Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 7 Epreel
Kalenda Ọtọdọks · 25 Maachị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 7 Epreel 2027
Wenezdee · Izu nke 4 nke Lent Ukwu · Olu 3
Mmemme na ndị nsọ
The Annunciation of our Most Holy Lady, Theotokos and Ever-Virgin Mary
Oge Lent Ukwu
E kwere azụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe ụtụtụ: Oziọma (maka Mkpọsa)
39Nʼoge ahụ, Meri biliri gaa ọsịịsọ nʼotu obodo dị nʼugwu Juda. 40Nʼebe ahụ, ọ banyere nʼụlọ Zekaraya, kelee Elizabet. 41Mgbe Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa nọ ya nʼafọ megharịrị ahụ. E mere ka Elizabet jupụta na Mmụọ nsọ. 42O tiri mkpu nʼoke olu sị, “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ nʼetiti ụmụ nwanyị niile. Onye a gọziri agọzi ka nwa ahụ ị bu nʼafọ bụkwa. 43Onye kwanụ ka m bụ na ihuọma dị otu a kpọrọ m na nne Onyenwe m ga-abịa ileta m? 44Ngwangwa m nụrụ olu ekele gị, nwa nọ m nʼafọ wuliri elu nʼọṅụ. 45Ngọzị ga-adịrị onye ahụ kwere na Onyenwe anyị ga-emezu ihe o kweere ya na nkwa ime.” 46Ma Meri sịrị, “Mkpụrụobi m na-ebuli Onyenwe anyị elu 47mmụọ m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke bụ Onye nzọpụta m, 48nʼihi na o ledatala anya, lekwasị m, bụ odibo ya dị ala. Site ugbu a gaa nʼihu, ọgbọ niile ga-akpọ m onye a gọziri agọzi. 49Nʼihi na Onye dị ike emeelara m ihe dị ukwuu. Aha ya dịkwa nsọ. 56Meri nọnyeere ya ihe dịka ọnwa atọ ma mesie laghachi nʼụlọ ya.
Elekere nke 6
21Lee anya! Onyenwe anyị si nʼebe obibi ya na-abịa ikpe ndị bi nʼụwa ikpe nʼihi mmehie ha niile. Ụwa ga-ekpughepụ gosi ọbara niile a wụsiri nʼelu ya, ọ gaghị ezokwa ndị niile e gburu lie nʼime ya. 27:1Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eji mma agha ya iwe ya, dị ukwuu dịkwa ezigbo ike, taa agwọ ahụ na-akpụ akpụ bụ Leviatan ahụhụ. Leviatan bụ agwọ mgbakọ ahụ; ọ ga-egbukwa nnukwu anụ ọjọọ ahụ nke bi na mmiri. 2Nʼụbọchị ahụ, abụ a ga-adị nʼọnụ ha, abụ ha ga-abụ banyere ubi vaịnị nke na-amị ezi mkpụrụ. 3“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-elekọta ya, ana m agba ya mmiri ụbọchị niile, na-eche ya nche ehihie na abalị. Ka onye ọbụla ghara iji ihe ọjọọ leta ya. 4Adịghị m ewekwa iwe. Ọ bụrụ na ọ bụ naanị ogwu na uke na-echere m aka mgba, aga m ebili buso ha agha, aga m esurekwa ha ọkụ. 5Ma ọ bụghị otu a, ka ha bịakwute m maka nchekwa, ha bịa ka mụ na ha mee udo. E, ha bịa ka mụ na ha mee udo.” 6Nʼụbọchị ndị na-abịa, Jekọb ga-agba mgbọrọgwụ. Izrel ga-agbawa okoko dịka osisi, maakwa ifuru, jirikwa mkpụrụ mejupụta ụwa niile. 7Onyenwe anyị atabeghị Izrel ahụhụ dịka o si taa ndị iro ya. O mebekwaghị ka e gbuo ndị ya dị ka e si gbuo ndị iro ha. 8Onyenwe anyị tara ndị ya ahụhụ, mee ka a dọrọ ha nʼagha ma buru ha gaa mba ọzọ. Ọ bụ ifufe ọjọọ nke si nʼọwụwa anyanwụ ka o ji bupụ ha. 9Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka a ga-esi bupụ ikpe ọmụma dịrị Jekọb, nke a bụkwa iju eju nke mkpụrụ e ji wezuga mmehie ya: Mgbe ha gweriri nkume niile ha ji wuo ebe ịchụ aja arụsị ha dịka ntụ, mgbe ha wezugara ogidi arụsị Ashera, na ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
18Ụmụ ndị ikom Noa ndị si nʼụgbọ mmiri pụta bụ Shem, Ham na Jafet. (Ham bụ nna Kenan.) 19Ndị a bụ ụmụ ndị ikom atọ Noa mụrụ. Ọ bụ site na ha ka ndị mmadụ niile gbasara nʼụwa niile si pụta. 20Noa, onye ọrụ ubi, bidoro ịkụ ubi vaịnị a gbara ogige. 21Mgbe ọ ṅụrụ mmanya si nʼubi a, ṅụbiga ya oke, ọ gbaara ọtọ dinaa ala nʼime ụlọ ikwu ya. 22Ham, nna Kenan, hụrụ ọtọ nna ya, gaa kọọrọ ụmụnne ya abụọ nọ nʼezi ihe ọ hụrụ. 23Ma Shem na Jafet weere akwa tụkwasị nʼubu ha, were azụ jere ije ruo nʼebe nna ha nọ, hapụ akwa ahụ ka ọ dakwasị nna ha kpuchikwaa ọtọ ya. Ma ha chepuru ihu nʼebe ọzọ mgbe ha na-eme nke a, nʼihi ya, ha elekwasịghị ọtọ nna ha anya. 24Mgbe Noa si nʼụra mmanya ya bilie, chọpụta ihe nwa ya nwoke nke nta mere, 25o kwuru sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka Kenan bụ! Ohu ndị ohu, ka ọ ga-abụrụ ụmụnne ya.” 26Ọ sịkwara, “Ngọzị dịrị Onyenwe anyị Chineke Shem. Ka Kenan bụrụ ohu Shem. 27Ka Chineke mee ka ebe obibi Jafet saa mbara, ka Jafet biri nʼụlọ ikwu Shem, meekwa ka Kenan bụrụ ohu ya.” 28Mgbe uju mmiri ahụ gabigachara, Noa biri ndụ narị afọ atọ na iri afọ ise ọzọ. 29Ọnụọgụgụ afọ Noa niile mgbe ọ nwụrụ, bụ narị afọ itoolu na iri afọ ise. 10:1Ndị a bụ akụkọ banyere Shem, Ham na Jafet, ụmụ ndị ikom atọ Noa mụrụ. Ha onwe ha mụtara ụmụ nke aka ha, mgbe uju mmiri gafesịrị.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
23Onye nwere uche na-edebe ihe ọmụma ha nye onwe ha, ma onye nzuzu na-agbasa enweghị uche ya nʼanwụ. 24Aka na-arụsị ọrụ ike ga-achị achị, ma umengwụ ga-akwụsị naanị nʼọrụ mmanye. 25Obi nke jupụtara na nchegbu na-ada mba, ma okwu ọma na-eme ka obi ṅụrịa. 26Onye ezi omume na-eduzi onye agbataobi ya, ma onye na-emebi iwu na-eduhie ha. 27Onye umengwụ adịghị ahụ anụ ọ chụtara na nta nʼọkụ, ma ndị na-arụsị ọrụ ike na-eri site nʼakụ ha nwetara nʼịchụ nta. 28Ụzọ nke onye ezi omume na-eduba na ndụ, nʼụzọ ahụ, ọnwụ adịghị ya. 13:1Nwa maara ihe na-ege ntị na ndụmọdụ nna ya ma onye na-akwa emo adịghị ege ntị nʼịba mba. 2Onye na-eme ezi ihe ga-esite nʼokwu ọnụ ya nweta ụgwọ ọrụ, ma ndị na-aghọgbu ibe ha ga-anata ihe ike dịka ụgwọ ọrụ ha. 3Mmadụ zuruoke bụ onye na-ejide ire ya aka! Ma onye ekwuruekwu na-ewetara onwe ya mbibi. 4Ndị umengwụ na-achọ ọtụtụ ihe ma ọ dịghị ihe ha na-enweta; ma onye na-arụsị ọrụ ike na-enweta ihe niile ọ chọrọ. 5Onye ezi omume kpọrọ ụgha asị, ma okwu ọnụ onye na-emebi iwu na-ewetara ya ihere na nkọcha. 6Ezi omume mmadụ na-abara ya uru na ndụ ya niile, ma ajọ omume ndị mmehie na-ala ha nʼiyi. 7Ọ dị mmadụ na-eme ka ọ bụ ọgaranya maọbụ onye ụkpa. Ma ọ dịkwa mmadụ na-eme ka ọ bụ onye ụkpa maọbụ ọgaranya. 8Ọgaranya nwere ike jiri ego ya gbapụta onwe ya, ma ogbenye adịghị azaghachi mba banyere imerụ ya ahụ. 9Ìhè onye ezi omume na-enwupụ enwupụ, ma oriọna onye mmebi iwu ga-anyụ.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka Mkpọsa)
1Nʼoge a, Mosis na-azụ igwe anụ ụlọ Jetro ọgọ ya nwoke, onye nchụaja na Midia. Otu ụbọchị, o duuru igwe anụ ụlọ ndị a gaa nʼakụkụ ọzara. Ọ batara Horeb, ugwu Chineke. 2Nʼebe ahụ, mmụọ ozi nke Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ya nʼọkụ na-ere nʼetiti ọhịa. Mosis hụrụ na ọ bụ ezie na ọhịa ahụ na-enwu ọkụ ma ọ naghị ere ọkụ. 3Nʼihi ya, Mosis chere nʼobi ya sị, “Aga m aga nso leruo ihe omimi a anya, otu ọkụ si enwu ma ọhịa anaghị ere ọkụ.” 4Mgbe Onyenwe anyị hụrụ na ọ tụgharịrị ka ọ hụ ihe na-eme, Chineke kpọrọ ya oku site nʼime ọhịa ahụ, “Mosis! Mosis!” Ọ sị, “Lekwa m nʼebe a.” 5Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Abịakwala nso. Yipụ akpụkpọụkwụ gị, nʼihi na ebe i guzo bụ ala dị nsọ.” 6Ọ sịrị, “Abụ m Chineke nke nna gị. Chineke nke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb.” Mosis zoro ihu ya, nʼihi na ọ tụrụ egwu ilegide Chineke anya. 7Mgbe ahụ Onyenwe anyị sịrị, “Nʼezie, ahụla m nhụju anya nke ndị m nọ nʼIjipt, anụkwala m mkpu akwa ha, nʼihi aka ike nke ndị na-achị ha dịka ndị ohu. Nʼihi na ama m ahụhụ ha na-agabiga. 8Ya mere, agbadatala m ịnapụta ha site nʼaka ndị Ijipt na ịkpọpụta ha site nʼala ahụ, idubata ha nʼala ọma ahụ, nke sara mbara, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. Ala ebe ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Amọrait, na ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus bi.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka Mkpọsa)
22“ Onyenwe anyị kpụrụ m dịka mmalite ụzọ ya, tupu o bido ike ihe ọbụla ọzọ. 23Site nʼebighị ebi gara aga ka m dị; adịkwa m adị tupu e kee ụwa. 24Anọ m na-adị tupu e kee ogbu mmiri, tupu isi iyi ọbụla agbapụta mmiri nʼelu ụwa, 25tupu e kee ugwu ukwu na ugwu nta. 26E, amụọla m rịị tupu Chineke ekee ụwa na osisi niile, na aja niile dị nʼime ya. 27Anọ m ya mgbe o doziri mbara eluigwe nʼọnọdụ ya, mgbe ọ tụsara ha nʼelu ogbu mmiri niile; 28mgbe o hiwere mbara eluigwe, mgbe o mere ka isi iyi niile nke ogbu mmiri dị ike, 29mgbe ọ kpara oke nye osimiri ebe ọ ga-akwụsị, ka mmiri ya ghara ịgafe iwu ya, mgbe ọ kara akara ebe a tọrọ ntọala nke ụwa. 30Oge ahụ niile ka m na-anọ nʼakụkụ ya dịka onye ǹka. Ihe banyere m na-atọkwa ya ụtọ; ana m egwuri egwu nʼihu ya.
Akwụkwọ ozi (maka Mkpọsa)
11Onye ahụ na-eme mmadụ ka ọ dị nsọ, na ndị ahụ e mere ka ha dị nsọ si nʼotu ezinaụlọ. Nʼihi ya, ihere adịghị eme ya ịkpọ ha ụmụnna ya. 12Ọ sịrị, “Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m, nʼetiti nzukọ ka m ga-anọ bụọrọ gị abụ otuto.” 13Ọzọkwa, “Aga m atụkwasị obi m na ya.” Ọzọkwa, ọ sịrị, “Lee mụ onwe m, na ụmụ ndị Chineke nyere m.” 14Ebe ọ bụ na ụmụ ndị ahụ ketara oke na anụ ahụ na ọbara, ya onwe ya sooro ha keta oke nʼụdịdị ahụ, ka o site nʼọnwụ ya laa onye ahụ nwere ike ọnwụ nʼiyi, onye ahụ bụ ekwensu. 15Ma tọpụ ndị ahụ niile egwu nke ọnwụ mere ka ha bụrụ ohu na ndụ ha niile. 16Nʼihi na nʼezie, ọ bụghị ndị mmụọ ozi ka ọ na-enyere aka kama ọ bụ ụmụ ụmụ Ebraham. 17Nʼihi nke a, e mere ka o yie ụmụnna ya nʼihe niile, ka o nwe ike ghọọ onyeisi nchụaja kwesiri ntụkwasị obi ma na nke nwere obi ebere nʼijere Chineke ozi, ka o nweekwa ike chụọ aja ikpuchi mmehie mmadụ niile. 18Ebe ọ bụ na ya onwe ya tara ahụhụ mgbe a na-anwa ya ọnwụnwa, o nwekwara ike inyere ndị a na-anwa ọnwụnwa aka.
Oziọma (maka Mkpọsa)
24Mgbe ụbọchị ndị ahụ gasịrị, Elizabet bụ nwunye ya tụụrụ ime. O zoro onwe ya nʼime ụlọ ọnwa ise. 25Ọ sịrị, “Onyenwe anyị emeerela m nke a. O gosila m ihuọma ya nʼụbọchị ndị a, ma wepụkwara m ihere nʼetiti ndị nke m.” 26Ma nʼọnwa isii ya, Chineke zigara mmụọ ozi ya, bụ Gebrel, ka ọ gaa nʼobodo Nazaret nke dị nʼime Galili. 27Ka o jekwuru otu nwaagbọghọ na-amaghị nwoke bụ onye otu nwoke aha ya bụ Josef, onye sitere nʼagbụrụ Devid, kwere nkwa ịlụ. Aha nwaagbọghọ a bụ Meri. 28O jekwuru ya sị ya, “Ekele! Gị onye ihuọma dịkwasịrị. Onyenwe anyị nọnyekwara gị.” 29Ma obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu nʼihi okwu ya. O bidokwara ịtụgharị nʼuche ya ihe ekele a pụtara. 30Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Atụla egwu Meri, nʼihi na i chọtala ihuọma nʼebe Chineke nọ. 31Ma lee ị ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ị ga-akpọkwa aha ya Jisọs. 32Ọ ga-abụ nnukwu mmadụ onye a ga-akpọ Ọkpara Onye kachasị ihe niile elu. Onyenwe anyị Chineke ga-enye ya ocheeze nna ya Devid. 33Ọ ga-achị ụlọ Jekọb ruo ebighị ebi, alaeze ya agaghị enwekwa ọgwụgwụ.” 34Meri sịrị mmụọ ozi ahụ, “Olee otu nke a ga-esi mee ebe m bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke?” 35Mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye kachasị ihe niile elu ga-ekpuchikwa gị. Ya mere onye nsọ ahụ a ga-amụ, a ga-akpọ ya Ọkpara Chineke. 36Lekwa Elizabet onye ikwu gị atụrụla ime nwa nwoke nʼagadi ya. Nke a bụ ọnwa isii ya, bụ onye ahụ ha na-akpọ nwanyị aga. 37Nʼihi na ọ dịghị okwu sitere na Chineke nke na-agaghị ere.” 38Meri zaghachiri sị, “Abụ m ohu Onyenwe anyị, ka ọ dịrị m dị ka i kwuru.” Mgbe ahụ mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya laa.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 25 Maachị na kalenda nzukọ bụ 7 Epreel na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike