Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 13 Epreel

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 13 Epreel 2027

Tiuzdee · Izu nke 3 nke Oge Ista

Mmemme na ndị nsọ

Tiuzdee nke izu nke 3 nke Oge Ista

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: ọcha

Onye nsọ Matin nke Mbụ, Pope na Onye nwụrụ nʼihi okwukwe · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọrụ 7:51–8:1

51“Unu ndị isiike! Ndị obi ha, na ntị ha kpọchiri akpọchi ịnụ ihe. Ndị na-ajụ ịnabata Mmụọ Nsọ dịka nna nna unu ha mere. 52Ọ dị onye amụma ndị nna unu ha na-akpọgbughị? Ha gburu ọ bụladị ndị buru amụma banyere ọbịbịa nke onye ezi omume ahụ, ma ugbu a unu bụ ndị raara ya nye ma gbukwaa ya. 53Unu bụ ndị natara iwu Chineke dịka e nyere ya site nʼaka ndị mmụọ ozi, ma unu edebeghị ya.” 54Mgbe ha nụrụ ihe ndị a, iwe were ha nke ukwu. Ha tara ikikere eze nʼiwe na nʼọnụma nʼebe ọ nọ. 55Ma ebe o jupụtara na Mmụọ Nsọ, o lere anya nʼeluigwe hụ ebube Chineke. Ọ hụkwara Jisọs ka o guzoro nʼaka nri Chineke. 56Ọ sịrị, “Lee, ana m ahụ ka eluigwe meghere, hụkwa Nwa nke Mmadụ ka ọ na-eguzo nʼaka nri Chineke.” 57Ha mere ụzụ dị ukwuu, were mkpịsịaka ha rụchie ntị ha. Ha niile gbara ọsọ gaa nụkwasị ya, 58dọkpụrụ ya pụọ nʼazụ obodo malite ịtụ ya nkume. Nʼoge a, ndị akaebe wụsara uwe ha nʼụkwụ otu nwokorobịa a na-akpọ Sọl. 59Mgbe ha na-atụ Stivin nkume ahụ, o kpere ekpere, “Onyenwe anyị Jisọs, nara mmụọ m.” 60O gburu ikpere nʼala werekwa oke olu tie mkpu, “Onyenwe anyị, biko agụnyekwarala ha mmehie nke a!” Mgbe o kwusiri nke a, ọ dara nʼala nwụọ. 8:1Sọl kwenyere ka e gbuo ya. Nʼụbọchị ahụ, oke mkpagbu bidoro megide nzukọ dị na Jerusalem. Ndị niile kwere ekwe, ma ewezuga ndị ozi nʼonwe ha gbasasịrị nʼala Judịa na Sameria.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 31:2–3, 5–7, 16, 20

2Tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m, bịa ngwangwa gbapụta m; ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba, ebe mgbaba e wusiri ike maka nzọpụta m. 3Ebe ị bụ oke nkume m na ebe mgbaba m e wusiri ike, nʼihi aha gị, duo m ma na-edukwa m. 5Nʼaka gị ka m na-enyefe mmụọ m; gbapụta m, o Onyenwe anyị, Chineke, onye eziokwu. 6Akpọrọ m ha asị bụ ndị niile na-efe chi mba ọzọ ndị na-abaghị uru; ana m atụkwasị Onyenwe anyị obi m. 7Aga m enwe obi ụtọ ma ṅụrịkwaa ọṅụ nʼime ịhụnanya gị, nʼihi na ị hụrụ nsogbu m marakwa ihe mgbu nke mmụọ m. 16Mee ka amara gị mụkwasị ohu gị dịka anyanwụ; zọpụta m nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ. 20I na-ezobe ha nʼebe nzuzo gị pụọ nʼizu nzuzo nke ụmụ mmadụ; ị na-echebe ha nʼime ebe obibi gị; ka ha pụọ nʼebubo nke ire dị iche iche.

Oziọma

Jọn 6:30–35

30Ya mere ha sịrị ya, “Olee ihe ịrịbama ị ga-egosi anyị nke anyị ga-ahụ ma kwere na gị? Kedụ ọrụ ị ga-arụ? 31Nna nna anyị ha riri mánà nʼọzara; dị ka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘O sitere nʼeluigwe nye ha achịcha ka ha rie.’” 32Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụghị Mosis nyere unu achịcha ahụ site nʼeluigwe, kama ọ bụ Nna m na-enye unu ezi achịcha ahụ site nʼeluigwe. 33Nʼihi na achịcha Chineke bụ nke ahụ si nʼeluigwe rịdata, na-enyekwa ụwa ndụ.” 34Ha sịrị ya, “Nna anyị ukwu, nye anyị ụdị achịcha a site ugbu a gawa.” 35Jisọs sịrị ha, “Abụ m achịcha ahụ na-enye ndụ. Onye ọbụla na-abịakwute m, agụụ agaghị agụ ya. Onye ọbụla kwa kweere na m, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike