna ya ụtọ, ma onye nzuzu na-eleda nne ya anya. 21Onye na-enweghị uche na-aṅụrị ọṅụ nʼime amaghị ihe ya, ma onye nwere nghọta na-aga ije nʼụzọ ziri ezi. 22Nzube na-enweghị ndụmọdụ na-ama afọ nʼala, ma ndị ndụmọdụ dịrị ọtụtụ ọganihu ga-adị. 23Ọṅụ na-adị mgbe mmadụ natara ọsịsa dị mma, okwu e kwuru nʼoge o kwesiri dị mma. 24Ụzọ ndụ na-agbago elu nye onye nwere uche, iwezuga ha site na-ịgbada nʼala mmụọ dị nʼokpuru. 25Onyenwe anyị na-adọtu ma na-adọrisi ụlọ nke onye mpako, ma oke ala nke nwanyị di ya nwụrụ ka ọ na-elekọta. 26Echiche ọjọọ niile nke ndị na-emebi iwu ka Onyenwe anyị kpọrọ asị ma okwu ebere niile dị ọcha nʼanya ya. 27Onye anya ukwu na-ewetara ezinaụlọ ya nsogbu. Ma onye kpọrọ iri ngarị asị ga-adị ndụ. 28Obi onye ezi omume na-atule ọsịsa ya ma ọnụ nke onye ajọ omume na-asọpụta ihe ọjọọ dị iche iche. 29Onyenwe anyị anọghị ndị na-emebi iwu nso; ma ọ na-anụ ekpere ndị ezi omume. 30Ihu ọchị na-eweta obi ụtọ. Akụkọ ọma na-enyekwa ọkpụkpụ ndụ. 31Onye na-ege ntị nye ịba mba nke na-enye ndụ ga-esoro ndị amamihe nọrọ. 32Onye jụrụ ịdọ aka na ntị kpọrọ onwe ya asị ma onye ọbụla naara ndụmọdụ nwere nghọta. 33Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ amamihe na-abịa site nʼịdọ aka na ntị; onye dị umeala nʼobi ga-anata ugwu na nsọpụrụ. 16:1Mmadụ nwere ike pịa ihe ọ chọrọ ime, ma okwu ikpeazụ ga-esi nʼọnụ Onyenwe anyị. 2Ụzọ niile nke mmadụ dị ọcha nʼanya ya, ma Onyenwe anyị na-atule ebumnobi niile nke mmadụ. 3Were ọrụ gị niile nyefee nʼaka Onyenwe anyị, ọ ga-eme ka ha gaa nʼihu. 4Onyenwe anyị na-eme ka ihe niile rụpụta ebumnuche ya, o bụladị ndị mmebi iwu ka e debere maka ụbọchị mbibi. 5Onyenwe anyị kpọrọ ndị nwere obi dị mpako asị. Mara nke a nke ọma: Ha aghaghị ịta ahụhụ. 6Ọ bụ site nʼịhụnanya na eziokwu ka eji ekpuchi mmehie; ọ bụkwa site nʼegwu Onyenwe anyị ka mmadụ ji agbanarị mmehie. 7Mgbe ụzọ mmadụ na-agbaso na-atọ Onyenwe anyị ụtọ, ọ na-eme ka mmadụ ahụ na ndị iro ya dị nʼudo. 8Ọ dị mma inwe ihe nta nʼezi omume karịa inwe ọtụtụ uru nʼụzọ ikpe na-ezighị ezi. 9Anyị nwere ike pịa ọpịpịa nʼobi anyị, maọbụ Onyenwe anyị na-edu ije anyị.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 1 Epreel na kalenda nzukọ bụ 14 Epreel na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike