Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 12 Epreel

Kalenda Ọtọdọks · 30 Maachị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 12 Epreel 2027

Mọnde · Izu nke 5 nke Lent Ukwu · Olu 4

Mmemme na ndị nsọ

Venerable John Climacus of Sinai, Author of “the Ladder” († 649)

Oge Lent Ukwu

Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Elekere nke 6

Aịz 37:33–38:6

33“Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru banyere eze Asịrịa. “Ọ gaghị azọbata ụkwụ ya nʼime obodo a maọbụ gbaa ọ bụladị otu àkụ nʼebe a. Ọ gaghị eji ọta jegharịa nʼọnụ ụzọ ama ya, maọbụ wuo mgbidi nnọchibido megide ya. 34Ụzọ o si bịa ka ọ ga-esi laghachi; ọ gaghị abanye nʼobodo a.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 35“Aga m echebe obodo a, zọpụtakwa ya nʼihi aha m, na nʼihi Devid, bụ ohu m.” 36Mmụọ ozi Onyenwe anyị pụrụ gaa tigbuo otu puku narị na puku iri asatọ na ise nʼụlọ ikwu ndị Asịrịa. Mgbe ndị mmadụ tetara nʼisi ụtụtụ, lee, ozu ka ha jupụtara ebe niile. 37Ya mere, Senakerib, eze Asịrịa, biliri ije, laghachi nʼala ya. Ọ laghachiri biri nʼobodo Ninive. 38Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ na-akpọ isiala nʼụlọ chi ya a na-akpọ Nisrọk, ụmụ ya ndị ikom aha ha bụ Adramelek na Shareza were mma agha gbuo ya. Ha gbapụrụ ọsọ gbaga nʼala Ararat. Isahadon, bụ nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 38:1Nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa ruo na ọ gaara anwụ. Aịzaya onye amụma, nwa Emọz, bịakwutere ya, sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: Dozie ezinaụlọ gị, nʼihi na ị ga-anwụ. Ị gaghị esite nʼute ọrịa a bilie.” 2Hezekaya tụgharịrị chee ihu ya nʼaja ụlọ kpee ekpere nye Onyenwe anyị sị, 3“Chetakwa, Onyenwe anyị, otu m si jegharịa nʼihu gị nʼikwesị ntụkwasị obi, jiri obi m niile fee gị ofufe, ma meekwa ihe dị mma nʼanya gị.” Hezekaya bekwara akwa nke ukwuu. 4Mgbe ahụ, okwu nke Onyenwe anyị rutere Aịzaya, 5“Gaa, gwa Hezekaya, sị ‘Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Chineke nna gị Devid kwuru, anụla m ekpere gị, ahụkwala m anya mmiri akwa gị. Aga m atụkwasị afọ iri na ise nʼụbọchị ndụ gị. 6Aga m anapụtakwa gị na obodo a site nʼaka eze Asịrịa. Aga m echebe obodo a.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jen 13:12–18

12Ebram nọdụrụ nʼala Kenan, ma Lọt gara biri nʼetiti obodo ndị ahụ dị na mbara ala. Ọ mara ụlọ ikwu ya nso nso obodo Sọdọm. 13Ma ndị Sọdọm bụ ndị obi tara mmiri, ndị na-emehie nke ukwuu megide Onyenwe anyị. 14Mgbe Lọt siri nʼebe ahụ pụọ, Onyenwe anyị gwara Ebram okwu sị ya, “Site nʼebe ahụ ị nọ lelie anya gị, lee anya nʼugwu na ndịda, nʼọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ. 15Ala ahụ niile ị hụrụ ka m ga-enye gị na mkpụrụ gị ruo mgbe ebighị ebi. 16Aga m eme ka mkpụrụ gị baa ụba dịka aja dị nʼala. Ọ bụrụ na mmadụ enwe ike ịgụta ọnụọgụgụ aja dị nʼala, ha ga-enwe ike gụta ọnụọgụgụ mkpụrụ gị. 17Bilie jegharịa nʼala ahụ niile nʼakụkụ ya ọbụla, nʼihi na ana m enye gị ha niile.” 18Ya mere, Ebram bugharịrị ụlọ ikwu ya, gaa biri nʼakụkụ osisi ukwu Mamre nke dị na Hebrọn. O wuru ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị nʼebe ahụ.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ilu 14:27–15:4

27Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ isi iyi nke ndụ; nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ. 28Otuto onye eze na-enwe dabeere nʼọnụọgụgụ ndị ọ na-achị, e wezuga ndị ọ na-achị, eze enweghị ugwu ọbụla. 29Onye na-enwe ndidi nwere ọtụtụ nghọta, ma onye obi ọkụ na-egosi enweghị uche ya. 30Ndụ dị jụụ na-eme ka ụbọchị mmadụ dị ogologo; ekworo na-eme ka o ree ure. 31Onye ọbụla na-emegbu onye ogbenye na-elelị Chineke kere ha anya, ma onye na-emere onye ogbenye ebere na-asọpụrụ Chineke. 32Ọ bụladị nʼọnwụ onye ezi omume nwere ebe mgbaba nʼime Chineke, ma ndị ajọ omume na-ala nʼiyi, mgbe mbibi bịara. 33Nʼobi onye nwere nghọta ka amamihe na-anọgide, ma ọ bụladị nʼetiti ndị nzuzu ọ na-eme ka amara ya. 34Ezi omume na-ewuli mba elu, ma mmehie bụ ihe ihere nye ndị ọbụla. 35Eze na-aṅụrị ọṅụ nʼihi odibo maara ihe; ma odibo na-eweta ihere na-akpali oke iwe ya. 15:1Ọsịsa okwu dị nro na-eme ka iwe na ọnụma laa azụ; ma okwu ike na-akpali iwe. 2Ire onye maara ihe na-eme ka ihe ọmụma mụbaa, ma ọnụ onye nzuzu na-ekwupụta okwu enweghị uche. 3Onyenwe anyị na-ahụzu ihe niile, anya ya dịkwa nʼahụ ndị ọma na ndị ọjọọ. 4Okwu dị nwayọọ na-eweta ndụ na ume; ma nkwutọ na-eweta ịda mba.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 30 Maachị na kalenda nzukọ bụ 12 Epreel na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike