Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 15 Epreel

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 15 Epreel 2027

Tọọzdee · Izu nke 3 nke Oge Ista

Mmemme na ndị nsọ

Tọọzdee nke izu nke 3 nke Oge Ista

Ụbọchị izu · Agba ofufe: ọcha

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọrụ 8:26–40

26Mgbe ahụ mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara Filip sị, “Gaa na ndịda, nʼụzọ ọzara nke siri Jerusalem gawa Gaza, ụzọ ahụ bụ ụzọ ọzara.” 27O biliri gawa. Mgbe ahụ, otu onye Itiopia bụ onye onozi, bụrụkwa onyeisi ozi dị mkpa, onye na-eche akụ nke Kandis, eze nwanyị ndị Itiopia, gara Jerusalem ife Chineke. 28Mgbe ọ na-ala, ọ nọdụrụ ala nʼụgbọala ya, nke ịnyịnya na-adọkpụgharị, na-agụ akwụkwọ Aịzaya onye amụma. 29Mmụọ Nsọ gwara Filip, “Gaa ụgbọ ahụ nso, sonyekwara ya.” 30Filip gara nso, nụkwa ka ọ na-agụ akwụkwọ Aịzaya onye amụma. Ọ sịrị, “Ị na-aghọta ihe ị na-agụ?” 31Ọ sịrị, “M ga-esi aṅaa ghọta, ma mmadụ ezighị m?” Ọ rịọrọ Filip ka ọ rigota nʼụgbọala ahụ, soro ya nọdụ nʼime ya. 32Mpaghara akwụkwọ nsọ ọ na-agụ bụ nke a, “E duuru ya dị ka atụrụ gaa nʼebe a ga-egbu ya. Dịka nwa atụrụ na-anọ nwayọọ nʼihu onye na-akpacha ya ajị, otu a ka ọ na-emegheghị ọnụ ya. 33Nʼọnọdụ ịdị ala ya, e meghị ka ikpe ziri ezi ruo ya aka. Onye ga-akọ akụkọ banyere agbụrụ ya? Nʼihi na e sitere nʼụwa wepụ ndụ ya.” 34Onozi ahụ jụrụ Filip, “Biko, gwa m, onye ka onye amụma a na-ekwu okwu ya? Ọ bụ ihe banyere onwe ya ka ọ na-ekwu, ka ọ bụ banyere onye ọzọ?” 35Mgbe ahụ, Filip malitere ikwu okwu, site nʼakụkọ akwụkwọ nsọ ọ na-agụ kọọrọ ya akụkọ oziọma banyere Jisọs. 36Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ha bịaruru ebe ọdọ mmiri nta dị. Onozi ahụ sịrị, “Lee, nke a bụ mmiri. Ọ dị ihe ga-egbochi ime m baptizim?” 37Filip sịrị, “Ọ bụrụ na i ji obi gị niile kwere, e nwere ike ime gị baptizim.” Onozi ahụ sịrị, “Ekwere m na Jisọs Kraịst bụ Ọkpara Chineke.” 38O kwuru ka a kwụsị ụgbọala ahụ. Mgbe ahụ, onozi ahụ na Filip wụdatara banye nʼime mmiri ebe Filip nọ mee ya baptizim. 39Mgbe ha sitere nʼime mmiri ahụ pụta, ngwangwa Mmụọ Onyenwe anyị sitere nʼebe ahụ wepụ Filip, onye onozi ahụ ahụkwaghị ya anya ọzọ; kama ọ gara nʼihu nʼije ya na-aṅụrịkwa ọṅụ. 40Ebe ọzọ a hụrụ Filip bụ nʼAzọtus. O jegharịkwara nʼobodo niile dị nʼala ahụ, na-ekwusa oziọma ruo mgbe ọ bịaruru Sizaria.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 66:8–9, 16–17, 20

8Toonu Chineke anyị, unu mmadụ niile, kwere ka a nụ ụda otuto ya; 9O chebela ndụ anyị, ma mee ka ụkwụ anyị ghara ịmịchapụ. 16Bịanụ nụrụ, unu niile na-atụ egwu Chineke; ka m kọọrọ unu ihe o meere m. 17Eji m ọnụ m kpọkuo ya; otuto ya dị m nʼire. 20Otuto dịrị Chineke, onye na-ajụghị ekpere m maọbụ ghara izi m ịhụnanya ya!

Oziọma

Jọn 6:44–51

44O nweghị onye nwere ike ịbịakwute m ma ọ bụghị na Nna ahụ zitere m kpọtara ya, aga m akpọlitekwa ya nʼụbọchị ikpeazụ. 45E dere ya nʼakwụkwọ ndị amụma, ‘Ha niile ga-abụ ndị Chineke ga-akụziri ihe.’ Onye ọbụla nke gere Nna ahụ ntị ma mụtakwa ihe site na ya na-abịakwute m. 46O nweghị onye ọbụla hụrụla Nna ahụ karịakwa onye ahụ sitere na Chineke, naanị ya hụrụla Nna ahụ. 47Nʼeze, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla kwerenụ nwere ndụ ebighị ebi. 48Abụ m achịcha nke ndụ. 49Nna nna unu ha riri mánà ahụ nʼime ọzara ma mecha nwụọ. 50Ma nke a bụ achịcha ahụ nke si nʼeluigwe bịa, nke mmadụ pụrụ iri ma ghara ịnwụ anwụ. 51Abụ m achịcha dị ndụ nke siri nʼeluigwe bịa. Ọ bụrụ na onye ọbụla erie achịcha a, ọ ga-adị ndụ ruo ebighị ebi. Nri a bụ anụ ahụ m, nke m ga-enye maka ndụ nke ụwa.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike