Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 13 Epreel

Kalenda Ọtọdọks · 31 Maachị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 13 Epreel 2027

Tiuzdee · Izu nke 5 nke Lent Ukwu · Olu 4

Mmemme na ndị nsọ

St. Hypatius the Wonderworker and Bishop of Gangra († c. 326)

Oge Lent Ukwu

Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Elekere nke 6

Aịz 40:18–31

18Onye kwanụ ka unu ga-eji tụnyere Chineke? Olee ụdị oyiyi unu ga-eji kọwaa ihe o yiri? 19Ma gbasara arụsị apịrị apị, nke onye na-akwa nka ọla tụrụ, nke onye ọkpụ ụzụ ọlaedo na-eji ọlaedo techie ya, ọ bụkwa ya ka ọ na-akpụrụ ọlaọcha. 20Ma onye ogbenye na-enweghị ịchụ aja dị otu a na-ahọrọ osisi nke na-agaghị ere ure. Ọ na-akpọtara onwe ya onye maara akwa ǹka osisi nke ọma, onye ga-apịtara ya oyiyi arụsị nke na-agaghị ada ada. 21Ọ bụ na unu amaghị? Ọ ga-abụ na unu anụbeghị ya? Ọ pụtara na a kọbereghị unu ya site na mmalite? Ọ bụ na unu aghọtabeghị site na mgbe a tọrọ ntọala ụwa? 22Na Chineke nọ nʼelu ocheeze ya nke gbara ụwa gburugburu. Ndị nọ nʼụwa dịkwa ka ụmụ ụkpana. Ọ bụ ya tụsara eluigwe dịka akwa, were ya mere ebe obibi ya. 23Ọ na-eweda ndị ukwu niile nke ụwa, mee ha ka ha ghọọ ihe efu. 24Mgbe a na-ele ha anya, ha na-adị ka ihe a kụrụ nʼubi nke na-epute epute. Mgbe a kụrụ ha, mgbe ha na-epute, mgbe ha na-amanye mgbọrọgwụ nʼala, mgbe ahụ kwa ka Onyenwe anyị na-ezite ifufe nke na-akpọnwụ ha, bufuo ha dịka ahịhịa kpọrọ nkụ. 25“Olee onye unu ga-eji tụnyere m? Onye kwa ka mụ na ya ha?” Nke a bụ ihe Onye Nsọ Izrel na-ajụ. 26Lee anya nʼeluigwe; onye kere kpakpando ndị a niile? Onye na-edu ha dịka onye ọzụzụ atụrụ? Onye na-akpọ nke ọbụla aha ya? Ọ bụ site nʼamamihe na ike ya dị ukwuu, ka o ji eme ka ha ghara ịkpafu. 27Ọ bụ nʼihi gịnị ka i ji na-asị, gị Jekọb? Ọ bụkwa gịnị mere gị Izrel, i ji na-atamu ntamu na-asị, “Ụzọ m bụ ihe ezonarịrị Onyenwe anyị, Chineke adịghị etinyekwa anya ya nʼihe metụtara m?” 28Ọ bụ na ị matabeghị? Ọ ga-abụ na ị nụbeghị ya? Onyenwe anyị bụ Chineke nke mgbe niile ebighị ebi, Onye kere nsọtụ niile nke ụwa. Ọ naghị ada mba; ike adịghịkwa agwụ ya. O nwekwaghị onye pụrụ ịmata ịdị omimi nke nghọta ya. 29Ọ na-enye ndị na-ada mba ike, na-emekwa ka ndị na-enweghị ume nwee ume. 30Ọ bụladị ụmụ okorobịa na-ada mba, ike na-agwụkwa ha. E, ụmụ okorobịa na-asọ ngọngọ daa, 31ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị, ga-agbanwe ike ha, nweta ike ọhụrụ. Ha ga-eji nku felie elu dịka ugo. Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha; ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jen 15:1–15

1Mgbe nke a gasịrị, okwu Onyenwe anyị ruru Ebram site nʼọhụ, sị ya, “Atụla egwu, Ebram Abụ m ọta gị, ụgwọ ọrụ dị ukwu nke i nwere.” 2Ma Ebram zara sị ya, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, gịnị bụ ihe ị ga-enye m ebe ọ bụ na m amụtaghị nwa? Lee, ọ bụ Elieza, onye Damaskọs, ga-eketa akụ m niile.” 3Ebram gara nʼihu kwuo sị, “Ebe ọ bụ na m amụtaghị ụmụ, ọ bụ ohu nọ nʼụlọ m ga-eketa akụ m.” 4Ma okwu Onyenwe anyị rutere ya, “Nwoke a agaghị eketa ihe i nwere, kama nwa nwoke nke ga-esi nʼahụ gị pụta ga-eketa ihe i nwere.” 5Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kpọpụtara Ebram nʼezi sị ya, “Lelie anya gị elu na mbara eluigwe, gụọ kpakpando niile ị hụrụ ọnụ, ma ị ga-enwe ike ịgụta ha.” Ọ gwara ya sị, “Otu a ka mkpụrụ gị ga-adị. A gaghị agụta ha ọnụ.” 6Ebram kweere nʼihe Onyenwe anyị kwuru. Nʼihi nke a, a gụnyere ya okwukwe a dịka ezi omume. 7Onyenwe anyị gwakwara ya sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, onye si nʼala Ụọ nke ndị Kaldịa kpọpụta gị, inye gị ala a ka ọ bụrụ ihe nweta gị.” 8Ma Ebram zara sị, “Biko, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị olee otu m ga-esi mara na m ga-enweta ya?” 9Onyenwe anyị zara sị ya, “Wetara m nwa nne ehi gbara afọ atọ, na nne ewu gbara afọ atọ, na ebule gbara afọ atọ, na nduru, na nwa kpalakwukwu.” 10Ebram wetaara ya ihe ndị a niile bọwaa ha ụzọ abụọ, doo ha nʼusoro ka otu akụkụ chee akụkụ nke ọzọ ihu. Ma ọ bọwaghị ụmụ nnụnụ ndị ahụ. 11Mgbe anụ ufe fekwasịrị ozu anụ ndị ahụ, Ebram chụpụrụ ha. 12Mgbe anwụ bidoro ịda, Ebram dara nʼoke ụra, oke ụjọ na oke ọchịchịrị dakwasịrị ya. 13Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara ya sị, “Mata nke ọma na ụmụ ụmụ gị ga-anọ dịka ndị ọbịa nʼala na-abụghị nke ha. A ga-edo ha ọnọdụ dịka ndị ohu, mejọọ ha narị afọ anọ. 14Ma aga m ata mba ahụ ha na-efe dịka ohu ahụhụ. Nʼikpeazụ, ha ga-eji ọtụtụ akụ si nʼebe ahụ pụta. 15Ma ị ga-anwụ nʼudo. A ga-eli gị mgbe ị kara ezi nka.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ilu 15:7–19

7Egbugbere ọnụ onye maara ihe na-agbasa ihe ọmụma, ma obi ndị nzuzu ezighị ezi. 8Onyenwe anyị na-akpọ aja ndị ajọ omume asị, ma ekpere ndị ndụ ha ziri ezi na-atọ ya ụtọ. 9Onyenwe anyị kpọrọ ụzọ ndị na-emebi iwu asị, ma ndị na-achụso ezi omume ka ọ na-ahụ nʼanya. 10Oke ịdọ aka na ntị na-echere ndị na-ahapụ ụzọ. Onye kpọrọ ịba mba asị ga-anwụ ọnwụ. 11Onyenwe anyị mazuru ihe omimi niile nke ọnwụ na ọkụ ala mmụọ; ọ ga-esikwa aṅaa ghara ịma obi ụmụ mmadụ? 12Ọ dịghị atọ onye na-akwa emo ụtọ ma a baara ya mba, ya mere ọ dịghị ejekwuru onye maara ihe. 13Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ihu dị mma. Ihu gbarụrụ agbarụ na-egosi obi nwere ihe mwute. 14Obi nwere nghọta na-achọ ịmata ihe, ma ọnụ onye nzuzu na-azụ onwe ya nʼokwu na-abaghị uru. 15Ndụ onye ogbenye jupụtara nnọọ na mgbalị, ma ndị nwere udo nʼobi na-eri oriri mgbe niile. 16Ọ dị mma inwe akụnụba dị nta ma bụrụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị, karịa inwe akụ ma nọrọ na nsogbu. 17Ọ ka mma bụ oke nri akwụkwọ nri nta nke nwere ịhụnanya, karịa ehi buru ibu a zụziri azụzi nke ịkpọ asị dị na ya. 18Onye iwe ọkụ na-amalite ọgụ; ma onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ na-eme ka ịlụ ọgụ kwụsị. 19Eji ogwu gbochie ụzọ onye umengwụ, ma ụzọ onye omume ya ziri ezi bụ ụzọ dị larịị.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 31 Maachị na kalenda nzukọ bụ 13 Epreel na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike