Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 16 Epreel

Kalenda Ọtọdọks · 3 Eprel (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 16 Epreel 2027

Fraịdee · Izu nke 5 nke Lent Ukwu · Olu 4

Mmemme na ndị nsọ

Venerable Nicetas the Confessor, Abbot of Medikion († 824)

Oge Lent Ukwu

Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Elekere nke 6

Aịz 45:11–17

11“Otu a ka Onyenwe anyị, Onye nsọ nke Izrel, Onye kere Izrel na-ajụ ajụjụ sị; banyere ihe ndị gaje ime ị na-ajụ m ajụjụ banyere ụmụ m, maọbụ nye m iwu banyere ọrụ aka m? 12Ọ bụ mụ onwe m kere ụwa, keekwa mmadụ ka o biri nʼime ya. Aka m abụọ ka m ji gbasaa mbara igwe, nyekwa kpakpando niile iwu. 13M ga-akpọlite Sairọs nʼezi omume m: M ga-eme ka ụzọ ya niile zie ezi. Ọ ga-ewughachi obodo m, mee ka ndị m a dọtara nʼagha nwere onwe ha, ma ọ bụghị nʼihi ọnụahịa maọbụ ihe nrite, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.” 14Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Ihe ndị Ijipt rụpụtara na ngwa ahịa ndị Kush na ndị Saba ahụ toro ogologo, ha ga-abịakwute gị, ha ga-abụ nke gị; ha ga-esokwa gị nʼazụ dịka ndị mkpọrọ e kere agbụ. Ha ga-akpọ isiala nʼihu gị rịọ gị arịrịọ, na-asị, ‘Nʼezie, ọ bụ naanị otu Chineke dị, onye nọnyere gị, ọ dịkwaghị chi ọzọ dị.’ ” 15Nʼezie, gị onwe gị bụ Chineke, Onye nzọpụta Izrel. Ị bụkwa Chineke, onye na-ezonarị mmadụ onwe ya. 16A ga-eme ndị niile na-akpụ arụsị ihe ihere, e, ihere ga-eme ha nʼihi na a ga-etinye ha nʼọnọdụ oke ihere. 17Ma Onyenwe anyị ga-eji nzọpụta nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi zọpụta Izrel. Ihere agaghị eme ha. A gaghị etinyekwa ha nʼọnọdụ ihe ihere ruo mgbe ebighị ebi.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jen 22:1–18

1Mgbe ihe ndị a gasịrị, Chineke nwara Ebraham. Ọ sịrị ya, “Ebraham.” Ebraham zara sị, “Lekwa m.” 2Chineke sịrị, “Duru nwa gị nwoke, naanị otu nwa gị nwoke, Aịzik onye ị hụrụ nʼanya, gaa nʼala Mọrịa. Jiri ya chụọrọ m aja nsure ọkụ nʼelu otu nʼime ugwu dị nʼebe m ga-egosi gị.” 3Nʼisi ụtụtụ echi ya, Ebraham biliri kwadoo ịnyịnya ibu ya. O duuru ndị ikom abụọ na-ejere ya ozi, na nwa ya nwoke Aịzik. O gbutere nkụ ga-ezuru ya ịchụ aja nsure ọkụ, bilie gawa ebe ahụ Chineke gwara ya maka ya. 4Nʼụbọchị nke atọ, Ebraham lepụrụ anya hụ ebe ahụ nʼebe dị anya. 5Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi sị, “Nọdụnụ nʼebe a, unu na ịnyịnya ibu anyị, ka mụ na nwokorobịa a gaa nʼebe ahụ. Anyị feecha ofufe, anyị ga-alọghachikwute unu ọzọ.” 6Ebraham boro nwa ya nwoke Aịzik ukwu nkụ ahụ e ji achụ aja nsure ọkụ nʼisi, ma ya onwe ya jidere ọkụ na mma. 7Aịzik gwara nna ya Ebraham sị, “Nna m.” Ebraham zara, “Ehee, nwa m.” Aịzik sịrị, “Ọkụ na nkụ dị nʼebe a, olee nwa atụrụ e ji achụ aja nsure ọkụ?” 8Ebraham zara, “Nwa m, Chineke nʼonwe ya ga-eweta nwa atụrụ e ji achụ aja nsure ọkụ.” Ha abụọ gakwara nʼihu nʼije ha. 9Mgbe ha ruru ebe ahụ Chineke gwara ya maka ya, Ebraham wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ, doo nkụ ndị ahụ niile nʼusoro nʼelu ya. O kere nwa ya Aịzik agbụ, tụkwasị ya nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, na nʼelu nkụ ndị ahụ. 10Mgbe ahụ Ebraham setịpụrụ aka ya, welite mma ka o gbuo nwa ya nwoke. 11Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị si nʼeluigwe kpọọ ya oku sị ya, “Ebraham! Ebraham!” Ebraham zara, “Lekwa m nʼebe a.” 12Ọ sịrị ya, “Emetụkwala nwokorobịa ahụ aka. Emekwala ya ihe ọbụla. Nʼihi na amatala m ugbu a na ị na-atụ egwu Chineke, ebe ọ bụ na i kwenyere iji nwa gị nwoke, naanị otu nwa nwoke i nwere chụọrọ m aja.” 13Ebraham leliri anya hụ otu ebule nke eriri ọhịa jidere na mpi ya. Ebraham gara jide ebule ahụ, were ya chụọ aja nsure ọkụ nʼọnọdụ nwa ya nwoke. 14Ya mere, Ebraham kpọrọ ebe ahụ, “ Onyenwe anyị ga-arọpụta.” Ya mere ruo taa a na-asị, “Nʼugwu Onyenwe anyị, a ga-arọpụta.” 15Mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe kpọọ Ebraham oku nke ugboro abụọ, 16sị, “Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, ji onwe m na-aṅụ iyi na-ekwupụta sị, ebe ọ bụ na i mere ihe dị otu a, na i kwenyere iji nwa gị nwoke, naanị otu nwoke i nwere chụọrọ m aja, 17aga m agọzi gị nʼezie, mekwa ka ụmụ ụmụ gị mụbaa nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando nke mbara eluigwe na dịka aja dị nʼọnụ mmiri osimiri. Ụmụ ụmụ gị ga-enwetara onwe ha ọnụ ụzọ ama ndị iro ha. 18Sitekwa na mkpụrụ gị ka a ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa, nʼihi na i rubeere m isi.”

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ilu 17:17–18:5

17Ezi enyi na-egosi ịhụnanya ya nʼoge ọbụla. Otu a kwa, nwanne na-aba uru nʼoge mkpa. 18Ọ bụ uche ezughị oke ịnara ụgwọ onye ọzọ ji, si otu a ghọọ onye ji ụgwọ. 19Onye na-ahụ esemokwu nʼanya hụrụ mmehie nʼanya. Onye na-ewuli ọnụ ụzọ ama ya elu na-akpọ ntipịa oku. 20Ọ dịghị aga nʼihu bụ onye obi ya gbagọrọ agbagọ. Onye nwere ire nrafu ga-adanye na nsogbu. 21Ọ bụ naanị iru ụjụ na obi ọjọọ dịịrị nna nke nwa ya na-eme ihe nzuzu. 22Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ sie ike, ma mmụọ na-eru ụjụ oge niile na-akpata ọrịa. 23Onye ajọ omume na-anara ihe ngarị na nzuzo ka ọ sụgharịa ikpe ziri ezi isi. 24Onye nwere nghọta na-eche uche amamihe nʼihe ọ na-eme, ma anya onye nzuzu na-elegharị ruo na nsọtụ nke ụwa. 25Nwa dị nzuzu na-ewetara nna ya mwute, bụrụkwa nne mụrụ ya ihe ilu. 26Ọ bụrụ na ịra onye ezi omume nra adịghị mma, nʼezie, ịpịa ndị ọrụ ihe nʼihi ezi ọrụ ha ezighị ezi. 27Nwoke ahụ na-adịghị ekwu ọtụtụ okwu bụ onye maara ihe, onye mmụọ ya dịkwa jụụ bụ onye nwere nghọta. 28A ga-agụ onye nzuzu nʼonye maara ihe ma ọ bụrụ na ha gba nkịtị, gụọkwa ha na ndị nwere nghọta ma ọ bụrụ na ha e jide ire ha. 18:1Onye ihe mmadụ na-adịghị amasị na-agbaso naanị ọchịchọ nke ya onwe ya, na-alụsokwa ezi nzube niile ọzọ ọgụ. 2Nghọta adịghị atọ onye nzuzu ụtọ. Naanị ihe ọ maara bụ ikwu uche ya. 3Mgbe onye ajọ omume na-abata, ka nleda anya na-abata, otu a kwa nkọcha na-eweta ihere. 4Okwu ọnụ niile bụ mmiri dị omimi, ma amamihe dị ka mmiri iyi na-asọ asọ. 5Ọ dịghị mma ime ka ikpe gara onye mere ihe ọjọọ, si otu a gbochie onye aka ya dị ọcha inweta ikpe ziri ezi.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 3 Epreel na kalenda nzukọ bụ 16 Epreel na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike